Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a
|
| 1 |
| Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị, |
| 2 |
| “Lee, ahọpụtala m Bezalel nwa Uri, nwa Hua, onye si nʼebo Juda, |
| 3 |
| emejupụtakwala m ya na Mmụọ nke Chineke, nʼamamihe, nghọta, ihe ọmụma na ike ije ozi ọrụ ǹka dị iche iche, |
| 4 |
| ichepụta ihe ǹka dị iche iche, nke metụtara ọlaọcha na ọlaedo na bronz, |
| 5 |
| ịwa nkume na ido nkume, ịkwa ǹka osisi, na ịrụ ọrụ ǹka dị iche iche. |
| 6 |
| Ọzọkwa, ahọpụtala m Oholiab, nwa Ahisamak, onye si nʼebo Dan, ka ọ bụrụ onye inyeaka Bezalel. “Enyekwala m ndị ǹka niile amara ịrụ ọrụ dị iche, nke ga-enyere ha aka ịrụ ihe ndị a niile m nyere gị iwu ịrụ: |
| 7 |
| “ya bụ, ụlọ nzute ahụ, na igbe iwu ọgbụgba ndụ ahụ, na ebe mkpuchi mmehie dị ya nʼelu, na ngwongwo ndị ọzọ niile dị nʼụlọ ikwu ahụ, |
| 8 |
| na tebul, na ngwongwo ya, ma ihe ịdọkwasị oriọna nke ọlaedo a nụchara anụcha, na ngwongwo ya, |
| 9 |
| na ebe ịchụ aja nke aja nsure ọkụ na-esi isi ụtọ, na ebe ịchụ aja nke aja nsure ọkụ, na ngwongwo ya, na ite mmiri ịsa ụkwụ na aka, na ụkwụ ite ahụ. |
| 10 |
| Na uwe ọma ahụ akpara akpa, ma uwe nsọ Erọn onye nchụaja na uwe nke ụmụ ya ndị ikom, mgbe ha na-eje ozi dịka ndị nchụaja. |
| 11 |
| Ya na mmanụ nsọ ahụ, na ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ e mere maka Ebe Nsọ. “Ha ga-arụzu ihe ndị a nʼusoro dịka m si nye gị ya nʼiwu.” |
| 12 |
| Mgbe ahụ, Onyenwe anyị sịrị Mosis, |
| 13 |
| Gwa ndị Izrel, “Unu aghaghị ido ụbọchị izuike m nsọ. Nʼihi na nke a ga-abụ ihe ịrịbama nʼetiti mụ na unu ruo ọgbọ niile ga-abịa, ka unu maara na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, onye na-edo unu nsọ. |
| 14 |
| “ ‘Ụbọchị izuike m dị nsọ nye unu. Nʼihi nke a, unu ga-edebe ya nsọ. Ọ bụrụ na onye ọbụla edebeghị ya nsọ, ọ ga-anwụ. Ọ bụrụkwa na onye ọbụla arụọ ọrụ ọbụla nʼụbọchị izuike m, a ga-ewezuga ya site nʼebe unu nọ. |
| 15 |
| Ụbọchị isii ka unu ga-arụ ọrụ unu niile. Ma ụbọchị nke asaa dị iche. Ọ bụ ụbọchị izuike. Ọ bụkwa ụbọchị dị nsọ nye Onyenwe anyị. Nʼihi nke a, onye ọbụla rụrụ ọrụ ọbụla nʼụbọchị Izuike ga-anwụ. |
| 16 |
| Ndị Izrel ga-edebe ụbọchị Izuike, na-eme mmemme ya nʼọgbọ niile, dịka ọgbụgba ndụ nke ebighị ebi. |
| 17 |
| Ọ ga-abụ ihe ịrịbama nke ga-adịgide nʼetiti mụ na ndị Izrel ruo mgbe ebighị ebi. Nʼihi na nʼụbọchị isii ka Onyenwe anyị kere eluigwe na ụwa. Ọ kwụsịrị ọrụ nʼụbọchị nke asaa, zuo ike, turu ndụ.’ ” |
| 18 |
| Mgbe Onyenwe anyị gwasịrị Mosis okwu ndị a nʼelu ugwu Saịnaị, o nyere ya mbadamba nkume abụọ nke iwu ọgbụgba ndụ ahụ. Ọ bụkwa mbadamba nkume ndị ahụ nke mkpịsịaka Chineke dere ihe nʼelu ha. |
|
| Chekwaa ihe edeturu |
https://beblia.bible:81/BibleAudio/igbo2020/exodus/031.mp3
40
31