× Asụsụ Europe Russian Belarusian Asụsụ Ukraine Asụsụ Polish Serbian Bulgaria Asụsụ Slovakian Czech Asụsụ Romania Moldovian Azebaịjan Armenia Onye Georgia Albania Avar Bashkir Tatar Chechen Asụsụ Slovenian Asụsụ Croatian Estonia Asụsụ Latvian Asụsụ Lithuania Asụsụ Hungary Asụsụ Finish Asụsụ Norway Asụsụ Sweden Asụsụ Iceland Grik Masedonia German Bavaria Asụsụ Dutch Asụsụ Danish Welsh Gaelic Asụsụ Aịrish French Basque Catalan .Talian Galacian Romani Bosnian North America Bekee South America Asụsụ Spanish Asụsụ Portuguese Guarani Asụsụ Quechuan Aymara Central America Onye Jamaica Asụsụ Nawatụl Kiche Qeqchi Asụsụ Haiti Ebe Ọwụwa Anyanwụ Eshia Chinese nke Ndị Japan Korean Mongolian Uyghur Hmong South East Asia Onye Malaysia Burmese Chin Asụsụ Nepali Cebuano Asụsụ Tagle Kambodia Thai Indoneshian Vietnam Asụsụ Javanese Lao Iban Iu Mien Kachin Lahu Aceh Balinese Bugis Pampanga Sasak Shan Waray South Asia Hindi Dia Awadhi Mizo Kannada Malayalam Marathi Gujarati Asụsụ Tamil Telugu Asụsụ Punjabi Kurukh Asụsụ Assam Maithili Asụsụ Bengali Asụsụ Urdu Sinhala Dogri Haryanvi Meitei Konkani Santalaị Sindhi Koya Thado Sanskrit Devanagari Adilabad Gondi Ahirani Balochi Bundeli Chhattisgarhi Garhwali Kangri Kumaoni Mewari Munda Sadri Seraiki Shekhawati Sylheti Etiti Asia Kyrgyz Asụsụ Uzbek Tajik Ndị Turkmen Kazakhstan Karakalpak Etiti ọwụwa anyanwụ Turkish Hibru Arabic Peshia Kurdi Pashto Coptic Africa Afrịka Xhosa Asụsụ Ndebele Akpan Asụsụ Amharik Wolaytta Onye Naijiria Mossi Ika Dinka Kabyle Ewe Asụsụ Swahili Morocco Asụsụ Somali Shona Madagaska Igbo Lingala Baoule Siswati Tsonga Tswana Onye Gambian Ndi Yoruba Kamba Kinyarwanda Hausa Chewa Luo Makua Dyula Fulfulde Kalenjin Kikọyu Kikwango Kirundi Krio Nigerian Pidgin Oromo Tshiluba Tshivenda Twi Umbundu Lugbara Luguru Pular Gussi Maasai Turkana Moba Nuer Shilluk Tamasheq Makonde Bemba Fon Hadiyya Ibibio Kimbundu Kimiiru Lango Liberian Kreyol Lomwe Mende Morisyen Ndau Nyankole Sena Sidamo Soga Songe Sukuma Tarifit Teso Tiv Zande Kọntinent Australia New Zealand Papua New Guinea Asụsụ Ochie Asụsụ Arameik Latin Esperanto 1 1 1 1988 Nsọ nʼIgbo 2020Bible Nso 200619881 1 1 JỌN MATIUMAKLUKJỌNỌLU OZIROM1 KỌRINT2 KỌRINTGALETIAEFESỌSFILIPAIKỌLỌSI1 TESALỌNAIKA2 TESALỌNAIKA1 TIMỌTI2 TIMỌTITAITỌSFAILIMONHIBRUJEMES1 PITA2 PITA1 JỌN2 JỌN3 