× Asụsụ Europe Russian Belarusian Asụsụ Ukraine Asụsụ Polish Serbian Bulgaria Asụsụ Slovakian Czech Asụsụ Romania Moldovian Azebaịjan Armenia Onye Georgia Albania Avar Bashkir Tatar Chechen Asụsụ Slovenian Asụsụ Croatian Estonia Asụsụ Latvian Asụsụ Lithuania Asụsụ Hungary Asụsụ Finish Asụsụ Norway Asụsụ Sweden Asụsụ Iceland Grik Masedonia German Bavaria Asụsụ Dutch Asụsụ Danish Welsh Gaelic Asụsụ Aịrish French Basque Catalan .Talian Galacian Romani Bosnian North America Bekee South America Asụsụ Spanish Asụsụ Portuguese Guarani Asụsụ Quechuan Aymara Central America Onye Jamaica Asụsụ Nawatụl Kiche Qeqchi Asụsụ Haiti Ebe Ọwụwa Anyanwụ Eshia Chinese nke Ndị Japan Korean Mongolian Uyghur Hmong South East Asia Onye Malaysia Burmese Chin Asụsụ Nepali Cebuano Asụsụ Tagle Kambodia Thai Indoneshian Vietnam Asụsụ Javanese Lao Iban Iu Mien Kachin Lahu Aceh Balinese Bugis Pampanga Sasak Shan Waray South Asia Hindi Dia Awadhi Mizo Kannada Malayalam Marathi Gujarati Asụsụ Tamil Telugu Asụsụ Punjabi Kurukh Asụsụ Assam Maithili Asụsụ Bengali Asụsụ Urdu Sinhala Dogri Haryanvi Meitei Konkani Santalaị Sindhi Koya Thado Sanskrit Devanagari Adilabad Gondi Ahirani Balochi Bundeli Chhattisgarhi Garhwali Kangri Kumaoni Mewari Munda Sadri Seraiki Shekhawati Sylheti Etiti Asia Kyrgyz Asụsụ Uzbek Tajik Ndị Turkmen Kazakhstan Karakalpak Etiti ọwụwa anyanwụ Turkish Hibru Arabic Peshia Kurdi Pashto Coptic Africa Afrịka Xhosa Asụsụ Ndebele Akpan Asụsụ Amharik Wolaytta Onye Naijiria Mossi Ika Dinka Kabyle Ewe Asụsụ Swahili Morocco Asụsụ Somali Shona Madagaska Igbo Lingala Baoule Siswati Tsonga Tswana Onye Gambian Ndi Yoruba Kamba Kinyarwanda Hausa Chewa Luo Makua Dyula Fulfulde Kalenjin Kikọyu Kikwango Kirundi Krio Nigerian Pidgin Oromo Tshiluba Tshivenda Twi Umbundu Lugbara Luguru Pular Gussi Maasai Turkana Moba Nuer Shilluk Tamasheq Makonde Bemba Fon Hadiyya Ibibio Kimbundu Kimiiru Lango Liberian Kreyol Lomwe Mende Morisyen Ndau Nyankole Sena Sidamo Soga Songe Sukuma Tarifit Teso Tiv Zande Kọntinent Australia New Zealand Papua New Guinea Asụsụ Ochie Asụsụ Arameik Latin Esperanto 1 1 1 1988 Nsọ nʼIgbo 2020Bible Nso 200619881 1 1 MAK MATIUMAKLUKJỌNỌLU OZIROM1 KỌRINT2 KỌRINTGALETIAEFESỌSFILIPAIKỌLỌSI1 TESALỌNAIKA2 TESALỌNAIKA1 TIMỌTI2 TIMỌTITAITỌSFAILIMONHIBRUJEMES1 PITA2 PITA1 JỌN2 JỌN3 JỌNJUDNKPUGHE1 1 1 11 123456789101112131415161 1 1 : 25 1234567891011121314151617181920212223242526272829303132331 1 1 Igbo Bible 1988 MAK 11 Chekwaa ihe edeturu 1Mgbe ha bịaruru nso Jerusalem, ha