× Asụsụ Europe Russian Belarusian Asụsụ Ukraine Asụsụ Polish Serbian Bulgaria Asụsụ Slovakian Czech Asụsụ Romania Moldovian Azebaịjan Armenia Onye Georgia Albania Avar Bashkir Tatar Chechen Asụsụ Slovenian Asụsụ Croatian Estonia Asụsụ Latvian Asụsụ Lithuania Asụsụ Hungary Asụsụ Finish Asụsụ Norway Asụsụ Sweden Asụsụ Iceland Grik Masedonia German Bavaria Asụsụ Dutch Asụsụ Danish Welsh Gaelic Asụsụ Aịrish French Basque Catalan .Talian Galacian Romani Bosnian North America Bekee South America Asụsụ Spanish Asụsụ Portuguese Guarani Asụsụ Quechuan Aymara Central America Onye Jamaica Asụsụ Nawatụl Kiche Qeqchi Asụsụ Haiti Ebe Ọwụwa Anyanwụ Eshia Chinese nke Ndị Japan Korean Mongolian Uyghur Hmong South East Asia Onye Malaysia Burmese Chin Asụsụ Nepali Cebuano Asụsụ Tagle Kambodia Thai Indoneshian Vietnam Asụsụ Javanese Lao Iban Iu Mien Kachin Lahu Aceh Balinese Bugis Pampanga Sasak Shan Waray South Asia Hindi Dia Awadhi Mizo Kannada Malayalam Marathi Gujarati Asụsụ Tamil Telugu Asụsụ Punjabi Kurukh Asụsụ Assam Maithili Asụsụ Bengali Asụsụ Urdu Sinhala Dogri Haryanvi Meitei Konkani Santalaị Sindhi Koya Thado Sanskrit Devanagari Adilabad Gondi Ahirani Balochi Bundeli Chhattisgarhi Garhwali Kangri Kumaoni Mewari Munda Sadri Seraiki Shekhawati Sylheti Etiti Asia Kyrgyz Asụsụ Uzbek Tajik Ndị Turkmen Kazakhstan Karakalpak Etiti ọwụwa anyanwụ Turkish Hibru Arabic Peshia Kurdi Pashto Coptic Africa Afrịka Xhosa Asụsụ Ndebele Akpan Asụsụ Amharik Wolaytta Onye Naijiria Mossi Ika Dinka Kabyle Ewe Asụsụ Swahili Morocco Asụsụ Somali Shona Madagaska Igbo Lingala Baoule Siswati Tsonga Tswana Onye Gambian Ndi Yoruba Kamba Kinyarwanda Hausa Chewa Luo Makua Dyula Fulfulde Kalenjin Kikọyu Kikwango Kirundi Krio Nigerian Pidgin Oromo Tshiluba Tshivenda Twi Umbundu Lugbara Luguru Pular Gussi Maasai Turkana Moba Nuer Shilluk Tamasheq Makonde Bemba Fon Hadiyya Ibibio Kimbundu Kimiiru Lango Liberian Kreyol Lomwe Mende Morisyen Ndau Nyankole Sena Sidamo Soga Songe Sukuma Tarifit Teso Tiv Zande Kọntinent Australia New Zealand Papua New Guinea Asụsụ Ochie Asụsụ Arameik Latin Esperanto 1 1 1 1988 Nsọ nʼIgbo 2020Bible Nso 200619881 1 1 LUK MATIUMAKLUKJỌNỌLU OZIROM1 KỌRINT2 KỌRINTGALETIAEFESỌSFILIPAIKỌLỌSI1 TESALỌNAIKA2 TESALỌNAIKA1 TIMỌTI2 TIMỌTITAITỌSFAILIMONHIBRUJEMES1 PITA2 PITA1 JỌN2 JỌN3 JỌNJUDNKPUGHE1 1 1 6 1234567891011121314151617181920212223241 1 1 : 27 123456789101112131415161718192021222324252627282930313233343536373839404142434445464748491 1 1 Igbo Bible 1988 LUK 6 Chekwaa ihe edeturu 1Nꞌụbọchị Satọde, nke