× Asụsụ Europe Russian Belarusian Asụsụ Ukraine Asụsụ Polish Serbian Bulgaria Asụsụ Slovakian Czech Asụsụ Romania Moldovian Azebaịjan Armenia Onye Georgia Albania Avar Bashkir Tatar Chechen Asụsụ Slovenian Asụsụ Croatian Estonia Asụsụ Latvian Asụsụ Lithuania Asụsụ Hungary Asụsụ Finish Asụsụ Norway Asụsụ Sweden Asụsụ Iceland Grik Masedonia German Bavaria Asụsụ Dutch Asụsụ Danish Welsh Gaelic Asụsụ Aịrish French Basque Catalan .Talian Galacian Romani Bosnian Kabardian North America Bekee South America Asụsụ Spanish Asụsụ Portuguese Guarani Asụsụ Quechuan Aymara Central America Onye Jamaica Asụsụ Nawatụl Kiche Qeqchi Asụsụ Haiti Ebe Ọwụwa Anyanwụ Eshia Chinese nke Ndị Japan Korean Mongolian Uyghur Hmong Tibetian South East Asia Onye Malaysia Burmese Chin Asụsụ Nepali Cebuano Asụsụ Tagle Kambodia Thai Indoneshian Asụsụ Sundan Vietnam Asụsụ Javanese Lao Iban Iu Mien Kachin Lahu Aceh Balinese Bugis Pampanga Sasak Shan Waray Madurese South Asia Hindi Dia Awadhi Mizo Kannada Malayalam Marathi Gujarati Asụsụ Tamil Telugu Asụsụ Punjabi Kurukh Asụsụ Assam Maithili Asụsụ Bengali Asụsụ Urdu Sinhala Dogri Haryanvi Meitei Konkani Santalaị Sindhi Koya Thado Sanskrit Devanagari Adilabad Gondi Ahirani Balochi Bundeli Chhattisgarhi Garhwali Kangri Kumaoni Mewari Munda Sadri Seraiki Shekhawati Sylheti Bagri Bhilali Bodo Braj Tulu Etiti Asia Kyrgyz Asụsụ Uzbek Tajik Ndị Turkmen Kazakhstan Karakalpak Etiti ọwụwa anyanwụ Turkish Hibru Arabic Peshia Kurdi Mazanderani Pashto Coptic Africa Afrịka Xhosa Asụsụ Ndebele Akpan Asụsụ Amharik Wolaytta Onye Naijiria Mossi Ika Dinka Kabyle Ewe Asụsụ Swahili Morocco Asụsụ Somali Shona Madagaska Igbo Lingala Baoule Siswati Tsonga Tswana Onye Gambian Ndi Yoruba Kamba Kinyarwanda Hausa Chewa Luo Makua Dyula Fulfulde Kalenjin Kikọyu Kikwango Kirundi Krio Nigerian Pidgin Oromo Tshiluba Tshivenda Twi Umbundu Lugbara Luguru Pular Gussi Maasai Turkana Moba Nuer Shilluk Tamasheq Makonde Bemba Fon Hadiyya Ibibio Kimbundu Kimiiru Lango Liberian Kreyol Lomwe Mende Morisyen Ndau Nyankole Sena Sidamo Soga Songe Sukuma Tarifit Teso Tiv Zande Dagbani Edo Kituba Kọntinent Australia New Zealand Papua New Guinea Asụsụ Ochie Asụsụ Arameik Latin Esperanto 1 1 1 Igbo 1988 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo 2020Bible Nso 2006Igbo 19881 1 1 ROM MATIUMAKLUKJỌNỌLU OZIROM1 KỌRINT2 KỌRINTGALETIAEFESỌSFILIPAIKỌLỌSI1 TESALỌNAIKA2 TESALỌNAIKA1 TIMỌTI2 TIMỌTITAITỌSFAILIMONHIBRUJEMES1 