× Asụsụ Europe Russian Belarusian Asụsụ Ukraine Asụsụ Polish Serbian Bulgaria Asụsụ Slovakian Czech Asụsụ Romania Moldovian Azebaịjan Armenia Onye Georgia Albania Avar Bashkir Tatar Chechen Asụsụ Slovenian Asụsụ Croatian Estonia Asụsụ Latvian Asụsụ Lithuania Asụsụ Hungary Asụsụ Finish Asụsụ Norway Asụsụ Sweden Asụsụ Iceland Grik Masedonia German Bavaria Asụsụ Dutch Asụsụ Danish Welsh Gaelic Asụsụ Aịrish French Basque Catalan .Talian Galacian Romani Bosnian North America Bekee South America Asụsụ Spanish Asụsụ Portuguese Guarani Asụsụ Quechuan Aymara Central America Onye Jamaica Asụsụ Nawatụl Kiche Qeqchi Asụsụ Haiti Ebe Ọwụwa Anyanwụ Eshia Chinese nke Ndị Japan Korean Mongolian Uyghur Hmong South East Asia Onye Malaysia Burmese Chin Asụsụ Nepali Cebuano Asụsụ Tagle Kambodia Thai Indoneshian Vietnam Asụsụ Javanese Lao Iban Iu Mien Kachin Lahu Aceh Balinese Bugis Pampanga Sasak Shan Waray South Asia Hindi Dia Awadhi Mizo Kannada Malayalam Marathi Gujarati Asụsụ Tamil Telugu Asụsụ Punjabi Kurukh Asụsụ Assam Maithili Asụsụ Bengali Asụsụ Urdu Sinhala Dogri Haryanvi Meitei Konkani Santalaị Sindhi Koya Thado Sanskrit Devanagari Adilabad Gondi Ahirani Balochi Bundeli Chhattisgarhi Garhwali Kangri Kumaoni Mewari Munda Sadri Seraiki Shekhawati Sylheti Etiti Asia Kyrgyz Asụsụ Uzbek Tajik Ndị Turkmen Kazakhstan Karakalpak Etiti ọwụwa anyanwụ Turkish Hibru Arabic Peshia Kurdi Pashto Coptic Africa Afrịka Xhosa Asụsụ Ndebele Akpan Asụsụ Amharik Wolaytta Onye Naijiria Mossi Ika Dinka Kabyle Ewe Asụsụ Swahili Morocco Asụsụ Somali Shona Madagaska Igbo Lingala Baoule Siswati Tsonga Tswana Onye Gambian Ndi Yoruba Kamba Kinyarwanda Hausa Chewa Luo Makua Dyula Fulfulde Kalenjin Kikọyu Kikwango Kirundi Krio Nigerian Pidgin Oromo Tshiluba Tshivenda Twi Umbundu Lugbara Luguru Pular Gussi Maasai Turkana Moba Nuer Shilluk Tamasheq Makonde Bemba Fon Hadiyya Ibibio Kimbundu Kimiiru Lango Liberian Kreyol Lomwe Mende Morisyen Ndau Nyankole Sena Sidamo Soga Songe Sukuma Tarifit Teso Tiv Zande Kọntinent Australia New Zealand Papua New Guinea Asụsụ Ochie Asụsụ Arameik Latin Esperanto 1 1 1 1988 Nsọ nʼIgbo 2020Bible Nso 200619881 1 1 1 KỌRINT MATIUMAKLUKJỌNỌLU OZIROM1 KỌRINT2 KỌRINTGALETIAEFESỌSFILIPAIKỌLỌSI1 TESALỌNAIKA2 TESALỌNAIKA1 TIMỌTI2 TIMỌTITAITỌSFAILIMONHIBRUJEMES1 PITA2 PITA1 JỌN2 JỌN3 JỌNJUDNKPUGHE1 1 1 7 123456789101112131415161 1 1 : 2 123456789101112131415161718192021222324252627282930313233343536373839401 1 1 Igbo Bible 1988 1 KỌRINT 7 Chekwaa ihe edeturu 1Ugbu a, achọrọ m ịsa ajụjụ ndị ahụ unu jụrụ nꞌakwụkwọ unu deteere m. Ndị a bụ ọsịsa m banyere ajụjụ ịlụ nwanyị. Ọ dị mma ma ọ bụrụ na nwoke emetụghị nwanyị aka.2Ma ọ ka mma ka onye ọ bụla lụọ nwanyị, nwoke ọ bụla nwụnye nke aka ya, nwanyị ọ bụla di nke aka ya. Nke a ga-eme ka ha ghara ime mmehie.3Ka nwoke ọ bụla nwere nwụnye nye nwụnye ya ihe nile ruuru ya dị ka nwanyị nwere di. Nwanyị ọ bụla ga-emekwara di ya otu aka ahụ.4Nꞌihi na nwanyị ọ bụla lụrụ di adịkwaghị achị ahụ ya, kama ọ bụ di ya na-achị ya. Otu aka ahụ, di anakwaghị achị ahụ ya, kama ọ bụ nwụnye ya na-achị ya.5Ka di na nwụnye hapụ igbochi ibe ha mmekọrịta nke anụ ahụ ruuru ha. Karịakwa ma ọ bụ na mkpebi ha nwere nꞌetiti onwe ha ịnọrọ iche nwoge nta nꞌihi inyefe onwe ha ikpe ekpere nye Chineke. Mgbe oge a gasịrị, ha ga-agakwa nꞌihu na mmekọrịta ha, ka e site otu a hapụ inye ekwensu ohere ịnwa ha ọnwụnwa nꞌihi enweghị ike ha ijide onwe ha aka.6Anaghị m ekwu nke a ịkwagide unu ịlụ di na nwụnye, kama onye chọrọ ịlụ nwere ike lụọ.7Asị m kwuo, aga m asị na ọ ga-aka mma ka mmadụ nile nọrọ dị ka m ṅa-alụghị nwụnye. Ma onye ọ bụla nwere onyinye nke Chineke nyere ya. Ụfọdụ ka o nyere onyinye ịbụ di ma ọ bụ nwụnye, ndị ọzọ ka o nyere onyinye ịnọrọ onwe ha na-alụghị di ma ọ bụ nwụnye.8Ya mere geenụ ntị, unu ụmụ nwanyị nile na-alụbeghị di, na unu nile di ha nwụrụ anwụ, ọ ga-akara unu mma ịnọrọ nke onwe unu dị ka m.9Ma ọ bụrụ na ị pụghị ijide onwe gị, igbaso nwoke ma ọ bụ nwanyị, gaa chọrọ di ma ọ bụ nwụnye lụọ. Ọ ka mma ịlụ di ma ọ bụ nwụnye, karịa ịnọ na-alụghị di ma ọ bụ nwụnye na-anwụ nꞌihi agụụ inwe mmekọrịta nke nwoke na nwanyị.10Ugbu a, unu ndị nwere di na ndị nwere nwụnye nile, enwere m iwu m na-enye unu. Iwu a esighị nꞌaka m, kama o si nꞌaka Onyenwe anyị. O kwesịghị ka nwanyị ọ bụla hapụ di ya.11A sịkwa na nwanyị ọ bụla ahapụ di ya, ya nọọrọ onwe ya, ma ọ bụ ya laghachikwuru di ya. Nwoke ọ bụla ekwesịkwaghị ịchụpụ nwụnye ya.12Ka m tụnyetụ aro nke m. Ọ bụ ezie na ọ bụghị Chineke kwuru ha, kama ha ziri ezi nꞌanya m. Ọ bụrụ na onye kwere ekwe alụọ nwanyị nke na-ekweghị ekwe, ya achụpụla ya ma ọ bụrụ na nwanyị ahụ achọọ ịnọgide dị ka nwụnye ya.13Ọ bụrụkwa na nwanyị kwere ekwe alụọ di nke na-ekweghị ekwe, ya agbarala di ya achọkwaghị m, ma ọ bụrụ na di ya chọrọ ka nwanyị ahụ nọgide dị ka nwụnye ya.14Nꞌihi na a na-eme ka nwoke ahụ na-ekweghị ekwe bịarute Chineke nso site na nwụnye ya, otu a kwa a