× Asụsụ Europe Russian Belarusian Asụsụ Ukraine Asụsụ Polish Serbian Bulgaria Asụsụ Slovakian Czech Asụsụ Romania Moldovian Azebaịjan Armenia Onye Georgia Albania Avar Bashkir Tatar Chechen Asụsụ Slovenian Asụsụ Croatian Estonia Asụsụ Latvian Asụsụ Lithuania Asụsụ Hungary Asụsụ Finish Asụsụ Norway Asụsụ Sweden Asụsụ Iceland Grik Masedonia German Bavaria Asụsụ Dutch Asụsụ Danish Welsh Gaelic Asụsụ Aịrish French Basque Catalan .Talian Galacian Romani Bosnian North America Bekee South America Asụsụ Spanish Asụsụ Portuguese Guarani Asụsụ Quechuan Aymara Central America Onye Jamaica Asụsụ Nawatụl Kiche Qeqchi Asụsụ Haiti Ebe Ọwụwa Anyanwụ Eshia Chinese nke Ndị Japan Korean Mongolian Uyghur Hmong South East Asia Onye Malaysia Burmese Chin Asụsụ Nepali Cebuano Asụsụ Tagle Kambodia Thai Indoneshian Vietnam Asụsụ Javanese Lao Iban Iu Mien Kachin Lahu Aceh Balinese Bugis Pampanga Sasak Shan Waray South Asia Hindi Dia Awadhi Mizo Kannada Malayalam Marathi Gujarati Asụsụ Tamil Telugu Asụsụ Punjabi Kurukh Asụsụ Assam Maithili Asụsụ Bengali Asụsụ Urdu Sinhala Dogri Haryanvi Meitei Konkani Santalaị Sindhi Koya Thado Sanskrit Devanagari Adilabad Gondi Ahirani Balochi Bundeli Chhattisgarhi Garhwali Kangri Kumaoni Mewari Munda Sadri Seraiki Shekhawati Sylheti Etiti Asia Kyrgyz Asụsụ Uzbek Tajik Ndị Turkmen Kazakhstan Karakalpak Etiti ọwụwa anyanwụ Turkish Hibru Arabic Peshia Kurdi Pashto Coptic Africa Afrịka Xhosa Asụsụ Ndebele Akpan Asụsụ Amharik Wolaytta Onye Naijiria Mossi Ika Dinka Kabyle Ewe Asụsụ Swahili Morocco Asụsụ Somali Shona Madagaska Igbo Lingala Baoule Siswati Tsonga Tswana Onye Gambian Ndi Yoruba Kamba Kinyarwanda Hausa Chewa Luo Makua Dyula Fulfulde Kalenjin Kikọyu Kikwango Kirundi Krio Nigerian Pidgin Oromo Tshiluba Tshivenda Twi Umbundu Lugbara Luguru Pular Gussi Maasai Turkana Moba Nuer Shilluk Tamasheq Makonde Bemba Fon Hadiyya Ibibio Kimbundu Kimiiru Lango Liberian Kreyol Lomwe Mende Morisyen Ndau Nyankole Sena Sidamo Soga Songe Sukuma Tarifit Teso Tiv Zande Kọntinent Australia New Zealand Papua New Guinea Asụsụ Ochie Asụsụ Arameik Latin Esperanto 1 1 1 1988 Nsọ nʼIgbo 2020Bible Nso 200619881 1 1 ROM MATIUMAKLUKJỌNỌLU OZIROM1 KỌRINT2 KỌRINTGALETIAEFESỌSFILIPAIKỌLỌSI1 TESALỌNAIKA2 TESALỌNAIKA1 TIMỌTI2 TIMỌTITAITỌSFAILIMONHIBRUJEMES1 PITA2 PITA1 JỌN2 JỌN3 JỌNJUDNKPUGHE1 1 1 8 123456789101112131415161 1 1 : 28 1234567891011121314151617181920212223242526272829303132333435363738391 1 1 Igbo Bible 1988 ROM 8 Chekwaa ihe edeturu 1Ya