× Asụsụ Europe Russian Belarusian Asụsụ Ukraine Asụsụ Polish Serbian Bulgaria Asụsụ Slovakian Czech Asụsụ Romania Moldovian Azebaịjan Armenia Onye Georgia Albania Avar Bashkir Tatar Chechen Asụsụ Slovenian Asụsụ Croatian Estonia Asụsụ Latvian Asụsụ Lithuania Asụsụ Hungary Asụsụ Finish Asụsụ Norway Asụsụ Sweden Asụsụ Iceland Grik Masedonia German Bavaria Asụsụ Dutch Asụsụ Danish Welsh Gaelic Asụsụ Aịrish French Basque Catalan .Talian Galacian Romani Bosnian Kabardian North America Bekee South America Asụsụ Spanish Asụsụ Portuguese Guarani Asụsụ Quechuan Aymara Central America Onye Jamaica Asụsụ Nawatụl Kiche Qeqchi Asụsụ Haiti Ebe Ọwụwa Anyanwụ Eshia Chinese nke Ndị Japan Korean Mongolian Uyghur Hmong Tibetian South East Asia Onye Malaysia Burmese Chin Asụsụ Nepali Cebuano Asụsụ Tagle Kambodia Thai Indoneshian Asụsụ Sundan Vietnam Asụsụ Javanese Lao Iban Iu Mien Kachin Lahu Aceh Balinese Bugis Pampanga Sasak Shan Waray Madurese South Asia Hindi Dia Awadhi Mizo Kannada Malayalam Marathi Gujarati Asụsụ Tamil Telugu Asụsụ Punjabi Kurukh Asụsụ Assam Maithili Asụsụ Bengali Asụsụ Urdu Sinhala Dogri Haryanvi Meitei Konkani Santalaị Sindhi Koya Thado Sanskrit Devanagari Adilabad Gondi Ahirani Balochi Bundeli Chhattisgarhi Garhwali Kangri Kumaoni Mewari Munda Sadri Seraiki Shekhawati Sylheti Bagri Bhilali Bodo Braj Tulu Etiti Asia Kyrgyz Asụsụ Uzbek Tajik Ndị Turkmen Kazakhstan Karakalpak Etiti ọwụwa anyanwụ Turkish Hibru Arabic Peshia Kurdi Mazanderani Pashto Coptic Africa Afrịka Xhosa Asụsụ Ndebele Akpan Asụsụ Amharik Wolaytta Onye Naijiria Mossi Ika Dinka Kabyle Ewe Asụsụ Swahili Morocco Asụsụ Somali Shona Madagaska Igbo Lingala Baoule Siswati Tsonga Tswana Onye Gambian Ndi Yoruba Kamba Kinyarwanda Hausa Chewa Luo Makua Dyula Fulfulde Kalenjin Kikọyu Kikwango Kirundi Krio Nigerian Pidgin Oromo Tshiluba Tshivenda Twi Umbundu Lugbara Luguru Pular Gussi Maasai Turkana Moba Nuer Shilluk Tamasheq Makonde Bemba Fon Hadiyya Ibibio Kimbundu Kimiiru Lango Liberian Kreyol Lomwe Mende Morisyen Ndau Nyankole Sena Sidamo Soga Songe Sukuma Tarifit Teso Tiv Zande Dagbani Edo Kituba Kọntinent Australia New Zealand Papua New Guinea Asụsụ Ochie Asụsụ Arameik Latin Esperanto 1 1 1 Igbo 1988 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo 2020Bible Nso 2006Igbo 19881 1 1 MAK MATIUMAKLUKJỌNỌLU OZIROM1 KỌRINT2 KỌRINTGALETIAEFESỌSFILIPAIKỌLỌSI1 