× Asụsụ Europe Russian Belarusian Asụsụ Ukraine Asụsụ Polish Serbian Bulgaria Asụsụ Slovakian Czech Asụsụ Romania Moldovian Azebaịjan Armenia Onye Georgia Albania Avar Bashkir Tatar Chechen Asụsụ Slovenian Asụsụ Croatian Estonia Asụsụ Latvian Asụsụ Lithuania Asụsụ Hungary Asụsụ Finish Asụsụ Norway Asụsụ Sweden Asụsụ Iceland Grik Masedonia German Bavaria Asụsụ Dutch Asụsụ Danish Welsh Gaelic Asụsụ Aịrish French Basque Catalan .Talian Galacian Romani Bosnian North America Bekee South America Asụsụ Spanish Asụsụ Portuguese Guarani Asụsụ Quechuan Aymara Central America Onye Jamaica Asụsụ Nawatụl Kiche Qeqchi Asụsụ Haiti Ebe Ọwụwa Anyanwụ Eshia Chinese nke Ndị Japan Korean Mongolian Uyghur Hmong South East Asia Onye Malaysia Burmese Chin Asụsụ Nepali Cebuano Asụsụ Tagle Kambodia Thai Indoneshian Vietnam Asụsụ Javanese Lao Iban Iu Mien Kachin Lahu Aceh Balinese Bugis Pampanga Sasak Shan Waray South Asia Hindi Dia Awadhi Mizo Kannada Malayalam Marathi Gujarati Asụsụ Tamil Telugu Asụsụ Punjabi Kurukh Asụsụ Assam Maithili Asụsụ Bengali Asụsụ Urdu Sinhala Dogri Haryanvi Meitei Konkani Santalaị Sindhi Koya Thado Sanskrit Devanagari Adilabad Gondi Ahirani Balochi Bundeli Chhattisgarhi Garhwali Kangri Kumaoni Mewari Munda Sadri Seraiki Shekhawati Sylheti Etiti Asia Kyrgyz Asụsụ Uzbek Tajik Ndị Turkmen Kazakhstan Karakalpak Etiti ọwụwa anyanwụ Turkish Hibru Arabic Peshia Kurdi Pashto Coptic Africa Afrịka Xhosa Asụsụ Ndebele Akpan Asụsụ Amharik Wolaytta Onye Naijiria Mossi Ika Dinka Kabyle Ewe Asụsụ Swahili Morocco Asụsụ Somali Shona Madagaska Igbo Lingala Baoule Siswati Tsonga Tswana Onye Gambian Ndi Yoruba Kamba Kinyarwanda Hausa Chewa Luo Makua Dyula Fulfulde Kalenjin Kikọyu Kikwango Kirundi Krio Nigerian Pidgin Oromo Tshiluba Tshivenda Twi Umbundu Lugbara Luguru Pular Gussi Maasai Turkana Moba Nuer Shilluk Tamasheq Makonde Bemba Fon Hadiyya Ibibio Kimbundu Kimiiru Lango Liberian Kreyol Lomwe Mende Morisyen Ndau Nyankole Sena Sidamo Soga Songe Sukuma Tarifit Teso Tiv Zande Kọntinent Australia New Zealand Papua New Guinea Asụsụ Ochie Asụsụ Arameik Latin Esperanto 1 1 1 1988 Nsọ nʼIgbo 2020Bible Nso 200619881 1 1 JỌN MATIUMAKLUKJỌNỌLU OZIROM1 KỌRINT2 KỌRINTGALETIAEFESỌSFILIPAIKỌLỌSI1 TESALỌNAIKA2 TESALỌNAIKA1 TIMỌTI2 TIMỌTITAITỌSFAILIMONHIBRUJEMES1 PITA2 PITA1 JỌN2 JỌN3 JỌNJUDNKPUGHE1 1 1 17 1234567891011121314151617181920211 1 1 : 17 12345678910111213141516171819202122232425261 1 1 Igbo Bible 1988 JỌN 17 Chekwaa ihe edeturu 1Mgbe Jisọs kwusịrị okwu ndị a, o legidere anya nꞌeluigwe sị, “Nna, oge ahụ a kara aka eruola. Biko, nye Ọkpara gị otuto, ka Ọkpara gị nyekwa gị otuto.2I nyela ya ike nꞌebe mmadụ nile dị. Ee, i nyekwara ya ike nꞌebe ihe nile e kere eke dị, na ike inye ndị nile i nyere ya ndụ ebighị ebi.3Nke a bụkwa ụzọ ndụ ebighị ebi ahụ. Ka mmadụ mata na ọ bụ nanị gị bụ Chineke nꞌezie, ka ha matakwa na Jisọs Kraịst bụkwa onye ahụ i zitere nꞌụwa.4Enyela m gị otuto nile nꞌime ụwa a, ya mere arụsịrị m ọrụ nile ị chọrọ ka m rụọ.5Ma ugbu a, Nna m, mee ka otuto gị pụta ìhè nꞌahụ m ugbu a m guzo nꞌihu gị. Otuto ahụ m nwererị nꞌime gị mgbe a na-atọbeghị ntọ ala ụwa a.6“Ezila m ndị a ihe nile banyere gị. Gị onwe gị nyere m ha site