× Asụsụ Europe Russian Belarusian Asụsụ Ukraine Asụsụ Polish Serbian Bulgaria Asụsụ Slovakian Czech Asụsụ Romania Moldovian Azebaịjan Armenia Onye Georgia Albania Avar Bashkir Tatar Chechen Asụsụ Slovenian Asụsụ Croatian Estonia Asụsụ Latvian Asụsụ Lithuania Asụsụ Hungary Asụsụ Finish Asụsụ Norway Asụsụ Sweden Asụsụ Iceland Grik Masedonia German Bavaria Asụsụ Dutch Asụsụ Danish Welsh Gaelic Asụsụ Aịrish French Basque Catalan .Talian Galacian Romani Bosnian North America Bekee South America Asụsụ Spanish Asụsụ Portuguese Guarani Asụsụ Quechuan Aymara Central America Onye Jamaica Asụsụ Nawatụl Kiche Qeqchi Asụsụ Haiti Ebe Ọwụwa Anyanwụ Eshia Chinese nke Ndị Japan Korean Mongolian Uyghur Hmong South East Asia Onye Malaysia Burmese Chin Asụsụ Nepali Cebuano Asụsụ Tagle Kambodia Thai Indoneshian Vietnam Asụsụ Javanese Lao Iban Iu Mien Kachin Lahu Aceh Balinese Bugis Pampanga Sasak Shan Waray South Asia Hindi Dia Awadhi Mizo Kannada Malayalam Marathi Gujarati Asụsụ Tamil Telugu Asụsụ Punjabi Kurukh Asụsụ Assam Maithili Asụsụ Bengali Asụsụ Urdu Sinhala Dogri Haryanvi Meitei Konkani Santalaị Sindhi Koya Thado Sanskrit Devanagari Adilabad Gondi Ahirani Balochi Bundeli Chhattisgarhi Garhwali Kangri Kumaoni Mewari Munda Sadri Seraiki Shekhawati Sylheti Etiti Asia Kyrgyz Asụsụ Uzbek Tajik Ndị Turkmen Kazakhstan Karakalpak Etiti ọwụwa anyanwụ Turkish Hibru Arabic Peshia Kurdi Pashto Coptic Africa Afrịka Xhosa Asụsụ Ndebele Akpan Asụsụ Amharik Wolaytta Onye Naijiria Mossi Ika Dinka Kabyle Ewe Asụsụ Swahili Morocco Asụsụ Somali Shona Madagaska Igbo Lingala Baoule Siswati Tsonga Tswana Onye Gambian Ndi Yoruba Kamba Kinyarwanda Hausa Chewa Luo Makua Dyula Fulfulde Kalenjin Kikọyu Kikwango Kirundi Krio Nigerian Pidgin Oromo Tshiluba Tshivenda Twi Umbundu Lugbara Luguru Pular Gussi Maasai Turkana Moba Nuer Shilluk Tamasheq Makonde Bemba Fon Hadiyya Ibibio Kimbundu Kimiiru Lango Liberian Kreyol Lomwe Mende Morisyen Ndau Nyankole Sena Sidamo Soga Songe Sukuma Tarifit Teso Tiv Zande Kọntinent Australia New Zealand Papua New Guinea Asụsụ Ochie Asụsụ Arameik Latin Esperanto 1 1 1 1988 Nsọ nʼIgbo 2020Bible Nso 200619881 1 1 ROM MATIUMAKLUKJỌNỌLU OZIROM1 KỌRINT2 KỌRINTGALETIAEFESỌSFILIPAIKỌLỌSI1 TESALỌNAIKA2 TESALỌNAIKA1 TIMỌTI2 TIMỌTITAITỌSFAILIMONHIBRUJEMES1 PITA2 PITA1 JỌN2 JỌN3 JỌNJUDNKPUGHE1 1 1 1 123456789101112131415161 1 1 : 16 12345678910111213141516171819202122232425262728293031321 1 1 Igbo Bible 1988 ROM 1 Chekwaa ihe edeturu 1Ndị enyi m nọ na Rom, akwụkwọ ozi a si nꞌaka mụ onwe m Pọl, odibo Jisọs Kraịst onye Chineke kpọrọ ka ọ bụrụ onye na-ekwu ọnụ Kraịst, na onye e zipụkwara ịgbasa ozi ọma Kraịst.2Ozi ọma a bụ nke ahụ Chineke kwere na nkwa nꞌoge gara aga site nꞌọnụ ndị amụma ya. Ọ bụkwa ozi ọma e dekwara ihe banyere ya nꞌakwụkwọ nsọ.3Ozi ọma a metụtara Onyenwe anyị Jisọs Kraịst Ọkpara Chineke, onye bụ nwa nwa Devidi site nꞌọmụmụ nke anụ ahụ.4Chineke gosiri na Jisọs bụ Ọkpara ya, onye ike nile dị nꞌaka ya, na onye nwekwara Mmụọ nke dị nsọ, mgbe o mere ka o si nꞌọnwụ bilie.5Ugbu a, ọ bụ site na Kraịst ka Chineke ji họpụta anyị ịbụ ndị ga-ejegharị ebe nile ịgwa ndị nọ ebe nile ihe Chineke meere ha, na ime ka ha kwerekwa na Chineke, kpebiekwa irubere ya isi.6Unu sokwa nꞌime ndị ahụ Chineke kpọrọ ka unu bụrụ ndị nke Jisọs Kraịst.7Nꞌihi ya, ana m edere unu nile bi na Rom akwụkwọ a, unu ndị Chineke hụrụ nꞌanya, ndị a kpọkwara ka ha dị nsọ. Ekpere m bụ ka Chineke nna anyị na Onyenwe anyị Jisọs Kraịst, nye unu amara ya na udo ya.8Aghaghị m imalite site nꞌikele Chineke ekele nꞌihi unu, site nꞌaha Jisọs Kraịst. Nke a bụ nꞌihi na ụwa nile anụla ihe gbasara okwukwe unu, nꞌihi na ebe ọ bụla m gara ana m anụ ka a na-ekwu okwu banyere okwukwe unu nwere na Chineke.9Chineke nꞌonwe ya, onye m na-ejere ozi, site nꞌikwusa ozi ọma nke Ọkpara ya, ga-agbara m akaebe na m na-echeta unu mgbe nile nꞌekpere m ehihie na abalị.10Mgbe ọ bụla m na-ekpe ekpere, ana m arịọ ka ọ bụrụ ihe ga-ekwe mee na site nꞌike Chineke, aga m enwe ohere ịbịa leta unu.11Ọ na-agụ m agụụ nke ukwuu ịbịa hụ unu anya, nꞌihi na achọrọ m ka unu keta oke nꞌonyinye Mmụọ Nsọ nke Chineke nyere m, nke ga-enyere unu aka iguzsi ike nꞌokwukwe.12Ọ bụkwaghị nanị nke a, kama achọrọ m ka anyị gbarịtaa onwe anyị ume. Unu gbaa m ume, mụ onwe m agbaa unu ume. Site nꞌụzọ dị otu a anyị ga-abụ ngọzi nye onwe anyị.13Ụmụnna m, achọrọ ime ka unu mata na atụọla m ịbịa leta unu ọtụtụ mgbe ma tutuu ruo ugbu a enwebeghị ike ịbịa. Ezubere m ịbịa ime ka unu mata Kraịst dị ka m mere nꞌetiti ndị mba ọzọ ndị na-abụghị ndị Juu.14Nꞌihi na ọrụ m na-aghaghị ịrụ bụ ikwusa ozi ọma nye mmadụ nile, ikwusa ozi ọma nye ndị Griik na ndị na-abụghị ndị Griik, nyekwa ndị maara ihe na ndị nzuzu.15Nꞌihi ya, dị ka ike Chineke nyere m ha, ejikekwara m ịbịa ikwusa ozi ọma Jisọs Kraịst nye unu nile bi na Rom.16Nꞌihi na ihere ikwusa ozi ọma Kraịst adịghị eme m. Nꞌihi na amaara m na ọ bụ ụzọ dị ike nke Chineke kwadooro isite ịzọpụta onye ọ bụla kweere na ya. E buru ụzọ kwusaara ndị Juu ozi ọma a, ugbu a a na-akwusara ya ndị mba ọzọ.17Ọ bụ ozi ọma nke naakọrọ anyị na Chineke edoziela ụzọ anyị ga-esi dị ọcha nꞌihu ya site nꞌokwukwe na ntụkwasị obi anyị nwere na Kraịst. Ozi ọma a na-agwakwa anyị na anyị pụrụ inweta ihe ndị a nile nanị site nꞌokwukwe. Nꞌihi na e deela ya rị nꞌakwụkwọ nsọ sị, “Ọ bụ nanị site nꞌokwukwe ka onye ezi omume ga-esi dị ndụ.”18Nꞌihi na e sitela nꞌeluigwe mee ka iwe Chineke pụta ìhè megide mmehie na ajọ omumue nile nke ndị na-emebi iwu, ndị na-esite nꞌajọ omume ha na-eguzogide eziokwu ahụ.19Nꞌihi na ndị a maara ihe ha kwesịrị ịmata banyere Chineke. Ha maara ya nꞌihi na Chineke nꞌonwe ya emeela