× Asụsụ Europe Russian Belarusian Asụsụ Ukraine Asụsụ Polish Serbian Bulgaria Asụsụ Slovakian Czech Asụsụ Romania Moldovian Azebaịjan Armenia Onye Georgia Albania Avar Bashkir Tatar Chechen Asụsụ Slovenian Asụsụ Croatian Estonia Asụsụ Latvian Asụsụ Lithuania Asụsụ Hungary Asụsụ Finish Asụsụ Norway Asụsụ Sweden Asụsụ Iceland Grik Masedonia German Bavaria Asụsụ Dutch Asụsụ Danish Welsh Gaelic Asụsụ Aịrish French Basque Catalan .Talian Galacian Romani Bosnian Kabardian North America Bekee South America Asụsụ Spanish Asụsụ Portuguese Guarani Asụsụ Quechuan Aymara Central America Onye Jamaica Asụsụ Nawatụl Kiche Qeqchi Asụsụ Haiti Ebe Ọwụwa Anyanwụ Eshia Chinese nke Ndị Japan Korean Mongolian Uyghur Hmong Tibetian South East Asia Onye Malaysia Burmese Chin Asụsụ Nepali Cebuano Asụsụ Tagle Kambodia Thai Indoneshian Asụsụ Sundan Vietnam Asụsụ Javanese Lao Iban Iu Mien Kachin Lahu Aceh Balinese Bugis Pampanga Sasak Shan Waray South Asia Hindi Dia Awadhi Mizo Kannada Malayalam Marathi Gujarati Asụsụ Tamil Telugu Asụsụ Punjabi Kurukh Asụsụ Assam Maithili Asụsụ Bengali Asụsụ Urdu Sinhala Dogri Haryanvi Meitei Konkani Santalaị Sindhi Koya Thado Sanskrit Devanagari Adilabad Gondi Ahirani Balochi Bundeli Chhattisgarhi Garhwali Kangri Kumaoni Mewari Munda Sadri Seraiki Shekhawati Sylheti Bagri Bhilali Bodo Braj Tulu Etiti Asia Kyrgyz Asụsụ Uzbek Tajik Ndị Turkmen Kazakhstan Karakalpak Etiti ọwụwa anyanwụ Turkish Hibru Arabic Peshia Kurdi Mazanderani Pashto Coptic Africa Afrịka Xhosa Asụsụ Ndebele Akpan Asụsụ Amharik Wolaytta Onye Naijiria Mossi Ika Dinka Kabyle Ewe Asụsụ Swahili Morocco Asụsụ Somali Shona Madagaska Igbo Lingala Baoule Siswati Tsonga Tswana Onye Gambian Ndi Yoruba Kamba Kinyarwanda Hausa Chewa Luo Makua Dyula Fulfulde Kalenjin Kikọyu Kikwango Kirundi Krio Nigerian Pidgin Oromo Tshiluba Tshivenda Twi Umbundu Lugbara Luguru Pular Gussi Maasai Turkana Moba Nuer Shilluk Tamasheq Makonde Bemba Fon Hadiyya Ibibio Kimbundu Kimiiru Lango Liberian Kreyol Lomwe Mende Morisyen Ndau Nyankole Sena Sidamo Soga Songe Sukuma Tarifit Teso Tiv Zande Dagbani Edo Kituba Kọntinent Australia New Zealand Papua New Guinea Asụsụ Ochie Asụsụ Arameik Latin Esperanto 1 1 1 Igbo 1988 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo 2020Bible Nso 2006Igbo 19881 1 1 MATIU MATIUMAKLUKJỌNỌLU OZIROM1 KỌRINT2 KỌRINTGALETIAEFESỌSFILIPAIKỌLỌSI1 TESALỌNAIKA2 TESALỌNAIKA1 TIMỌTI2 TIMỌTITAITỌSFAILIMONHIBRUJEMES1 PITA2 PITA1 JỌN2 JỌN3 JỌNJUDNKPUGHE1 1 1 4 123456789101112131415161718192021222324252627281 1 1 : 1 123456789101112131415161718192021222324251 1 1 Igbo Bible 1988 MATIU 4 Chekwaa ihe edeturu 1Emesịa, Mmụọ Nsọ duuru Jisos baa nꞌọzara ka ekwensu nwaa ya ọnwụnwa.2Iri ụbọchị anọ, ehihie na abalị, Jisọs nọrọ na-erighị nri ọ bụla. Agụụ gụrụ ya nke ukwuu.3Mgbe ahụ ekwensu bịara nwaa ya ọnwụnwa sị ya, “Ọ bụrụ nꞌezie na ị bụ Ọkpara Chineke