× Asụsụ Europe Russian Belarusian Asụsụ Ukraine Asụsụ Polish Serbian Bulgaria Asụsụ Slovakian Czech Asụsụ Romania Moldovian Azebaịjan Armenia Onye Georgia Albania Avar Bashkir Tatar Chechen Asụsụ Slovenian Asụsụ Croatian Estonia Asụsụ Latvian Asụsụ Lithuania Asụsụ Hungary Asụsụ Finish Asụsụ Norway Asụsụ Sweden Asụsụ Iceland Grik Masedonia German Bavaria Asụsụ Dutch Asụsụ Danish Welsh Gaelic Asụsụ Aịrish French Basque Catalan .Talian Galacian Romani Bosnian North America Bekee South America Asụsụ Spanish Asụsụ Portuguese Guarani Asụsụ Quechuan Aymara Central America Onye Jamaica Asụsụ Nawatụl Kiche Qeqchi Asụsụ Haiti Ebe Ọwụwa Anyanwụ Eshia Chinese nke Ndị Japan Korean Mongolian Uyghur Hmong South East Asia Onye Malaysia Burmese Chin Asụsụ Nepali Cebuano Asụsụ Tagle Kambodia Thai Indoneshian Vietnam Asụsụ Javanese Lao Iban Iu Mien Kachin Lahu Aceh Balinese Bugis Pampanga Sasak Shan Waray South Asia Hindi Dia Awadhi Mizo Kannada Malayalam Marathi Gujarati Asụsụ Tamil Telugu Asụsụ Punjabi Kurukh Asụsụ Assam Maithili Asụsụ Bengali Asụsụ Urdu Sinhala Dogri Haryanvi Meitei Konkani Santalaị Sindhi Koya Thado Sanskrit Devanagari Adilabad Gondi Ahirani Balochi Bundeli Chhattisgarhi Garhwali Kangri Kumaoni Mewari Munda Sadri Seraiki Shekhawati Sylheti Etiti Asia Kyrgyz Asụsụ Uzbek Tajik Ndị Turkmen Kazakhstan Karakalpak Etiti ọwụwa anyanwụ Turkish Hibru Arabic Peshia Kurdi Pashto Coptic Africa Afrịka Xhosa Asụsụ Ndebele Akpan Asụsụ Amharik Wolaytta Onye Naijiria Mossi Ika Dinka Kabyle Ewe Asụsụ Swahili Morocco Asụsụ Somali Shona Madagaska Igbo Lingala Baoule Siswati Tsonga Tswana Onye Gambian Ndi Yoruba Kamba Kinyarwanda Hausa Chewa Luo Makua Dyula Fulfulde Kalenjin Kikọyu Kikwango Kirundi Krio Nigerian Pidgin Oromo Tshiluba Tshivenda Twi Umbundu Lugbara Luguru Pular Gussi Maasai Turkana Moba Nuer Shilluk Tamasheq Makonde Bemba Fon Hadiyya Ibibio Kimbundu Kimiiru Lango Liberian Kreyol Lomwe Mende Morisyen Ndau Nyankole Sena Sidamo Soga Songe Sukuma Tarifit Teso Tiv Zande Kọntinent Australia New Zealand Papua New Guinea Asụsụ Ochie Asụsụ Arameik Latin Esperanto 1 1 1 1988 Nsọ nʼIgbo 2020Bible Nso 200619881 1 1 MATIU MATIUMAKLUKJỌNỌLU OZIROM1 KỌRINT2 KỌRINTGALETIAEFESỌSFILIPAIKỌLỌSI1 TESALỌNAIKA2 TESALỌNAIKA1 TIMỌTI2 TIMỌTITAITỌSFAILIMONHIBRUJEMES1 PITA2 PITA1 JỌN2 JỌN3 JỌNJUDNKPUGHE1 1 1 18 123456789101112131415161718192021222324252627281 1 1 : 15 12345678910111213141516171819202122232425262728293031323334351 1 1 Igbo Bible 1988 