PITA2 PITA1 JỌN2 JỌN3 JỌNJUDNKPUGHE1 1 1 2 123456789101112131415161 1 1 : 1 12345678910111213141516171819202122232425262728291 1 1 Igbo Bible 1988 ROM 2 Chekwaa ihe edeturu 1Enyi m nwoke, ọ bụrụ na ị na-edo onwe gị ugbu a dị ka onye ikpe megide ndị ahụ mehiere, achọrọ m ime ka ị mata na o nweghị ụzọ o si kwesị ekwesị ka gị, onye ọ bụla ị bụ, kpee onye ọzọ ikpe. Nꞌihi na mgbe ị mara onye ọzọ ikpe, chetakwa na ọ bụkwa onwe gị ka ị na-ama ikpe, ebe ọ bụ na gị onwe gị na-emekwa otu ụdị mmehie ahụ.2Ma anyị maara na Chineke na-ekpe ndị na-eme ihe ọjọọ dị otu a ikpe nꞌụzọ ziri ezi.3Ya mere, mgbe gị onwe gị nọdụrụ ala na-atụ onye ọzọ aka nꞌihu nꞌihe ndị ahụ ị na-emekwa, i chere na Chineke ga-ekpe ya ikpe hapụ ikpe gị ike? Ka ị na-eche na o nwere ụzọ ị ga-esi gbanarị ikpe ọmụma Chineke?4Ka ị na-eleda obi ebere Chineke, na nnagide ọ na-anagide ndụ ọjọọ gị, na ogologo ntachi obi ya anya? Ị maghị na obi ebere o nwere nꞌebe ị nọ kwesịrị ime ka i site na mmehie gị chegharịa?5Ma ọ naghị emetụ gị nꞌobi ikwere na Chineke, nꞌihi mkpọchị nke obi gị kpọchịrị! Ma ihe ị na-eme bụ nanị ijikere onwe gị nye ụbọchị ahụ Chineke ga-esite nꞌiwe ya kpee gị ikpe dị egwu. Mgbe Chineke ga-ekpughe na ọ bụ onye na-ekpe ikpe ziri ezi.6Nꞌụbọchị ahụ, Chineke ga-akwụghachi onye ọ bụla dị ka ọrụ ya si dị.7Chineke gaenye ndị nile sitere na ntachi obi na ezi ọrụ na-achọ otuto na nsọpụrụ na ndụ ahụ na-adịgide adịgide ndụ ebighị ebi.8Ma ndị nile na-akpa iche, ndị jụkwara iso eziokwu ahụ, ndị na-anọgidekwa na-eme ihe ọjọọ, ka Chineke ga-ata ahụhụ, gosi ha iwe ọkụ na ọnụma ya.9Ee, nsogbu na iru uju gaabịakwasị ha nile, ndị Juu na ndị mba ọzọ, bụ ndị nọgidere na mmehie.10Ma otuto na nsọpụrụ na udo nke si nꞌebe Chineke nọ, ga-abụ nke onye ọ bụla na-eme ihe Chineke na-achọ, ee, onye Juu ọ bụla na ndị mba ọzọ.11Nꞌihi na Chineke anaghị ele mmadụ anya nꞌihu.12Nꞌdị nile mehiere nꞌọnọdụ enweghị iwu ga-ala nꞌiyi na-agbanyeghị ihe iwu kwuru. Ma ndị nile mehiere megide iwu ahụ ha maara ihe banyere ya ka a ma-ama ikpe dị ka iwu si kwuo.13Nꞌihi na ọ bụghị ndị ahụ na-anụ mgbe a na-agụpụta akwụkwọ iwu ka a na-agụ dị ka ndị ezi omume, kama ọ bụ ndị ahụ nile na-eme ihe ha nụrụ iwu kwuru.14Nꞌezie, mgbe ndị mba ọzọ na-enweghị iwu sitere nꞌobi ha mee ihe iwu kwuru, o gosiri na ha bụ inwu nye onwe ha, ọ bụ ezie na ha enweghị iwu ahụ e dere ede.15Nꞌihi na ndụ ha na-egosipụta na e deela ihe ndị ahụ iwu kwuru nꞌobi ha. Akọnuche ha na-egosikwa na nke a bụ eziokwu, ebe ọ bụ na akọnuche ha na-ama ha ikpe mgbe ufọdụ, ma na-etokwa ya mgbe ụfọdụ.16Ya mere, anyị maara na a ga-agụkọ ihe ndị a nile nꞌụbọchị ahụ Chineke ga-ekpe ndụ nzuzo nile ụmụ mmadụ na-ebi ikpe, site na Kraịst Jisọs. Ihe ndị a sokwa nꞌozi ọma nke m na-ekwusa.17Leenụ! gị onye na-akpọ onwe gị onye Juu, onye tụkwasịrị obi gị nꞌiwu ahụ Chineke nyere gị, onye na-anyakwa isi na ị maara Chineke.18Ee, o juru gị afọ na ị maara ihe Chineke na-achọ, ọ jukwara gị afọ na i nwere ike ịkọwa ihe dị iche nꞌetiti ajọ ihe na ihe ziri ezi.19Ụzọ e si eme uche Chineke doro gị nnọọ anya, ruo na i nwere ike iguso ndị na-amaghị ụzọ a otu ha ga-esi bịakwute Chineke. Ị na-agụ onwe gị dị ka ìhè na-edu ndị nọ nꞌọchịchịrị ụzọ.20Ị na-agụkwa onwe gị dị ka onye nkuzi ndị na-amaghị ihe, na onye nkuzi ụmụntakịrị, nꞌihi na ị maara iwu Chineke nke ọma, jupụtakwa nꞌamamihe na eziokwu.21Ma ugbu a, enyi m nwoke, mgbe a nile ị na-ezi ndị mmadụ ihe ị na-ezikwa onwe gị? Ị na-ezi ndị ọzọ na izu ohi bụ ihe ọjọọ, i leziela anya hụ na ị naghị ezu ohi?22Ị na-agwa ndị mmadụ ka ha ghara ịkwa iko, i leziela anya hụ na gị onwe gị adịghị akwa iko? Ị chọghị iji anya hụ ka mmadụ na-ekpere arụsị a kpụrụ akpụ, ma ọ naghị ezukpọ ego dị nꞌụlọ nsọ ukwu Chineke?23Ị na-akpa nganga na ị maara iwu nke ọma, ma lee na mgbe ị na-emebi otu nꞌime iwu ndị a ọ bụ ihe ihere ka ị na-ewetara Chineke.24Ọ bụghị ihe iju anya na e deela ya nꞌakwụkwọ nsọ sị, “Ndị mba ọzọ na-ekwulu aha Chineke nꞌihi unu ndị Juu.”25Uru ọ bara na mmadụ bụ onye Juu bụ na onye ahụ na-edebe iwu Chineke. Nꞌihi na ọ bụrụ na unu emebie iwu ya o nweghị ihe dị iche nꞌetiti unu na ndị na-amaghị Chineke.26Nꞌihi na ọ bụrụ na ndị mba ọzọ edebe iwu Chineke, Chineke ga-agụ ha dị ka ndị Juu.27Ọ bụ ezie na unu ndị Juu nwere iwu e dere nꞌakwụkwọ, ma ndị ahụ na-abụghị ndị Juu, ndị na-eme ihe iwu na-achọ ga-ama unu ikpe. Ha ga-ama unu ikpe nꞌihi na unu anaghị eme ihe iwu na-achọ.28Mmadụ abụghị onye Juu site nanị nꞌọmụmụ a mụrụ ya nꞌezinụlọ ndị Juu, ma ọ bụ nꞌihi na e biri onye ahụ ugwu nꞌusoro omenala ndị Juu.29É, è, onye bụ onye Juu nꞌezie bụ onye ahụ bụ onye Juu nꞌime mmụọ ya, onye e biri obi ya ugwu. Obibi ugwu a bụkwa ọrụ Mmụọ Chineke ọ bụghị ọrụ nke iwu e dere ede na-arụ. Otuto onye dị otu a na-enweta na-esitekwa nꞌebe Chineke nọ bịa, ọ bụghị site nꞌaka mmadụ.Igbo Bible 1988 No Data Igbo Bible 1988 ROM 2 00:00:00 00:00:00 0.5x 2.0x https://beblia.bible:81/BibleAudio/igbo1988/romans/002.mp3 16 2