rutere obodo nta Betfeji nke dị na Betani. Emesịa, ha bịarutere ugwu olivu. Nꞌebe ahụ ka Jisọs zipụrụ mmadụ abụọ nꞌime ndị na-eso ụzọ ya.2Ọ gwara ha sị, “Gaanụ nꞌime obodo nta dị nꞌihu anyị. Mgbe unu na-abanye nꞌime obodo ahụ, unu ga-ahụ nwa inyinya ibu, nke onye ọ bụla na-arịkwasịbeghi nꞌelu ya. Tọpụnụ ya nꞌagbụ kpụtara m ya.3“Ọ bụrụ na onye ọ bụla ajụọ unu ihe mere unu jiri na-atọpụ ya nꞌagbụ, sịnụ onye ahụ, na ọ dị nna unu ukwu mkpa. Anyị ga-akpụghachi ya ma emesịa.”4Ndị ahụ e ziri ozi gara nꞌobodo nta ahụ, hụ inyinya ibu ebe Jisọs sị na ha ga-ahụ ya. E kenyere ya nꞌosisi dị nꞌihu otu ụlọ. Mgbe ndị ahụ bidoro ịtọpụ ya,5ndị mmadụ guzo nꞌebe ahụ jụrụ ha sị, “Gịnị mere unu ji atọpụ inyinya ibu ahụ?”6Ha gwara ndị ahụ ihe Jisọs gwara ha ka ha kwuo. Ndị ahụ hapụrụ ha ka ha tọrọ inyinya ibu ahụ.7Mgbe ahụ ha kpụtaara Jisọs inyinya ibu ahụ, tụsaa uwe ha nꞌazụ ya. Jisọs nọkwasịrị nꞌelu inyinya ibu ahụ.8Mgbe ahụ kwa, ọtụtụ mmadụ nꞌime igwe mmadụ ahụ tụsara uwe ha nꞌụzọ, ndị ọzọ tụsara alaka osisi ha gbutere nꞌọhia.9Ndị nọ Jisọs nꞌihu na ndị na-eso ya nꞌazụ, tiri mkpu na-asị, “Ka Chineke gọzie ya! Ngọzi dịrị onye ahụ na-abịa nꞌaha Onyenwe anyị!10“Ngọzi dịrị alaeze ahụ na-abịa, alaeze nna anyị Devidi! Ka Chineke site nꞌeluigwe gọzie ya!”11Otu a ka Jisọs siri banye Jerusalem, gaa nꞌụlọ nsọ ukwu Chineke. O legharịrị anya nꞌihe nile dị nꞌebe ahụ, emesịa, ọ hapụrụ Jerusalem gaa Betani, ya na ndị na-eso ụzọ ya, nꞌihi na chi ebidola iji.12Nꞌụtụtụ echi ya, mgbe ha si Betani na-apụta, agụụ bidoro ịgụ Jisọs.13Site nꞌebe dị anya, ọ hụrụ otu osisi fiigi nꞌihu ya nke nwere ahịhịa ndụ. Mgbe ọ bịaruru osisi ahụ nso, ọ gara nꞌukwu ya ile ma ọ ga-achọta mkpụrụ nꞌelu ya. Mgbe o ruru nꞌukwu osisi ahụ, ọ hụghị mkpụrụ ọ bụla, nanị ahịhiạ ndụ, nꞌihi na oge a abụghị oge osisi a ji amị mkpụrụ.14Mgbe ahụ Jisọs gwara osisi a okwu sị, “Site nꞌụbọchị taa gaa nꞌihu, ị gaghị amịkwa mkpụrụ ọzọ!” Ndị na-eso ụzọ ya nụrụ mgbe Jisọs kwuru okwu a.15Ha sitere nꞌebe ahụ pụọ na-aga nꞌihu nꞌije ha ịga Jerusalem. Mgbe ha ruru ebe ahụ, Jisọs banyere nꞌime ụlọ nsọ ukwu Chineke, bido ịchụpụ ndị na-azụ ahịa na ndị na-ere ahịa nꞌebe ahụ. O kpugharịrị tebulu ndị na-agbanwe ego, kwatuokwa ọdụ ahịa ndị na-ere nduru.16O gbochikwara onye ọ bụla iwebata ngwongwo ahịa orire nꞌime ụlọ nsọ ukwu ahụ.17Ọ gwara ndị nọ nꞌebe ahụ sị, “E dere ya nꞌakwụkwọ nsọ sị, ‘Ụlọ nsọ m ga-abụ ụlọ ekpere nye mba nile,’ ma unu emeela ya ka ọ ghọọ ọgba ndị na-apụnarị mmadụ ihe nꞌike.”18Mgbe ndị isi nchụaja na ndị ozizi iwu nụrụ ihe Jisọs kwuru, ha bidoro ịchọ ụzọ ha ga-esi gbuo ya. Ha tụrụ egwu na Jisọs pụrụ ime ka ọgba aghara bido, nꞌihi na ọtụtụ mmadụ na-anabata okwu ya nke ọma.19Nꞌanyasị ụbọchị ahụ, Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya hapụrụ Jerusalem pụọ.20Nꞌisi ụtụtụ echi ya, mgbe ha sitere nꞌakụkụ osisi fiigi ahụ Jisọs bụrụ ọnụ na-agafe, ha hụrụ na osisi a esitela na mgbọrọgwụ ya kpọnwụọ ruo nꞌalaka ya.21Pita chetara okwu ahụ Jisọs kwuru ụnyaahụ, gwa Jisọs okwu sị, “Onye ozizi, lee anya! Osisi fiigi ahụ ị bụrụ ọnụ akpọnwụọla!”22Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ ya okwu sị, “Nweenụ okwukwe nꞌime Chineke. Nꞌihi na m na-agwa unu sị, ọ bụrụ na unu enwee okwukwe nꞌime Chineke, unu pụrụ ịgwa ugwu olivu a okwu sị,23‘Site nꞌebe a wezuga onwe gị, gaa daba nꞌime osimiri.’ Ọ bụrụ na unu enweghị obi abụọ, kama kwere na ihe unu kwuru ga-emezu, ọ ga-emezukwa dị ka unu siri kwuo ya.24“Ya mere, ka m gwa unu, ihe ọ bụla unu rịọrọ mgbe unu kpere ekpere, nweenụ okwukwe na unu anatala ya, ọ ga-emezukwara unu dị ka unu siri kpee ya.25Kama, mgbe unu na-ekpe ekpere, unu ebula iro nꞌobi unu megide onye ọ bụla. Burunụ ụzọ gbaghara onye ahụ, ka Nna unu bi nꞌeluigwe gbaghara unu mmehie unu.26“Ma ọ bụrụ na unu ajụ ịgbaghara, Nna unu bi nꞌeluigwe agaghị agbaghara unu mmehie unu.”27Nꞌoge a ha erutela Jerusalem ọzọ. Mgbe Jisọs nọ na-ejegharị nꞌime ụlọ nsọ ukwu ahụ, ndị isi nchụaja na ndị ozizi iwu na ndị okenye ndị Juu bịakwutere ya.28Ha jụrụ ya ajụjụ sị, “Ebee ka i si nweta ike i ji eme ihe ndị a ị na-eme? Onye nyere gị ike ime ha?”29Jisọs zara ha sị, “Aga m ajụ unu otu ajụjụ. Unu zaa m ajụjụ m, aga m aza unu ajụjụ unu, gwakwa unu onye nyere m ike m ji mee ihe m mere.”30Nke a bụ ajụjụ Jisọs jụrụ ha, “Ònye zitere Jọn omee baptizim? Ò bụ Chineke ka ọ bụ onye ọzọ? Gwanụ m!”31Ndị isi nchụaja ahụ na ndị ozizi iwu na ndị okenye ahụ tulere okwu a kpebie sị, “Ọ bụrụ na anyị asaa ya na ọ bụ Chineke zitere Jọn omee baptizim, ọ ga-ajụ anyị ihe mere anyị jiri jụ ịnabata ozi ya.32Ọ bụrụkwa na anyị asị na ọ bụghị Chineke zitere ya, anyị na-etinye onwe anyị na nsogbu, nꞌihi na igwe mmadụ ndị a ga-ebido ọgba aghara.” Nꞌihi na ndị mmadụ kweere na Jọn bụ onye amụma.33Ya mere ha zara Jisọs sị ya, “Anyị enweghị ike ịsa ajụjụ gị. Anyị amaghị.” Jisọs zakwara sị ha, “Mgbe ahụ mụ onwe m agakwaghị agwa unu onye nyere m ike ịrụ ọrụ ndị a nile.”Igbo Bible 1988 No Data Igbo Bible 1988 MAK 11 00:00:00 00:00:00 0.5x 2.0x https://beblia.bible:81/BibleAudio/igbo1988/mark/011.mp3 16 11