MATIU 18 Chekwaa ihe edeturu 1Nꞌoge ahụ kwa, ndị na-eso ụzọ ya bịakwutere ya jụọ ya ajụjụ sị, “Ọ bụ onye nꞌetiti anyị ga-enwe ọnọdụ dị ukwuu karịa ndị ọzọ nꞌalaeze eluigwe?”2Jisọs kpọrọ otu nwantakịrị ka ọ bịakwute ya. O mere ka nwanta ahụ guzo nꞌetiti ha.3Mgbe ahụ Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ ya okwu sị, “Ọ bụrụ na unu esiteghị na mmehie unu chegharịa bịakwute Chineke dị ka ụmụntakịrị, unu agaghị abata nꞌime alaeze eluigwe.4Onye ọ bụla wedara onwe ya ala dị ka nwantakịrị bụ onye dịkarịsịrị ukwuu nꞌalaeze eluigwe.5Onye ọ bụla naabatara nwantakịrị dị otu a nꞌihi m, bụ onye nabatara m, na onye lezikwara m anya.6Ma ọ bụrụ na onye ọ bụla nꞌime unu emee ka otu nꞌime ndị a dị nta, bụ ndị tụkwasịrị m obi, daa mba nꞌokwukwe ya, ọ kaara onye ahụ mma na e kedoro ya nkume nꞌolu, tụnye ya nꞌoke osimiri ka mmiri rie ya.7“Ahụhụ dịrị ụwa nꞌihi mmehie nile dị nꞌime ya. Ọnwụnwa na-eduba mmadụ ime ihe ọjọọ na-adị oge nile. Ma ahụhụ ga-adịrị nwoke ahụ na-ewetara ibe ya ihe ọnwụnwa.8Nꞌihi nke a, ọ bụrụ na aka gị ma ọ bụ ụkwụ gị ga-eme ka i mehie, gbupụ ya tufuokwa ya. Ọ kaara gị mma na ị ga-abanye nꞌalaeze eluigwe na-enweghị ụkwụ na aka, karịa na ị ga-enwe aka na ụkwụ ma banye nꞌọkụ ala mmụọ.9Ọzọ, ọ bụrụ na anya gị ga-eme ka ị mehie, ghụpụta ya tufuokwa ya. Ọ kaara gị mma na ị ga-eji otu anya banye alaeze eluigwe karịa na ị ga-enwe anya abụọ, banye nꞌọkụ ala mmụọ.10“Lezienụ anya ka unu ghara ileda otu nꞌime ụmụntakịrị a anya. Nꞌihi na nꞌeluigwe, ndị mmụọ ozi ha na-anọ nꞌihu Nna m mgbe nile.11Nꞌihi na mụ, Nwa nke mmadụ, bịara ịzọpụta ndị furu efu.12“Gịnị ka unu chere? Ọ bụrụ na ọ dị onye nwere narị atụrụ, ma otu nꞌime ha akapfuo, gịnị ka ọ ga-eme? Ọ̀ gaghị ahapụ iri atụrụ toolu na toolu fọdụrụ pụọ jegharịa nꞌugwu na ndịda nile, ịchọ atụrụ ahụ kpafuru akpafu?13Ọ bụrụkwa na ọ chọta ya, gịnị ka ọ ga-eme? Ọ ga-aṅụrị ọṅụ nꞌihi otu atụrụ a karịa iri atụrụ toolu na toolu ndị nọ nꞌụlọ.14Otu a ka ọ dịkwa nꞌebe Nna m nọ; ọ bụghị ọchịchọ ya na otu nꞌime ndị a dịkarịsịrị nta ga-ala nꞌiyi.15“Ọ bụrụ na nwanne gị emehie megide gị, jekwuru ya na nzuzo tụọ ya mmehie ya nꞌihu. Ọ bụrụ na o gee gị ntị, rịọọkwa mgbaghara, i ritela nwanne gị nꞌuru.16Ma ọ bụrụ na o geghị gị ntị, kpọrọ otu onye ma ọ bụ mmadụ abụọ ọzọ laghachi azụ nꞌebe ọ nọ, meekwa ka ihe nile i kwuru nꞌihu ndị akaebe a doo ya anya.17Ọ bụrụkwa na ọ nọgidesie ike jụ ige gị ntị, were ikpe gị jekwuru ndị chọọchị. Ọ bụrụ na ọ nabataghị ikpe ndị chọọchị kpere, gụọ ya dị ka