nꞌụwa. Ha nile bụkwa nke gị. Ma ugbu a, i nyere m ha ka ha bụrụ nke m. Ha debekwara okwu gị nile.7Nꞌihi nke a ha maara na ihe nile i nwere bụ nke m. Ihe nile m nwere bụkwa nke gị.8Ma ugbu a, enyela m ha okwu ahụ i nyere m ka m nye ha. Ha anabatala ya, ghọta ya, jidesiekwa ya ike. Ha aghọtala na mụ onwe m si nꞌebe ị nọ bịa nꞌụwa. Ha kweere na m si nꞌebe ị nọ bịa, na ọ bụkwa gị onwe gị zitere m.9“Ugbu a ana m ekpe ekpere nꞌihi ndị a nile i nyere m. Ekpeghị m ekpere nꞌihi ndị nọ nꞌụwa. Kama ana m ekpe ekpere nꞌihi ndị a i nyere m, nꞌihi na ha bụkwa ndị nke gị.10Ndị nke gị nile bụkwa ndị nke m. Ha nile nꞌotu nꞌotu bụkwa otuto m.11Ma ugbu a ọ fọdụrụ nwa oge nta ka m hapụ ụwa. Aga m ahapụkwa ha nꞌụwa bịakwute gị. Biko Nna dị nsọ, site nꞌike dị nꞌaha gị chebe ndị nile i si nꞌụwa nye m, ka ha bụrụ otu dị ka mụ na gị siri bụrụ otu.12Mgbe mụ na ha nọ nꞌụwa echebere m ha site nꞌaha gị nke i nyere m. O nwekwaghị onye ọ bụla nꞌime ha lara nꞌiyi, karịakwa onye ahụ bụ nwa ọkụ ala mmụọ, dị ka akwụkwọ nsọ siri gbaa ama banyere ya.13“Ma ugbu a, ana m alọghachikwute gị. Ma ana m ekwu ihe ndị a nꞌụwa ugbu a mụ na ha nọ, ka ha jupụta nꞌọṅụ m.14Enyela m ha okwu gị. Ma nꞌihi ya, ụwa akpọọla ha asị. Nꞌihi na ha sitere nꞌomenala ndị ụwa pụọ. Dị ka m si pụọkwa nꞌomume ọjọọ nile nke ụwa.15Ekpeghị m ekpere ka i wepụ ha nꞌụwa, kama ana m achọ ka i debe ha nke ọma. Ka ha ghara ịdaba nꞌaka onye ụrụala ahụ bụ ekwensu.16Ha onwe ha abụghị ndị nke ụwa dị ka mụ onwe m na-abụkwaghị nke ụwa.17Biko mee ha ka ha dị ọcha dịkwa nsọ site nꞌịnagide ozizi gị nile nꞌihi na ha bụ eziokwu.18Dị ka i siri zite m nꞌụwa, otu a ka m na-ezipụkwa ha nꞌụwa.19Ọ bụkwa nꞌihi ha ka m jiri debe onwe m nsọ nꞌime eziokwu ahụ.20“Ekpeghị m ekpere nꞌihi ndị a nanị. Kama ana m ekpekwa ekpere a nꞌihi ndị nile ga-ekwere na mụ, nꞌoge dị nꞌihu, site nꞌama ndị a ga-agba banyere m.21Isi ekpere m nꞌihi ha bụ ka ha nile nwee otu obi na otu mkpebi banyere ihe nile ha ga-eme, dị ka mụ na gị si nwekọọ. Nna, ee, dị ka gị onwe gị dị nꞌime m, dị ka mụ onwe m dịkwa nꞌime gị, achọrọ m ka ndị nile kweere na m nọgide nꞌime anyị. Mgbe ahụ ndị nile nọ nꞌụwa ga-esite nꞌomume dị otu a mata na gị onwe gị zitere m.22“Enyere m ha otuto i nyere m. Otuto ga-eme ka ha nile bụrụ otu dị ka anyị dịkwa.23Mgbe ahụ aga m ebikwa nꞌime ha, gị onwe gị ga-ebikwa nꞌime m. Anyị na ha ga-abụrụ ndị e jikọtara nꞌotu. Ụwa ga-esikwa otu a mata na gị onwe gị zitere m. Ha gaamatakwa na ị hụrụ ndị nile kweere na m nꞌanya, dị ka ị hụrụ m nꞌanya.24Biko Nna m, achọrọ m ka ndị nile kweere na m soro m bikọọ nꞌotu ebe. Ndị ahụ nile i nyere m site nꞌụwa, achọrọ m ka ha hụ otuto m nile, nke i nyere m site nꞌịhụnanya gị, nke i nwere nꞌebe m nọ malite na ntọ ala nke ụwa a.25“Nna onye ezi omume, nꞌezie, ụwa amaghị gị. Ma amaara m gị. Otu aka ahụ, ndị nile na-eso ụzọ m maara gị. Ha matakwara na ọ bụ gi zitere m.26Emeela m ka ha mata onye ị bụ. Aga m agakwa nꞌihu na-egosi ha ihe omimi nile dị nꞌime gị, tutuu ruo mgbe a ga-eme ka ịhụnanya i nwere nꞌebe m nọ dịgide nꞌime ha, tutuu ruo mgbe m ga-ebikwa nꞌime ha.”Igbo Bible 1988 No Data Igbo Bible 1988 JỌN 17 00:00:00 00:00:00 0.5x 2.0x https://beblia.bible:81/BibleAudio/igbo1988/john/017.mp3 21 17