TESALỌNAIKA2 TESALỌNAIKA1 TIMỌTI2 TIMỌTITAITỌSFAILIMONHIBRUJEMES1 PITA2 PITA1 JỌN2 JỌN3 JỌNJUDNKPUGHE1 1 1 1 123456789101112131415161 1 1 : 1 1234567891011121314151617181920212223242526272829303132333435363738394041424344451 1 1 Igbo Bible 1988 MAK 1 Chekwaa ihe edeturu 1Akụkọ m chọrọ ịkọrọ unu ugbu a bụ akụkọ banyere Jisọs Kraịst, Ọkpara Chineke.2Amụma ahụ Aịzaya onye amụma buru emezuola. Nꞌihi na Chineke sitere nꞌọnụ ya gbaa ama sị na mgbe ọbịbịa Jisọs ruru, ọ ga-ezite otu onye ga-ekwusara mmadụ nile na oge ọbịbịa ya eruola.3Nwoke a, dị ka Aịzaya siri kwuo ga-esite nꞌọzara ebe ọ ga-ebi kwuo okwu. Isi okwu ya ga-abụkwa: “Dozienu ụzọ maka ọbịbịa Onyenwe anyi, meenụ ka okporo ụzọ ọ ga-agbaso guzozie.”4Nwoke ahụ Chineke zitere bụ Jọn omee baptizim. O bi nꞌọzara, sitekwa nꞌebe ahụ jegharịa ebe nile. Ọ na-akpọku ndị mmadụ ka ha site na mmehie ha chegharịa, ka e mee ha baptizim, ka Chineke gbaghara ha.5Ọtụtụ mmadụ sitere Judia na obodo nile dị Jerusalem gburugburu bịakwute ya. Ha jekwuuru ya nꞌosimiri Jọdan ebe ọ nọ na-ekwusa nkwusa ya. Mgbe ha kwupụtasịrị mmehie ha o mere ha baptizim.6Uwe Jọn yi nꞌahụ ya bụ nke e mere site nꞌajị inyinya a na-akpọ kamel. O kekwara belịtị dị warara nꞌukwu ya. Nri ọ na-eri bụ nanị igurube na mmanụ aṅụ a na-azaghị aza.7Mgbe ndị mmadụ na-abịakwute ya, Jọn kwusaara ha na-asị, “Ọ dị nwoke dị ukwuu ga-abịa nꞌoge na-adịghị anya. Ọ dị ukwuu karịa m. Ọ dị nnọọ ukwuu na enweghị m ike ịtọpụ eriri e jiri kechie akpụkpọ ụkwụ ya.8Ugbu a ana m eji mmiri efu na-eme unu baptizim, ma mgbe nwoke ahụ dị ukwuu bịara, ọ ga-eji Mmụọ Nsọ mee unu baptizim.”9Otu ụbọchị, Jisọs sitere Nazaret obodo dị nꞌime Galili bịa nꞌosimiri Jọdan. Ọ bịara ka Jọn mee ya baptizim. Jọn mekwara ya baptizim.10Mgbe Jisọs si nꞌime mmiri ahụ na-apụta, oge Jọn mechara ya baptizim, ọ hụrụ ka eluigwe meghere, hụkwa ka Mmụọ Nsọ si nꞌeluigwe rịdata dị ka nduru, bekwasị Jisọs nꞌisi.11Nꞌotu oge ahụ kwa, olu dị ukwuu sitere nꞌeluigwe daa sị, “Ị bụ Ọkpara m, onye m hụrụ nꞌanya. Ihe nile banyere gị na-enye m obi ụtọ.”12Ọ dịghị anya mgbe ihe ndị a mesịrị, Mmụọ Nsọ kwaliri Jisọs ka ọ gaa nꞌime ọzara.13Ebe ahụ ka ọ ga-anọ iri ụbọchị anọ ka ekwensu nwaa ya ọnwụnwa. Nanị ya nọ nꞌebe ahụ, mmadụ ọ bụla anọkwaghị ya, kariakwa ụmụ anụ ọhịa. Ma ndị mmụọ ozi bịakwara nyere ya aka.14Emesịa, mgbe e jidere Jọn tụnye ya nꞌụlọ mkpọrọ, Jisọs gara