ka o doo ha anya, site nꞌitinye ụdị amamihe a nꞌime ha.20Site nꞌoge Chineke kere ụwa na ihe nile dị nꞌime ya, ụmụ mmadụ ahụla ụwa na eluigwe, na ihe nile Chineke kere eke. Ha sitekwara nꞌihe ndị a mata ụdị ike ebighị Chineke nwere. Ya mere, ebe ọ bụ na ha maara ihe ndị a nile, ha enwekwaghị ngọpụ ọ bụla nꞌụbọchị ikpe ahụ ha gaeguzo nꞌihu Chineke.21Ọ bụ eziokwu na ha maara na Chineke dị, ma na ndụ ha, ha adịghị ezipụta na ha maara na Chineke dị. Ha anaghị asọpụrụ ya, ha anakwaghị enye Chineke ekele nꞌihi nchebe ọ na-echebe ha. Nanị ihe ha na-eche nꞌobi ha bụ ihe nzuzu, ịtụpụta nꞌuche ha ihe ha chere na Chineke yiri, na ihe ha chere na ọ chọrọ ka ha mee. Ọ bụkwa ụdị echiche dị otu a mere ka obi ha gbaa ọchịchịrị.22Mgbe ha na-eche na ha bụ ndị maara ihe, ha amataghị na ha bụ ndị nzuzu.23Kama ife Chineke na-adịghị anwụ anwụ ofufe, ha weere otuto ha kwesịrị inye ya nye ihe ndị ahụ ha jiri aka ha kpụọ, ihe ndị a yiri mmadụ na-anwụ anwụ, na ụmụ anụmanụ, na ihe na-akpụ akpụ nꞌala.24Nꞌihi na ha gosiri onwe ha dị ka ndị nzuzu, Chineke gbaketara ha azụ, hapụ ha ka ha mee ihe ọjọọ ndị ahụ na-agụ obi ha agụụ, bụ ịhe ọjọọ ndị ahụ ha ji merụọ anụ ahụ ha.25Kama ha ga-ekwere ihe ahụ ha maara na ọ bụ eziokwu Chineke, ha kpebiri ikwere nꞌokwu ụgha. Nꞌihi ya ha gara nꞌihu ife na ịsọ pụrụkwa ihe Chineke kere eke kama ha ga-efe Chineke, Onye kere ha na onye kwesịrị ka e nye otuto mgbe nile ebighị ebi. Amin!26Ọ bụ nke a mere Chineke ji hapụ ha ka ha na-eme ihe ọjọọ ndị ahụ na-agụ obi ha agụụ ime. Nꞌihi ya, ọ bụladị ndị inyom na ndị inyom ibe ha nọgidere na-enwe mmekọrịta nꞌụzọ na-ezighị ezi nye ha.27Ọzọ kwa, ndị ikom ha họrọ ka ha na ndị ikom ibe ha na-enwe ụdị mmekọrịta a. Nꞌụzọ dị otu a ha natakwara ntaramahụhụ kwesịri ha nꞌihi ihe ọjọọ ndị a ha na-eme.28Ya mere, ebe ha kpachapụrụ anya jụ ịmata onye Chineke bụ, Chine nyere ha akọnuche ndị nzuzu, nke mere ka ha na-eme ihe ọjọọ nile nke ajọ echiche obi ha chepụtara.29Ha jupụtara nꞌajọ omume na mmehie nile, anya ukwu, ekworo, obi ọjọọ, igbu mmadụ, esemokwu, aghụghọ, uche ọjọọ, na ntakwu.30Ha bụ ndị kpọrọ Chineke asị, bụrụkwa ndị nkwutọ, ndị nganga, ndị na-anya isi, ndị na-eme ibe ha ihe ihere. Oge nile ihe na-eche uche ya bụ ụzọ ha ga-esi gaa nꞌihu asọpụrụghị ndị mụrụ ha.31Nꞌezie ewu tara akọnuche ha. Ha adịghị emezu nkwa ọ bụla ha kwere. Ihe mmadụ ibe ha adịkwaghị atọ ha ụtọ. Ebe ha bụ ndị kwara obi nꞌazụ ha enweghị obi ebere nꞌebe mmadụ ibe ha nọ.32Ọ bụ eziokwu na ha maara nke ọma na Chineke ga-ekpe ha ikpe nꞌihi ihe ọjọọ ha na-eme, matakwa na Chineke ga-ama ndị nile na-eme ihe dị otu a ikpe ọnwụ, ma ha gara nꞌihu na-eme ihe ndị a, ma na-akwalikwa mmụọ ndị ọzọ ka ha soro na-eme ha.Igbo Bible 1988 No Data Igbo Bible 1988 ROM 1 00:00:00 00:00:00 0.5x 2.0x https://beblia.bible:81/BibleAudio/igbo1988/romans/001.mp3 16 1