× Asụsụ Europe Russian Belarusian Asụsụ Ukraine Asụsụ Polish Serbian Bulgaria Asụsụ Slovakian Czech Asụsụ Romania Moldovian Azebaịjan Armenia Onye Georgia Albania Avar Bashkir Tatar Chechen Asụsụ Slovenian Asụsụ Croatian Estonia Asụsụ Latvian Asụsụ Lithuania Asụsụ Hungary Asụsụ Finish Asụsụ Norway Asụsụ Sweden Asụsụ Iceland Grik Masedonia German Bavaria Asụsụ Dutch Asụsụ Danish Welsh Gaelic Asụsụ Aịrish French Basque Catalan .Talian Galacian Romani Bosnian North America Bekee South America Asụsụ Spanish Asụsụ Portuguese Guarani Asụsụ Quechuan Aymara Central America Onye Jamaica Asụsụ Nawatụl Kiche Qeqchi Asụsụ Haiti Ebe Ọwụwa Anyanwụ Eshia Chinese nke Ndị Japan Korean Mongolian Uyghur Hmong South East Asia Onye Malaysia Burmese Chin Asụsụ Nepali Cebuano Asụsụ Tagle Kambodia Thai Indoneshian Vietnam Asụsụ Javanese Lao Iban Iu Mien Kachin Lahu Aceh Balinese Bugis Pampanga Sasak Shan Waray South Asia Hindi Dia Awadhi Mizo Kannada Malayalam Marathi Gujarati Asụsụ Tamil Telugu Asụsụ Punjabi Kurukh Asụsụ Assam Maithili Asụsụ Bengali Asụsụ Urdu Sinhala Dogri Haryanvi Meitei Konkani Santalaị Sindhi Koya Thado Sanskrit Devanagari Adilabad Gondi Ahirani Balochi Bundeli Chhattisgarhi Garhwali Kangri Kumaoni Mewari Munda Sadri Seraiki Shekhawati Sylheti Etiti Asia Kyrgyz Asụsụ Uzbek Tajik Ndị Turkmen Kazakhstan Karakalpak Etiti ọwụwa anyanwụ Turkish Hibru Arabic Peshia Kurdi Pashto Coptic Africa Afrịka Xhosa Asụsụ Ndebele Akpan Asụsụ Amharik Wolaytta Onye Naijiria Mossi Ika Dinka Kabyle Ewe Asụsụ Swahili Morocco Asụsụ Somali Shona Madagaska Igbo Lingala Baoule Siswati Tsonga Tswana Onye Gambian Ndi Yoruba Kamba Kinyarwanda Hausa Chewa Luo Makua Dyula Fulfulde Kalenjin Kikọyu Kikwango Kirundi Krio Nigerian Pidgin Oromo Tshiluba Tshivenda Twi Umbundu Lugbara Luguru Pular Gussi Maasai Turkana Moba Nuer Shilluk Tamasheq Makonde Bemba Fon Hadiyya Ibibio Kimbundu Kimiiru Lango Liberian Kreyol Lomwe Mende Morisyen Ndau Nyankole Sena Sidamo Soga Songe Sukuma Tarifit Teso Tiv Zande Kọntinent Australia New Zealand Papua New Guinea Asụsụ Ochie Asụsụ Arameik Latin Esperanto 1 1 1 1988 Nsọ nʼIgbo 2020Bible Nso 200619881 1 1 JỌN MATIUMAKLUKJỌNỌLU OZIROM1 KỌRINT2 KỌRINTGALETIAEFESỌSFILIPAIKỌLỌSI1 TESALỌNAIKA2 TESALỌNAIKA1 TIMỌTI2 