× Asụsụ Europe Russian Belarusian Asụsụ Ukraine Asụsụ Polish Serbian Bulgaria Asụsụ Slovakian Czech Asụsụ Romania Moldovian Azebaịjan Armenia Onye Georgia Albania Avar Bashkir Tatar Chechen Asụsụ Slovenian Asụsụ Croatian Estonia Asụsụ Latvian Asụsụ Lithuania Asụsụ Hungary Asụsụ Finish Asụsụ Norway Asụsụ Sweden Asụsụ Iceland Grik Masedonia German Bavaria Asụsụ Dutch Asụsụ Danish Welsh Gaelic Asụsụ Aịrish French Basque Catalan .Talian Galacian Romani Bosnian Kabardian North America Bekee South America Asụsụ Spanish Asụsụ Portuguese Guarani Asụsụ Quechuan Aymara Central America Onye Jamaica Asụsụ Nawatụl Kiche Qeqchi Asụsụ Haiti Ebe Ọwụwa Anyanwụ Eshia Chinese nke Ndị Japan Korean Mongolian Uyghur Hmong Tibetian South East Asia Onye Malaysia Burmese Chin Asụsụ Nepali Cebuano Asụsụ Tagle Kambodia Thai Indoneshian Asụsụ Sundan Vietnam Asụsụ Javanese Lao Iban Iu Mien Kachin Lahu Aceh Balinese Bugis Pampanga Sasak Shan Waray Madurese South Asia Hindi Dia Awadhi Mizo Kannada Malayalam Marathi Gujarati Asụsụ Tamil Telugu Asụsụ Punjabi Kurukh Asụsụ Assam Maithili Asụsụ Bengali Asụsụ Urdu Sinhala Dogri Haryanvi Meitei Konkani Santalaị Sindhi Koya Thado Sanskrit Devanagari Adilabad Gondi Ahirani Balochi Bundeli Chhattisgarhi Garhwali Kangri Kumaoni Mewari Munda Sadri Seraiki Shekhawati Sylheti Bagri Bhilali Bodo Braj Tulu Etiti Asia Kyrgyz Asụsụ Uzbek Tajik Ndị Turkmen Kazakhstan Karakalpak Etiti ọwụwa anyanwụ Turkish Hibru Arabic Peshia Kurdi Mazanderani Pashto Coptic Africa Afrịka Xhosa Asụsụ Ndebele Akpan Asụsụ Amharik Wolaytta Onye Naijiria Mossi Ika Dinka Kabyle Ewe Asụsụ Swahili Morocco Asụsụ Somali Shona Madagaska Igbo Lingala Baoule Siswati Tsonga Tswana Onye Gambian Ndi Yoruba Kamba Kinyarwanda Hausa Chewa Luo Makua Dyula Fulfulde Kalenjin Kikọyu Kikwango Kirundi Krio Nigerian Pidgin Oromo Tshiluba Tshivenda Twi Umbundu Lugbara Luguru Pular Gussi Maasai Turkana Moba Nuer Shilluk Tamasheq Makonde Bemba Fon Hadiyya Ibibio Kimbundu Kimiiru Lango Liberian Kreyol Lomwe Mende Morisyen Ndau Nyankole Sena Sidamo Soga Songe Sukuma Tarifit Teso Tiv Zande Dagbani Edo Kituba Kọntinent Australia New Zealand Papua New Guinea Asụsụ Ochie Asụsụ Arameik Latin Esperanto 1 1 1 Igbo 1988 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo 2020Bible Nso 2006Igbo 19881 1 1 ỌLU OZI MATIUMAKLUKJỌNỌLU OZIROM1 KỌRINT2 KỌRINTGALETIAEFESỌSFILIPAIKỌLỌSI1 TESALỌNAIKA2 TESALỌNAIKA1 TIMỌTI2 TIMỌTITAITỌSFAILIMONHIBRUJEMES1 PITA2 PITA1 JỌN2 JỌN3 JỌNJUDNKPUGHE1 1 1 1 123456789101112131415161718192021222324252627281 1 1 : 1 1234567891011121314151617181920212223241 1 1 Igbo Bible 1988 ỌLU OZI 1 Chekwaa ihe edeturu 1Ezi enyi m Teofilọs, nꞌakwụkwọ mbụ m deere gị, agwara m gị ihe banyere Jisọs Kraịst. Agwara m gị ihe banyere ndụ ya, ọrụ ọ rụrụ, na ihe o ziri.2Agwakwara m gị otu o siri laghachi nꞌeluigwe mgbe o nyesịrị ndị na-eso ụzọ ya ndụmọdụ site nꞌike Mmụọ Nsọ. Ndị ahụ bụ ndị na-eso ụzọ ya ọ họpụtara.3O gosiri ha onwe ya mgbe o si nꞌọnwụ bilie. Ihe ruru iri ụbọchị anọ site na mgbe a kpọgburu ya, ha hụrụ ya na ndụ site nꞌoge ruo nꞌoge. Nꞌụzọ doro anya, o gosiri ha na ọ bụ ya onwe ya ka ha na-ahụ. Nꞌoge a ọ gwara ha okwu banyere alaeze Chineke.4Nꞌoge ọ nọnyeere ha o nyere ha iwu ka ha hapụ isite na Jerusalem pụọ. Ọ sịrị ha, “Nọgidenụ na Jerusalem tutuu ruo mgbe unu sị nꞌaka Nna m nata onyinye ahụ o kwere na nkwa dị ka m gwara