Galili. Ebe ahụ ka ọ nọ na-ekwusa ozi ọma Chineke.15Nke a bụ isi okwu ya, “Oge ahụ eruola. Oge Chineke ga-ebido ọchịchị ya nꞌụwa. Chegharịanụ, nabatakwaranụ onwe unu ozi ọma a!”16Mgbe ọ na-aga ije nꞌakụkụ ọnụ mmiri osimiri Galili ọ hụrụ Saịmọn na Anduru nwanne ya. Ha bụ ndị ọkụ azụ. Jisọs hụrụ ha mgbe ha na-awụnye ụgbụ ha ji egbu azụ nꞌime mmiri.17Jisọs kpọrọ ha sị ha, “Bịanụ soro m. Aga m eme ka unu ghọọ ndị ọkụ na-akụta mmadụ.”18Ngwangwa ha hapụrụ ụgbụ azụ ha soro Jisọs.19Mgbe Jisọs hapụrụ ebe ahụ gatụ nꞌihu nke nta, ọ hụrụ Jemes na Jọn nwanne ya. Ha abụọ bụ ụmụ Zebedi. Ha bụkwa ndị ọkụ azụ. Nꞌoge Jisọs hụrụ ha ha nọ na-adụchi ụgbụ ha dọkara adọka.20Otu ihe ahụ Jisọs gwara Saịmọn na Anduru ka ọ gwakwara Jemes na Jọn. Na-atụfughị oge Jemes na Jọn hapụrụ nna ha nꞌime ụgbọ mmiri ha ji egbu azụ soro Jisọs. Nna Jemes na Jọn nwere ndị o goro ọrụ so ya na-arụ ọrụ nꞌoge a.21Mgbe oge nta gasịrị, Jisọs na ndị so ya bịaruru Kapanọm. Nꞌụbọchị izuike ndị Juu, nke bụ ụbọchị Satọde, bụrụkwa ụbọchị ịga nꞌụlọ ekpere, Jisọs na ndị na-eso ya jere nꞌụlọ ekpere dị nꞌebe ahụ. Nꞌebe ahụ, Jisọs ziri ndị bịara okwu Chineke.22O juru ndị nọ nꞌụlọ ekpere ahụ anya otu Jisọs si kwuo okwu Chineke. Nꞌihi na o zighị ha dị ka ndị ozizi ndị Juu si ezi. Kama o ziri ha dị ka onye maara ihe nile.23Ma nꞌụlọ ekpere ahụ e nwere otu nwoke nọ nꞌime ya nke mmụọ ọjọọ na-esogbu. Mgbe nwoke a nụrụ ihe Jisọs na-ezi, o tiri mkpu akwa sị,24“Gịnị ka anyị na gị nwekọrọ gị Jisọs onye Nazaret? Ị̀ bịara nꞌebe a ka ị laa anyị nꞌiyi? Amaara m gị, ị bụ Ọkpara Chineke dị ndụ!”25Jisọs baara mmụọ ọjọọ ahụ mba sị ya, “Mechie ọnụ si nꞌime nwoke a pụta!”26Nꞌotu oge ahụ mmụọ ọjọọ ahụ mere ka akwụkwụ dọọ nwoke ahụ. Emesịa ọ kwara akwa nꞌoke olu hapụ nwoke ahụ.27O juru ndị nọ nꞌụlọ ekpere ahụ anya nke ukwuu. Nꞌihi ya ha bidoro na-ajụrịta onwe ha ajụjụ na-asị, “Anyị ga-esi aṅaa kọwaa ihe anya anyị hụrụ taa? Nꞌezie, nke a bụ nnọọ ozizi ọhụrụ! Lee, okwu ọnụ efu ka o ji nye iwu ka mmụọ ọjọọ site nꞌahụ mmadụ pụọ, ha pụkwara!”28Ọ dịghị anya akụkọ ọrụ a Jisọs rụrụ gbasara ruo ebe nile. Ndị mmadụ bi nꞌakụkụ Galili nile nụrụ ihe banyere ya.29Mgbe ha si nꞌụlọ ekpere ahụ pụta, Jisọs gara nꞌụlọ Saịmọn na Anduru. Jemes na Jọn sokwa ya gaa.30Mgbe ha jeruru nꞌụlọ ahụ, ha hụrụ nne nwụnye Saịmọn ka o dina nꞌihe ndina. Ahụ ọkụ jikwa ya. Ha gwara Jisọs banyere nke a.31Jisọs gara nso ebe