TIMỌTITAITỌSFAILIMONHIBRUJEMES1 PITA2 PITA1 JỌN2 JỌN3 JỌNJUDNKPUGHE1 1 1 8 1234567891011121314151617181920211 1 1 : 32 12345678910111213141516171819202122232425262728293031323334353637383940414243444546474849505152535455565758591 1 1 Igbo Bible 1988 JỌN 8 Chekwaa ihe edeturu 1Jisọs lọghachiri azụ nꞌugwu ahụ a na-akpọ Olivet.2Nꞌechi ya, nꞌisi ụtụtụ, ọ banyere nꞌụlọ nsọ ukwu Chineke. Mgbe na-adịghị anya, ndị na-eso ụzọ ya na ọtụtụ igwe mmadụ bịakwutere ya, gbaa ya gburugburu. O guzoro nꞌetiti ha malite izi ha ihe.3Mgbe ọ nọ na-ekwu okwu, ndị isi ndị Juu na ndị Farisii bịakwutere ya. Lee! ha dọkpụ otu nwanyị onye ha jidere mgbe ọ nọ na-akwa iko. Ha mere ka nwanyị ahụ guzo nꞌetiti igwe mmadụ ahụ nile.4Mgbe ahụ ha jụrụ Jisọs ajụjụ sị ya, “Onye ozizi, lee, anyị jidere nwanyị a nꞌime ịkwa iko, ọ bụladị mgbe ya na nwoke dina!5Iwu Mosisi nyere anyị kwuru na onye mere ihe dị otu a kwesịrị ka anyị jiri nkume tụgbuọ ya. Gịnị ka i nwere ikwu banyere nke a?”6Ha kwuru okwu ndị a ile ma ha gaesite nꞌọsịsa Jisọs ga-enye ha boo ya ebubo ịkwagide mmebi iwu. Ha gere ntị ka ha nụrụ ihe Jisọs ga-ekwu. Ma ebe ọ bụ na Jisọs matara echiche obi ha, ọ gwaghị ha ihe ọ bụla. Kama o huuru ala were mkpịsị aka ya dee ihe nꞌala.7Mgbe ha nọgidere na-esogbu ya ka okwu si ya nꞌọnụ pụta, Jisọs lelitere anya ya elu gwa ha sị, “Unu nwere ike tụọ nwanyị a nkume ugbu a. Ma achọrọ m ka onye ga-ebu ụzọ tụọ ya nkume bụrụ onye nke na-emebeghị mmehie nꞌoge ọ bụla.”8Jisọs hurukwara ala ọzọ malitekwa ide ihe ọ na-ede nꞌala.9Mgbe ndị ahụ kpụtara nwanyị ahụ nụrụ ihe Jisọs kwuru, ha nile nꞌotu nꞌotu, malite nꞌonye okenye ha, sitere nꞌebe ahụ pụọ. Nꞌikpeazụ, ọ fọdụrụ nanị Jisọs na nwanyị ahụ.10Mgbe Jisọs guzoro ọtọ lee anya gburugburu, o nweghị onye ọ bụla ọ hụrụ karịa nanị nwanyị ahụ. Jisọs jụrụ nwanyị ahụ ajụjụ sị, “Olee ndị ahụ kpọtara gị nꞌebe a? Ò nweghị onye ọ bụla nꞌime ha mara gị ikpe?”11Nwanyị ahụ zaghachiri ya sị, “O nweghị onye ọ bụla nꞌime ha mara m ikpe, Onyenwe m.” Jisọs sịrị ya, “Mụ onwe m amakwaghị gị ikpe. Laa nꞌụlọ gị, kama emehiekwala ọzọ.”12Mgbe ihe ndị a gasịrị, Jisọs gwara igwe mmadụ ahụ okwu sị, “Mụ onwe m bụ onye na-enye ndị bi nꞌụwa ìhè. Onye ọ bụla sooro m agaghị ejegharị nꞌime ọchịchịrị, kama ìhè ahụ ga-anọnyere ya ruo