JỌNJUDNKPUGHE1 1 1 1 1234567891011121314151617181920211 1 1 : 12 1234567891011121314151617181920212223242526272829303132333435363738394041424344454647484950511 1 1 Igbo Bible 1988 JỌN 1 Chekwaa ihe edeturu 1Site na mmalite ihe nile, Okwu ahụ dị. Okwu ahụ na Chineke nọkwa, Okwu ahụ bụkwa Chineke.2Site nꞌoge ihe nile bidoro, Okwu ahụ na Chineke nọkwa.3E kere ihe nile site nꞌaka ya. Nꞌezie, ọ dịghị ihe ọ bụla e kere eke nke a na-ekeghị site nꞌaka ya.4Nꞌime ya ka ihe nile nwere ndụ siri nwee ndụ ha, nꞌihi nke a, ndụ ahụ dị nꞌime ya na-enyekwa ndị nile bi nꞌụwa ìhè.5Ezi ndụ ahụ dị nꞌime ya bụ ìhè na-enwu nꞌime ọchịchịrị. Ọchịchịrị ọ bụla enwebekwaghị ike ịmenyụ ìhè ahụ dị nꞌime ya.6Ọ dị otu nwoke Chineke zitere a na-akpọ Jọn.7Jọn bịara ka ọ kọwaara mmadụ nile ihe banyere ìhè ahụ.8Jọn nꞌonwe ya abụghị ìhè ahụ. Ọ bụ nanị onye gbara ama kọwaakwa ihe banyere ìhè ahụ.9Nꞌikpeazụ, Okwu ahụ bụ ìhè nke ụwa, bịara nꞌụwa. Ọ bịara inye onye ọ bụla bi nꞌụwa ìhè.10Ọ bịara nꞌụwa, bụ ụwa ahụ o kere nꞌonwe ya, ma ụwa amaghị ya.11Ọ bịara nꞌụwa ahụ bụ nke aka ya, ma ndị ahụ bụ ndị nke ya anabataghị ya.12Ma ndị nile naara ya, ndị nile kweere nꞌaha ya, ka o nyere ike ịbụ ụmụ Chineke.13A mụghị ndị a kweere na ya site nꞌọmụmụ nke anụ ahụ, ma ọ bụ site nꞌọchịchọ nwoke, ma ọ bụ site na ntụpụta mmadụ, kama ịmụ ọzọ a sitere na Chineke nꞌonwe ya.14Okwu ahụ ghọrọ mmadụ, gbokwasị onwe ya ọdịdị mmadụ, sorokwa mmadụ bikọọ nꞌụwa a. O jupụtara nꞌamara na eziokwu. Anyị hụkwara ebube ya, ebube ahụ a pụrụ ịhụ nanị na ndụ onye bụ Ọkpara Chineke Nna nke eluigwe.15Jọn omee baptizim mere ka igwe mmadụ ahụ nile mata Kraịst mgbe o tiri mkpu sị, “Lee! Onye a bụ onye ahụ m gwara unu ihe banyere ya, sị, onye dị ukwuu karịa m na-abịa, ọ dị ukwuu karịa m nꞌihi na ọ na-adị rị tupuu amụọ m.”16Anyị sitere nꞌaka ya nata amara pụrụ iche, nꞌokpukpu nꞌokpukpu, amara sitere nꞌeluigwe bịa.17Nꞌihi na iwu sitere nꞌaka Mosisi bịa, ma ugbu a, Jisọs Kraịst ewetarala anyị amara na eziokwu.18Ọ dịbeghị onye ọ bụla ji anya ya hụ Chineke anya mgbe ọ bụla, ma Jisọs Kraịst, onye nanị ya bụ Ọkpara Chineke, bụrụkwa onye ya na Chineke nọ rị site na mbụ egosila anyị onye Chineke bụ, meekwa ka anyị mata ya.19Mgbe ahụ ndị isi ndị Juu bi na Jerusalem zigara ụfọdụ ndị nchụaja ụlọ nsọ ukwu Chineke, na ndị Livayị naeje ozi nꞌụlọ nsọ ahụ, ka