× Asụsụ Europe Russian Belarusian Asụsụ Ukraine Asụsụ Polish Serbian Bulgaria Asụsụ Slovakian Czech Asụsụ Romania Moldovian Azebaịjan Armenia Onye Georgia Albania Avar Bashkir Tatar Chechen Asụsụ Slovenian Asụsụ Croatian Estonia Asụsụ Latvian Asụsụ Lithuania Asụsụ Hungary Asụsụ Finish Asụsụ Norway Asụsụ Sweden Asụsụ Iceland Grik Masedonia German Bavaria Asụsụ Dutch Asụsụ Danish Welsh Gaelic Asụsụ Aịrish French Basque Catalan .Talian Galacian Romani Bosnian North America Bekee South America Asụsụ Spanish Asụsụ Portuguese Guarani Asụsụ Quechuan Aymara Central America Onye Jamaica Asụsụ Nawatụl Kiche Qeqchi Asụsụ Haiti Ebe Ọwụwa Anyanwụ Eshia Chinese nke Ndị Japan Korean Mongolian Uyghur Hmong South East Asia Onye Malaysia Burmese Chin Asụsụ Nepali Cebuano Asụsụ Tagle Kambodia Thai Indoneshian Vietnam Asụsụ Javanese Lao Iban Iu Mien Kachin Lahu Aceh Balinese Bugis Pampanga Sasak Shan Waray South Asia Hindi Dia Awadhi Mizo Kannada Malayalam Marathi Gujarati Asụsụ Tamil Telugu Asụsụ Punjabi Kurukh Asụsụ Assam Maithili Asụsụ Bengali Asụsụ Urdu Sinhala Dogri Haryanvi Meitei Konkani Santalaị Sindhi Koya Thado Sanskrit Devanagari Adilabad Gondi Ahirani Balochi Bundeli Chhattisgarhi Garhwali Kangri Kumaoni Mewari Munda Sadri Seraiki Shekhawati Sylheti Etiti Asia Kyrgyz Asụsụ Uzbek Tajik Ndị Turkmen Kazakhstan Karakalpak Etiti ọwụwa anyanwụ Turkish Hibru Arabic Peshia Kurdi Pashto Coptic Africa Afrịka Xhosa Asụsụ Ndebele Akpan Asụsụ Amharik Wolaytta Onye Naijiria Mossi Ika Dinka Kabyle Ewe Asụsụ Swahili Morocco Asụsụ Somali Shona Madagaska Igbo Lingala Baoule Siswati Tsonga Tswana Onye Gambian Ndi Yoruba Kamba Kinyarwanda Hausa Chewa Luo Makua Dyula Fulfulde Kalenjin Kikọyu Kikwango Kirundi Krio Nigerian Pidgin Oromo Tshiluba Tshivenda Twi Umbundu Lugbara Luguru Pular Gussi Maasai Turkana Moba Nuer Shilluk Tamasheq Makonde Bemba Fon Hadiyya Ibibio Kimbundu Kimiiru Lango Liberian Kreyol Lomwe Mende Morisyen Ndau Nyankole Sena Sidamo Soga Songe Sukuma Tarifit Teso Tiv Zande Dagbani Kọntinent Australia New Zealand Papua New Guinea Asụsụ Ochie Asụsụ Arameik Latin Esperanto 1 1 1 1988 Nsọ nʼIgbo 2020Bible Nso 200619881 1 1 JỌN MATIUMAKLUKJỌNỌLU OZIROM1 KỌRINT2 KỌRINTGALETIAEFESỌSFILIPAIKỌLỌSI1 TESALỌNAIKA2 TESALỌNAIKA1 TIMỌTI2 TIMỌTITAITỌSFAILIMONHIBRUJEMES1 PITA2 PITA1 JỌN2 JỌN3 JỌNJUDNKPUGHE1 1 1 3 1234567891011121314151617181920211 1 1 : 20 1234567891011121314151617181920212223242526272829303132333435361 1 