× Asụsụ Europe Russian Belarusian Asụsụ Ukraine Asụsụ Polish Serbian Bulgaria Asụsụ Slovakian Czech Asụsụ Romania Moldovian Azebaịjan Armenia Onye Georgia Albania Avar Bashkir Tatar Chechen Asụsụ Slovenian Asụsụ Croatian Estonia Asụsụ Latvian Asụsụ Lithuania Asụsụ Hungary Asụsụ Finish Asụsụ Norway Asụsụ Sweden Asụsụ Iceland Grik Masedonia German Bavaria Asụsụ Dutch Asụsụ Danish Welsh Gaelic Asụsụ Aịrish French Basque Catalan .Talian Galacian Romani Bosnian North America Bekee South America Asụsụ Spanish Asụsụ Portuguese Guarani Asụsụ Quechuan Aymara Central America Onye Jamaica Asụsụ Nawatụl Kiche Qeqchi Asụsụ Haiti Ebe Ọwụwa Anyanwụ Eshia Chinese nke Ndị Japan Korean Mongolian Uyghur Hmong South East Asia Onye Malaysia Burmese Chin Asụsụ Nepali Cebuano Asụsụ Tagle Kambodia Thai Indoneshian Vietnam Asụsụ Javanese Lao Iban Iu Mien Kachin Lahu Aceh Balinese Bugis Pampanga Sasak Shan Waray South Asia Hindi Dia Awadhi Mizo Kannada Malayalam Marathi Gujarati Asụsụ Tamil Telugu Asụsụ Punjabi Kurukh Asụsụ Assam Maithili Asụsụ Bengali Asụsụ Urdu Sinhala Dogri Haryanvi Meitei Konkani Santalaị Sindhi Koya Thado Sanskrit Devanagari Adilabad Gondi Ahirani Balochi Bundeli Chhattisgarhi Garhwali Kangri Kumaoni Mewari Munda Sadri Seraiki Shekhawati Sylheti Etiti Asia Kyrgyz Asụsụ Uzbek Tajik Ndị Turkmen Kazakhstan Karakalpak Etiti ọwụwa anyanwụ Turkish Hibru Arabic Peshia Kurdi Pashto Coptic Africa Afrịka Xhosa Asụsụ Ndebele Akpan Asụsụ Amharik Wolaytta Onye Naijiria Mossi Ika Dinka Kabyle Ewe Asụsụ Swahili Morocco Asụsụ Somali Shona Madagaska Igbo Lingala Baoule Siswati Tsonga Tswana Onye Gambian Ndi Yoruba Kamba Kinyarwanda Hausa Chewa Luo Makua Dyula Fulfulde Kalenjin Kikọyu Kikwango Kirundi Krio Nigerian Pidgin Oromo Tshiluba Tshivenda Twi Umbundu Lugbara Luguru Pular Gussi Maasai Turkana Moba Nuer Shilluk Tamasheq Makonde Bemba Fon Hadiyya Ibibio Kimbundu Kimiiru Lango Liberian Kreyol Lomwe Mende Morisyen Ndau Nyankole Sena Sidamo Soga Songe Sukuma Tarifit Teso Tiv Zande Kọntinent Australia New Zealand Papua New Guinea Asụsụ Ochie Asụsụ Arameik Latin Esperanto 1 1 1 1988 Nsọ nʼIgbo 2020Bible Nso 200619881 1 1 JỌN MATIUMAKLUKJỌNỌLU OZIROM1 KỌRINT2 KỌRINTGALETIAEFESỌSFILIPAIKỌLỌSI1 TESALỌNAIKA2 TESALỌNAIKA1 TIMỌTI2 TIMỌTITAITỌSFAILIMONHIBRUJEMES1 PITA2 PITA1 JỌN2 JỌN3 JỌNJUDNKPUGHE1 1 1 14 1234567891011121314151617181920211 1 1 : 6 123456789101112131415161718192021222324252627282930311 1 1 Igbo Bible 1988 JỌN 14 Chekwaa ihe edeturu 1“Ka obi ghara ịlọ unu mmiri. Kwerenụ na Chineke, kwerekwanụ na m.2Nꞌụlọ Nna m ọtụtụ ụlọ obibi dị ya. Ọ bụrụ na o sighị otu a dịrị, agaara m agwa unu. Ma ana m aga idoziri unu ha.3Mgbe m dozichara ha, aga m abịa ịkpọrọ unu, ka mụ na unu nọdụ.4Unu maara nke ọma ebe m na-aga.”5Ma Tọmọs sịrị ya, “Onyenwe anyị, anyị amaghị ebe ị na-aga, olee otu anyị ga-esi mata ụzọ ahụ?”6Jisọs zara ya sị, “Mụ onwe m bụ ụzọ, na eziokwu ahụ, na ndụ. O nweghị onye na-abịakwute Nna m ma ọ bụghị site na m.7Ọ bụrụ na ị maara onye m bụ, ị ga-amatakwa Nna m. Site taa unu amatala ya. Unu ahụkwala ya.”8Filip sịrị ya, “Onyenwe anyị ọ bụrụ na i zi anyị