× Asụsụ Europe Russian Belarusian Asụsụ Ukraine Asụsụ Polish Serbian Bulgaria Asụsụ Slovakian Czech Asụsụ Romania Moldovian Azebaịjan Armenia Onye Georgia Albania Avar Bashkir Tatar Chechen Asụsụ Slovenian Asụsụ Croatian Estonia Asụsụ Latvian Asụsụ Lithuania Asụsụ Hungary Asụsụ Finish Asụsụ Norway Asụsụ Sweden Asụsụ Iceland Grik Masedonia German Bavaria Asụsụ Dutch Asụsụ Danish Welsh Gaelic Asụsụ Aịrish French Basque Catalan .Talian Galacian Romani Bosnian North America Bekee South America Asụsụ Spanish Asụsụ Portuguese Guarani Asụsụ Quechuan Aymara Central America Onye Jamaica Asụsụ Nawatụl Kiche Qeqchi Asụsụ Haiti Ebe Ọwụwa Anyanwụ Eshia Chinese nke Ndị Japan Korean Mongolian Uyghur Hmong South East Asia Onye Malaysia Burmese Chin Asụsụ Nepali Cebuano Asụsụ Tagle Kambodia Thai Indoneshian Vietnam Asụsụ Javanese Lao Iban Iu Mien Kachin Lahu Aceh Balinese Bugis Pampanga Sasak Shan Waray South Asia Hindi Dia Awadhi Mizo Kannada Malayalam Marathi Gujarati Asụsụ Tamil Telugu Asụsụ Punjabi Kurukh Asụsụ Assam Maithili Asụsụ Bengali Asụsụ Urdu Sinhala Dogri Haryanvi Meitei Konkani Santalaị Sindhi Koya Thado Sanskrit Devanagari Adilabad Gondi Ahirani Balochi Bundeli Chhattisgarhi Garhwali Kangri Kumaoni Mewari Munda Sadri Seraiki Shekhawati Sylheti Etiti Asia Kyrgyz Asụsụ Uzbek Tajik Ndị Turkmen Kazakhstan Karakalpak Etiti ọwụwa anyanwụ Turkish Hibru Arabic Peshia Kurdi Pashto Coptic Africa Afrịka Xhosa Asụsụ Ndebele Akpan Asụsụ Amharik Wolaytta Onye Naijiria Mossi Ika Dinka Kabyle Ewe Asụsụ Swahili Morocco Asụsụ Somali Shona Madagaska Igbo Lingala Baoule Siswati Tsonga Tswana Onye Gambian Ndi Yoruba Kamba Kinyarwanda Hausa Chewa Luo Makua Dyula Fulfulde Kalenjin Kikọyu Kikwango Kirundi Krio Nigerian Pidgin Oromo Tshiluba Tshivenda Twi Umbundu Lugbara Luguru Pular Gussi Maasai Turkana Moba Nuer Shilluk Tamasheq Makonde Bemba Fon Hadiyya Ibibio Kimbundu Kimiiru Lango Liberian Kreyol Lomwe Mende Morisyen Ndau Nyankole Sena Sidamo Soga Songe Sukuma Tarifit Teso Tiv Zande Kọntinent Australia New Zealand Papua New Guinea Asụsụ Ochie Asụsụ Arameik Latin Esperanto 1 1 1 1988 Nsọ nʼIgbo 2020Bible Nso 200619881 1 1 GALETIA MATIUMAKLUKJỌNỌLU OZIROM1 KỌRINT2 KỌRINTGALETIAEFESỌSFILIPAIKỌLỌSI1 TESALỌNAIKA2 TESALỌNAIKA1 TIMỌTI2 TIMỌTITAITỌSFAILIMONHIBRUJEMES1 PITA2 PITA1 JỌN2 JỌN3 JỌNJUDNKPUGHE1 1 1 2 1234561 