mgbe ebighị ebi.”13Ndị Farisii nọ nꞌebe ahụ zaghachiri ya sị, “Ị na-agbara onwe gị ama! Ya mere ama ị na-agbara onwe gị erijughị afọ.”14Ma Jisọs gwara ha sị, “Ọ bụ eziokwu na m na-agbara onwe m ama, ma ama m na-agba bụ eziokwu. Amaara m ebe m si bịa, amakwara m ebe m na-aga. Ma unu onwe unu amaghị ihe ndị a nile.15O nweghị ihe ọ bụla unu ma banyere m. Ma unu na-ekpe m ikpe. Otu ọ dị, ikpe ikpe nke m abụghị nꞌoge dị ugbu a.16Mgbe ọ bụla m jikeere ikpe ikpe, aga m ekpe ikpe ziri ezi. Nꞌihi na Nna m, onye zitere m, na-agbara m ama.17Iwu unu kwuru sị, ‘Ama mmadụ abụọ gbara banyere ihe ọ bụla bụ eziokwu.’18Ana m agba ama banyere onwe m. Otu a kwa Nna m, onye zitere m, na-agbakwa ama banyere m.”19Mgbe ahụ ha jụrụ Jisọs sị ya, “Olee ebe Nna gị nọ?” Jisọs zaghachiri ha sị, “Ebe unu na-amaghị onye m bụ, unu apụghị ịmata onye Nna m bụ. Ọ bụrụ na unu matara m unu ga-amatakwa onye Nna m bụ.”20Okwu ndị a nile ka Jisọs kwuru nꞌụlọ nsọ ukwu ha, na mpaghara ụlọ ahụ a na-akpọ Ụlọ Akụ. Ma ọ dịghị onye ọ bụla nwere obi ike ijide ya nꞌihi na oge ọnwụ ya erubeghị.21Mgbe oge ntakịrị gasịrị, Jisọs gwara ha okwu ọzọ sị, “Nꞌoge na-adịghị anya, aga m ahapụ unu, unu gaachọ m ma unu agaghị ahụ m anya. Nꞌihi nke a unu ga-anwụ nꞌime mmehie unu. Ma unu apụghị ịbịa nꞌebe m nọ.”22Ndị Juu ahụ jụrịtara onwe ha ajụjụ sị, “Nwoke a ọ̀ ga-egbu onwe ya? Gịnị ka okwu ndị a ọ na-ekwu pụtara, ‘Unu apụghị ịbịa nꞌebe m na-aga?’ ”23Jisọs sịrị ha, “Unu si nꞌụwa ma esi m nꞌelu bịa. Unu bụkwa ndị ụwa, ma abụkwaghị m nke ụwa. Kama esitere m nꞌeluigwe bịa.24Ọ bụ nꞌihi nke a ka m ji gwa unu na unu ga-anwụ nꞌime mmehie unu. Nꞌihi na ọ bụrụ na unu ekweghị na abụ m Onye nzọpụta ahụ, Ọkpara Chineke, unu ga-anwụ nꞌime mmehie unu.”25Ya mere, ndị Farisii ahụ jụrụ Jisọs ajụjụ sị ya, “Onye ka ị bụ?” Jisọs zara sị ha, “Abụ m onye ahụ m gwara unu na m bụ na mbụ.26Enwere m ọtụtụ ihe m ga-ezi unu, ma matanụ na onye ahụ zitere m bụ onye eziokwu. Nꞌihi nke a ihe nile m nụrụ site nꞌọnụ ya ka m gwara unu.”27Ọ bụ ihe banyere Chineke ka Jisọs na-agwa ha, ma ha aghọtaghị ihe ọ na-ekwu.28Nꞌihi nke a, Jisọs dọrọ ha aka na ntị sị, “Mgbe unu mere ka m nwụọ, unu ga-amata na unu egbuola Onye nzọpụta ahụ, bụ onye Chineke zitere. Unu ga-amatakwa na ihe nile m gwara unu esiteghị