Nna ahụ afọ ga-eju anyị.”9Jisọs zara ya sị, “Ọtụtụ oge ndị a mụ na unu nọrọ ọ̀ bụ na ị matabeghị onye m bụ, Filip? Onye ọ bụla hụrụ m ahụla Nna ahụ. Gịnị mere i ji na-asị m, ‘Zi m Nna ahụ?’10Ọ bụ na i kweghị na m nọ nꞌime Nna m, na Nna m nọkwa nꞌime m? Okwu nile m na-ekwu esitekwaghị nꞌebe m nọ pụta. Ha bụ okwu nke Nna m. Nna m bi nꞌime m na-arụkwa ọrụ ya nꞌọnwe ya.11Kwere ihe m gwara gị. Ebi m nꞌime Nna m, Nna m bikwa nꞌime m. Ọ bụrụ na i kwereghị okwu ọnụ m, kwere nꞌihi ọrụ ndị a nile m na-arụ.12“Nꞌeziokwu, ana m agwa unu sị, onye ọ bụla tụkwasịrị m obi ga-enwe ike mee ihe ndị a nile. Ọ ga-enwekwa ike ime karịa ihe ndị a nꞌihi na m na-alakwuru Nna m.13Ihe ọ bụla unu gaarịọ site nꞌaha m, aga m enye unu ya. Aga m enye ya ka e site na ya nye Nna m otuto nꞌihi ihe Ọkpara ya na-eme.14Ihe ọ bụla unu rịọrọ nꞌaha m, aga m eme ya.15“Ọ bụrụ na unu hụrụ m nꞌanya unu debe ihe nile m nyere unu nꞌiwu.16Aga m arịọ Nna m ka o zitere unu Onye nkasịobi, onye ga-anọnyere unu ruo mgbe ebighị ebi. Onye a ga-abụ Mmụọ nke eziokwu.17Ndị bi nꞌụwa agaghị anabata ya, nꞌihi na ha apụghị ịhụ ya anya. Ha amakwaghị ya. Ma unu onwe unu maara ya, nꞌihi na unu na ya nọ ugbu a. O bikwa nꞌime unu.18Agaghị m ahapụ unu ka unu nọdụ nanị unu. Aga m abịakwutekwa unu.19Na mgbe na-adịghị anya site ugbu a, ụwa agaghị ahụkwa m anya. Ma unu onwe unu ga-ahụ m anya. Nꞌihi na m na-adị ndụ unu onwe unu gaadịkwa ndu.20Mgbe ụbọchị ahụ bịara, ihe nile ga-edo unu anya. Unu ga-amata na m nọ nꞌime Nna m na unu nọkwa nꞌime m, na mụ onwe m nọkwa nꞌime unu.21Onye na-anabata ihe m nyere nꞌiwu ma na-edebekwa ya bụ onye hụrụ m nꞌanya. Onye hụrụ m nꞌanya ka Nna m ga-ahụ nꞌanya. Aga m ahụkwa ya nꞌanya gosikwa ya onwe m.”22Judas (ọ bụghị nke raara ya nye) sịrị ya, “Onyenwe ayị, olee otu ị ga-esi gosi anyị onwe gị ma hapụ igosi ụwa onwe gị?”23Jisọs zara ya sị, “Ọ bụrụ na onye ọ bụla hụrụ m nꞌanya, ọ ga-edebe okwu m. Nna m ga-ahụkwa ya nꞌanya. Mụ na Nna m ga-abịakwa nꞌebe onye ahụ nọ soro ya biri.24Onye na-ahụghị m nꞌanya agaghị edebe okwu m. Okwu nile unu nụrụ nꞌọnụ m abụghị nke m. Ha bụ okwu Nna m, onye zitere m.25Agwala m unu ihe ndị a ugbu a mụ na unu nọ.26Ma Onye nkasịobị ahụ bụ Mmụọ Nsọ, onye Nna m ga-ezite nꞌaha m, ga-ezi unu ihe nile. Ọ gaechetara unu ihe nile m gwara unu.27“Udo ka m na-ahapụrụ unu. Udo nke m ka m na-enye unu. Ọ bụghị dị ka ụwa si enye udo ka m na-enye unu udo nke m. Unu ekwela ka obi lọọ unu mmiri. Ka ụjọ hapụkwa ịtụ unu.28Unu nụrụ na m gwara unu okwu sị, ‘Aga m ahapụ unu, emesịa aga m alaghachikwute unu.’ Ọ bụrụ na unu hụrụ m nꞌanya unu gaara aṅụrị ọṅụ. Nꞌihi na m na-alakwuru Nna m. Nna m dịkwa ukwuu karịa m.29Ana m agwa unu ihe ndị a mgbe ihe ọ bụla na-emebeghị, ka ọ bụrụ na mgbe o mere unu ga-enwe okwukwe.30“Agaghị m agwa unu ọtụtụ okwu ọzọ nꞌihi na eze na-achị ụwa a na-abịa. Ọ nwekwaghị ike ọ bụla nꞌebe m nọ.31Ọ na-abịa ka ụwa mara na m hụrụ Nna m nꞌanya. Ka ụwa matakwa na m na-eme ihe Nna m nyere m nꞌiwu ime. Bilienụ ka anyị si nꞌebe a pụọ.Igbo Bible 1988 No Data Igbo Bible 1988 JỌN 14 00:00:00 00:00:00 0.5x 2.0x https://beblia.bible:81/BibleAudio/igbo1988/john/014.mp3 21 14