× Asụsụ Europe Russian Belarusian Asụsụ Ukraine Asụsụ Polish Serbian Bulgaria Asụsụ Slovakian Czech Asụsụ Romania Moldovian Azebaịjan Armenia Onye Georgia Albania Avar Bashkir Tatar Chechen Asụsụ Slovenian Asụsụ Croatian Estonia Asụsụ Latvian Asụsụ Lithuania Asụsụ Hungary Asụsụ Finish Asụsụ Norway Asụsụ Sweden Asụsụ Iceland Grik Masedonia German Bavaria Asụsụ Dutch Asụsụ Danish Welsh Gaelic Asụsụ Aịrish French Basque Catalan .Talian Galacian Romani Bosnian North America Bekee South America Asụsụ Spanish Asụsụ Portuguese Guarani Asụsụ Quechuan Aymara Central America Onye Jamaica Asụsụ Nawatụl Kiche Qeqchi Asụsụ Haiti Ebe Ọwụwa Anyanwụ Eshia Chinese nke Ndị Japan Korean Mongolian Uyghur Hmong South East Asia Onye Malaysia Burmese Chin Asụsụ Nepali Cebuano Asụsụ Tagle Kambodia Thai Indoneshian Vietnam Asụsụ Javanese Lao Iban Iu Mien Kachin Lahu Aceh Balinese Bugis Pampanga Sasak Shan Waray South Asia Hindi Dia Awadhi Mizo Kannada Malayalam Marathi Gujarati Asụsụ Tamil Telugu Asụsụ Punjabi Kurukh Asụsụ Assam Maithili Asụsụ Bengali Asụsụ Urdu Sinhala Dogri Haryanvi Meitei Konkani Santalaị Sindhi Koya Thado Sanskrit Devanagari Adilabad Gondi Ahirani Balochi Bundeli Chhattisgarhi Garhwali Kangri Kumaoni Mewari Munda Sadri Seraiki Shekhawati Sylheti Etiti Asia Kyrgyz Asụsụ Uzbek Tajik Ndị Turkmen Kazakhstan Karakalpak Etiti ọwụwa anyanwụ Turkish Hibru Arabic Peshia Kurdi Pashto Coptic Africa Afrịka Xhosa Asụsụ Ndebele Akpan Asụsụ Amharik Wolaytta Onye Naijiria Mossi Ika Dinka Kabyle Ewe Asụsụ Swahili Morocco Asụsụ Somali Shona Madagaska Igbo Lingala Baoule Siswati Tsonga Tswana Onye Gambian Ndi Yoruba Kamba Kinyarwanda Hausa Chewa Luo Makua Dyula Fulfulde Kalenjin Kikọyu Kikwango Kirundi Krio Nigerian Pidgin Oromo Tshiluba Tshivenda Twi Umbundu Lugbara Luguru Pular Gussi Maasai Turkana Moba Nuer Shilluk Tamasheq Makonde Bemba Fon Hadiyya Ibibio Kimbundu Kimiiru Lango Liberian Kreyol Lomwe Mende Morisyen Ndau Nyankole Sena Sidamo Soga Songe Sukuma Tarifit Teso Tiv Zande Kọntinent Australia New Zealand Papua New Guinea Asụsụ Ochie Asụsụ Arameik Latin Esperanto 1 1 1 1988 Nsọ nʼIgbo 2020Bible Nso 200619881 1 1 ROM MATIUMAKLUKJỌNỌLU OZIROM1 KỌRINT2 KỌRINTGALETIAEFESỌSFILIPAIKỌLỌSI1 TESALỌNAIKA2 TESALỌNAIKA1 TIMỌTI2 TIMỌTITAITỌSFAILIMONHIBRUJEMES1 PITA2 PITA1 JỌN2 JỌN3 JỌNJUDNKPUGHE1 1 1 3 123456789101112131415161 1 1 : 23 123456789101112131415161718192021222324252627282930311 1 1 Igbo Bible 1988 ROM 3 Chekwaa ihe edeturu 1Ọ̀ dị uru pụrụ iche