nꞌuche m kama ha bụ ihe nile Nna m chọrọ ka m gwa unu.29Chineke onye zitere m naanọnyekwara m mgbe nile. Ọ hapụkwaghị m mgbe ọ bụla. Ọ bụkwa ihe na-atọ ya ụtọ ka m na-eme mgbe nile.”30Mgbe Jisọs kwusịrị okwu ndị a, ọtụtụ ndị nụrụ okwu ya, kweere na ya.31Ya mere, Jisọs chigharịrị gwa ndị ahụ nile kweere na ya sị, “Ọ bụrụ na unu anọgide nꞌihe nile m gwara unu, unu ga-abụ ndị na-eso ụzọ m nꞌeziokwu.32Unu ga-amatakwa eziokwu ahụ. Ọ bụkwa eziokwu ahụ ga-eme ka unu nwere onwe unu.”33Ndị Juu ahụ zara Jisọs sị, “Anyị bụ ụmụ Eberaham, o nwebeghị oge anyị ji bụrụ ohu onye ọ bụla. Olee otu ị ga-esi mee ka anyị nwere onwe anyị?”34Jisọs zara ha sị, “Nꞌezie, asị m unu, onye ọ bụla na-eme mmehie bụ ohu mmehie.35Ohu enwekwaghị onwe ya mgbe ọ bụla ọ nọ nꞌụlọ onyenwe ya. Ma Ọkpara onye nwe ụlọ ahụ nwe onwe ya, nꞌihi na ọ na-anọgide nꞌụlọ ahụ oge nile.36Ya mere, ọ bụrụ na Ọkpara ahụ ga-eme ka unu pụọ nꞌohu, unu agaghị abụkwa ohu ọzọ. Kama unu ga-enwere onwe unu.37Ọ bụ ezie na unu sitere nꞌagbụrụ Eberaham pụta. Ma unu na-achọ ụzọ igbu m. Unu chọkwara ime nke a nꞌihi na okwu m enweghị ọnọdụ nꞌime unu.38Ma ugbu a ana m akọwara unu ihe m hụrụ mgbe mụ na Nna m nọ. Unu onwe unu na-emekwa ihe unu mụtara site nꞌaka nna unu.”39Ha zara Jisọs sị ya, “Eberaham bụ nna anyị.” Jisọs sịrị ha, “Ọ bụrụ na unu bụ ụmụ Eberaham, unu gaara arụ ọrụ Eberaham rụrụ.40Ma unu na-achọ ụzọ igbu m nꞌihi na m gwara unu eziokwu ahụ m nụrụ site nꞌọnụ Nna m. Eberaham, onye unu na-ekwu na ọ bụ nna unu, emesoghị m omume ọjọọ dị otu a.41Kama ọ bụ ọrụ ọjọọ nke nna unu chọrọ ka unu na-arụ.” Ndị isi ndị Juu ahụ zara sị ya, “Anyị abụghị ndị a mụrụ site nꞌịkwa iko. Anyị nwere Chineke dị ka nna anyị.”42Jisọs gwara ha sị, “Ọ bụrụ nꞌezie na Chineke bụ nna unu, unu ga-ahụ m nꞌanya. Nꞌihi na ọ bụ Chineke zitere m. Abịaghị m site nꞌike nke m.43Gịnị mere unu adịghị aghọta ihe m na-agwa unu? Nke a pụtara na ọ dị onye na-eme ka unu hapụ ịghọta ihe ndị a nile m na-akọrọ unu.44Onye na-eme ihe dị otu a bụ nna unu ekwensu. Unu na-aṅụrị ọṅụ nke ukwuu nꞌihi na unu na-eme ihe nile na-atọ ya ụtọ. Ekwensu bụ ogbu mmadụ site na mbụ. Ọ kpọrọ eziokwu asị nꞌihi na eziokwu ọ bụla adịghị nꞌime ya. Ọ na-anyakwa isi mgbe nile, nꞌime ụgha nile, nꞌihi na ọ hụrụ ịgha ụgha nꞌanya. Ọ bụkwa nna