na-emekwa ka nwụnye ahụ na-ekweghị ekwe bịarute Chineke nso site na di ya. Nꞌihi na, ọ bụrụ na ha agbaara onwe ha achọkwaghị m, a ga-agụ ụmụ ha dị ka ndị na-amaghị Chineke. Ma ọ bụrụ na ha ebiri, a ga-agụ ha dị ka ndị dị nsọ.15Ma ọ bụrụ na di ma ọ bụ nwụnye nke na-ekweghị ekwe achọọ ikewapụ onwe ya, ka di ma ọ bụ nwụnye nke kwere ekwe ghara ịkwụsị ha. Ha kewapụ onwe ha. Nke a bụ nꞌihi na Chineke chọrọ ka ụmụ ya bie ndụ udo nꞌezinụlọ ha.16Nꞌihi na gị nwanyị na-adọ ka di gị nọgide, gịnị nyere gị olileanya iche na di gị ga-emesịa kwere na Kraịst? Otu a kwa gị nwoke na-adọ ka nwụnye gị nọgide, olee otu i si mara na ị pụrụ ime ka nwụnye gị bụrụ onye Kraịst?17Bikonụ mgbe unu na-enwe mkpebi unu nꞌihe ndị a, ka onye ọ bụla na-ebi ndụ ya dị ka Chineke chọrọ ka o bie ya. Onye na-alụ di ma ọ bụ nwụnye, ya mee ya dị ka otu Chineke si duzie. Onye nke na-adịghị alụkwa, ya meekwa dị ka Chineke siri duzie ya. Nke a bụ iwu m na-enye nꞌụlọ chọọchị nile m gara.18Dị ka ihe ịma atụ, ọ bụrụ na ọ dị onye e biri ugwu tupuu ya anabata Onyenwe anyị, ka nke a hapụ iwute ya. Ka onye a na-ebighị ugwu hapụ inye onwe ya nsogbu, ịchọ ụzọ a ga-esi bie ya ugwu.19Nꞌihi na ọ dịghị mkpa ma e biri gị ugwu ma e bighị gị ugwu. Ọ dịghị ihe ndị a pụtara nꞌihu Chineke. Ihe dị mkpa bụ irube isi nꞌiwu Chineke na ime ihe na-atọ ya ụtọ.20Ka onye ọ bụla nọgide dị ka ọ dị mgbe a kpọrọ ya.21Ọ bụrụ na ị bụ ohu echegbula onwe gị nꞌihi ya. Kama ọ bụrụ na ọ dị ụzọ ị pụrụ isi nwere onwe gị, mee ya.22Nꞌihi na ọ bụrụ na Chineke kpọrọ gị mgbe ị bụ ohu, cheta na Kraịst emeela ka ị bụrụ onye nweere onwe ya site nꞌike mmehie. Ọ bụrụ na Chineke kpọrọ gị mgbe i nweere onwe gị, cheta na ị bụ ohu Kraịst ugbu a.23Kraịst akwụọla ụgwọ isi unu, unu bụ nke ya ugbu a. Ya mere, bienụ ndụ dị ka ndị nwe onwe ha, unu abụkwala ohu mmadụ ọzọ.24Ụmụnna m, nꞌọnọdụ ọ bụla mmadụ nọ mgbe ọ nabatara Kraịst, ya nọgidesie ike nꞌime ya, kama nanị ihe ọ ga-eme bụ ịtụkwasị Kraịst obi nꞌihi na Onyenwe anyị nọ nꞌebe ahụ inyere ya aka.25Ajụjụ ọzọ unu jụrụ bụ banyere ụmụ agbọghọ na-alụbeghị di. Unu na-ajụ ma o ziri ezi nꞌezie ka ha lụọ di. Enweghị m iwu ọ bụla site nꞌaka Chineke banyere ajụjụ a, ma o nyere m amamihe nke a pụrụ ịtụkwasị obi. Nꞌihi nke a, leenụ ihe m chere banyere ajụjụ a.26Echere m na ọ ka mma ugbu a, nꞌihi nsogbu na-adakwasị ndị Kraịst nꞌoge a, ka nwoke na nwanyị onye Kraịst ọ bụla nọọrọ onwe ya na-alụghị di ma ọ bụ nwụnye.27Ma ọ bụrụ na ị nwere di ma ọ bụ nwụnye, ahapụla