mmadụ nwere nꞌihi na ọ bụ onye Juu? Gịnị bụkwa uru ahụ dị ukwuu nke ndị e biri ugwu nꞌusoro omenala ndị Juu nwere?2Ọ bara uru nꞌụzọ nile na mmadụ bụ onye Juu. Nke mbụ, ọ bụ ndị Juu ka e weere okwu Chineke nyefee nꞌaka.3Ọ bụ ezie na ụfọdụ ndị Juu ekwesịghị ntụkwasị obi, ma ekwesịghị ntụkwasị obi ha ọ̀ pụrụ ime ka Chineke ghara imezu nkwa o kwere ndị ahụ hụrụ ya nꞌanya?4Tụfịakwa! Chineke ekwela! Ọ bụrụdị na mmadụ nile nọ nꞌụwa aghọọ ndị okwu ụgha, eziokwu nke Chineke ga-adịgide. Nꞌihi na e dere nꞌakwụwkọ nsọ sị na okwu ọ bụla Chineke kwuru ga-abụ eziokwu mgbe nile. Ka e si otu a mee ka Chineke bụrụ onye mmeri mgbe ọ bụla onye ọ bụla jụrụ ajụjụ banyere okwu ahụ.5Ọ bụrụ na ajọ omume anyị na-eme ka ezi omume Chineke pụta ìhè, gịnị ka anyị ga-ekwu? Anyị ga-asị na Chineke adịghị eme ihe ziri ezi ma ọ bụrụ na ọ taa anyị ahụhụ nꞌihi ajọ omume anyị? Ana m ekwu okwu a dị ka ndị mmadụ si ekwu ya.6Ọ̀ bụ ụdị okwu dị aṅaa dị nke a? Ọ bụrụ na ihe esi otu ahụ mee, oleekwanụ otu Chineke ga-esi kpee ụwa ikpe?7Nꞌihi na ọ bụrụ na a na-esite nꞌokwu ụgha m na-ewetara Chineke otuto, ebe ọ bụ na okwu ụgha m na-eme ka eziokwu Chineke pụtazie nke ọma, gịnị mere a ga-eji maa m ikpe mmehie?8Nꞌihi na ọ bụrụ na ajọ omume m na-ewetara Chineke ezi otuto, mgbe ahụ ihe anyị ga-ekwu bụ na ọ dị mma ka anyị nọgide na-eme ihe ọjọọ ka ihe ọma si na ya bịa. (Nꞌezie, ọmụma ikpe na-eche ndị na-ekwu ụdị okwu a bụ ọmụma ikpe ziri ezi.) Ma ụfọdụ na-ekwu na ọ bụ ụdị okwu a ka m na-ekwusa.9Ugbu a, ọ̀ dị ụzọ anyị bụ ndị Juu si ka ndị ọzọ mma? Mbaa! O nweghị ụzọ anyị si ka ha mma. Nꞌihi na e meela ya rị ka ọ pụta ìhè na mmadụ nile bụ ndị mmehie, ndị Juu na ndị mba ọzọ.10Akwụkwọ nsọ ekwuola ya sị, “Ọ dịghị onye ọ bụla dị mma nꞌụwa. Ọ dịghị onye ọ bụla, ọ bụladị otu onye nꞌụwa bụ onye ezi omume.11“Ọ dịghị onye ọ bụla na-aghọta, ọ dịkwaghị onye ọ na-agụ agụụ igbaso Chineke.12“Mmadụ nile esila nꞌebe Chineke nọ kpafuo. Ha nile emehiela. Ọ dịghị onye na-eme ihe dị mma, ọ bụladị otu onye.13“Okwu na-esi ha nꞌọnụ apụta bụ okwu rere ure, nke na-esi isi dị ka isi na-esite nꞌili ghe oghe na-apụta. Ire ha jupụtakwara nꞌokwu ụgha. Okwu ọjọọ ha na-ekwu nwere ike igbu mmadụ. Ọ dị ka elo si nꞌọnụ ajụala apụta.14“Nanị okwu ilu jupụtara ha nꞌọnụ.15“Ihe ha na-eme ọsịịsọ bụ igbu ọchụ na imerụ mmadụ ahụ.16Ebe ọ bụla ha gara, ha na-eweta mbibi na nsogbu nye ndị ahụ.17Ha amaghị ihe a na-akpọ udo.18“Ha amụtabeghị ihe ịtụ Chineke egwu bụ.”19Anyị maara na idebe iwu dịịrị ndị ahụ Chineke nyere iwu ya. Ma e mekwara ka iwu bụrụ ihe ga-eme ka ọnụ ndị mmadụ nile dere duu, ka mmadụ nile nọ nꞌụwa mata na nꞌihu Chineke ha bụ ndị ikpe mara.20Nꞌihi na o nweghị onye ọ bụla a pụrụ ịgụ nꞌonye ezi omume nꞌihu Chineke maka na o debere iwu. Kama ihe iwu na-eme bụ igosi anyị na anyị bụ ndị mmehie.21Ma ugbu a, Chineke egosila anyị ụzọ ọhụrụ, nke ya na ụmụ mmadụ ga-esi dịrị nꞌudo. Ọ bụghị ụzọ metụtara idebe iwu. Ọ bụ ụzọ ọhụrụ. Nꞌezie, ọ bụghị ụzọ ọhụrụ, nꞌihi na ndị amụma agbaalarị ama, e dekwara ya nꞌakwụkwọ iwu, na Chineke ga-eme ihe dị otu a.22Chineke ekwuola na ya ga-anabata anyị, gụọ anyị na ndị na-emeghị mmehie, ma ọ bụrụ na anyị ekwere na Jisọs Kraịst. Chineke na-anabatakwa ndị nile kweere na Kraịst na-ajụghị ajụjụ ma ha bụ ndị Juu ma ọ bụkwanụ ndị mba ọzọ.23Nꞌihi na mmadụ nile emehiela megide Chineke. Ha adịghị emekwa ihe nile Chineke chọrọ ka ha mee.24Ma ugbu a, Chineke na-agụ anyị na ndị ezi omume site nꞌamara ya, nke ọ na-enye nꞌefu, site na Kraịst Jisọs, onye sitere nꞌọnwụ nke ọ nwụrụ gbapụta anyị, mee ka anyị nwere onwe anyị.25Nꞌihi na Chineke zitere Kraịst ka ọ bụrụ aja a chụrụ nꞌihi ikpuchi mmehie anyị, ka ọbara Kraịst na okwukwe anyị nwere nꞌime ya bụrụ ihe ịjụrụ obi nye ya maka mgbaghara mmehie. Chineke sitere nꞌụzọ a mee ka ọ pụta ìhè na ya bụ onye na-ekpe ikpe ziri ezi, ebe o sitere na ntachi obi ya hapụ ịta ndị ahụ mehiere megide ya nꞌoge mgbe ochie ahụhụ.26Ugbu a, Chineke na-anabata ndị mmehie site nꞌụzọ a igosikwa na ya bụ onye na-ekpe ikpe ziri ezi na Onye ahụ na-agụ ndị nile nwere okwukwe nꞌime Jisọs dị ka ndị na-emeghị mmehie.27Ọ bụrụ na o si otu a dịrị, ọ dị ihe inya isi ọ bụla dị nye anyị? Chineke ọ zọpụtara anyị nꞌihi na anyị debere iwu? É,è, nzọpụta anyị dabeere nꞌokwukwe anyị nwere nꞌime Kraịst.28Ya mere Chineke zọpụtara anyị nꞌihi okwukwe anyị nwere na Kraịst, ọ bụghị nꞌihi na anyị mere ihe iwu kwuru.29Chineke ọ na-azọpụta nanị ndị Juu? Mba! Nꞌihi na Chineke bụkwa Chineke ndị mba ọzọ. Ọ ga-anabatakwa ndị mba ọzọ bụ ndị bịakwutere ya site nꞌokwukwe nꞌime Kraịst.30Nꞌihi na dị ka Chineke si emeso ndị Juu omume, otu a ka o si emesokwa ndị mba ọzọ. Ọ ga-anabata ndị Juu nile kweere na Kraịst, nabatakwa ndị mba ọzọ site nꞌokwukwe ha nꞌime Jisọs Kraịst.31Ọ bụrụ na Chineke na-anabata anyị site nꞌokwukwe anyị nwere na Kraịst, ọ̀ pụtara na iwu adịkwaghị mkpa? Mba! Kama anyị na-enye iwu ọnọdụ kwesịrị ya.Igbo Bible 1988 No Data Igbo Bible 1988 ROM 3 00:00:00 00:00:00 0.5x 2.0x https://beblia.bible:81/BibleAudio/igbo1988/romans/003.mp3 16 3