× Asụsụ Europe Russian Belarusian Asụsụ Ukraine Asụsụ Polish Serbian Bulgaria Asụsụ Slovakian Czech Asụsụ Romania Moldovian Azebaịjan Armenia Onye Georgia Albania Avar Bashkir Tatar Chechen Asụsụ Slovenian Asụsụ Croatian Estonia Asụsụ Latvian Asụsụ Lithuania Asụsụ Hungary Asụsụ Finish Asụsụ Norway Asụsụ Sweden Asụsụ Iceland Grik Masedonia German Bavaria Asụsụ Dutch Asụsụ Danish Welsh Gaelic Asụsụ Aịrish French Basque Catalan .Talian Galacian Romani Bosnian Kabardian North America Bekee South America Asụsụ Spanish Asụsụ Portuguese Guarani Asụsụ Quechuan Aymara Central America Onye Jamaica Asụsụ Nawatụl Kiche Qeqchi Asụsụ Haiti Ebe Ọwụwa Anyanwụ Eshia Chinese nke Ndị Japan Korean Mongolian Uyghur Hmong Tibetian South East Asia Onye Malaysia Burmese Chin Asụsụ Nepali Cebuano Asụsụ Tagle Kambodia Thai Indoneshian Asụsụ Sundan Vietnam Asụsụ Javanese Lao Iban Iu Mien Kachin Lahu Aceh Balinese Bugis Pampanga Sasak Shan Waray Madurese South Asia Hindi Dia Awadhi Mizo Kannada Malayalam Marathi Gujarati Asụsụ Tamil Telugu Asụsụ Punjabi Kurukh Asụsụ Assam Maithili Asụsụ Bengali Asụsụ Urdu Sinhala Dogri Haryanvi Meitei Konkani Santalaị Sindhi Koya Thado Sanskrit Devanagari Adilabad Gondi Ahirani Balochi Bundeli Chhattisgarhi Garhwali Kangri Kumaoni Mewari Munda Sadri Seraiki Shekhawati Sylheti Bagri Bhilali Bodo Braj Tulu Etiti Asia Kyrgyz Asụsụ Uzbek Tajik Ndị Turkmen Kazakhstan Karakalpak Etiti ọwụwa anyanwụ Turkish Hibru Arabic Peshia Kurdi Mazanderani Pashto Coptic Africa Afrịka Xhosa Asụsụ Ndebele Akpan Asụsụ Amharik Wolaytta Onye Naijiria Mossi Ika Dinka Kabyle Ewe Asụsụ Swahili Morocco Asụsụ Somali Shona Madagaska Igbo Lingala Baoule Siswati Tsonga Tswana Onye Gambian Ndi Yoruba Kamba Kinyarwanda Hausa Chewa Luo Makua Dyula Fulfulde Kalenjin Kikọyu Kikwango Kirundi Krio Nigerian Pidgin Oromo Tshiluba Tshivenda Twi Umbundu Lugbara Luguru Pular Gussi Maasai Turkana Moba Nuer Shilluk Tamasheq Makonde Bemba Fon Hadiyya Ibibio Kimbundu Kimiiru Lango Liberian Kreyol Lomwe Mende Morisyen Ndau Nyankole Sena Sidamo Soga Songe Sukuma Tarifit Teso Tiv Zande Dagbani Edo Kituba Kọntinent Australia New Zealand Papua New Guinea Asụsụ Ochie Asụsụ Arameik Latin Esperanto 1 1 1 Igbo 1988 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo 2020Bible Nso 2006Igbo 19881 1 1 GALETIA MATIUMAKLUKJỌNỌLU OZIROM1 KỌRINT2 KỌRINTGALETIAEFESỌSFILIPAIKỌLỌSI1 TESALỌNAIKA2 TESALỌNAIKA1 TIMỌTI2 TIMỌTITAITỌSFAILIMONHIBRUJEMES1 PITA2 PITA1 JỌN2 JỌN3 JỌNJUDNKPUGHE1 1 1 1 1234561 1 1 : 1 12345678910111213141516171819202122231 1 1 Igbo Bible 1988 GALETIA 1 Chekwaa ihe edeturu 1Akwụkwọ ozi a si nꞌaka m, Pọl, onye a kpọrọ ịbụ onyeozi. Ọ bụghị mmadụ kpọrọ m ịbụ onyeozi, kama ọkpụkpọ m si nꞌaka Jisọs Kraịst na Chineke Nna, onye mere ka Kraịst site na dnị nwụrụ anwụ bilie.2Ndị sokwa m na-ede akwụkwọ a, bụ ụmụnna anyị nile ndị mụ na ha nọ nꞌebe a. Ọ bụkwa unu nzukọ Kraịst dị nꞌobodo Galetia ka anyị na-edetara akwụkwọ a.3Ka amara na udo nke na-esite nꞌaka Chineke bụ Nna anyị na nꞌaka Onyenwe anyị Jisọs Kraịst apụta dịnyere unu nile.4Ọ bụ Kraịst nwụrụ nꞌihi mmehie anyị dị ka Chineke Nna zubere na ọ ga-anwụ, ịgbapụta anyị site nꞌụwa ọjọọ a, nke anyị bi nꞌime ya.5Ka