× Asụsụ Europe Russian Belarusian Asụsụ Ukraine Asụsụ Polish Serbian Bulgaria Asụsụ Slovakian Czech Asụsụ Romania Moldovian Azebaịjan Armenia Onye Georgia Albania Avar Bashkir Tatar Chechen Asụsụ Slovenian Asụsụ Croatian Estonia Asụsụ Latvian Asụsụ Lithuania Asụsụ Hungary Asụsụ Finish Asụsụ Norway Asụsụ Sweden Asụsụ Iceland Grik Masedonia German Bavaria Asụsụ Dutch Asụsụ Danish Welsh Gaelic Asụsụ Aịrish French Basque Catalan .Talian Galacian Romani Bosnian North America Bekee South America Asụsụ Spanish Asụsụ Portuguese Guarani Asụsụ Quechuan Aymara Central America Onye Jamaica Asụsụ Nawatụl Kiche Qeqchi Asụsụ Haiti Ebe Ọwụwa Anyanwụ Eshia Chinese nke Ndị Japan Korean Mongolian Uyghur Hmong South East Asia Onye Malaysia Burmese Chin Asụsụ Nepali Cebuano Asụsụ Tagle Kambodia Thai Indoneshian Vietnam Asụsụ Javanese Lao Iban Iu Mien Kachin Lahu Aceh Balinese Bugis Pampanga Sasak Shan Waray South Asia Hindi Dia Awadhi Mizo Kannada Malayalam Marathi Gujarati Asụsụ Tamil Telugu Asụsụ Punjabi Kurukh Asụsụ Assam Maithili Asụsụ Bengali Asụsụ Urdu Sinhala Dogri Haryanvi Meitei Konkani Santalaị Sindhi Koya Thado Sanskrit Devanagari Adilabad Gondi Ahirani Balochi Bundeli Chhattisgarhi Garhwali Kangri Kumaoni Mewari Munda Sadri Seraiki Shekhawati Sylheti Etiti Asia Kyrgyz Asụsụ Uzbek Tajik Ndị Turkmen Kazakhstan Karakalpak Etiti ọwụwa anyanwụ Turkish Hibru Arabic Peshia Kurdi Pashto Coptic Africa Afrịka Xhosa Asụsụ Ndebele Akpan Asụsụ Amharik Wolaytta Onye Naijiria Mossi Ika Dinka Kabyle Ewe Asụsụ Swahili Morocco Asụsụ Somali Shona Madagaska Igbo Lingala Baoule Siswati Tsonga Tswana Onye Gambian Ndi Yoruba Kamba Kinyarwanda Hausa Chewa Luo Makua Dyula Fulfulde Kalenjin Kikọyu Kikwango Kirundi Krio Nigerian Pidgin Oromo Tshiluba Tshivenda Twi Umbundu Lugbara Luguru Pular Gussi Maasai Turkana Moba Nuer Shilluk Tamasheq Makonde Bemba Fon Hadiyya Ibibio Kimbundu Kimiiru Lango Liberian Kreyol Lomwe Mende Morisyen Ndau Nyankole Sena Sidamo Soga Songe Sukuma Tarifit Teso Tiv Zande Kọntinent Australia New Zealand Papua New Guinea Asụsụ Ochie Asụsụ Arameik Latin Esperanto 1 1 1 1988 Nsọ nʼIgbo 2020Bible Nso 200619881 1 1 1 KỌRINT MATIUMAKLUKJỌNỌLU OZIROM1 KỌRINT2 KỌRINTGALETIAEFESỌSFILIPAIKỌLỌSI1 TESALỌNAIKA2 TESALỌNAIKA1 TIMỌTI2 TIMỌTITAITỌSFAILIMONHIBRUJEMES1 PITA2 PITA1 JỌN2 JỌN3 JỌNJUDNKPUGHE1 1 1 9 123456789101112131415161 1 1 : 27 1234567891011121314151617181920212223242526271 1 1 Igbo Bible 1988 1 KỌRINT 9 Chekwaa ihe edeturu 1Abụ m onyeozi Kraịst, bụrụkwa onye nwe onwe m. Abụkwa m otu nꞌime ndị ji anya ha hụ Jisọs Onyenwe anyị. Ndụ ọhụrụ ahụ unu nwere ugbu a sitekwara nꞌọrụ Onyenwe anyị m rụrụ nꞌetiti unu.2Ọ bụrụ na ndị ọzọ asị na m abụghị onyeozi Kraịst, unu onwe