mere, ikpe ọmụma ọ bụla adịkwaghị ugbu a nye ndị nile nọ nꞌime Jisọs Kraịst.2Nꞌihi na ike ahụ Mmụọ na-enye ndụ na-enye abụrụla nke m, site nꞌịdị nꞌotu nke mụ na Kraịst. Ike a emekwaala ka m nwere onwe m nꞌebe ike nile nke mmehie na ọnwụ dị.3A zọpụtaghị anyị nꞌihi na anyị debere iwu, nꞌihi na ọ dịghị mgbe anyị na-edebe ya, anyị enwekwaghị ike idebe ya. Ma Chineke sitere nꞌụzọ dị iche zọpụta anyị. Chineke zitere Ọkpara ya ka ọ bịa nꞌụdị anyị bụ mmadụ ka ọ laa ike nke mmehie nꞌiyi, site nꞌiji onwe ya chụọ aja nꞌihi mmehie anyị.4Ya mere, anyị pụrụ idebezu ihe nile iwu chọrọ ugbu a, site nꞌike Mmụọ Nsọ. Ọ bụkwaghị ọrụ anyị ime ihe anụ ahụ anyị chọrọ.5Ndị nile na-ebi ndụ ha dị ka anụ ahụ si chọọ, na-ebi ya nanị imezu agụụ nile na-agụ anụ ahụ ha. Ma ndị nile na-agbaso ụzọ nke Mmụọ Nsọ na-achọpụta na ha na-eme ihe Chineke na-achọ.6Mkpụrụ obi ọ bụla na-agbaso ọchịchọ nke ọdịdị ochie ya ga-anwụ. Ma mkpụrụ obi na-agbaso Mmụọ Nsọ Chineke ga-ebi ndụ nꞌudo.7Nꞌihi na ọdịdị ochie dị nꞌime anyị na-ebu agha imegide Chineke. Ọ naghị erubere Chineke isi, ọ nakwaghị eme ihe Chineke na-achọ.8Ya mere, ndị nile ọdịdị ochie ha na-achị, ndị na-eme ihe ọ chọrọ, enweghị ike ime ihe ga-atọ Chineke ụtọ.9Ma lee! Ọ bụrụ na Mmụọ Chineke bi nꞌime unu na-achị ndụ ọhụrụ unu, unu agaghị emekwa uche ọdịdị ochie unu. Chetakwa na ọ bụrụ na Mmụọ Kraịst ebighị nꞌime gị, ị bụghị onye nke Kraịst.10Ọ bụrụkwa na Kraịst bi nꞌime gị, anụ ahụ gị ga-abụ ihe nwụrụ anwụ nꞌebe mmehie dị, ma Mmụọ Nsọ bi nꞌime gị ga-enye gị ndụ, nꞌihi na o burularị ụzọ mee ka ị bụrụ onye ezi omume.11Ọ bụrụ na Mmụọ Chineke, onye mere ka Jisọs si nꞌọnwụ bilie, bi nꞌime gị, ọ ga-emekwa ka anụ ahụ gị dị ndụ ọzọ, mgbe ị nwụchara, site nꞌike Mmụọ Nsọ ahụ, onye bi nꞌime gị.12Ya mere, ụmụnna m, anyị ji ụgwọ. Ma ọ bụghị ọdịdị ochie anyị ka anyị ji ụgwọ ime ihe ọ bụla ọ chọrọ ka anyị mee.13Nꞌihi na ọ bụrụ na anyị anọgide na-eme ihe ọdịdị ochie anyị chọrọ, anyị ga-ala nꞌiyi. Kama ọ bụrụ na anyị esite nꞌike Mmụọ Chineke gwepịa, ma wezuga ọrụ ọjọọ nke anụ ahụ, anyị ga-adịkwa ndụ.14Nꞌihi na ndị nile Mmụọ Chineke na-achị bụ ụmụ Chineke.15Anyị bụ ụmụ Chineke. O kwesịkwaghị ka anyị na-eme dị ka ndị ohu, ndị ụjọ na-atụ. A kpọbatala anyị nꞌezinụlọ Chineke. Ya mere, ka anyị kpaa agwa dị ka ụmụ Chineke. Ka anyị kpọọkwa Chineke “Nna, Nna” nꞌihi na ọ bụ Nna anyị.16Mmụọ Nsọ na-agwakwa anyị okwu nꞌime mmụọ anyị, na-agbara anyị ama na anyị bụ ụmụ Chineke nꞌezie.17Ugbu a, ọ bụrụkwa na anyị bụ ụmụ ya, anyị gaeketa oke nꞌakụ ahụ dị nꞌalaeze Chineke. Nꞌihi na ihe nile Chineke nyere Jisọs abụrụla nke anyị. Ọ bụrụkwa nꞌezie na anyị ga-eso Kraịst keta oke nꞌotuto ya, anyị aghaghị iso ya keta oke na ntaramahụhụ ya.18Nꞌikwu eziokwu, ahụhụ nile anyị na-ata ugbu a erughị ihe a ga-eji tụnyere ngọzi nile Chineke gaje inye anyị.19Nꞌihi na ụwa na ihe nile e kere eke dị nꞌime ya ji ndidi na olileanya na-echesi ike ịhụ ụbọchị ahụ mgbe Chineke ga-esite nꞌọnwụ kpọlite ụmụ ya.20Nꞌihi na Chineke bụrụ ihe nile o kere eke ọnụ, ọ bụghị nꞌihi na ihe ndị a chọrọ ịnọ ọnọdụ a, kama, ọ bụ nꞌihi na Chineke chọrọ ka o si otu ahụ dịrị. Ma otu ọ dị, ihe ndị a nile nwere olileanya na,21otu ụbọchị na-abịa mgbe Chineke ga-azọpụta ha site nꞌaka ịbụ ohu nke ire ure, mee ka ha soro ụmụ Chineke nile nwere onwe ha, sorokwa ha keta oke nꞌebube ahụ ga-abụ nke ha.22Anyị maara na tutuu ruo ugbu a, ihe nile e kere eke, dị ka ụmụ anụmanụ, na ahihia, nọ na-asụ ude, nꞌihi ihe mgbu ha nọ nꞌime ya. Ma ha nọkwa na-ele anya ọbịbịa nke ụbọchị ahụ.23Ọ bụghị nanị nke a, ma anyị onwe anyị bụ ndị Kraịst, ndị nwere Mmụọ Chineke, nọkwa na-asụ ude nꞌime obi anyị, na-eche ọbịbịa nke ụbọchị ahụ, mgbe a ga-ewezugara anyị ihe mgbu na ọrịa nile. Anyị nọkwa na-ele anya ọbịbịa nke ụbọchị ahụ mgbe Chineke ga-enye anyị ihe nile kwesịrị anyị dị ka ụmụ Chineke, ya na ahụ ọhụrụ ahụ o kwere anyị na nkwa, ahụ nke na-agaghị arịakwa ọrịa ọzọ, nke na-agaghị anwụkwa ọzọ.24A zọpụtara anyị site na ntụkwasị obi anyị nwere na Chineke. Ịtụkwasị mmadụ obi bụ inwe olileanya na anyị ga-esi nꞌaka ya nata ihe anyị na-enweghị ugbu a. Nꞌihi na ọ baghị uru mmadụ inwe olileanya nꞌihe o ji anya ya na-ahụ ugbu a.25Ọ bụrụkwa na anyị nwere olileanya na ọ dị ihe Chineke ga-emere anyị, anyị kwesịrị iji ndidi chere ruo mgbe o mezuru ihe ahụ.26Mgbe ọ bụla kwa anyị ji ndidi na-eche ihe anyị nwere olileanya na anyị ga-enweta, Mmụọ Nsọ na-enyere anyị aka nꞌọnọdụ adịghị ike anyị nile. Nꞌihi na nꞌọnọdụ ụfọdụ, anyị adịghị ama ihe anyị kwesịrị ịrịọ Chineke ka o meere anyị, ma ọ bụ otu anyị ga-esi doo ọnụ anyị kpee ekpere ahụ, ma Mmụọ Nsọ na-eji ịsụ ude nke mmadụ na-enweghị ike ịkọwa na-arịọrọ anyị arịrịọ.27Chineke Nna anyị, onye na-enyocha obi mmadụ nile makwaara ihe Mmụọ Nsọ ahụ na-eche, mgbe ọ na-arịọ arịrịọ ahụ nꞌusoro, dị ka Chineke si chọọ.28Anyị makwaara na ọ bụrụ na anyị hụrụ Chineke nꞌanya, na-emekwa ihe ọ na-achọ, ka ha ha, bụ ihe nile na-adakwasị anyị nꞌọnọdụ ọ bụla, bụ ihe Chineke ji na-arụ ọrụ, ịrụpụta ezi ihe na ndụ anyị.29Nꞌihi na site na