bụ ụbọchị izuike ndị Juu, Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya sitere nꞌubi a kụrụ ọka gafee. Mgbe ha na-agafe, ndị na-eso Jisọs ghọọrọ ụfọdụ ọka taa.2Ma mgbe ha na-eme nke a, ụfọdụ ndị Farisii hụrụ ha, tie mkpu sị, “Gịnị mere unu ji na-emebi iwu? Gịnị mere unu ji na-eme ihe megidere iwu nꞌụbọchị izuike?”3Jisọs zara ha sị, “Ọ̀ bụ na unu agụtaghị ihe akwụkwọ nsọ kwuru na Devidi mere mgbe agụụ gụrụ ya na ndị so ya?4Ọ banyere nꞌụlọ nsọ ukwu Chineke were beredi e nyere Chineke dị ka onyinye taa, nyekwa ndị so ya ka ha taa. Ma ọ dịghị onye ọzọ kwesịrị iri achịcha ahụ karịakwa ndị nchụaja.”5Mgbe ahụ Jisọs gwakwara ha okwu sị ha, “Ọ bụ Nwa nke mmadụ ka ọ dịrị ikpebi ihe e kwesịrị ime nꞌụbọchị izuike nꞌihi na ọ bụ ya bụ Onyenwe ụbọchị izuike!”6Nꞌụbọchị Satọde ọzọ, Jisọs banyere nꞌụlọ ekpere ndị Juu bido na-ezi okwu Chineke. Nꞌụlọ ahụ, otu nwoke nọ ya, onye aka nri ya kpọnwụrụ akpọnwụ.7Ndị Farisii na ndị ozizi iwu nọ na-ele Jisọs anya ịhụ ihe ọ ga-eme. Ha chọrọ ịmata ma ọ ga-agwọ nwoke ahụ nꞌụbọchị izuike ka ha site na ya nweta ebubo ha ga-ebo ya.8Ma ebe Jisọs maara ihe ha na-ezube nꞌobi ha, ọ kpọrọ nwoke ahụ nke aka ya kpọnwụrụ akpọnwụ sị ya, “Pụta bịa guzoro nꞌetiti ụlọ ekpere a.” Nwoke ahụ pụtara bịa guzoro ebe Jisọs sị ya guzo.9Mgbe ahụ Jisọs gwara ndị nọ nꞌebe ahụ okwu sị, “Achọrọ m ịjụ unu otu ajụjụ: o ziri ezi ime ihe ọma nꞌụbọchị izuike ka iwu ọ sị anyị mee ihe ọjọọ nꞌụbọchị izuike? O ziri ezi ịzọpụta mmadụ nꞌụbọchị izuike ka ọ ka mma ịla ndụ mmadụ nꞌiyi nꞌụbọchị ahụ?”10Mgbe ahụ Jisọs lere anya gburugburu nꞌiwe sị nwoke ahụ aka ya kpọnwụrụ akpọnwụ, “Setịpụ aka gị.” Mgbe nwoke ahụ setịpụrụ aka ya, ọ dịkwara ya mma ọzọ.11Mgbe ndị iro Jisọs hụrụ ihe Jisọs mere, ọnụma jupụtara ha obi. Ha zukọtara ikwu otu ha ga-esi jide Jisọs, gbuo ya.12Mgbe ọzọ kwa, Jisọs gara rigoro nꞌelu ugwu ikpe ekpere. Ọ nọgidere nꞌebe ahụ abalị nile.13Mgbe chi bọrọ, ọ kpọrọ ndị nile na-eso ụzọ ya, site nꞌime ha họrọ mmadụ iri na abụọ ndị ọ kpọrọ ndị ozi ya.14Ndị a bụ aha ndị ọ họpụtara, Saimọn, (onye ọ gụgharịrị Pita) na Anduru nwanne ya, Jemes na Jọn, Filip na Batalomiu.15Matiu na Tọmọs, Jemes nwa Alfiọs na Saimọn onye so nꞌotu ndị Juu chọrọ iji ike kwatuo ọchịchị ndị Rom.16Na Judas nwanne Jemes, na Judas Isikariọt, nwoke ahụ mesịrị rara Jisọs nye nꞌaka ndị gburu ya.17Emesịa, Jisọs na ndị ozi iri na abụọ ahụ si nꞌugwu ahụ rịdata. Na ndịda ugwu ebe ha guzo, ọtụtụ ndị na-eso Jisọs gbara ha gburugburu, ha na ndị nile si Judia, Jerusalem, na obodo Taịa na Saidọn bịa ịnụ ihe Jisọs na-ekwu, na