unu maara na m bụ onyeozi Kraịst, nꞌihi na ọ bụ site nꞌọrụ m, dị ka onyeozi ya, ka unu ji bụrụ ndị kwere na Kraịst.3Mgbe ọ bụla ndị mmadụ na-ajụ ajụjụ banyere ihe m bụ, ihe a bụ ọsịsa m na-enye ha.4Ọ̀ bụ na o kwesịghị ekwesị na a ga-enye m ihe ruru m dị ka onyeozi Kraịst? Ọ̀ ga-abụ na enweghị m ike ịbata nꞌụlọ unu nọnyere unu, ka unu jiri nri unu zụọ m, dị ka ndị ozi Kraịst ọzọ na-eme?5A sịkwa na m nwere nwụnye, onye bụ onye Kraịst, ọ̀ bụ na m enweghị ike iduru ya gaa ebe ọ bụla m na-aga dị ka ndị ozi ọzọ na-eme, na dị ka ụmụnne Onyenwe anyị na Pita na-emekwa?6Ọ̀ ga-abụ nanị mụ na Banabas ga-anọgide na-arụpụtara onwe anyị ihe anyị ga na-eri, mgbe unu na-egboro ndị ọzọ mkpa ha?7Olee onye agha unu maara nke na-esi nꞌakpa ya akwụ onwe ya ụgwọ ọnwa? Ka ọ̀ dị onye ọrụ ubi unu maara nke na-adịghị eri mkpụrụ e si nꞌubi ya weta? Olee onye ọzụzụ atụrụ unu maara nke na-adịghị aṅụ mmiri ara e si nꞌatụrụ ọ na-azụ apịpụta?8Nꞌezie, anaghị m ekwu ihe a nꞌihi na ha bụ ihe na-eme ụbọchị nile nꞌetiti ndị mmadụ, kama akwụkwọ nsọ kwagidekwara ihe ndị a.9Nꞌihi na e dere ya nꞌakwụkwọ nsọ ahụ Chineke nyere Mosisi sị, “Ị gaghị ekechi ọnụ ehi nke na-arụ ọrụ nꞌubi gị, ime ka ọ ghara ịta ọka mgbe ọ na-azọcha mkpụrụ ọka.” Unu chere na ọ bụ nanị ehi ka Chineke bu nꞌobi kwuo okwu a?10É, è! O bukwa anyị nꞌobi kwuo ya. Nꞌezie, e dere ihe ndị a nꞌihi anyị, nꞌihi na onye kụrụ mkpụrụ nꞌubi na onye gara wee ihe dị nꞌubi ahụ, kwesịrị iketa oke site na mkpụrụ e si nꞌubi ahụ weta.11Mkpụrụ anyị kụrụ nꞌime obi unu bụ mkpụrụ nke mmụọ. Ọ̀ ga-abụ ihe ọjọọ ma anyị sị unu nyetụ anyị ihe oriri na akwa oyiyi unu?12Echere m na ọ bụ anyị kwesịrị isite nꞌaka unu nata ihe ndị a karịa ndị ọzọ a unu na-enye ihe ndị a. Ma ọ dịbeghị mgbe anyị rịọrọ unu ihe ọ bụla, kama anyị na-agbalịsi ike ịhụ na ọ dịghị ihe ga-egbochi unu iji ezi obi na-ege ntị nꞌozi ọma Kraịst nke anyị wetara.13Ma unu maara na ndị na-arụ ọrụ nꞌụlọ nsọ ukwu Chineke na-esi nꞌụlọ nsọ ahụ na-eweta ihe ha na-eri. Otu a kwa, ndị nchụaja na-eketakwa oke nꞌụfọdụ ihe ha ji chụọ aja.14Nꞌotu aka ahụ kwa, Chineke ekwuola na ndị nile na-ekwusa ozi ọma ya ga-esi nꞌozi ọma eweta nri ha ga-eri.15Ma ajụbeghị m unu ihe ọ bụla. Nꞌeziokwu, anaghị m ede akwụkwọ a ime ka unu bido izitere m ihe. Ọ ga-akara m mma na m nwụrụ karịa na m ga-ana unu ihe ọ bụla nꞌihi ozi ọma m na-ekwusara unu! Nke a bụ ihe m ji anya isi!16Ọ bụghị na ọ dị ihe ọzọ pụrụ iche ikwusa ozi ọma na-ewetara m. Enweghị m ike ịkwụsị ikwusa ozi ọma. Nꞌihi na ọ bụrụ na m akwụsị ikwusa ozi ọma, agaghị enwe udo na ọṅụ ọ bụla. Onye a bụrụ ọnụ ka m ga-abụ ma ọ bụrụ na m akwụsị ikwusa ozi ọma Onyenwe anyị.17A sị na m ji aka m họpụta onwe m ịrụ ọrụ a, agaara m enwe olileanya na Chineke ga-akwụ m