1 1 : 20 1234567891011121314151617181920211 1 1 Igbo Bible 1988 GALETIA 2 Chekwaa ihe edeturu 1Mgbe afọ iri na anọ gasịrị, ejeghachiri m Jerusalem ọzọ. Mụ na Banabas na Taitọs so laghachi Jerusalem nke ugbu abụọ a.2Agara m Jerusalem nꞌihi na ọ bụ uche Chineke ka m gaa. Na nzukọ nzuzo nke mụ na ndị ndu nwere, akọwaara m ha ihe banyere ozi ọma nke m na-ekwusa nꞌetiti ndị mba ọzọ. Nꞌihi na achọghị m ka ọrụ nile m rụrụ nꞌoge gara aga, na ọrụ m na-arụ ugbu a, bụrụ ihe efu.3Ma ọ bụ ezie na Taitọs onye mba ọzọ so m gaa ije a, ndị isi nọ na Jerusalem akwagideghị ka e bie ya ugwu.4Okwu banyere obibi ugwu agaraghị adapụta, ma ọ bụghị na e nwere ndị kpọrọ onwe ha ndị Kraịst, ndị na-abụkwaghị ndị Kraịst nꞌezie, ndị batara nꞌọgbakọ ahụ na nzuzo. Ndị a batara inyocha ụdị inwe onwe anyị nke anyị nwere nꞌime Kraịst Jisọs, na ịchọpụta ma anyị na-erubekwa isi nꞌiwu ndị Juu. Ndị a gbalịrị iji iwu ndị Juu kee anyị agbụ ime anyị ka anyị bụrụ ndị ohu nke iwu ahụ.5Ma o nweghị oge anyị ji gee ntị nꞌihe ha kwuru, nꞌihi na anyị chọrọ ichedo eziokwu ahụ dị nꞌozi ọma ka a ghara ịgwa ya ihe ọ bụla.6Ndị isi chọọchị nile nọ nꞌebe ahụ, atụkwasịghị ihe ọ bụla nꞌozi ọma m na-ekwusa nꞌetiti ndị mba ọzọ. Ma ihe banyere ọnọdụ ha dị ka ndị ozi emetụghị m nꞌobi, nꞌihi na anyị nile bụ otu nꞌihu Chineke.7Kama, mgbe Pita, Jemes na Jọn, ndị bụ ndị isi chọọchị hụrụ otu Chineke si jiri m rụọ ọrụ, ikwusa ozi ọma nꞌetiti ndị mba ọzọ, dị ka Chineke nꞌonwe ya si gọzie Pita, nꞌọrụ ikwusa ozi ọma nꞌetiti ndị Juu, nꞌihi na ọ bụ otu Chineke ahụ nyere Pita onyinye ikwusa ozi ọma nꞌetiti ndị Juu, nyekwa m onyinye ikwusa ozi ọma nꞌetiti ndị mba ọzọ, ndị isi ahụ nile nara mu na Banabas aka, gbaa anyị ume, sị anyị gaa nꞌihu nꞌọrụ anyị, ikwusa ozi ọma nꞌetiti ndị mba ọzọ, ka ha onwe ha kwa gaa nꞌihu ịrụ ọrụ nke ha nꞌetiti ndị Juu.8***9***10Kama nanị otu ihe ha rịọrọ anyị, bụ ka anyị cheta inyere ndị ogbenye aka. Nke a bụkwa ihe m na-achọsi ike inyere ha aka.11Ma mgbe Pita bịaruru Antiọk, atara m ya ụta nke ukwuu nꞌihu ụmụ Chineke nile, nꞌihi na ihe o mere jọrọ njọ nke ukwuu.12Nꞌihi na mgbe o buru ụzọ bịa Antiọk, Pita na ụmụnna anyị ndị a na-ebighị ugwu, na-erikọta nri. Ma mgbe ndị Juu, ndị Jemes zitere, bịaruru Antiọk, Pita ekwekwaghị iso ndị mba ọzọ ahụ rikọọ nri, nꞌihi na ọ na-atụ egwu ihe ndị Juu a bu iwu nꞌisi, ndị sị na ọ dị mkpa ibi