ha bịakwute Jọn, jụọ ya ajụjụ sị, “Ị bụ onye?”20Ma Jọn omee baptizim ezoghị ihe ọ bụla nꞌebe ha nọ. Kama ọ gwaghere ha ọnụ sị ha, “Mụ onwe m abụghị m Onye nzọpụta ahụ.”21Ma ndị nchụaja ahụ jụrụ Jọn ajụjụ ọzọ sị ya, “Onye kwanụ ka ị bụ? Ị̀ bụ Ịlaịja?” Jọn zara ha sị, “É,è, abụghị m Ịlaịja.” Ha jụrụ ya ajụjụ ọzọ sị, “Ị̀ bụ onye amụma ahụ Mosisi gwara anyị ihe banyere ya?” Jọn zakwara sị ha, “Ọ dịghị! Abụghị m onye amụma ahụ unu na-ekwu ihe banyere ya.”22Ndị nchụaja ahụ jụrụ Jọn ajụjụ ọzọ sị ya, “Onye kwanụ ka ị bụ? Biko gwa anyị eziokwu ka anyị nweta ọsịsa dị mma anyị ga-asa ndị zitere anyị.”23Mgbe ahụ Jọn gwara ha sị, “Abụ m nanị olu na-eti mkpu nꞌọzara na-asị, ‘Jikerenụ nꞌihi ọbịbịa nke Onyenwe anyị!’ Nke a bụ mmezu amụma ahụ Aịzaya buru nꞌoge ya.”24Ndị nchụaja ahụ e zipụrụ ịjụ Jọn ajụjụ a sitere nꞌetiti ndị Farisii bịa.25Ha jụrụ Jọn ajụjụ ọzọ sị, “Ọ bụrụ na ị bụghị Onye nzọpụta ahụ, ma ọ bụ Ịlaịja, ma ọ bụ onye amụma ahụ, gịnị mere i ji eme ọtụtụ mmadụ baptizim?”26Jọn zara sị ha, “Ana m eji mmiri efu eme mmadụ baptizim, ma ọ dị otu nwoke guzo nꞌetiti unu onye unu naamataghị, onye ga-ebido ọrụ ya nꞌoge na-adịghị anya site ugbu a.27Ọ bụkwa ihe banyere ya ka m na-agwa unu. Nꞌezie, eturughi m ịtọghepụ eriri dị nꞌakpụkpọ ụkwụ ya.”28Ihe ndị a nile mere nꞌobodo nta a na-akpọ Betani nke dị nꞌofe mmiri osimiri Jọdan. Nꞌebe ahụ ka Jọn nọ naeme ndị mmadụ baptizim.29Nꞌechi ya, mgbe Jọn hụrụ Jisọs ka ọ na-abịa nꞌakụkụ ebe ọ nọ, o tiri mkpu sị, “Lee Nwa atụrụ Chineke, onye naebupụ mmehie ụwa!30Onye a bụ onye ahụ m gwara unu ihe banyere ya. Chetanụ na m gwara unu sị, ‘Nꞌoge na-adịghị anya otu onye dị ukwuu karịa m ga-abịa. Ya onwe ya bukwa ụzọ dịrị. Ọ na-adịkwa ruo mgbe nile ebighị ebi.’31Amatakwaghị m na ọ bụ ya. Kama ana m eme-ndị mmadụ baptizim ebe a ka ọ dịrị m mfe igosi ya nye ndị Izirel nile.”32Nke a bụ ama Jọn gbara: “Ahụrụ m ka eluigwe meghere, hụkwa Mmụọ Nsọ ka ọ rịdatara dị ka nduru bekwasị nwoke a nꞌisi.33“Ma amaghị m onye nwoke a bụ. Kama Chineke, onye zitere m ime ndị mmadụ baptizim ebe a, gwara m sị, ‘Onye ahụ Mmụọ Nsọ ga-ebekwasị nꞌisi, bụ onye ahụ unu na-ele anya ya. Ọ bụkwa onye ndị mmadụ ga-esite nꞌaka ya nata Mmụọ Nsọ.’34Ihe ndị a nile mezuru nꞌahụ nwoke a. Nꞌihi nke a ana m agbasi ama ike na nwoke a bụ Ọkpara Chineke nꞌeziokwu.”35Nꞌechi ya kwa, Jọn na