ụgwọ ọnwa. Ma o sighị otu a dịrị. Ọ bụ Chineke nꞌonwe ya họpụtara m, nyefee m ọrụ nꞌaka. Ya mere, ọ bụ ọrụ nke m na-aghaghị ịrụ.18Ebe m na-arụ ya dị ka ọrụ m na-aghaghị ịrụ, gịnị bụ ụgwọ ọrụ m? Ụgwọ ọrụ m bụ ọṅụ m na-enwe site nꞌizisa ozi ọma a, na-anaghị onye ọ bụla ụgwọ ọrụ ọ bụla, ma ọ bụ ihe ruru m.19Site nꞌụzọ dị otu a, abụghị m ohu onye ọ bụla nꞌihi na o nweghị onye m nọ nꞌokpuru ya nke na-akwụ m ụgwọ ọrụ, kama abụ m onyenwe onwe ya. Ma emeela m onwe m ohu nye mmadụ nile ka m nwee ike site nꞌụzọ dị otu a rite ọtụtụ mkpụrụ obi nꞌuru nye Kraịst.20Mgbe ọ bụla m bịara nꞌetiti ndị Juu ana m eme dị ka onye Juu, ka m nwee ike nwetara Kraịst ụfọdụ nꞌime ha. Ọ bụ ezie na anọghị m nꞌokpuru iwu Mosisi, ma mgbe m nọ nꞌetiti ndị mba ọzọ ndị na-ebi ndụ dị ka usoro okpukpe iwu ndị Juu si dị, ana m emekwa dị ka m bụ otu nꞌime ndị nọ nꞌokpuru iwu, ka m si otu a nwee ike ikwusara ha ozi ọma, inyere ha aka.21Otu aka ahụ kwa, mgbe mụ na ndị mba ọzọ na-anọghị nꞌokpuru iwu nọkọrọ, ana m eme dị ka ha si eme ka m nwee ike site nꞌụzọ dị otu a mee ka ha mata Kraịst. Ma nke a apụtaghị na m na-akwụsị ime ihe Chineke na-achọ. Mba! Ana m emekwarị dị ka onye nọ nꞌokpuru iwu Kraịst.22Ọ bụrụkwa na mụ na ndị okwukwe ha na-esighị ike anọkọọ, ana m emekwa dị ka ha, ka m nwee ike mee ka ha mata Kraịst. Ee, otu ọ bụla mmadụ si dịrị, ana m agbalị chọọ ụzọ m ga-esi mee ka ọ nabata m, ka m nwee ike gwa ya ihe banyere Kraịst, Ka Kraịst zọpụta ya.23Ana m eme ihe ndị a ka ozi ọma nwee ike ruo ha nile ntị. Ana m emekwa ya nꞌihi ngọzi m na-enweta mgbe m na-ele ha ka ha na-anabata Jisọs dị ka Onyenwe ha na Onye nzọpụta ha.24Unu maara na mgbe ọtụtụ mmadụ na-agba ọsọ, nꞌoge a na-agba ọsọ ịsọ mpi, ọ bụ otu onye nanị na-enwe ihe onyinye nke mbụ. Ya mere, gbasienụ ọsọ ike, ka unu nweta ụdị onyinye ahụ.25Mgbe ọgba ọsọ na-ejikere ịgba ọsọ ya, ọ na-enwe ntachi obi nꞌọtụtụ ahụhụ nke ya na ọzụzụ so. Ma ọgba ọsọ a na-azụ onwe ya nanị ka o nweta okpu mmeri okoko osisi na-emebi emebi, ma ọ bụ iko ọlaọcha. Ma ọsọ anyị na-agba bụ ka anyị nweta okpu mmeri nke eluigwe nke na-adịghị emebi emebi.26Ọ bụ nke a mere m ji na-agba ọsọ a na-eleghị anya nꞌazụ, tutuu ruo mgbe m ruru na njedebe ije ahụ. Ana m alụsi ọgụ ike ka m nwee ike merie, dị ka ọkụ ọkpọ nke na-adịghị akụjọ akụjọ.27Dị ka ọgba ọsọ, ana m azụ ahụ m, na-enye ya ahụhụ, na-azụ ya ka ọ na-eme ihe kwesịrị ekwesị, ọ bụghị ihe ọ chọrọ ime. Nꞌihi na achọghị m ka ọ bụrụ na mgbe m gbalịsịrị ike mee ka ọtụtụ mmadụ bụrụ ndị na-eso nꞌọsọ a, mụ onwe m a bụrụ onye a jụrụ ajụ, nke na-agaghị enweta ihe a na-agbata nꞌọsọ.Igbo Bible 1988 No Data Igbo Bible 1988 1 KỌRINT 9 00:00:00 00:00:00 0.5x 2.0x https://beblia.bible:81/BibleAudio/igbo1988/1corinthians/009.mp3 16 9