× Asụsụ Europe Russian Belarusian Asụsụ Ukraine Asụsụ Polish Serbian Bulgaria Asụsụ Slovakian Czech Asụsụ Romania Moldovian Azebaịjan Armenia Onye Georgia Albania Avar Bashkir Tatar Chechen Asụsụ Slovenian Asụsụ Croatian Estonia Asụsụ Latvian Asụsụ Lithuania Asụsụ Hungary Asụsụ Finish Asụsụ Norway Asụsụ Sweden Asụsụ Iceland Grik Masedonia German Bavaria Asụsụ Dutch Asụsụ Danish Welsh Gaelic Asụsụ Aịrish French Basque Catalan .Talian Galacian Romani Bosnian North America Bekee South America Asụsụ Spanish Asụsụ Portuguese Guarani Asụsụ Quechuan Aymara Central America Onye Jamaica Asụsụ Nawatụl Kiche Qeqchi Asụsụ Haiti Ebe Ọwụwa Anyanwụ Eshia Chinese nke Ndị Japan Korean Mongolian Uyghur Hmong South East Asia Onye Malaysia Burmese Chin Asụsụ Nepali Cebuano Asụsụ Tagle Kambodia Thai Indoneshian Vietnam Asụsụ Javanese Lao Iban Iu Mien Kachin Lahu Aceh Balinese Bugis Pampanga Sasak Shan Waray South Asia Hindi Dia Awadhi Mizo Kannada Malayalam Marathi Gujarati Asụsụ Tamil Telugu Asụsụ Punjabi Kurukh Asụsụ Assam Maithili Asụsụ Bengali Asụsụ Urdu Sinhala Dogri Haryanvi Meitei Konkani Santalaị Sindhi Koya Thado Sanskrit Devanagari Adilabad Gondi Ahirani Balochi Bundeli Chhattisgarhi Garhwali Kangri Kumaoni Mewari Munda Sadri Seraiki Shekhawati Sylheti Etiti Asia Kyrgyz Asụsụ Uzbek Tajik Ndị Turkmen Kazakhstan Karakalpak Etiti ọwụwa anyanwụ Turkish Hibru Arabic Peshia Kurdi Pashto Coptic Africa Afrịka Xhosa Asụsụ Ndebele Akpan Asụsụ Amharik Wolaytta Onye Naijiria Mossi Ika Dinka Kabyle Ewe Asụsụ Swahili Morocco Asụsụ Somali Shona Madagaska Igbo Lingala Baoule Siswati Tsonga Tswana Onye Gambian Ndi Yoruba Kamba Kinyarwanda Hausa Chewa Luo Makua Dyula Fulfulde Kalenjin Kikọyu Kikwango Kirundi Krio Nigerian Pidgin Oromo Tshiluba Tshivenda Twi Umbundu Lugbara Luguru Pular Gussi Maasai Turkana Moba Nuer Shilluk Tamasheq Makonde Bemba Fon Hadiyya Ibibio Kimbundu Kimiiru Lango Liberian Kreyol Lomwe Mende Morisyen Ndau Nyankole Sena Sidamo Soga Songe Sukuma Tarifit Teso Tiv Zande Kọntinent Australia New Zealand Papua New Guinea Asụsụ Ochie Asụsụ Arameik Latin Esperanto 1 1 1 1988 Nsọ nʼIgbo 2020Bible Nso 200619881 1 1 1 KỌRINT MATIUMAKLUKJỌNỌLU OZIROM1 KỌRINT2 KỌRINTGALETIAEFESỌSFILIPAIKỌLỌSI1 TESALỌNAIKA2 TESALỌNAIKA1 TIMỌTI2 TIMỌTITAITỌSFAILIMONHIBRUJEMES1 PITA2 PITA1 JỌN2 JỌN3 JỌNJUDNKPUGHE1 1 1 1 123456789101112131415161 1 1 : 10 123456789101112131415161718192021222324252627282930311 1 1 Igbo Bible 1988 1 KỌRINT 1 Chekwaa ihe edeturu 1Akwụkwọ ozi a si nꞌaka m Pọl, onye e sitere nꞌọchịchọ Chineke kpọọ ịbụ onyeozi Jisọs Kraịst. Nwanne m nwoke Sostenis sokwa m na-ede akwụkwọ a.2Ọ bụ unu ka m na-edetara akwụkwọ a, unu nzukọ Chineke dị na Kọrint, ndị Chineke kpọrọ ka unu bụrụ ndị nke ya, ndị e mekwara ka unu site na Jisọs bụrụ ndị Chineke na-anabata. Anyị na-edekwara unu ndị Kraịst nile nọ nꞌebe nile akwụkwọ a, unu nile bụ ndị na-akpọku aha Jisọs Kraịst, dị ka Onyenwe anyị na Onyenwe unu.3Ka Chineke nna na Onyenwe anyị Jisọs Kraịst nye unu amara na udo nke na-esi nꞌaka ya na-abịa.4Mgbe ọ bụla m na-ekpe ekpere, ana m ekele Chineke ekele nꞌihi onyinye amara nile o nyere unu site na Kraịst Jisọs.5Nꞌihi na Chineke emeela ka unu baa ụba nꞌụzọ nile, ebe ọ bụ na unu na Kraịst bụ otu. O meekwala ka unu nwee nghọta zuru ezu banyere eziokwu nile. Ọ na-emekwa ka unu nwee ike na-ekwuwapụta okwu banyere ozi ọma ya.6Ihe ahụ m gwara unu na mbụ emezuola! Ozi ọma Kraịst Jisọs agbaala mgbọrọgwụ nꞌime unu.7Nꞌihi na ugbu a, Chineke enyela unu amara ya na ngọzi ya nile. O nyekwala unu onyinye Mmụọ Nsọ nile na ike dum unu chọrọ iji mee ihe na-atọ ya ụtọ. Chineke nyere unu ihe ndị a nile ugbu a unu nọ na-ele anya ọbịbịa Onyenwe anyị Jisọs Kraịst.8Ọ bụkwa Chineke ga-echebe unu ruo ọgwụgwụ, meekwa ka unu bụrụ ndị a ga-agụ dị ka ndị ezi omume nꞌụbọchị ahụ Onyenwe anyị Jisọs Kraịst ga-ekpe ụwa nile ikpe.9Chineke nꞌonwe ya ga-emere unu nke a. Nꞌihi na ọ bụ onye anyị kwesịrị ịtụkwasị obi. Ọ bụkwa Chineke kpọbatara unu nꞌọnọdụ ahụ nke unu na Ọkpara ya bụ Onyenwe anyị Jisọs Kraịst nọ ugbu a na-enwe mmekọrịta.10Ụmụnna m, eji m aha Onyenwe anyị Jisọs Kraịst na-arịọ unu, ka unu nile na-ekwekọrịta nꞌihe ọ bụla unu kwuru, ka nkewa ọ bụla gharakwa ịbata nꞌetiti unu. Ana m arịọkwa unu ka unu dị nꞌotu, nꞌechiche obi unu na nꞌizu unu.11Nꞌihi na ụmụnna m, esi m nꞌọnụ ndị si nꞌezinụlọ Kloyi bịara nꞌebe a nụrụ na esemokwu dị nꞌetiti unu.12Anụrụ m na ịkpa iche iche abatala nꞌetiti unu. Na ụfọdụ nꞌime unu na-anya isi na-agwa ibe ha sị, “Abụ m onye na-eso Pọl.” Ndị ọzọ na-asịkwa, “Abụ m onye na-eso Apọlọs”, ndị ọzọ kwa na-asị, “Ana m eso Pita”, ma ndị ọzọ na-asị kwa, “Ọ bụ Kraịst ka m na-eso”.13Mgbe unu na-eme ihe ndị a, ihe pụtara ìhè bụ na unu ekewasịala Kraịst, mee ka ọ dị ọtụtụ. Ma ka m jụọ unu, Kraịst, ọ̀ dị abụọ? Ọ̀ bụ mụ onwe m bụ Pọl ka a kpọgidere nꞌobe nꞌihi unu? Ọ̀ dị onye e mere baptizim nꞌetiti unu baa nꞌaha Pọl?14Ana m ekele Chineke ekele na ọ dịghị onye ọ bụla nꞌime unu m mere baptizim, ewezugakwa Krispọs na Gatọs.15Nꞌihi na nke a ga-eme ka onye ọ bụla ghara ikwu na e mere unu baptizim ka unu bụrụ ndị na-eso ụzọ m.16Ahaa! Echetara m na emekwara m Stevanas na ezinụlọ ya baptizim. Ewezuga ndị a, amaghị m ma m ga-echetakwa onye ọzọ m mere baptizim nꞌonwe m.17Nꞌihi na Kraịst eziteghị m ime ndị mmadụ baptizim. O zitere m iji okwu dị mfe