mmadụ ugwu tupuu a zọpụta ya, ga-ekwu.13Nꞌihi ihe a Pita mere, ndị Juu nile bụ ndị Kraịst so anyị nọdụ nꞌebe ahụ, sooro nzọ ụkwụ Pita, mee ihe o mere, jụ iso ndị a irikọta nri, si otu a ghọọ ndị ihu abụọ.14Mgbe m hụrụ ihe ọjọọ a ha na-eme, hụ na ha adịghị agazi ije dị ka eziokwu nke ozi ọma ahụ si dị, agwara m Pita okwu nꞌihu ha nile, sị, “Ọ bụ ezie na ị bụ onye Juu site nꞌọmụmụ a mụrụ gị, ma ị kwụsịla idebe iwu ndị Juu, gịnị mere i ji na-agbalị ugbu a ime ka ndị mba ọzọ a debe iwu ndị Juu ahụ ị jụrụ ajụ?”15Ọ bụ ezie na anyị bụ ndị Juu site nꞌọmụmụ a mụrụ anyị, ọ bụ ezie na anyị abụkwaghị ndị mba ọzọ na-ebi ndụ mmehie,16ma anyị bụ ndị Juu maara na mmadụ ọ bụla na Chineke enweghị ike ịdị nꞌudo, site nꞌidebe iwu ndị Juu, kama, na udo na-adị nꞌetiti Chineke na mmadụ nanị site nꞌokwukwe anyị nwere na Jisọs ịsachapụ mmehie anyị. Ọ bụ nke a mere anyị ji kwere na Jisọs Kraịst, ka e mee ka Chineke nabata anyị, site nꞌokwukwe anyị, ọ bụghị nꞌihi na anyị debere iwu ndị Juu. Nꞌihi na o nweghị onye ọ bụla a ga-azọpụta nꞌihi na o debere iwu ndị Juu.17Ọ bụrụ na anyị atụkwasị Kraịst obi ka ọ zọpụta anyị, mesịa chọpụta na anyị jehiere ụzọ ịtụkwasị ya obi, nꞌihi na nzọpụta dị nanị mgbe e biri anyị ugwu, na mgbe anyị debere iwu ndị Juu, ọ̀ gaghị abụ ihe ziri ezi ma ọ bụrụ na anyị ekwuo na okwukwe anyị nwere na Kraịst abụrụla ihe wetaara anyị ịla nꞌiyi? Ma Chineke ekwela na mmadụ ga-eche ụdị echiche a banyere Onyenwe anyị.18Kama aga m abụ onye na-emebi iwu ma ọ bụrụ na m ebido na-akwalị ozizi ochie ahụ m na-agbalị ịla nꞌiyi, bụ ozizi nke na-asị na nzọpụta na-adịrị nanị ndị debere iwu ndị Juu.19Nꞌihi na abụ m onye nwụrụ anwụ nꞌebe iwu dị. Ee, ọ bụ iwu mere ka m nwụọ, ka m si otu a bụrụ onye na-adị ndụ nye Chineke. A kpọgidekọtala mụ na Kraịst nꞌobe,20ọ bụkwaghị mụ onwe m na-adị ndụ ugbu a, kama ọ bụ Kraịst na-adị ndụ ya nꞌime m. Ndụ ahụ nke m na-adị ugbu a, nꞌanụ ahụ m, bụ nke m na-adị nꞌihi okwukwe m nwere nꞌime Ọkpara Chineke, onye hụrụ m nꞌanya, ma werekwa onwe ya nye ka a kpọgide ya nꞌobe nꞌihi m.21Ugbu a abụkwaghị m otu nꞌime ndị na-akpọ ọnwụ Kraịst ihe na-enweghị isi. Nꞌihi na a sị na a pụrụ ịzọpụta anyị site nꞌidebe iwu ọ garaghị adị mkpa na Kraịst ga-abịa nwụọ.Igbo Bible 1988 No Data Igbo Bible 1988 GALETIA 2 00:00:00 00:00:00 0.5x 2.0x https://beblia.bible:81/BibleAudio/igbo1988/galatians/002.mp3 6 2