otuto dịrị Chineke ruo mgbe nile ebighị ebi. Amin.6O juru m anya, na unu esitela nꞌebe Chineke nọ wezuga onwe unu, na-agbaso ozi ọma ọzọ, nke na-abụghị ozi ọma Chineke, Onye jiri amara ya, na ịhụnanya ya, kpọbata unu, ime ka unu keta ndụ ebighị ebi ahụ ọ na-enye site na Kraịst.7Nꞌihi na ọ dịghị ozi ọma ọzọ dị, ma ọ bụghị nanị ozi ọma nzọpụta ahụ anyị kwusaara unu. Ma ụfọdụ mmadụ a, ndị na-agbanwe ozi ọma Kraịst, na eziokwu dị nꞌime ya, na-eduhie unu ime ka unu si nꞌezi ụzọ jehie.8Ka ikpe ọmụma Chineke dị nꞌisi onye ọ bụla, ma mụ onwe m kwa, nke ga-ekwusara unu ozi ọma ọzọ dị iche, karịa ozi ọma ahụ anyị kwusaara unu. Ee, ka ikpe ọmụma dịkwa, ọ bụladị nꞌisi mmụọ ozi ọ bụla si nꞌeluigwe bịa kwusaara unu ozi ọma ọzọ dị iche. Ka m kwuokwa ya ọzọ, “Ikpe ọmụma Chineke ga-adakwasị onye ọ bụla kwusaara unu ozi ọma dị iche, karịa ozi ọma ahụ anyị buru ụzọ kwusaara unu.”9Eji m aka na unu na-ahụ ugbu a, na achọghị m isite nꞌokwu ire ụtọ, mee ka unu nabata m, kama ihe m chọrọ bụ nanị ime ihe ga-atọ Chineke ụtọ. Nꞌihi na a sị na m chọrọ ime ihe ga-atọ ndị mmadụ ụtọ, agaraghị m abụ onye na-ejere Kraịst ozi.10Ụmụnna m, achọrọ m ime ka unu mata, na ozi ọma ahụ m kwusaara unu abụghị ihe mmadụ chepụtara nꞌuche ya, kama ọ bụ ihe si nꞌobi Chineke Nna anyị pụta.11Nꞌihi na anataghị m ozi ọma ahụ site nꞌaka mmadụ ọ bụla, ọ dịkwaghị onye ọ bụla ziri m ya, kama ọ bụ Jisọs Kraịst nꞌonwe ya bụ onye kpughere ya nye m.12Amaara m na unu amatala ihe banyere ndụ m nꞌoge gara aga, otu m si bụrụ onye weere onwe ya nye nꞌihi ofufe ndị Juu, na otu m siri sogbuo nzukọ Kraịst nꞌebe nile, ma gbalịsiekwa ike imegide ya.13Abụ m otu nꞌime ndị a maara aha ha nꞌetiti ndị ọgbọ m, nꞌihe banyere ofufe ndị Juu. Enwekwara m oke ịnụ ọkụ nꞌobi ịgbaso, na idebezu ụkpụrụ na omenala ofufe ndị Juu, nke nna nna anyị ha nyere anyị nꞌaka idebe.14Ma mgbe m na-eme ihe ndị a, ọ dị otu ihe mere. Nꞌihi na tupuu a mụpụta m site nꞌafọ nne m, Chineke esitelarị nꞌamara ya họpụta m, ịbụ onye nke ya. O sitekwara nꞌamara ya kpọọ m ka m bụrụ onyeozi ya.15Chineke mere ka m mata Ọkpara ya, ka m nwee ike ikwusara ndị mba ọzọ ozi ọma banyere ya. Mgbe Chineke zipụrụ m ikwusa ozi ọma ya nꞌetiti ndị mba ọzọ, o nweghị onye ọ bụla m jewkuru ka o zi m ihe ọ bụla.16Agaghị m Jerusalem ịhụ ndị buru m ụzọ bụrụ ndị ozi, kama e jere m nꞌime ọzara Arebia. Mgbe m nọchasịrị nꞌebe ahụ, alọghachiri m azụ nꞌobodo Damaskọs.17Ọ bụ mgbe afọ atọ gasịrị, ka m gara Jerusalem ileta Pita. Mụ na ya nọkọrọ ụbọchị iri na ise nꞌime Jerusalem.18Ma ọ dịkwaghị onyeozi ọzọ mụ na ya hụrụ anya, karịa kwa Jemes nwanne Onyenwe anyị Jisọs.19Ana m agwa unu okwu a nꞌihu Chineke, onye maara na ha bụ eziokwu. Ihe ndị a m na-edegara unu abụghị okwu ụgha.20Mgbe m si Jerusalem pụta, agara m Siria na Silisia.21Ma ndị Kraịst nọ na chọọchị nile dị nꞌala Judia amaghị onye m bụ.22Ihe ha ma banyere m, bụ nanị ihe ndị ọzọ gwara ha, na “Onye ahụ na-esogbu ndị na-eso ụzọ Jisọs Kraịst nꞌoge gara aga, na-ekwusazi ozi ọma ahụ ọ gbalịsịri ike imegide nꞌoge ahụ.”23Ha nyere Chineke otuto nꞌihi na echegharịala m.Igbo Bible 1988 No Data Igbo Bible 1988 GALETIA 1 00:00:00 00:00:00 0.5x 2.0x https://beblia.bible:81/BibleAudio/igbo1988/galatians/001.mp3 6 1