kwusaa ozi ọma ya. Ọ bụghị iji okwu oke mmụta mmadụ nke ga-eme ka ike ahụ dị na nkwusa ozi ọma nke obe Kraịst, bụrụ ihe efu.18Nꞌanya ndị na-efu efu, ozi ọma Kraịst bụ ihe nzuzu ma nꞌanya ndị a na-azọpụta azọpụta, ọ bụ ike Chineke.19Chineke kwuru nꞌakwụkwọ nsọ sị “Aga m emebi amamihe ndị maara ihe ạga m emekwa ka oke nghọta nke ndị maara ihe bụrụ ihe efu.”20Mgbe Chineke mere ihe dị otu a, gịnị ga-abụ ọnọdụ ndị amamihe, ndị mụrụ akwụkwọ na ndị nrụrịta ụka nke ihe ọmụma ụwa a? Chineke emeela ka amamihe ha na oke mmụta ha bụrụ ihe efu.21Chineke sitere nꞌamamihe ya chọpụta na ụmụ mmadụ enweghị ike ịmata onye ọ bụ site nꞌoke mmụta ha. Ọ bụ nke a mere o ji webata ụzọ ọ ga-esi zọpụta ndị ga-anabata ozi ọma ya. Ee, ụzọ ozi ọma a anyị na-ekwusa, nke ndị mmadụ na-akpọkwa ihe nzuzu.22Ozi ọma a bụ ihe nzuzu nye ndị Juu nꞌihi na ha chọrọ ịhụ ihe ịrịba ama na mbara eluigwe nke ga-egosi ha na ozi ọma a bụ eziokwu tupuu ha ekwere. Ọ bụ ihe nzuzu nye ndị mba ọzọ, nꞌihi na ihe ha na-anabata bụ nanị ozizi nke ya na usoro oke mmụta ha na-adakọta.23Ma anyị na-ekwusa na-asị na Kraịst nwụrụ nꞌelu obe ịzọpụta ha site na mmehie ha, okwu a na-ewe ndị Juu iwe, ma na ntị ndị mba ọzọ ọ dị ka okwu nzuzu.24Ma Chineke emegheela anya ndị nile ọ kpọrọ, ka ha hụ na Kraịst bụ ike dị ukwuu nke Chineke ji azọpụta ha. Kraịst nꞌonwe ya bụkwa onye Chineke sitere nꞌime ya gosi amamihe ya.25Ugbu a ihe ahụ ndị mmadụ kpọrọ nzuzu Chineke, aghọọla ihe karịrị amamihe nile nke ndị mmadụ mma. Ihe ahụ ha chekwara na ọ bụ adịghị ike Chineke, nꞌihi ọnwụ Kraịst nwụrụ nꞌobe, aghọọkwala ihe karịrị ike mmadụ nile.26Ma chetakwanụ ihe unu bụ tupuu Chineke akpọọ unu. Chetanụ na ọ bụ ole na ole nꞌime unu bụ ndị maara ihe, ndị dị ike, na ndị a maara aha ha nꞌobodo.27Ma lee na ọ bụ ihe ahụ ụwa gụrụ dị ka ihe nzuzu, ihe na-abaghị uru, ka ọ masịrị Chineke iji mee ka ihere mee ndị amamihe ahụ. Ọ bụkwa ihe ha gụrụ dị ka ihe na-adịghị ike ka Chineke ji mee ka ihere mee ndị dị ike.28Nꞌihi na Chineke họọrọ ihe dịkarịrị ala nke ụwa, na ihe a jụrụ ajụ, jiri ha mee ka ihe ụwa chere na ọ baghị uru, bụrụ ihe bara uru.29Chineke mere nke a nꞌihi na ọ chọrọ ka anụ ahụ nile, bụ mmadụ, hapụ ịnya isi nꞌihi ihe ọ bụla, nꞌebe Chineke nọ.30Nꞌihi na ọ bụ Chineke nanị mere ka unu nwee ndụ nꞌime Kraịst Jisọs, onye bụ mmụta anyị na amamihe anyị. Ọ bụ site na Kraịst ka anyị ji nwere onwe anyị, bụrụkwa ndị nsọ, na ndị Chineke zọpụtara.31Ọ bụ nke a mere akwụkwọ nsọ ji kwuo sị, “Ka onye ọ bụla chọrọ ịnya isi nyaa isi nanị nꞌihe Chineke mere.”Igbo Bible 1988 No Data Igbo Bible 1988 1 KỌRINT 1 00:00:00 00:00:00 0.5x 2.0x https://beblia.bible:81/BibleAudio/igbo1988/1corinthians/001.mp3 16 1