× Asụsụ Europe Russian Belarusian Asụsụ Ukraine Asụsụ Polish Serbian Bulgaria Asụsụ Slovakian Czech Asụsụ Romania Moldovian Azebaịjan Armenia Onye Georgia Albania Avar Bashkir Tatar Chechen Asụsụ Slovenian Asụsụ Croatian Estonia Asụsụ Latvian Asụsụ Lithuania Asụsụ Hungary Asụsụ Finish Asụsụ Norway Asụsụ Sweden Asụsụ Iceland Grik Masedonia German Bavaria Asụsụ Dutch Asụsụ Danish Welsh Gaelic Asụsụ Aịrish French Basque Catalan .Talian Galacian Romani Bosnian North America Bekee South America Asụsụ Spanish Asụsụ Portuguese Guarani Asụsụ Quechuan Aymara Central America Onye Jamaica Asụsụ Nawatụl Kiche Qeqchi Asụsụ Haiti Ebe Ọwụwa Anyanwụ Eshia Chinese nke Ndị Japan Korean Mongolian Uyghur Hmong South East Asia Onye Malaysia Burmese Chin Asụsụ Nepali Cebuano Asụsụ Tagle Kambodia Thai Indoneshian Vietnam Asụsụ Javanese Lao Iban Iu Mien Kachin Lahu Aceh Balinese Bugis Pampanga Sasak Shan Waray South Asia Hindi Dia Awadhi Mizo Kannada Malayalam Marathi Gujarati Asụsụ Tamil Telugu Asụsụ Punjabi Kurukh Asụsụ Assam Maithili Asụsụ Bengali Asụsụ Urdu Sinhala Dogri Haryanvi Meitei Konkani Santalaị Sindhi Koya Thado Sanskrit Devanagari Adilabad Gondi Ahirani Balochi Bundeli Chhattisgarhi Garhwali Kangri Kumaoni Mewari Munda Sadri Seraiki Shekhawati Sylheti Etiti Asia Kyrgyz Asụsụ Uzbek Tajik Ndị Turkmen Kazakhstan Karakalpak Etiti ọwụwa anyanwụ Turkish Hibru Arabic Peshia Kurdi Pashto Coptic Africa Afrịka Xhosa Asụsụ Ndebele Akpan Asụsụ Amharik Wolaytta Onye Naijiria Mossi Ika Dinka Kabyle Ewe Asụsụ Swahili Morocco Asụsụ Somali Shona Madagaska Igbo Lingala Baoule Siswati Tsonga Tswana Onye Gambian Ndi Yoruba Kamba Kinyarwanda Hausa Chewa Luo Makua Dyula Fulfulde Kalenjin Kikọyu Kikwango Kirundi Krio Nigerian Pidgin Oromo Tshiluba Tshivenda Twi Umbundu Lugbara Luguru Pular Gussi Maasai Turkana Moba Nuer Shilluk Tamasheq Makonde Bemba Fon Hadiyya Ibibio Kimbundu Kimiiru Lango Liberian Kreyol Lomwe Mende Morisyen Ndau Nyankole Sena Sidamo Soga Songe Sukuma Tarifit Teso Tiv Zande Kọntinent Australia New Zealand Papua New Guinea Asụsụ Ochie Asụsụ Arameik Latin Esperanto 1 1 1 1988 Nsọ nʼIgbo 2020Bible Nso 200619881 1 1 GALETIA MATIUMAKLUKJỌNỌLU OZIROM1 KỌRINT2 KỌRINTGALETIAEFESỌSFILIPAIKỌLỌSI1 TESALỌNAIKA2 TESALỌNAIKA1 TIMỌTI2 TIMỌTITAITỌSFAILIMONHIBRUJEMES1 PITA2 PITA1 JỌN2 JỌN3 JỌNJUDNKPUGHE1 