nwanyị a dina, jide ya nꞌaka, selie ya elu inyere ya aka ịnọdụ ala. Otu mgbe ahụ, ahụ ọkụ ahụ kwụsịrị. Nwanyị ahụ bilikwara gaa siere ha nri anyasị.32Nꞌoge anyasị, mgbe anwụ dara, ndị mmadụ butere ndị ha ahụ na-esighị ike, dote ha nꞌihu ụlọ ebe ahụ Jisọs nọ. Ha butekwara ndị mmụọ ọjọọ na-esogbu.33Nꞌanyasị ahụ kwa, a pụrụ ịsị na ndị nile bi na Kapanọm zukọrọ nꞌihu ụlọ ahụ ịhụ Jisọs na ịnụ okwu si ya nꞌọnụ na-apụta.34Jisọs pụtara nꞌezi gwọọ ndị nile ọrịa dị iche iche na-arịa. Ọ chụpụkwara mmụọ ọjọọ site nꞌahụ ndị ọ na-enye nsogbu. Ebe ọ bụ na mmụọ ọjọọ ndị a maara onye Jisọs bụ, o kweghị ka ha kwuo okwu ọ bụla mgbe ọ na-achụpụ ha.35Nꞌisi ụtụtụ ụbọchị nke ọzọ ya, mgbe mmadụ nile nọ na-arahụ ụra, mgbe ìhè ọ bụla na-adịghị, Jisọs sitere nꞌụra teta. O sitere nꞌụlọ ahụ ọ nọ pụta, pụọ, gaa ebe ọ ga-anọrọ onwe ya, nanị ya. Nꞌebe ahụ kwa ka ọ nọ kpee ekpere.36Mgbe chi bọziri Saịmọn na ndị ọzọ nọ nꞌụlọ ahụ chọgharịrị ya, ma ha ahụghị ya. Ha pụrụ jegharịa ịchọ ya.37Mgbe oge nta gasịrị, ha hụrụ ya, gwa ya okwu sị, “Lee na ndị mmadụ jupụtara nꞌihu ụlọ ahụ na-eche gị!”38Ma Jisọs gwara ha sị, “Ka anyị gaanụ ebe ọzọ, ka anyị gaanụ nꞌobodo ndị ọzọ dị anyị gburugburu, ka m kwusaakwara ha ozi ọma. Ọ bụ nꞌihi nke a ka m ji bịa.”39Ya mere, ha pụrụ jegharịa nꞌebe dị iche iche na Galili. Ebe ọ bụla ha jeruru, Jisọs kwusara ozi ọma nꞌụlọ ekpere ndị Juu. Ọ chụpụkwara mmụọ ọjọọ.40Otu ụbọchị, otu onye ekpenta bịakwutere Jisọs rịọọ ya sị, “Ọ bụrụ na ị chọrọ, ị pụrụ ime ka m dị ọcha.”41Jisọs nwere ọmiko nꞌahụ ya. O setipụrụ aka ya metụ onye ekpenta ahụ aka sị ya, “Achọrọ m ka ị dị ọcha, dịkwa ọcha.”42Nꞌotu oge ahụ, ọrịa ekpenta ahụ lara. Ahụ dịkwara nwoke ahụ mma!43Mgbe ahụ kwa, Jisọs dọrọ nwoke ahụ ọ gwọrọ aka na ntị sị ya,44“Lee, agwakwala onye ọ bụla banyere ọgwụgwọ m gwọrọ gị. Kama laa ugbu a, gaa gosi onye nchụaja onwe gị. Imekwa ka ndị ọzọ mata na a gwọọla gị gaa nye onyinye dị ka Mosisi nyere nꞌiwu na ndị a gwọrọ ọrịa ekpenta ga-enye.”45Ma nwoke ahụ lara kọsaa akụkọ ọgwụgwọ ya ebe nile. Nꞌihi nke a ọtụtụ mmadụ gbara Jisọs gburugburu. Nke a mere ka o siere Jisọs ike ịbanye nꞌobodo ọ bụla mgbe ìhè dị. Ya mere, ọ nọdụrụ nꞌebe ndị mmadụ na-ebighị. Ma ọtụtụ igwe mmadụ sitekwara ebe nile bịakwute ya nꞌebe ahụ.Igbo Bible 1988 No Data Igbo Bible 1988 MAK 1 00:00:00 00:00:00 0.5x 2.0x https://beblia.bible:81/BibleAudio/igbo1988/mark/001.mp3 16 1