1 Igbo Bible 1988 JỌN 3 Chekwaa ihe edeturu 1O nwere otu onyeisi ndị Juu, onye so nꞌotu ndị Farisii, aha ya bụ Nikọdimọs.2Nwoke a bịakwutere Jisọs nꞌabalị, sị ya, “Onye ozizi, anyị maara na ị bụ onye ozizi sitere nꞌebe Chineke nọ bịa. Nꞌihi na mmadụ ọ bụla apụghị ịrụ ụdị ọrụ ịtụnanya ị na-arụ ma ọ bụrụ na Chineke anọnyereghị ya.”3Jisọs zara ya sị, “Nꞌezie, asị m gị, ọ bụrụ na amụghị mmadụ ọzọ, ọ pụghị ịhụ ụwa ọhụrụ ahụ Chineke ga-eweta anya.”4Nikọdimọs jụrụ ya sị, “Ị̀ sị na ọ bụ ịmụ mmadụ ọzọ? E si aṅaa amụ dimkpa ọzọ? Onye ha ka m ọ pụrụ ịba nꞌafọ nne ya ka a mụọ ya ọzọ?”5Ma Jisọs sịrị ya, “Lee anya ka m gwa gị, ọ bụrụ na amụghị mmadụ site na mmiri na Mmụọ Nsọ, onye ahụ enweghị ike ịba nꞌalaeze Chineke.6Dị ka mmadụ nwere ike mụọ mmadụ ibe ya, otu a kwa, ọ bụ nanị Mmụọ Nsọ pụrụ ịmụ mmadụ nꞌime Mmụọ Nsọ.7Ya ejule gị anya na m sịrị, ‘A ghaghị ịmụ gị ọzọ.’8Dị ka ifufe si efegharị nꞌebe ọ bụla ọ chọrọ, ị na-anụkwa ka ọ na-eme mkpọtụ, ma ị mataghị ebe o si bịa ma ọ bụ ebe ọ na-aga, nꞌụzọ dị otu a, i nweghị ike ịmata otu Mmụọ Nsọ si amụ mmadụ ọzọ.”9Nikọdimọs sịrị ya, “Olee otu ihe ndị a ga-esi mezuo?”10Jisọs sịrị ya, “Ị̀ bụ onye ozizi nke mmadụ nile na-asọpụrụ nꞌIzirel ma ị maghị ihe ndị a?11Achọrọ m ka ị mata nke ọma na anyị na-ekwu ihe anyị maara na-agbakwa ama banyere ihe anya anyị hụrụ. Ma unu adịghị anabata ama anyị.12Ọ bụrụ na unu ekwereghị nꞌihe ndị a na-eme nꞌetiti mmadụ nꞌime ụwa, unu ga-esi aṅaa kwere ma ọ bụrụ na m agwa unu ihe banyere ihe dị nꞌeluigwe?13Ọ gwụchaala Onye nzọpụta ahụ si nꞌeluigwe rịdata. Ọ bụkwa mụ onwe m bụ ya. Ọ bụkwa m ga-alaghachi azụ nꞌeluigwe.14“Dị ka Mosisi siri welie agwọ ahụ elu nꞌelu osisi ahụ nꞌọzara, ime ka ndị lekwasịrị ya anya dịkwa ndụ ọzọ, otu a ka a ga-esi weliekwa Nwa nke mmadụ elu.15Ka onye ọ bụla kweere na m ghara ịnwụ, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.16Nꞌihi na Chineke hụbigara ụwa nꞌanya oke, na o nyere Ọkpara nke ọ mụrụ nanị ya. Ka onye ọ bụla tụkwasịrị obi na ya ghara ịla nꞌiyi, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.17Chineke eziteghị Ọkpara ya nꞌụwa ka ọ bịa kpee ụwa ikpe. Kama o zitere ya, ka ụwa site nꞌaka ya nwee nzọpụta.18“Ikpe agaghị amakwa ndị nile tụkwasịrị Ọkpara Chineke obi kama ndị nile jụrụ ya, abụrụla rị ndị a mara ikpe, nꞌihi na e kpeela ha ikpe ugbu a. Ha bụkwa ndị ikpe Chineke mara nꞌihi na ha ekwenyeghị nꞌỌkpara Chineke.19E mere ka ikpe Chineke ma ha, nꞌihi na ha hụrụ ọchịchịrị nꞌanya karịa ìhè nke