meenụ ka nkume ndị a ghọọrọ gị nri.”4Ma Jisọs sịrị ya, “Lee, akwụkwọ nsọ gwara anyị na ọ bụ nanị site nꞌirube isi nꞌokwu Chineke ka mkpụrụ obi mmadụ ga-eji dị ndụ, ọ bụghị site nꞌiri nri.”5Ọzọ, ekwensu duuru ya gaa guzo nꞌebe dịkarịsịrị elu nke ụlọ nsọ ukwu Chineke dị na Jerusalem sị ya,6“Site nꞌebe a tụda onwe gị igosi na ị bụ Ọkpara Chineke. Nꞌihi na e dere ya nꞌakwụkwọ nsọ sị, ‘Chineke ga-ezite ndị mmụọ ozi ya ka ha ghọta gị. Ha ga-echebe gị, ka ị ghara ịmerụ ahụ.’ ”7Ma Jisọs zara sị ya, “E deela ya nꞌakwụkwọ nsọ sị, ‘Ị gaghị anwa Onyenwe gị na Chineke gị ọnwụnwa nzuzu.’ ”8Ọzọ, ekwensu kpọọrọ ya gaa nꞌelu ugwu dị elu, gosi ya ụwa nile na ịma mma ya.9Ọ sịrị Jisọs, “Aga m enye gị ha nile ma ọ bụrụ na ị daa nꞌala kpọọ isi ala nye m.”10Ma Jisọs zara sị ya, “Si nꞌebe m nọ pụọ, ekwensu. Nꞌihi na akwụkwọ nsọ kwuru sị, ‘Ọ bụ nanị Onyenwe gị Chineke ka ị ga-akpọ isi ala nye, nanị ya kwa ka ị ga-efe.’ ”11Mgbe ahụ ekwensu hapụrụ ya laa. Ndị mmụọ ozi bịakwutere Jisọs inyere ya aka.12Mgbe Jisọs nụrụ na e jidela Jọn omee baptizim, ọ hapụrụ Judia laghachi Galili gaa biri na Nazaret.13Emesịa, ọ hapụrụ Nazaret gaa biri na Kapanọm. Kapanọm bụ obodo dị nꞌakụkụ osimiri Galili. Ọ dị nso nꞌoke ala Zebulọn na Naftali.14Nꞌụzọ dị otu a, amụma ahụ Aịzaya buru mezuru. Amụma nke sị,15“Ala Zebulọn na Naftalị, nke dị nꞌakụkụ osimiri Jọdan na Galili, ebe ọtụtụ ndị mba ọzọ bi. Nꞌebe ahụ,16ndị nọ nꞌọchịchịrị ahụla ìhè dị ukwuu. Ndị nọ nꞌala ọnwụ ka ìhè ahụ nwukwasịrị.”17Site nꞌoge ahụ gaa nꞌihu Jisọs bidoro na-ekwusa na-asị, “Chegharịanụ, sitenụ na mmehie unu bịakwute Chineke, nꞌihi na alaeze eluigwe na-abịa nso.”18Otu ụbọchị, mgbe Jisọs na-agafe nꞌakụkụ osimiri Galili, ọ hụrụ ụmụnne abụọ, Saịmọn onye a na-akpọ Pita, na Anduru nwanne ya, ndị ọrụ ha bụ igbu azụ, ebe ha nọ nꞌụgbọ mmiri na-egbu azụ.19Jisọs sịrị ha, “Bịanụ soro m. Aga m eme unu ndị ọkụ na-akụta mmadụ.”20Ha hapụrụ ngwa ọrụ ha otu mgbe ahụ soro ya.21Mgbe ọ gara nꞌihu nke nta, ọ hụrụ ụmụnne abụọ ọzọ, Jemes na Jọn, ebe ha na nna ha Zebedi nọ nꞌime ụgbọ mmiri na-emezi ihe ha ji egbu azụ. Jisọs kpọkwara ha.22Otu mgbe ahụ ha hapụrụ ụgbọ ha na nna ha soro ya.23Jisọs jegharịrị nꞌobodo Galili nile na-ezi ihe nꞌọgbakọ ndị Juu nile. Ọ na-ekwusa ozi ọma nke alaeze eluigwe nꞌebe ọ bụla ọ gara. Ọ gwọkwara ọrịa dị iche iche.24Akụkọ banyere ihe ịrịba ndị a fesara jezuo akụkụ Siria nile. Mgbe ahụ ọtụtụ ndị mmadụ kpọtaara ya ndị nile ahụ na-esighị ike, ndị na-arịa ụdị ọrịa dị iche iche, ndị nwere ahụ mgbu, na ndị mmụọ ọjọọ na-esogbu, na ndị akwụkwụ, na ndị akụkụ ahụ ha kpọnwụrụ akpọnwụ. Ọ gwọkwara ha nile.25Ọtụtụ mmadụ na-eso ya ebe nile ọ bụla ọ na-aga. Ndị sitere Galili, na Dekapolis, na Jerusalem, na Judia, na ọ bụladị nꞌofe osimiri Jọdan, bịara soro ya.Igbo Bible 1988 No Data Igbo Bible 1988 MATIU 4 00:00:00 00:00:00 0.5x 2.0x https://beblia.bible:81/BibleAudio/igbo1988/matthew/004.mp3 28 4