× Asụsụ Europe Russian Belarusian Asụsụ Ukraine Asụsụ Polish Serbian Bulgaria Asụsụ Slovakian Czech Asụsụ Romania Moldovian Azebaịjan Armenia Onye Georgia Albania Avar Bashkir Tatar Chechen Asụsụ Slovenian Asụsụ Croatian Estonia Asụsụ Latvian Asụsụ Lithuania Asụsụ Hungary Asụsụ Finish Asụsụ Norway Asụsụ Sweden Asụsụ Iceland Grik Masedonia German Bavaria Asụsụ Dutch Asụsụ Danish Welsh Gaelic Asụsụ Aịrish French Basque Catalan .Talian Galacian Romani Bosnian North America Bekee South America Asụsụ Spanish Asụsụ Portuguese Guarani Asụsụ Quechuan Aymara Central America Onye Jamaica Asụsụ Nawatụl Kiche Qeqchi Asụsụ Haiti Ebe Ọwụwa Anyanwụ Eshia Chinese nke Ndị Japan Korean Mongolian Uyghur Hmong South East Asia Onye Malaysia Burmese Chin Asụsụ Nepali Cebuano Asụsụ Tagle Kambodia Thai Indoneshian Vietnam Asụsụ Javanese Lao Iban Iu Mien Kachin Lahu Aceh Balinese Bugis Pampanga Sasak Shan Waray South Asia Hindi Dia Awadhi Mizo Kannada Malayalam Marathi Gujarati Asụsụ Tamil Telugu Asụsụ Punjabi Kurukh Asụsụ Assam Maithili Asụsụ Bengali Asụsụ Urdu Sinhala Dogri Haryanvi Meitei Konkani Santalaị Sindhi Koya Thado Sanskrit Devanagari Adilabad Gondi Ahirani Balochi Bundeli Chhattisgarhi Garhwali Kangri Kumaoni Mewari Munda Sadri Seraiki Shekhawati Sylheti Etiti Asia Kyrgyz Asụsụ Uzbek Tajik Ndị Turkmen Kazakhstan Karakalpak Etiti ọwụwa anyanwụ Turkish Hibru Arabic Peshia Kurdi Pashto Coptic Africa Afrịka Xhosa Asụsụ Ndebele Akpan Asụsụ Amharik Wolaytta Onye Naijiria Mossi Ika Dinka Kabyle Ewe Asụsụ Swahili Morocco Asụsụ Somali Shona Madagaska Igbo Lingala Baoule Siswati Tsonga Tswana Onye Gambian Ndi Yoruba Kamba Kinyarwanda Hausa Chewa Luo Makua Dyula Fulfulde Kalenjin Kikọyu Kikwango Kirundi Krio Nigerian Pidgin Oromo Tshiluba Tshivenda Twi Umbundu Lugbara Luguru Pular Gussi Maasai Turkana Moba Nuer Shilluk Tamasheq Makonde Bemba Fon Hadiyya Ibibio Kimbundu Kimiiru Lango Liberian Kreyol Lomwe Mende Morisyen Ndau Nyankole Sena Sidamo Soga Songe Sukuma Tarifit Teso Tiv Zande Kọntinent Australia New Zealand Papua New Guinea Asụsụ Ochie Asụsụ Arameik Latin Esperanto 1 1 1 1988 Nsọ nʼIgbo 2020Bible Nso 200619881 1 1 MATIU MATIUMAKLUKJỌNỌLU OZIROM1 KỌRINT2 KỌRINTGALETIAEFESỌSFILIPAIKỌLỌSI1 TESALỌNAIKA2 TESALỌNAIKA1 TIMỌTI2 TIMỌTITAITỌSFAILIMONHIBRUJEMES1 PITA2 PITA1 JỌN2 JỌN3 JỌNJUDNKPUGHE1 1 1 5 123456789101112131415161718192021222324252627281 1 1 : 38 1234567891011121314151617181920212223242526272829303132333435363738394041424344454647481 1 1 Igbo Bible 1988 MATIU 5 Chekwaa ihe edeturu 1Mgbe Jisọs hụrụ igwe mmadụ ahụ, o rigooro nꞌelu ugwu.2Mgbe ọ nọdụrụ ala, ndị na-eso ụzọ ya bịakwutere ya. O bidoro izi ha ihe sị,3“Ndị ogbenye nꞌime mmụọ ha bụ ndị a gọziri agọzi, nꞌihi na alaeze eluigwe bụ nke ha.4Ndị na-eru uju bụ ndị