si nꞌeluigwe bịa. Nꞌihi na ha bụkwa ndị na-eme ihe ọjọọ dị iche iche.20Ndị mmehie nile na-agba ọsọ site nꞌìhè ahụ. Ha achọghị ịbịakwute ìhè ahụ nꞌihi na mmehie ha ga-apụta ìhè.21Ma onye ọ bụla na-eme eziokwu ahụ na-eji oke ọṅụ bịakwute ìhè ahụ. Ọ na-atọkwa ya ụtọ ka mmadụ nile hụ ọrụ ya, nꞌihi na ọ na-arụ ọrụ ndị a site nꞌike nke Chineke.”22Mgbe ihe ndị a gasịrị, Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya gara nꞌime obodo Judia. Ebe ahụ ka ha nọdụrụ abalị ole na ole meekwa ọtụtụ mmadụ baptizim.23Otu aka ahụ, Jọn omee baptizim nọkwa nꞌọnụ mmiri a na-akpọ Aenọn nke dị nso nꞌobodo Salim, na-emekwa ọtụtụ mmadụ baptizim, nꞌihi na mmiri buru ibu dị nꞌebe ahụ. Ọtụtụ mmadụ na-abịakwutekwa ya ka o mee ha baptizim.24E tinyebeghị Jọn nꞌụlọ mkpọrọ mgbe ihe ndị a na-eme.25Nꞌoge a, ụfọdụ ndị na-eso ụzọ Jọn na ụfọdụ ndị Juu bidoro ịrụrịta ụka banyere ime mmadụ ka ọ dị ọcha.26Nꞌihi nke a ha bịakwutere Jọn sị ya, “Onye ozizi, lee onye ahụ i gosiri ndị mmadụ nꞌofe nke ọzọ nke osimiri Jọdan, onye ahụ ị gbara ama banyere, ọ nọ ugbu a na-eme ọtụtụ mmadụ baptizim. Igwe mmadụ na-esokwa ya ka o mee ha baptizim.”27Ma Jọn kọwaara ha sị, “Nanị Chineke na-esi nꞌeluigwe kenye onye ọ bụla ọrụ nke ọ na-aghaghị ịrụ.28Unu nile ga-agbara m ama na m gwara unu na mbụ sị, ‘Abụghị m Onye nzọpụta ahụ.’ Ọrụ m bụ nanị ikwadebere ya ụzọ, na ime ka mmadụ nile mara ya.29Nwanyị a na-alụ alụ, bụ akụ di ya (ya bụ onye na-alụ ya). Nwanyị ahụ na-alakwurukwa nwoke ahụ na-alụ ya. Ndị nile bụ enyi nwoke ahụ naesoro ya ṅụrịa ọṅụ.30Ya mere, nwoke ahụ kwesịrị ịdị elu nke ukwuu mgbe mụ onwe m na-adị ala.31“Onye ahụ si nꞌelu bịa dị ukwuu karịa onye ọ bụla. Onye a mụrụ nꞌụwa bụ mmadụ efu, okwu ya nile bụkwa okwu gbasara ihe dị nꞌụwa. Ma Onye ahụ si nꞌeluigwe bịa dị elu nke ukwuu karịa onye ọ bụla.32Ọ na-akọwakwa ihe nile ọ hụrụ na nke ọ nụrụ. Ma o nweghị onye na-anabata ihe ọ na-ekwu.33Ma ndị nile na-anabata ozi ọma ya aghaghị ịchọpụta na Chineke bụ onye eziokwu.34Nꞌihi na onye ọ bụla Chineke zitere na-ekwu okwu nke Chineke. Nꞌihi na onye ahụ naejupụta na Mmụọ nsọ Chineke.35Chineke Nna hụkwara Ọkpara ya nꞌanya. O werekwala ike nile tinye ya nꞌaka.36Ya mere onye ọ bụla kweere nꞌỌkpara ahụ nwere ndụ ebighị ebi. Ma onye ọ bụla jụrụ Ọkpara ahụ agaghị enwe ndụ ebighị ebi, kama iwe Chineke na-adịgide ya nꞌahụ.”Igbo Bible 1988 No Data Igbo Bible 1988 JỌN 3 00:00:00 00:00:00 0.5x 2.0x https://beblia.bible:81/BibleAudio/igbo1988/john/003.mp3 21 3