ndị bịara ka Jisọs gwọọ ha.18Jisọs chụpụkwara ọtụtụ mmụọ ọjọọ site nꞌime ndị ha na-esogbu.19Ọtụtụ mmadụ nꞌime igwe ndị ahụ gbara ya gburugburu gbalịrị imetụ ya ka, nꞌihi na ike dị ukwuu si Jisọs nꞌahụ na-apụ na-eme ka ahụ dị ndị ọrịa nile metụrụ ya aka mma.20Mgbe ihe ndị a na-eme, Jisọs tụgharịrị lee ndị na-eso ụzọ ya anya gwa ha okwu sị, “Lee obi ụtọ dịrị unu, ndị ogbenye, nꞌihi na alaeze eluigwe bụ nke unu.21“Lee obi ụtọ dịrị unu, unu ndị agụụ na-agụ nꞌihi na afọ ga-eju unu. Leekwa obi ụtọ dị na-eche unu mgbe ndị mmadụ na-akpọ unu asị, na mgbe a na-achụpụ unu, na-akparị unu, na-asịkwa na unu bụ ajọ mmadụ nꞌihi na unu na-eso m22***23Nụrịanụ ọṅụ mgbe ihe ndị a na-adakwasị unu, teekwanụ egwu ọṅụ, nꞌihi na ụgwọ ọrụ unu ga-adị ukwuu nꞌeluigwe. Nꞌihi na ọ bụkwa otu a ka nna nna ha siri meso ndị amụma.24“Ma lee ka ahụhụ na-eche ndị ọgaranya siri dị ukwuu! Nꞌihi na ha eketala oke ọṅụ ha nꞌụwa a.25Oke ahụhụ dịkwa na-eche ndị ọgaranya nꞌihi afọ ojuju nke ha na-enwe ugbu a, agụụ ga-agụkwa ha. Ha na-achị ọchị ugbu a, ma ha ga-akwa akwa, tie aka nꞌobi nꞌiru uju.26Lee ka ahụhụ si na-eche ndị ahụ ụmụ mmadụ na-eto, ndị ha na-ekwu okwu ọma banyere. Nꞌihi na site na mgbe ochie ọ bụ ndị amụma ụgha ka a na-eto otuto.27“Geenụ ntị nꞌihe m chọrọ ikwu, unu nile nọ nꞌebe a ugbu a. Hụnụ ndị iro unu nꞌanya, meekwaranụ ndị na-akpọ unu asị ihe ọma.28Gọzienụ ndị na-abụ unu ọnụ, ma kpeekwaranụ ndị ahụ na-akọcha unu ekpere.29“Ọ bụrụ na mmadụ akụọ gị aka nꞌotu nti, tụgharịara ya nti gị nke ọzọ. Ọ bụrụkwa na onye ọ bụla anara gị uwe ahụ gị, nyekwa ya uwe ime ahụ gị.30Nye onye ọ bụla rịọrọ gị ihe. Ọ bụrụkwa na mmadụ ewere ihe bụ nke gị, agala ịnapụta ya, hapụrụ ya ihe ahụ.31Otu ọ bụla unu si chọọ ka ndị mmadụ mesoo unu mmeso, sitekwanụ otu ahụ mesoo mmadụ ibe unu.32“Ọ bụrụ nanị ndị na-ahụ unu nꞌanya ka unu na-ahụ nꞌanya, unu atụkwala anya na Chineke ga-asị na unu mere nke ọma, nꞌihi na ndị mmehie na-ahụkwa ndị hụrụ ha nꞌanya nꞌanya.33Ọ bụrụkwa nanị ndị na-enyere unu aka ka unu na-enyere aka, obi ò ga-atọ Chineke ụtọ nꞌebe unu nọ? É, è. Nꞌihi na ndị mmehie na-enyekwara ndị na-enyere ha aka aka.34Ọ bụrụkwa nanị onye nwere ike ịkwụghachi unu ka unu na-agbazinye ihe, ụdị ihe ọma a abụghị nke e kwesịrị ikele unu ekele nꞌihi ya, nꞌihi na ndị mmehie na-agbazinyekwa ndị mmadụ ego, ka onye ha gbazinyere kwụghachikwa ha.35“Ma iwu m na-enye unu bụ nke a, hụnụ ndị iro unu nꞌanya, nyekwaranụ ndị ọzọ aka, gbazinyenụ ndị nọ na mkpa ihe ha chọrọ, na-eleghị anya na ha ga-akwụghachi unu. Unu mee nke a, ụgwọ ọrụ unu ga-adị ukwuu, unu ga-egosikwa na unu bụ ụmụ Chineke nꞌezie, nꞌihi na Chineke na-emere ndị na-eme ihe ọjọọ ihe ọma, na-egosikwa ndị na-adịghị ekele ya ekele obi ebere.36“Ya mere, nweenụ obi ebere dị ka nna unu bi nꞌeluigwe si enwe obi ebere.37“Unu ekpela ndị ọzọ ikpe, ka a ghara ikpe unu ikpe. Amala ndị ozọ ikpe ka a ghara ima unu ikpe. Gbagharanụ ndị ọzọ, a ga-agbagharakwa unu.38Kenyenụ ndị ọzọ ihe unu nwere, Chineke ga-enyeghachikwa unu. Onyinye unu ga-anata ga-abụ onyinye juru juru eju, nke a bịadara nke ọma, nke a yọgharịrị mee ka o jubiga oke, na nke na-asọgharị. Kama ọ bụ ụdị onyinye unu nyere, onyinye ukwu ma ọ bụ onyinye nta, ka Chineke ga-enyeghachikwa unu.”39Mgbe ahụ Jisọs jiri ilu gwa ha okwu sị, “Onye ìsì enweghị ike idu onye ìsì ibe ya, nihi na ha abụọ ga-adaba nꞌime olulu.40Nwanta akwụkwọ enweghị oge ọ ga-ama ihe karịa onye na-ezi ya ihe, kama mgbe ọ mụsịrị akwụkwọ ya ọ ga-amata ihe dị ka onye ziri ya ihe.41“Gịnị mere i ji legide anya na ntakịrị ahịhịa dị nwanna gị nꞌanya, ma ọ dịghị ihe ọ bụla ị na-eme banyere ibe osisi dachiri gị anya?42Ị̀ ga-esi aṅaa sị nwanna gị, biko kwere ka m tụpụta gị ahịhịa ntakịrị dị gị nꞌanya mgbe ibe osisi dachiri gị nꞌanya adịghị ekwe gị hụ ụzọ? Buru ụzọ wepụta ibe osisi dachiri gị nꞌanya, mgbe ahụ ị ga-ahụ ụzọ nke ọma iwepụ ntakịrị ahịhịa dị nwanna gị nꞌanya.43“Ezi osisi adịghị amị mkpụrụ ọjọọ. Ọ dịkwaghị osisi ọjọọ na-amị mkpụrụ ọma.44Nꞌihi na ọ bụ mkpụrụ osisi mịrị ka e ji ama ụdị osisi ọ bụ. Ndị mmadụ adịghị aghọta oroma nꞌosisi ụdara, otu a kwa o nweghị onye na-aghọta aṅara nꞌahịhịa ogwu.45Ezi mmadụ na-esite nꞌakụ ọma juru ya obi na-arụpụta ezi ihe, otu a kwa ajọ mmadụ na-esite nꞌobi ọjọọ ya na-arụpụta ajọ ihe. Nꞌihi na ihe ọ bụla dị mmadụ nꞌobi bụ ihe na-apụta nꞌọnụ ya.46“Gịnị mere unu ji na-akpọ m Onyenwe anyị, Onyenwe anyị, ma unu adịghị eme ihe m gwara unu?47Achọrọ m igosi unu ihe onye na-abịakwute m nke na-anụ okwu m, ma na-ejikwa ihe ọ na-anụ eme ihe, yiri.48Onye ahụ yiri nwoke wuru ụlọ ya nꞌelu ntọ ala dị mma, onye gwumiri ala, doo ntọ ala ụlọ ahụ nꞌelu nkume. Mmiri ga-ezo, tojuo iyi nile, meekwa ka ide mmiri sọọ gburugburu ụlọ ahụ, ma ọ gaghị eme ka ụlọ ahụ maa jijiji, nꞌihi na e wukwasịrị ya nꞌelu nkume.49“Ma onye ahụ nụrụ okwu m, nke na-ejighị ihe ọ nụrụ mee ihe, dị ka nwoke wukwasịrị ụlọ ya nꞌelu aja, nke na-enweghị ntọ ala ọ bụla. Mgbe ide mmiri sọrọ ụlọ ahụ gburugburu, ụlọ ahụ na-ada nnọọ gbirigidim!”Igbo Bible 1988 No Data Igbo Bible 1988 LUK 6 00:00:00 00:00:00 0.5x 2.0x https://beblia.bible:81/BibleAudio/igbo1988/luke/006.mp3 24 6