a gọziri agọzi, nꞌihi na a ga-akasị ha obi.5Ndị dị nwayọọ nꞌobi bụ ndị a gọziri agọzi, nꞌihi na ha ga-eketa ụwa.6“Ndị agụụ ezi omume na-agụ bụkwa ndị a gọzịrị agọzi, nꞌihi na afọ ga-eju ha.7Ndị na-enwe obi ebere bụ ndị a gọziri agọzi, nꞌihi na ha ka a ga-emere ebere.8Ndị dị ọcha nꞌobi bụkwa ndị a gọziri agọzị, nꞌihi na ha ga-ahụ Chineke anya.9Ndị na-achọ udo nꞌetiti mmadụ na ibe ha bụ ndị a gọziri agọzi, nꞌihi na a ga-akpọ ha ụmụ Chineke.10Ndị a na-akpagbu nꞌihi ezi omume ha bụ ndị a gọziri agọzi, nꞌihi na alaeze eluigwe bụ nke ha.11“Ndị a gọziri agọzi ka unu bụ ma ọ bụrụ na a na-ata unu ụta, na-esogbu unu, ma na-ekwukwa okwu ụgha megide unu nꞌihi m.12Ṅụrịanụ ọṅụ nꞌihi ya. Ka obi tọọkwa unu ụtọ. Nꞌihi na ụgwụ ọrụ unu ga-adị ukwuu nꞌeluigwe. Chetanụ na e si nꞌụzọ dị otu a sogbuo ndị amụma bu unu ụzọ.13“Unu bụ nnu nke ụwa, nꞌihi nke a unu etufula ụtọ unu. Ọ bụrụ na unu etufuo ụtọ unu, unu agaghị aba uru ọ bụla. A ga-etufu unu nꞌezi, zọokwa unu ụkwụ.14Unu bụ ìhè nke ụwa. Unu dị ka obodo e wuru nꞌelu ugwu nke a na-apụghị izo ezo.15Ndị mmadụ adịghị amụnye iheọkụ dọnye ya nꞌokpuru igbe, kama a na-adọkwasị ya nꞌelu ihe ịdọba iheọkụ, ka o nye ndị nile nọ nꞌụlọ ahụ ìhè.16Ya mere, unu ezokwala ìhè unu. Kwerenụ ka ìhè unu nwuore mmadụ nile, ka ndị mmadụ hụ ọrụ ọma unu, tookwa Nna unu bi nꞌeluigwe.17“Unu echela na abịara m ịkagbu iwu Mosisi, ma ọ bụ ịkagbu ịdọ aka na ntị nke ndị amụma. Abịaghị m ịkagbu akagbu, kama abịara m imezu ha.18Ana m ekwusi nke a ike na tutuu eluigwe na ụwa agabiga, ọ dịghị iwu ọ bụla ga-agafe ma o mezughị.19Nꞌihi ya, ọ bụrụ na onye ọ bụla emebie iwu dịkarịsịrị nta, ma zikwa ndị ọzọ imebi ya, a ga-agụ onye ahụ nꞌọnye dịkarịsịrị nta nꞌalaeze eluigwe. Ma onye na-ezi mmadụ ka ha debe iwu ahụ, ma na-emekwa okwu Chineke nꞌonwe ya, a ga-akpọ ya onye dị ukwuu nꞌalaeze eluigwe.20“Ka m dọọ unu aka na ntị. Ọ bụrụ na ezi omume unu apụtaghị ìhè karịa ezi omume ndị Farisii na ndị ozizi iwu, unu apụghị iketa alaeze eluigwe ma ọlị.21“Iwu Mosisi sị onye ọ bụla egbula mmadụ. Ọ bụrụ na onye ọ bụla egbuo mmadụ, a ga-akpọta ya nꞌihu ndị ga-ekpe ya ikpe.22Ma ana m asị unu, ọ bụrụ na iwe ewee gị megide nwanne gị, ị na-edo onwe nꞌọnọdụ onye a ga-ekpe ikpe. Ọ bụrụkwa na ị kpọọ nwanne gị onye iberibe, ma ọ bụ onye nzuzu, ị na-enye onwe gị nꞌaka ịba nꞌọkụ ala mmụọ.23“Ọ bụrụ na ị gaa inye onyinye gị nꞌụlọ nsọ Chineke, ma i cheta nꞌebe ahụ na gị na nwanne gị adịghị nꞌudo,24hapụ onyinye gị nꞌebe ịchụ aja laa ka gị na nwanne gị kpezie. Mgbe unu dịrị nꞌudo, laghachi bịa nye onyinye gị.25Mee ọsịịsọ ka gi na onye iro gị kpezie mgbe ọ na-eburubeghị ikpe gị na ya jee nꞌaka okpe ikpe onye ga-enyefe gị nꞌaka ndị ga-etinye gị nꞌụlọ mkpọrọ.26Nꞌezie, ọ bụrụ na ikpe gị eruo ụlọ ikpe, ị gaghị e si nꞌebe ahụ pụta, ma ị kwụsịghị ụgwọ nile i ji.27“Iwu Mosisi sịrị onye ọ bụla akwala iko.28Ma ana m asị unu, nwoke ọ bụla lere nwanyị ọ bụla anya nꞌụzọ na-adịghị mma, emeelarị mmehie ịkwa iko nꞌime obi ya megide nwanyị ahụ.29Nꞌihi nke a, ọ bụrụ na anya gị achọọ iduba gị na mmehie, ghụpụ ya tufuo. Ọ kaara gị mma na i ji otu anya baa nꞌalaeze eluigwe karịa na i ji anya abụọ baa nꞌọkụ ala mmụọ.30Ọ bụrụ na aka nri gị achọọ ime ka i mehie, gbupu ya tufuo. Ọ kaara gị mma na i ji otu aka baa nꞌalaeze eluigwe karịa na i ji aka abụọ baa nꞌọkụ.31“Nꞌime iwu Mosisi e kwuru na ọ bụrụ na nwoke ọ bụla achọọ ikewapụ onwe ya site nꞌebe nwụnye ya nọ, ọ ga-ebu ụzọ dee akwụkwọ nkewa ma ọ bụ akwụkwọ achọghị m nye ya.32Ma geenụ ntị nꞌiwu m na-enye. Nwoke ọ bụla kewapụrụ onwe ya site nꞌebe nwụnye ya nọ, nke ọ na-ejideghị nꞌebe ọ na-akwa iko emehiela, nꞌihi na ọ na-etinye nwanyị ahụ nꞌọnọdụ ga-eme ka ọ kwaa iko. Ọ bụrụ na nwanyị ahụ alụọ di ọzọ, nwoke ahụ lụrụ nwanyị ahụ na-emekwa mmehie ịkwa iko.33“Nꞌime iwu Mosisi a sịrị unu mezuo iyi nile unu ṅụrụ nye Chineke.34Ma asị m unu aṅụla iyi ọ bụla. Ejikwala eluigwe aṅụ iyi nꞌihi na eluigwe bụ ebe ocheeze Chineke dị.35Ejikwala ụwa aṅụ iyi nꞌihi na ụwa bụ ebe mgbakwasị ụkwụ ya.36Ejikwala isi gị aṅụ iyi nꞌihi na ị pụghị ime ka otu agịrị isi gị dị ọcha ma ọ bụ dị oji.37Aṅụla iyi ọ bụla. Kama ka ee gị bụrụ ee gị, ka é, è, gị bụrụ é, è gị. Ihe ọ bụla gafere nke a sitere nꞌekwensu.38“Iwu Mosisi nyere kwuru sị, ‘Ọ bụrụ na mmadụ aghụpụ anya gị, ghụpụkwara anya nke ya. Kụpụkwa eze onye kụpụrụ eze gị.’39Ma ana m asị unu alụsịla onye na-achọ imeru unu ahụ ọgụ. Kama ọ bụrụ na mmadụ akụọ gị aka nꞌotu nti, tụgharịara ya nti nke ọzọ.40Ọ bụrụ na mmadụ agbaara gị akwụkwọ nꞌụlọ ikpe ka ọ nara gị uwe ime ahụ gị, nyekwa ya uwe elu ahụ gị.41Ọ bụrụ na mmadụ esite nꞌike chọọ ka i soro ya gaa puku nzọ ụkwụ atọ, soro ya gaa puku nzọ ụkwụ isii, ma ọ bụrụ na nke a ga-eme ka udo dịrị.42Nye onye ọ bụla rịọrọ gị ihe. Achụghachikwala ndị na-abịa ka ị binye ha ego.43“A gwara unu sị, ‘Hụnụ ndị enyi unu nꞌanya, ma kpọọkwanụ ndị iro unu asị.’44Ma asị m unu, hụnụ ndị iro unu nꞌanya, kpeekwaranụ ndị na-esogbu unu ekpere.45Nke a ga-eme ka unu bụrụ ụmụ nke nna unu bi nꞌeluigwe, onye na-eme ka anwụ mụọra ndị ọma na ndị ọjọọ, na-emekwa ka mmiri zooro ndị ezi omume na ndị ajọ omume.46Ọ bụrụ nanị ndị hụrụ unu nꞌanya ka unu na-ahụ nꞌanya, gịnị ga-abụ ụgwọ ọrụ unu? Ọ bụladị ndị ọna ụtụ na-eme otu a.47Ọ bụrụkwa na unu na-ekele nanị ndị enyi unu ekele, ọ dịghị ihe ọ bụla dị iche nꞌebe unu na ndị ọzọ nọ. Nꞌihi na ndị na-amaghị Chineke na-emekwa otu ahụ.48Unu kwesịrị izu oke nꞌịrụ ọrụ ọma, dị ka Nna unu bi nꞌeluigwe si zuokwa oke.Igbo Bible 1988 No Data Igbo Bible 1988 MATIU 5 00:00:00 00:00:00 0.5x 2.0x https://beblia.bible:81/BibleAudio/igbo1988/matthew/005.mp3 28 5