onye mba ọzọ, onye na-amaghại Chineke.18Nꞌezie, asị m unu, na ihe ọ bụla unu kere agbụ nꞌụwa, e keela ya rị agbụ nꞌeluigwe. Ihe ọ bụla kwa unu tọpụrụ, a tọpụkwala ya rị nꞌeluigwe.19“Ana m agwa unu nke a sị, ọ bụrụ na mmadụ abụọ nꞌetiti unu ekwekọọ nꞌụwa banyere ihe ọ bụla unu na-arịọ nꞌekpere, Nna m bi nꞌeluigwe ga-emezuru unu ihe ahụ.20Nꞌihi na ebe ọ bụla mmadụ abụọ ma ọ bụ atọ zukọtara nꞌaha m, mụ onwe m nọ nꞌetiti ha.”21Mgbe ahụ Pita bịakwutere Jisọs jụọ ya ajụjụ sị, “Onywenwe anyị, ọ bụ ugbo ole ka m ga-agbaghara nwanne m nke mehiere megide m? Ọ̀ bụ ugbo asaa?”22Jisọs zara sị ya, “Ọ dịghị, ọ bụghị ugbo asaa. Kama ị ga-agbaghara ya ruo iri ugboro asaa uzọ asaa.23“A ga-eji alaeze eluigwe tụnyere eze ahụ kpebiri ka ya na ndị na-ejere ya ozi gụzie ego ya ha ji.24Mgbe ha malitere na-apịazi, a kọtaara eze ahụ otu nꞌime ndị ohu ya ji ya ụgwọ ruru nde naịra abụọ.25Nwoke ahụ enweghị ihe ọ ga-eji kwụọ ụgwọ o ji. Eze ahụ nyere iwu ka e refuo ya na nwụnye, na ụmụ ya, na ihe nile o nwere, nꞌihi ụgwọ o ji.26“Ma nwoke ahụ dara nꞌala nꞌihu eze ahụ, gbuokwa ikpere ya nꞌala rịọọ eze ahụ arịrịọ sị, ‘Onyenwe m, biko, nwee ntachi obi nꞌebe m nọ. Aga m akwụghachịkwa gị ụgwọ nile m ji gị.’27“Eze ahụ jupụtara nꞌọmiko nꞌebe ọ nọ, meere ya ebere. Ọ sịrị ya akwụghachila ụgwọ o ji ọzọ.28“Ma mgbe ohu ahụ sitere nꞌihu eze ahụ pụọ, o jekwuuru otu nwoke ji ya ụgwọ otu puku naịra. O jidere ya nꞌaka ike, machie ya aka nꞌakpịrị, sị ya, ‘Kwụghachi m ụgwọ i ji m ugbu a!’29“Nwoke ahụ dara nꞌala nꞌihu ya rịọọ ya ka o nye ya nwantịntị oge. Ọ rịọkwara ya sị, ‘Biko enyi m, nwee ntachi obi, aga m akwụghachi gị ụgwọ m ji gị.’30“Ma nwoke ahụ e ji ụgwọ achọghị ichere! O jidere nwoke ahụ, tụba ya nꞌụlọ mkpọrọ, ebe ọ ga-anọ ruo mgbe ọ kwụsịrị ụgwọ nile o ji ya.31“Mgbe ndị enyi nwoke ahụ e tinyere nꞌụlọ mkpọrọ hụrụ ihe mere enyi ha, ha jekwuuru eze ahụ, kọọrọ ya ihe nile ha hụrụ.32Eze ahụ kpọrọ nwoke a, nke ọ gbaghara ụgwọ nile o ji na mbụ sị ya, ‘Ajọ ohu! Nꞌebe a ka m nọ gbaghara gị.33Ebe m gbaghara gị ụgwọ i ji m, o kwesịghị ka i nwee obi ebere nꞌebe ndị ọzọ nọ, dị ka m si nwee obi ebere nꞌebe ị nọ?’34“Mgbe abụ, eze ahụ oke iwe juru obi, zipụrụ nwoke ahụ ka a taa ya ahụhụ, tutuu ruo mgbe ọ kwụsịrị ụgwọ nile o ji, na-afọdụghị otu kobo.35Otu a ka Nna m bi nꞌeluigwe ga-emekwa unu, ma ọ bụrụ na unu agbagharaghị ụmụnne unu.”Igbo Bible 1988 No Data Igbo Bible 1988 MATIU 18 00:00:00 00:00:00 0.5x 2.0x https://beblia.bible:81/BibleAudio/igbo1988/matthew/018.mp3 28 18