× Asụsụ Europe Russian Belarusian Asụsụ Ukraine Asụsụ Polish Serbian Bulgaria Asụsụ Slovakian Czech Asụsụ Romania Moldovian Azebaịjan Armenia Onye Georgia Albania Avar Bashkir Tatar Chechen Asụsụ Slovenian Asụsụ Croatian Estonia Asụsụ Latvian Asụsụ Lithuania Asụsụ Hungary Asụsụ Finish Asụsụ Norway Asụsụ Sweden Asụsụ Iceland Grik Masedonia German Bavaria Asụsụ Dutch Asụsụ Danish Welsh Gaelic Asụsụ Aịrish French Basque Catalan .Talian Galacian Romani Bosnian North America Bekee South America Asụsụ Spanish Asụsụ Portuguese Guarani Asụsụ Quechuan Aymara Central America Onye Jamaica Asụsụ Nawatụl Kiche Qeqchi Asụsụ Haiti Ebe Ọwụwa Anyanwụ Eshia Chinese nke Ndị Japan Korean Mongolian Uyghur Hmong South East Asia Onye Malaysia Burmese Chin Asụsụ Nepali Cebuano Asụsụ Tagle Kambodia Thai Indoneshian Vietnam Asụsụ Javanese Lao Iban Iu Mien Kachin Lahu Aceh Balinese Bugis Pampanga Sasak Shan Waray South Asia Hindi Dia Awadhi Mizo Kannada Malayalam Marathi Gujarati Asụsụ Tamil Telugu Asụsụ Punjabi Kurukh Asụsụ Assam Maithili Asụsụ Bengali Asụsụ Urdu Sinhala Dogri Haryanvi Meitei Konkani Santalaị Sindhi Koya Thado Sanskrit Devanagari Adilabad Gondi Ahirani Balochi Bundeli Chhattisgarhi Garhwali Kangri Kumaoni Mewari Munda Sadri Seraiki Shekhawati Sylheti Etiti Asia Kyrgyz Asụsụ Uzbek Tajik Ndị Turkmen Kazakhstan Karakalpak Etiti ọwụwa anyanwụ Turkish Hibru Arabic Peshia Kurdi Pashto Coptic Africa Afrịka Xhosa Asụsụ Ndebele Akpan Asụsụ Amharik Wolaytta Onye Naijiria Mossi Ika Dinka Kabyle Ewe Asụsụ Swahili Morocco Asụsụ Somali Shona Madagaska Igbo Lingala Baoule Siswati Tsonga Tswana Onye Gambian Ndi Yoruba Kamba Kinyarwanda Hausa Chewa Luo Makua Dyula Fulfulde Kalenjin Kikọyu Kikwango Kirundi Krio Nigerian Pidgin Oromo Tshiluba Tshivenda Twi Umbundu Lugbara Luguru Pular Gussi Maasai Turkana Moba Nuer Shilluk Tamasheq Makonde Bemba Fon Hadiyya Ibibio Kimbundu Kimiiru Lango Liberian Kreyol Lomwe Mende Morisyen Ndau Nyankole Sena Sidamo Soga Songe Sukuma Tarifit Teso Tiv Zande Kọntinent Australia New Zealand Papua New Guinea Asụsụ Ochie Asụsụ Arameik Latin Esperanto 1 1 1 1988 Nsọ nʼIgbo 2020Bible Nso 200619881 1 1 MATIU MATIUMAKLUKJỌNỌLU OZIROM1 KỌRINT2 KỌRINTGALETIAEFESỌSFILIPAIKỌLỌSI1 TESALỌNAIKA2 TESALỌNAIKA1 TIMỌTI2 TIMỌTITAITỌSFAILIMONHIBRUJEMES1 