1 1 5 1234561 1 1 : 19 12345678910111213141516171819202122232425261 1 1 Igbo Bible 1988 GALETIA 5 Chekwaa ihe edeturu 1Ugbu a, Kraịst emeela ka anyị pụọ nꞌohu. Ya mere, gbalịanụ ịhụ na unu nọ dị ka ndị nwe onwe ha. Unu alaghachikwala azụ idebe iwu na omenala ndị Juu.2Geenụ m ntị! Mụ onwe m bụ Pọl na-agwa unu nke a. Ọ bụrụ na unu echee na obibi ugwu na idebe iwu ndị Juu ga-eme ka unu bụrụ ndị ezi omume nꞌihu Chineke, Kraịst enweghị ike ịzọpụta unu.3Ka m kwuokwa ya ọzọ. Onye ọ bụla kweere ka e bie ya ugwu, nꞌihi na ọ chọrọ ka Chineke si otu a nabata ya, aghaghị idebezu iwu nile ndị Juu, ma ọ bụrụ na ọ chọghị ịla nꞌiyi.4Kraịst agaghị abara unu uru, ma ọ bụrụ na olileanya unu bụ isite nꞌidebe iwu bụrụ ndị Chineke ga-anabata. Unu abụrụla ndị furu efu nꞌebe amara Chineke dị.5Ma anyị onwe anyị na-esite nꞌinyeaka nke Mmụọ Nsọ na-enwe olileanya na ọnwụ Kraịst nwụrụ asachapụla mmehie anyị, ime ka anyị na Chineke dịrị na mma.6Anyị, ndị Kraịst mere ka anyị keta oke na ndụ ebighị ebi, adịghị echegbu onwe anyị ma anyị bụ ndị e biri ugwu ma anyị abụghị. Anyị adịkwaghị echegbu onwe anyị ma anyị na-edebe iwu na omenala ndị Juu, ma anyị adịghị edebe ha. Ihe dị anyị mkpa bụ okwukwe nke si nꞌịhụnanya na-egosi onwe ya.7Unu naara ejezi ije okwukwe unu nke ọma, ònye bịara gbochie unu ịga nꞌihu nꞌije a?8Ọ pụtạra ìhè na ọ bụghị Chineke mere nke a nꞌihi na ọ bụ ya onwe ya kpọbatara unu nꞌọnọdụ inwe onwe unu nꞌime Kraịst.9Ma chetanụ na ọ bụ nanị otu mkpịsị aka na-arụta mmanụ nke na-emetụta mkpịsị aka ndị ọzọ.10Ana m atụkwasị Onyenwe anyị obi ka ọ kpọghachite unu nꞌọnọdụ okwukwe ahụ ga-eme ka unu kwenye nꞌihe nile dị ka m si kwenye na ha. Chineke ga-atakwa onye ahụ ahụhụ, bụ onye ahụ buteere unu nsogbu a, ma na-agbalị iduhie unu.11Ụfọdụ mmadụ dị ndị na-asị na m na-ekwusa na-asị na ibi mmadụ ugwu na idebe omenala ndị Juu dị mkpa tupuu azọpụta mmadụ. Ọ bụrụ nꞌezie na m na-ekwusa ihe dị otu a, agaghị m abụ onye a na-akpagbu, nꞌihi na ụdị okwu dị otu a adịghị ewetara onye na-ekwusa ya nsogbu. Ma ebe ọ bụ na a na-akpagbu m, o gosiri na ihe m na-ekwusa bụ na nzọpụta dị nanị site nꞌokwukwe nꞌobe Kraịst.12Ọ gaara atọ m ụtọ ma ọ bụrụ na ndị a chọrọ ka e bie unu ugwu ga-ebipụ onwe ha site nꞌebe unu nọ.13Nꞌihi na e meela ka unu nwere onwe unu, ụmụnna m, ma unu enweghị onwe unu ime ihe ọjọọ, kama Kraịst