Mmụọ ozi Onyenwe anyị sitere na Gilgal bịa Bokim gwa ndị Izrel okwu sị ha, “Mụ onwe m kpọpụtara unu site nʼIjipt, kpọbata unu nʼala a dịka m kwere nna unu ha na nkwa. Asịrị m, ‘Agaghị m ala azụ imezu ọgbụgba ndụ mụ na unu,
Agwara m unu, na ‘agaghị m esite nʼihu unu chụpụ ha; ha ga-adịrị unu dịka ọnya nʼakụkụ niile, ebe chi niile ha ga-abụkwara unu ihe na-eweta ọnwụnwa. ’ ”
Ndị Izrel fere Onyenwe anyị ofufe ụbọchị niile nke ndụ Joshua, na nke ndụ ndị okenye ahụ, bụ ndị gara nʼihu bie ndụ mgbe ọ nwụsịrị, bụkwa ndị hụrụ ọrụ ukwuu niile nke Onyenwe anyị rụụrụ ndị Izrel.
Ha gbakụtara Onyenwe anyị azụ, bụ Chineke ahụ, nna ha fere ofufe, onye kpọpụtara ha site nʼala Ijipt. Ma ha malitere ife na ịsọpụrụ, na ịkpọ isiala nye ọtụtụ chi dị iche iche, bụ chi nke ndị bi ha gburugburu. Ha si otu a kpasuo Onyenwe anyị iwe.
Ya mere, Onyenwe anyị were iwe megide Izrel, rara ha nye nʼaka ndị ji aka ike pụnara ha ihe ha nwere. O weere ha resi ndị iro ha gbara ha gburugburu, bụ ndị ha enwekwaghị ike iguzogide.
Dịka ọ ṅụrụ ya nʼiyi nye ha, mgbe ọbụla ụmụ Izrel pụrụ ibu agha, aka Onyenwe anyị megidere ha ime ka ha bụrụ ndị e meriri emeri. Ọnọdụ ha jọrọ njọ nke ukwuu.
Ma ụmụ Izrel egeghị ndị ikpe ahụ ntị, kama ha nọgidere na-akpọ isiala nye ma na-agbasokwa chi ndị ọzọ. Dịka nna nna ha na-emeghị, ha mere ngwangwa wezuga onwe ha site nʼụzọ Onyenwe anyị, bụrụ ndị na-enupu isi nʼebe iwu Onyenwe anyị dị.
Ma mgbe ọbụla Onyenwe anyị nyere ụmụ Izrel onye ikpe, ọ na-anọnyere onye ikpe ahụ ogologo ụbọchị niile nke ndụ ya. Ọ na-esitekwa nʼaka onye ikpe a napụta ụmụ Izrel nʼaka ndị iro ha nʼihi na Onyenwe anyị nwere obi ebere nʼahụ ụmụ Izrel, mgbe ha na-asụ ude, nʼihi mmegbu na mkpagbu niile ndị iro ha na-emegbu ha, ma na-akpagbukwa ha.
Ma mgbe ọbụla onye ikpe a nwụrụ, ụmụ Izrel na-alaghachi azụ biwe ndụ ọjọọ karịa nke nna nna ha ochie. Ha na-agbaso chi ndị ọzọ, na-akpọ isiala nye ha, na ife ha ofufe. Ha jụrụ iwezuga agwa ọjọọ ha ndị a ma ọ bụkwa ụzụ isiike ha.