nke ndị nile na-agha ụgha.45Unu adịghị ekwere ihe nile m gwara unu nꞌihi na ha bụ eziokwu. Unu apụkwaghị ịghọta eziokwu.46“Onye nꞌime unu nile pụrụ ibo m ebubo mmehie ọ bụla? Ọ bụrụ na unu apụghị ịkwagide na m bụ onye mmehie, gịnị mere unu jiri jụ ikwere nꞌokwu m nile? Ihe nile m na-ekwu bụ eziokwu.47Onye ọ bụla nwere Chineke dị ka nna ya ga-anabata okwu Chineke. Ya mere, unu onwe unu abụghị ụmụ Chineke nꞌihi na unu achọghị ịnụ okwu ya.”48Ndị isi ndị Juu sịrị ya, “Nke a bụ nnọọ ihe anyị kwuru na ị bụ onye obodo ọzọ. Ọ pụtara ìhè ugbu a na mmụọ ọjọọ bi nꞌime gị na-achịkwa gị.”49Jisọs zara sị ha, “Mmụọ ọjọọ ọ bụla adịghị nꞌime m, kama unu amaghị onye m bụ. Ọ bụ Nna m ka m na-enye otuto.50Anaghị m ebuli onwe m elu. Kama ọ bụ ọchịchọ Chineke ka e bulie m elu. Ọ bụkwa Chineke gaekpe ndị nile jụrụ m ikpe nꞌotu nꞌotu.51Nꞌezie, nꞌezie, asị m unu, onye ọ bụla na-edebe okwu m nile agaghị anwụ ọzọ.”52Ndị isi ndị Juu ahụ sịrị, “Ahaa! anyị maara ugbu a na ị bụ onye isi mebiri. Eberaham na ndị amụma nile a maara aha ha nwụrụ kemgbe oge dị anya. Ma gị onwe gị na-asị na onye ọ bụla kweere na gị agaghị anwụ ruo mgbe ebighị ebi.53Ị na-akọwa na ị dị ukwuu karịa nna anyị Eberaham na ndị amụma ndị nwụrụ kemgbe oge dị anya? Gịnị ka ị na-eche na ị bụ?”54Jisọs gwara ha sị, “Ọ bụrụ na m naanya isi banyere onwe m, nke a abaghị uru. Kama Nna m onye unu na-asị na ọ bụ nna unu, bụ onye na-ebuli m elu.55Unu amakwaghị onye Chineke bụ. Amaara m ya nke ọma. Aga m abụ onye ụgha ma ọ bụrụ na m gaasị na amaghị m onye ọ bụ. Amaara m ya, na-edebekwa okwu ya nile.56Nna unu Eberaham ṅụrịrị ọṅụ nke ukwuu ma chọsiekwa ike ịhụ ụbọchị ndị a anya. Ọ ṅụrịrị ọṅụ nꞌihi na ọ matara na mụ onwe m ga-abụ Onye nzọpụta ahụ.”57Mgbe ahụ ndị isi ndị Juu ahụ nile sịrị ya, “Ị gbabeghị iri afọ ise, ị si aṅaa hụ Eberaham anya?”58Ma Jisọs zara sị ha, “Eziokwu ahụ bụ nke a, mụ onwe m na-adịrị ndụ tupuu amụọ Eberaham!”59Ndị isi ndị Juu ahụ nile were iwe nke ukwuu mgbe ha nụrụ ihe Jisọs kwuru. Ha nile tụtụlitere nkume ịtụ ya. Ma site nꞌụzọ ihe ịrịba ama dị iche, Jisọs zoro onwe ya site nꞌihu ha pụọ. O sitere nꞌụlọ nsọ ukwu ahụ pụọ.Igbo Bible 1988 No Data Igbo Bible 1988 JỌN 8 00:00:00 00:00:00 0.5x 2.0x https://beblia.bible:81/BibleAudio/igbo1988/john/008.mp3 21 8