ya, a sịkwa na ị bụ okokporo, emela ngwangwa ịchọ nwanyị ị ga-alụ ugbu a.28Ma ọ bụrụ na i kpebie nꞌobi gị ịlụ nwụnye, i meghị mmehie ọ bụla; ọ bụrụkwa na nwagbọghọ ekpebie na ọ ga-alụ di, o meghị mmehie. Ma chezie echiche ma ị ga-ebulitekwa nsogbu nke ya na mkpebi gị so nꞌoge a.29Ihe unu kwesịrị ịmata bụ na oge anyị nwere nꞌụwa a fọdụrụ nanị ntakịrị, nꞌihi nke a, ka ndị nwere di na nwụnye bụrụ ndị ji oge ha nile na-arụ ọrụ Chineke.30Ka ndị na-akwa akwa bie ndụ dị ka ndị na-enweghị obi ọjọọ ọ bụla, ka ndị na-achị ọchị dịrị ka ndị obi na-adịghị atọ ụtọ. Ka ndị na-azụ ahịa dịrị dị ka ndị na-enweghị ngwa ahịa ọ bụla.31Ka ndị na-etinye oge nꞌihe ụtọ nke ụwa hapụ ibi ndụ ịchọ iritecha ihe nile dị nꞌụwa nꞌuru. Nꞌihi na ụwa a, otu ọ dị ugbu a, bụ ihe na-agabiga agabiga.32Nꞌime ihe nile unu na-eme, unu emela ihe ga-ewetara unu oke echiche. Nwoke na-alụbeghị nwanyị nwere ohere iji oge ya nile rụọra Onyenwe anyị ọrụ. O nwekwara ohere ịgbalịsị ike ime ihe ga-atọ Chineke ụtọ.33Ma nwoke nwere nwụnye enwezighị ohere ịrụrụ Onyenwe anyị ọrụ nꞌihi na echiche ya nile na ihe na-agụ ya agụụ bụ igbo mkpa dị nꞌezinụlọ ya, na ime ihe ga-atọ nwụnye ya ụtọ.34Nꞌụzọ dị otu a, ọ na-enwekwa obi abụọ nꞌihe ọ bụla ọ chọrọ ime. Otu a ka ọ dịkwa nwagbọghọ lụrụ di. Echiche ya nile bụ ime ka ihe dị nꞌezinụlọ ya dị mma, na ime ihe ga-atọ di ya ụtọ. Ma ọchịchọ nwagbọghọ na-enweghị di bụ ime ihe ga-atọ Chineke ụtọ.35Ihe m na-eme abụghị ịgbalị igbochi unu ịlụ di ma ọ bụ nwụnye, kama ọ bụ inyere unu aka. Ya mere, achọrọ m ka unu mee ihe ahụ unu maara ga-enyere unu aka iji otu obi rụọra Chineke ọrụ.36Ọ bụrụkwa na nwoke ọ bụla ekpebie ịlụ nwụnye nꞌihi na o siiri ya ike ijide onwe ya nꞌihi agụụ mmekọrịta nke nwoke na nwanyị na-agụ ya, o meghị mmehie ọ bụla ma ọ lụọ nwụnye.37Ma ọ bụrụ na nwoke ekpebie nꞌobi ya na ọ gaghị alụ nwụnye ma nweekwa ike ijide onwe ya aka, ọ bụ ihe dị mma ka o mere.38Ya mere, onye ahụ lụrụ di ma ọ bụ nwụnye mere nke ọma, ma onye kpebikwara na ọ gaghị alụ mekwara nke ọma karịa.39Njikọta e jikọtara nwụnye na di ya na-adị ire nanị mgbe di nwanyị dị ndụ. Ọ bụrụ na di ya anwụọ o nwere ike ịlụ di ọzọ ma ọ bụrụ na ọ lụọ nanị onye nke Kraịst.40Nꞌuche m, ọ ga-enwe ọṅụ nꞌobi ya karịa ma ọ bụrụ na ọ lụghị di ọzọ. Ana m echekwa na ndụmọdụ ndị a m nyere unu si na Mmụọ Chineke bịa.Igbo Bible 1988 No Data Igbo Bible 1988 1 KỌRINT 7 00:00:00 00:00:00 0.5x 2.0x https://beblia.bible:81/BibleAudio/igbo1988/1corinthians/007.mp3 16 7