mere ka unu nwere onwe unu ime ka unu hụ ibe unu nꞌanya, na ijere ibe unu ozi.14Nꞌihi na ọ bụrụ na a chikọtaa iwu nile nꞌotu, ihe iwu nile na-ekwu bụ nke a, “Na-ahụnụ ndị ọzọ nꞌanya dị ka unu si hụ onwe unu nꞌanya.”15Ọ bụrụ na unu na-akọcha ibe unu, na-eji ọnụ unu na-ekwutọ ha, kama ịhụ ha nꞌanya, kpacharanụ anya. Jienụ onwe unu aka ka unu hapụ ịla onwe unu nꞌiyi.16Nke a bụ ndụmọdụ m na-enye unu. Kweenụ ka Mmụọ Nsọ na-achị ndụ unu, ịgwa unu ihe unu ga-eme, ma ọ bụ ebe unu ga-aga. Nke a ga-eme ka unu hapụ imezu ihe ọjọọ ndị ahụ anụ ahụ ochie unu chọrọ ka unu mee.17Nꞌihi na ihe anụ ahụ ochie anyị chọrọ bụ ime nanị ihe ọjọọ ahụ megidere ihe Mmụọ Nsọ chọrọ ka anyị mee. Ihe ọma ọ bụla anyị na-eme mgbe Mmụọ Nsọ na-achị ndụ anyị abụghị ihe ndụ anyị chọrọ. Ọchịchọ nke ndụ anyị na ọchịchọ nke Mmụọ Nsọ anaghị adakọta. Nke a mere o ji bụrụ na ịgba mgba na-adị mgbe nile nꞌuche anyị, mgbe anyị chọrọ ime ihe ọ bụla, nꞌihi na ọchịchọ nke Mmụọ Nsọ na ọchịchọ nke anụ ahụ anyị na-agbalị ịchị mkpebi anyị banyere ihe ọ bụla anyị chọrọ ime.18Ma ọ bụrụ na Mmụọ Nsọ na-edu unu, unu anọkwaghị nꞌokpuru iwu.19Mgbe ọ bụla kwa anyị na-agbaso ọchịchọ ọjọọ nile nke ndụ anyị, ọ bụ nanị ihe ọjọọ ndị a ga na-apụta ìhè na ndụ anyị: iche echiche na-adịghị ọcha, ịkwa iko na agụụ ịkwa iko.20Ikpere arụsị, iri amusu, ibu iro nꞌobi, na ịlụ ọgụ, ekworo na iwe, ịkpa iche iche, nkewa, ịhọ otu.21Ịkpọ asị, igbu ọchụ, ịṅụbiga mmanya oke, oke oriri na ihe ndị ọzọ yiri ha. Ma dị ka m gwara unu nꞌoge gara agwa, ndị na-eme ihe dị otu a agaghị abanye nꞌalaeze Chineke.22Ma mgbe Mmụọ Nsọ na-achị achị na ndụ anyị, ụdị ndụ a ga-apụta ìhè nꞌime anyị: ndụ ịhụnanya, na ọṅụ, na udo, na ogologo ntachi obi, na obi ọma, na ịdị mma, na ikwesị ntụkwasị obi, na23ịdị nwayọọ, na nke emebigaghị ihe oke. Ọ dịkwaghị iwu na-emegide ihe ndị a.24Ma ndị nile bụ ndị Kraịst akpọgidela anụ ahụ ha, ya na ọchịchọ ha nꞌelu obe.25Ọ bụrụkwa na anyị na-adị ndụ site nꞌike Mmụọ Nsọ, ka anyị soro nduzi na ntụzi Mmụọ Nsọ nꞌakụku nile nke ndụ anyị.26Mgbe anyị na-eso ụzọ a, anyị agaghị abụ ndị na-ele anya ka ndị ọzọ sọpụrụ anyị, ma ọ bụ too anyị, nꞌihi na nsọpụrụ na otuto dị otu a, na-ebute ekworo na obi ilu nꞌetiti anyị.Igbo Bible 1988 No Data Igbo Bible 1988 GALETIA 5 00:00:00 00:00:00 0.5x 2.0x https://beblia.bible:81/BibleAudio/igbo1988/galatians/005.mp3 6 5