mmalite ihe nile, Chineke maararị ndị ga-abịakwute ya. O kpebikwara na ndị a ga-abịakwute ya ga-adị ka Ọkpara ya Jisọs Kraịst, ka Jisọs bụrụ onye okenye e bu ụzọ mụọ nꞌetiti ọtụtụ ụmụnna.30Ọ bụkwa ndị ahụ nile Chineke họpụtara, ka ọ kpọrọ ka ha bịakwute ya. Mgbe ha bịara, Chineke mere ka ha bụrụ ndị ya na ha dị na mma. Ọ gụrụ ha dị ka ndị na-emeghị mmehie ọ bụla, meekwa ka ha bụrụ ndị gaeketa oke nꞌebube ahụ o kwere na nkwa.31Gịnị ọzọ ka anyị ga-ekwu banyere ihe ọma ndị a nile Chineke meere anyị. Ọ bụrụ na Chineke dịnyeere anyị, onye pụrụ iguzo megide anyị?32Tulee ya nꞌonwe gị: Onye ahụ na-azọghị ndụ Ọkpara ya, nke weere ya nye nꞌihi mmehie anyị, ọ̀ dị ihe ọzọ anyị chọrọ ọ na-agaghị enye anyị?33Ònye pụrụ ịpụta nꞌihu Chineke boo anyị bụ ndị ya ọ họpụtara ebubo mmehie? Ònye ka ọ bụ? Chineke nꞌonwe ya ọ ga-ebo anyị ebubo nꞌihi mmehie anyị? Mba! Nꞌihi na ọ bụ ya onwe ya gbaghaara anyị mmehie anyị, mee ka anyị na ya dị na mma.34Mgbe ahụ, olee onye ọzọ nwere ike ịma anyị ikpe ọnwụ? Ọ̀ bụ Kraịst? Mba! Nꞌihi na Kraịst bụ onye ahụ nwụrụ nꞌihi anyị, ọ bụkwa onye ahụ e mere ka o si nꞌọnwụ bilie, mee ka ọ nọọ nꞌaka nri Chineke, ebe ọ nọ na-arịọrọ anyị arịrịọ.35Ọ̀ dị onye nwere ike ikewapụ anyị site nꞌịhụnanya Kraịst nwere nꞌebe anyị nọ? Ọ bụrụ na anyị anọọ nꞌọnọdụ nsogbu, ma ọ bụ na mkpagbu, ma ọ bụ nꞌahụhụ, ihe ndị a ha na-egosi na Kraịst ahụkwaghị anyị nꞌanya? Mba! A sịkwa na anyị anọọ nꞌọnọdụ agụụ, ma ọ bụ nꞌụkpa, ma ọ bụ nꞌọnọdụ ihe egwu, ma ọ bụkwanụ nꞌọnwụ, ọ na-egosi na Chineke agbaketala anyị azụ? Mba!36Nꞌihi na akwụwkọ nsọ na-agwa anyị sị, “Ọ bụ nꞌihi gị, Chineke, ka anyị na ọnwụ ji na-agba mgba ụbọchị nile. A na-ele anyị anya dị ka atụrụ a gaje igbu egbu.”37Ma nꞌime ihe ndị a nile, mmeri bụ nke anyị site na Kraịst, onye ahụ hụrụ anyị nꞌanya, nwụọ nꞌihi anyị.38Nꞌihi na nke a bụ ihe m maara nke ọma, bụrụkwa ihe doro m anya, na ọ dịghị ihe pụrụ ikewapụ anyị site nꞌịhụnanya Chineke. Ọnwụ, ma ọ bụ ndụ enweghị ike ya, ndị mmụọ ozi ma ọ bụ ike nile dị nꞌeluigwe enweghị ike igbochi Chineke ịhụ anyị nꞌanya. Ọ bụladị ihe ọjọọ nile na-eme nꞌụwa taa, na nchegbu banyere ihe ga-eme echi, apụghị igbochi ịhụnanya Chineke.39Ịhụnanya Chineke ga-erute anyị ebe ọ bụla anyị nọ, nꞌelu mbara eluigwe, ma ọ bụ nꞌokpuru osimiri nke ụwa. Nꞌezie, ọ dịghị ihe ọ bụla Chineke kere eke pụrụ ikewapụ anyị site nꞌịhụnanya Chineke.Igbo Bible 1988 No Data Igbo Bible 1988 ROM 8 00:00:00 00:00:00 0.5x 2.0x https://beblia.bible:81/BibleAudio/igbo1988/romans/008.mp3 16 8