unu.”5Jisọs gwakwara ha sị, “Ọ bụ ezie na Jọn ji mmiri mee unu baptizim, ma tupuu abali ole na ole agafee, a ga-eji Mmụọ Nsọ mee unu baptizim.”6Oge ọzọ ya na ndị na-eso ụzọ ya nọkọrọ, ha jụrụ ya ajụjụ sị, “Onyenwe anyị, o ruola oge ị ga-eme ka Izirel nọdụrụ onwe ha dị ka alaeze nwere onwe ya?”7Ma Jisọs zara sị ha, “Ọ bụghị ọrụ unu ịmata ihe Nna m na-ezube ime, na mgbe ọ na-akwado ime ihe o zubere ime.8Ma mgbe Mmụọ Nsọ bịakwasịrị unu, unu ga-anata ike. Mgbe ahụ unu ga-agwa ndị mmadụ nọ na Jerusalem, na Judia, na Sameria, na mmadụ nile nọ na nsọtụ ụwa nile, ihe banyere m.”9Ọ dịghị anya, mgbe o kwusịrị okwu ndị a, mgbe ha nọ na-ele ya anya, e weliri ya elu, igwe ojii kpuchiri ya, mee ka ha ghara ịhụkwa ya anya ọzọ.10Mgbe ha na-elegide anya ha nꞌelu na-ele ya anya ka ọ na-arịgo, na mberede, ha hụrụ mmadụ abụọ yi uwe ọcha ka ha guzoro nꞌakụkụ ha.11Mmadụ abụọ ndị a jụrụ ha sị, “Ndị Galili, gịnị mere unu ji guzo nꞌebe a na-ele anya nꞌeluigwe? Jisọs alaala nꞌeluigwe. Otu ụbọchị unu ga-ahụkwa ya anya ọzọ, ka ọ na-alọta dị ka unu hụrụ ya taa, ka ọ na-ala nꞌeluigwe!”12Ha nọ nꞌugwu olivu mgbe ihe ndị a na-eme. Emesịa, ha sitere nꞌebe ahụ laghachikwa na Jerusalem. Ugwu olivu adịghị anya site na Jerusalem. Ọ bụ ihe dị ka kilomita abụọ site nꞌebe ahụ.13Mgbe ha lọghachiri Jerusalem, ha rigooro nꞌelu ụlọ ahụ ha nọ nꞌime ya. Ndị a bụ ndị nọ nꞌụlọ ahụ: Pita, na Jọn, na Jemes, na Anduru, na Filip, na Tọmọs, na Batalomi, na Matiu, na Jemes nwa Alfiọs, na Saịmọn onye aha ya bụkwa Zilọt, na Judas nwa Jemes.14Ha nile jikọtara onwe ha ọnụ na-ekpe ekpere site nꞌoge ruo nꞌoge. Ndị sonyere ha bụ ụfọdụ ndị inyom na Meri nne Jisọs, na ụmụnna Jisọs.15Ọ bụ nꞌoge a, mgbe ihe dị ka narị ndị kwere ekwe na iri abụọ zukọtara ka Pita biliri ọtọ nꞌetiti ha gwa ha okwu sị,16“Ụmụnna m, ọ dị mkpa ka ihe e dere nꞌakwụkwọ nsọ mezuo banyere Judas onye duuru ndị jidere Jisọs bịa. Mmụọ Nsọ kwuru na nke a ga-eme mgbe o sitere nꞌọnụ Devidi kwuo okwu nꞌoge gara aga.17Judas bụ otu nꞌime anyị. O nwere òke nꞌime ọrụ a, nꞌihi na a họpụtara ya dị ka e si họpụta anyị.18Ma ego ọ natara nꞌihi ọrụ ọjọọ ya ka o ji zụọ ala. Nꞌime ala ahụ ka ọ nọkwa daa ada, afọ ya etipuo, eriri afọ ya awụsịakwa.19Ndị nile bi na Jerusalem nụrụ akụkọ banyere ya. Nꞌihi ya ha kpọrọ ala ahụ Judas zụrụ Ala Ọbara.20E dere ya nꞌakwụkwọ Abụ Ọma sị, ‘Ka ebe obibi ya tọgbọrọ nꞌefu. Ka mmadụ ọ bụla hapụ ibi nꞌime ya. Ka onye ọzọ narakwa ọrụ ya.’21“Nꞌihi ya, anyị ga-ahọpụta onye ọzọ nꞌọnọdụ ya. Ka ọ bụrụ otu nꞌime anyị. Ka o soro anyị gbakọọ ama banyere mbilite nꞌọnwụ Jisọs. Ka anyị site nꞌetiti anyị họpụta onye naara eso anyị na-ejegharị site na mbụ, site nꞌoge Jọn mere baptizim ya tutuu ruo nꞌụbọchị ahụ Jisọs laghachiri nꞌeluigwe.”22Ụmụnna ahụ họpụtara mmadụ abụọ, Matayas na Josef Jọstus. Aha ọzọ a na-akpọ Josef Jọstus bụ Basabas.23Ha kpere ekpere rịọ Chineke ka o gosi ha onye ha ga-ahọrọ nꞌime mmadụ abụọ ahụ. Otu a ka ha si kpee ekpere ahụ: “Onyenwe anyị, ị maara obi mmadụ nile. Gosi anyị onye ị họpụtara nꞌime mmadụ abụọ ndị a ka ọ bụrụ onyeozi ga-anọchi anya Judas Iskariọt, onye gara ebe o kwesịrị ka ọ gaa.”24Mgbe ha kpesịrị ekpere, ha fere nza. Nza ahụ makwara Matayas. Ọ bụ ya ka ha họpụtara, gụnye ya ka ọ bụrụ otu nꞌime ndị ozi iri na abụọ ahụ.Igbo Bible 1988 No Data Igbo Bible 1988 ỌLU OZI 1 00:00:00 00:00:00 0.5x 2.0x https://beblia.bible:81/BibleAudio/igbo1988/acts/001.mp3 28 1