mmadụ abụọ ndị na-eso ụzọ ya, guzoro nꞌotu ebe.36Mgbe ọ hụrụ Jisọs ka ọ na-agafe nꞌebe ahụ ha nọ, o legidere ya anya sị, “Lee Nwa atụrụ Chineke!”37Mgbe mmadụ abụọ ahụ nụrụ ihe Jọn kwuru, ha tụgharịrị soro Jisọs.38Jisọs lere anya nꞌazụ hụ ka mmadụ abụọ ahụ na-eso ya. Ọ jụrụ ha sị, “Onye ka unu na-achọ?” Ha zara ya sị, “Onye ozizi olee ebe i bi?”39Jisọs sịrị ha, “Bịanụ ka unu hụrụ.” Nꞌotu oge ahụ, ha sooro Jisọs gaa nꞌebe o bi. Ha sooro ya nọgide nꞌebe ahụ nꞌụbọchị ahụ, nꞌihi na ọ bụ ihe dị ka elekere anọ nke anyasị ka ha jiri zute ya nꞌụbọchị ahụ.40Otu nꞌime mmadụ abụọ ahụ hụrụ Jisọs soro ya, bụ Anduru nwanne Saimọn Pita.41Anduru siri nꞌebe ahụ pụọ chọta Pita nwanne ya sị ya “Anyị achọtala Onye nzọpụta ahụ.”42O duuru Pita bịarute nꞌebe Jisọs nọ. Mgbe Jisọs hụrụ Pita, o legidesịrị ya anya ike gwa ya okwu sị ya, “Ọ bụ ezie na aha gị bụ Saimọn nwa Jọn ma site taa gaa nꞌihu, aha ọhụrụ gị bụ Pita, nke pụtara Nkume!”43Nꞌechi ya, Jisọs kpebiri ijeru Galili. Mgbe o ruru ebe ahụ ọ hụrụ Filip gwa ya okwu sị ya, “Soro m.”44Filip a bụkwa onye Betsaida, nke bụkwa obodo Anduru na Pita.45Emesịa, Filip pụrụ chọta nwoke a ana-akpọ Nataniel gwa ya sị, “Anyị ahụla Onye nzọpụta ahụ. Onye ahụ Mosisi na ndị amụma kwuru ihe banyere ya, Jisọs nwa Josef, onye obodo Nazaret.”46Ma Nataniel zara Filip sị ya, “Gịnị ka ị na-ekwu? Ị̀ sị na ọ bụ Nazaret? Ọ dị ihe ọma ọ bụla pụrụ isite na Nazaret pụta?” Filip zara sị ya, “Bịa ka ị chọpụta nꞌonwe gị.”47Mgbe Jisọs hụrụ Nataniel ka ọ na-abịa nso ebe ọ nọ, ọ sịrị, “Lee! Nke a bụ nwa afọ Izirel nꞌeziokwu! Aghụghọ ọ bụla adịghị nꞌime ya!”48Nataniel jụrụ Jisọs ajụjụ sị, “Ì si aṅaa mata onye m bụ?” Ma Jisọs zara ya sị, “Tupuu Filip akpọọ gị, ahụrụ m gị ka ị nọ nꞌokpuru osisi fiigi ahụ.”49Nataniel zara sị ya, “Onyenwe anyị, nꞌeziokwu ị bụ Ọkpara Chineke ahụ! Ị bụkwa Eze Izirel!”50Jisọs jụrụ Nataniel ajụjụ sị, “Ì kweere na m bụ Onye nzọpụta ahụ nꞌihi na m gwara gị na m hụrụ gị nꞌokpuru osisi fiigi ahụ? Nꞌezie, ị ga-ahụ ihe dị ukwuu karịa nke a, nke pụrụ igosi gị na mụ onwe m bụ Onye nzọpụta ahụ nꞌeziokwu.51Ị ga-ahụ ka eluigwe meghere, hụkwa ndị mmụọ ozi Chineke ka ha na-arigo naarịdatakwa ịbịakwute m bụ Onye nzọpụta.”Igbo Bible 1988 No Data Igbo Bible 1988 JỌN 1 00:00:00 00:00:00 0.5x 2.0x https://beblia.bible:81/BibleAudio/igbo1988/john/001.mp3 21 1