PITA2 PITA1 JỌN2 JỌN3 JỌNJUDNKPUGHE1 1 1 16 123456789101112131415161718192021222324252627281 1 1 : 18 123456789101112131415161718192021222324252627281 1 1 Igbo Bible 1988 MATIU 16 Chekwaa ihe edeturu 1Otu ụbọchị, ndị Farisii na ndị Sadusii bịakwutere Jisọs ịnwa ya ọnwụnwa. Ha gwara Jisọs sị ya, “Gosi anyị ihe ịrịba ama si nꞌelu, nke ga-ezi anyị na ị bụ onye ị sị na ị bụ.”2Jisọs zara sị ha, “Ihe unu maara nke ọma bụ nanị ịkọwa ihu eluigwe. Nꞌanyasị unu na-sị, ‘Mmiri agaghị ezo nꞌihi na ihu eluigwe na-acha uhie uhie.’3Nꞌụtụtụ unu na-asị, ‘Anyị ga-enwe mmiri ozuzo taa nꞌihi na ihu eluigwe na-acha uhie uhie na oji oji.’ Lee na unu pụrụ ịkọwa ihu eluigwe, ma unu apụghị isite nꞌihe ịrịba ama ndị a unu na-ahụ anya kọwaa ihe oge a anyị nọ nꞌime ya pụtara.4Ajọ ọgbọ nke jupụtara nꞌekweghị ekwe, nke na-arịọkwa ka e mee ihe ịrịba ama na mbara eluigwe. Ọ dịghị ihe ịrịba ama ọzọ a ga-egosi unu karịa ihe ịrịba ama Jona.” Mgbe ahụ Jisọs sitere nꞌebe ahụ ha nọ pụọ.5Mgbe ha gafesịrị nꞌofe ọzọ nke osimiri ahụ, ndị na-eso ụzọ ya chetara na ha ejighị ihe oriri ọ bụla.6Nꞌoge ahụ kwa, Jisọs dụrụ ha ọdụ sị ha, “Lezienụ anya nꞌebe ihe na-eko achịcha ndị Farisii na ndị Sadusii dị.”7Ma ndị na-eso ụzọ ya aghọtaghị ihe Jisọs na-agwa ha. Ha chere na ọ na-ekwu okwu a nꞌihi na ha chefuru iweta nri ha ga-eri.8Ebe ọ bụ na Jisọs matara ihe ha na-eche nꞌobi ha, ọ gwara ha okwu sị ha, “Unu ndị okwukwe nta! Gịnị mere unu ji na-esogbu onwe unu nꞌihi na unu enweghị ihe oriri?9Olee mgbe unu ga-amata ihe? Ọ̀ bụ na unu echetaghị puku mmadụ ise ahụ m jiri ogbe beredi ise mee ka ha rijuo afọ?10Unu echetakwaghị na m ji ogbe beredi asaa zụọ puku mmadụ anọ? Ibiribe beredi juru nkata ole ka unu tụtụkọtara?11Gịnị mere unu ji chee na ọ bụ ihe banyere nri ka m na-ekwu? Ka m kwuokwa okwu m kwuru ọzọ, cheenụ onwe unu nche nꞌebe ihe na-eko achịcha ndị Farisii na ndị Sadusii nọ.”12Nꞌikpeazụ ha ghọtara na ihe ọ na-akọwara ha abụghị ihe banyere ihe na-eko achịcha a na-ata ata, kama ọ bụ ihe banyere ozizi ọjọọ ndị Farisii na ndị Sadusii.13Mgbe Jisọs bịaruru obodo a na-akpọ Sizaria Filipaị, ọ jụrụ ndị na-eso ụzọ ya ajụjụ sị ha, “Onye ka ndị mmadụ na-asị na mụ onwe m bụ?”14Ha zara sị ya, “Ụfọdụ na-asị na ị bụ Jọn omee baptizim, ụfọdụ na-asị na ị bụ Ịlaịja, ndị ọzọ na-asịkwa na ị bụ Jeremaya, ma ọ bụ otu nꞌime ndị amụma.”15Ma Jisọs jụrụ ha sị, “Onye kwanụ ka unu onwe unu na-eche na m bụ?”16Saịmọn Pita zara sị ya, “Ị bụ Onye nzọpụta ahụ, Ọkpara Chineke dị ndụ.”17Jisọs gwara Pita okwu sị ya, “Saịmọn Pita, ị bụ onye Chineke gọzịrị agọzi, nꞌihi na eziokwu a i kwuru ugbu a esiteghị nꞌaka mmadụ efu rute gị. Kama ọ bụ Nna m bi nꞌeluigwe mere ka ị mata ya.18Ma ka m gwa gị eziokwu, aha gị bụ Pita, nke pụtara ma a sụgharịa ya, Nkume. Ọ bụkwa nꞌelu nkume a ka m ga-ewu ụlọ chọọchị m. Ike nile nke ọkụ ala mmụọ apụkwaghị iguzo megide ya.19Aga m enye gị mkpịsị igodo alaeze eluigwe. Ihe ọ bụla dị nꞌụwa ị jụrụ na ọ gaghị abata nꞌeluigwe agaghị abata nꞌebe ahụ. Ihe ọ bụla kwa ị nabatara nꞌụwa, ya ka a ga-anabatakwa nꞌeluigwe.”20Mgbe ahụ, Jisọs nyere ndị na-eso ụzọ ya iwu ka ha ghara ime ka ndị ọzọ mata na ya bụ Onye nzọpụta ahụ.21Site nꞌoge ahụ Jisọs malitere ịkọwara ndị na-eso ụzọ ya ihe banyere Jerusalem. O mere ka ha mata na ọ ga-ahụ ahụhụ dị iche iche site nꞌaka ndị isi ndị Juu. Ọ gwara ha sị, “Ndị isi ndị Juu ga-egbu m. Ma mgbe ụbọchị atọ gasịrị, aga m esite nꞌọnwụ bilie.”22Mgbe Jisọs gwasịrị ha okwu a, Pita duuru ya pụọ gaa nꞌotu akụkụ, nọdụ nꞌebe ahụ baara ya mba sị ya, “Onyenwe m, Chineke ekwela. Ihe ndị a agaghị adakwasị gị!”23Ma Jisọs chigharịrị lee Pita anya sị ya, “Si nꞌebe m nọ pụọ, ekwensu! Ị bụ nnọọ ajọ mmadụ nꞌebe m nọ. Nꞌihi na ihe ị na-eche echiche ya bụ nanị echiche mmadụ, ọ bụghị echiche Chineke.”24Mgbe ahụ Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ ya okwu sị ha, “Ọ bụrụ na onye ọ bụla achọọ ịbụ onye na-eso ụzọ m, ya buru ụzọ jụ onwe ya, buliekwa obe ya soro m nꞌazụ.25Nꞌihi na onye ọ bụla na-eche ndụ ya nche ka ọ hapụ ifunarị ya ga-atụfu ya. Ma onye ọ bụla tụfuru ndụ ya nꞌihi m, ga-enwetakwa ya.26Nꞌihi na uru gịnị ka mmadụ nwetara ma ọ bụrụ na o ritechaa ụwa nile nꞌuru ma tufuo ndụ ya? Gịnị bụ ihe ahụ dị nꞌụwa a ga-eji gbanwere ndụ mmadụ?27Nꞌihi na mụ bụ Nwa nke mmadụ ga-abịa nꞌebube nke Nna m, mụ na ndị mmụọ ozi m. Mgbe ahụ ka m ga-ekpe onye ọ bụla ikpe dị ka ọrụ ya si dị.28Ụfọdụ nꞌime unu ndị guzo nꞌebe a ugbu a ga-adị ndụ hụ Nwa nke mmadụ ka ọ na-abịa dị ka eze nꞌalaeze ya.”Igbo Bible 1988 No Data Igbo Bible 1988 MATIU 16 00:00:00 00:00:00 0.5x 2.0x https://beblia.bible:81/BibleAudio/igbo1988/matthew/016.mp3 28 16