× Asụsụ Europe Russian Belarusian Asụsụ Ukraine Asụsụ Polish Serbian Bulgaria Asụsụ Slovakian Czech Asụsụ Romania Moldovian Azebaịjan Armenia Onye Georgia Albania Avar Bashkir Tatar Chechen Asụsụ Slovenian Asụsụ Croatian Estonia Asụsụ Latvian Asụsụ Lithuania Asụsụ Hungary Asụsụ Finish Asụsụ Norway Asụsụ Sweden Asụsụ Iceland Grik Masedonia German Bavaria Asụsụ Dutch Asụsụ Danish Welsh Gaelic Asụsụ Aịrish French Basque Catalan .Talian Galacian Romani Bosnian Kabardian North America Bekee South America Asụsụ Spanish Asụsụ Portuguese Guarani Asụsụ Quechuan Aymara Central America Onye Jamaica Asụsụ Nawatụl Kiche Qeqchi Asụsụ Haiti Ebe Ọwụwa Anyanwụ Eshia Chinese nke Ndị Japan Korean Mongolian Uyghur Hmong Tibetian South East Asia Onye Malaysia Burmese Chin Asụsụ Nepali Cebuano Asụsụ Tagle Kambodia Thai Indoneshian Asụsụ Sundan Vietnam Asụsụ Javanese Lao Iban Iu Mien Kachin Lahu Aceh Balinese Bugis Pampanga Sasak Shan Waray Madurese South Asia Hindi Dia Awadhi Mizo Kannada Malayalam Marathi Gujarati Asụsụ Tamil Telugu Asụsụ Punjabi Kurukh Asụsụ Assam Maithili Asụsụ Bengali Asụsụ Urdu Sinhala Dogri Haryanvi Meitei Konkani Santalaị Sindhi Koya Thado Sanskrit Devanagari Adilabad Gondi Ahirani Balochi Bundeli Chhattisgarhi Garhwali Kangri Kumaoni Mewari Munda Sadri Seraiki Shekhawati Sylheti Bagri Bhilali Bodo Braj Tulu Etiti Asia Kyrgyz Asụsụ Uzbek Tajik Ndị Turkmen Kazakhstan Karakalpak Etiti ọwụwa anyanwụ Turkish Hibru Arabic Peshia Kurdi Mazanderani Pashto Coptic Africa Afrịka Xhosa Asụsụ Ndebele Akpan Asụsụ Amharik Wolaytta Onye Naijiria Mossi Ika Dinka Kabyle Ewe Asụsụ Swahili Morocco Asụsụ Somali Shona Madagaska Igbo Lingala Baoule Siswati Tsonga Tswana Onye Gambian Ndi Yoruba Kamba Kinyarwanda Hausa Chewa Luo Makua Dyula Fulfulde Kalenjin Kikọyu Kikwango Kirundi Krio Nigerian Pidgin Oromo Tshiluba Tshivenda Twi Umbundu Lugbara Luguru Pular Gussi Maasai Turkana Moba Nuer Shilluk Tamasheq Makonde Bemba Fon Hadiyya Ibibio Kimbundu Kimiiru Lango Liberian Kreyol Lomwe Mende Morisyen Ndau Nyankole Sena Sidamo Soga Songe Sukuma Tarifit Teso Tiv Zande Dagbani Edo Kituba Kọntinent Australia New Zealand Papua New Guinea Asụsụ Ochie Asụsụ Arameik Latin Esperanto 1 1 1 Igbo 1988 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo 2020Bible Nso 2006Igbo 19881 1 1 EFESỌS MATIUMAKLUKJỌNỌLU OZIROM1 KỌRINT2 KỌRINTGALETIAEFESỌSFILIPAIKỌLỌSI1 TESALỌNAIKA2 TESALỌNAIKA1 TIMỌTI2 TIMỌTITAITỌSFAILIMONHIBRUJEMES1 PITA2 PITA1 JỌN2 JỌN3 JỌNJUDNKPUGHE1 1 1 1 1234561 1 1 : 1 12345678910111213141516171819202122231 1 1 Igbo Bible 1988 EFESỌS 1 Chekwaa ihe edeturu 1Akwụkwọ ozi a sitere nꞌaka mụ onwe m bụ Pọl, onye Chineke họpụtara ịbụ onyeozi Jisọs Kraịst. Ọ bụ unu ka m na-edere ya, unu ụmụ Chineke bi nꞌEfesọs. Ee, ọ bụ unu ka m na-edere akwụkwọ a, unu bụ ụmụ Chineke kwesịrị ntụkwasị obi.2Ka amara na udo nke na-esite nꞌebe Chineke Nna anyị na nꞌebe Onyenwe anyị Jisọs Kraịst nọ dịrị unu.3Ka otuto dịrị Chineke, Onye bụ Nna Onyenwe anyị Jisọs Kraịst, nꞌihi na ọ gọziri anyị site nꞌinye anyị ngọzi nile nke eluigwe nꞌihi na anyị bụ nke Kraịst.4Nꞌihi na leenụ ihe Chineke meere anyị! Tupu o kee ụwa, ọ họpụtara anyị ịbụ ndị nke ya nꞌihi na ọ maara ihe Kraịst ga-emere anyị. Ọ họpụtara anyị ka o nwee ike mee anyị ndị dị nsọ na ndị na-agaghị enwe ịta ụta nꞌihu ya nꞌihi na ọ hụrụ anyị nꞌanya.5Ọ bụ rị uche ya ime anyị ụmụ ya site nꞌihe Kraịst ga-eme. Ma o mekwara ihe ndị a nile nꞌihi na ọ tọrọ ya ụtọ nꞌobi ime ya.6Ka anyị site na nke a too ya nꞌihi obi ọma ya bara ụba nke ukwuu, nke o gosiri anyị, na ihuọma ya, nke o mere ka o rute anyị aka nꞌihi na anyị bụ ndị nke Jisọs Kraịst, Nwa ya ọ hụrụ nꞌanya.7Lee otu obi ọma Chineke siri dị ukwuu nꞌebe anyị nọ! Nꞌihi na site nꞌọnwụ Kraịst, o mere ka anyị nwere onwe anyị. Ọ bụkwa site nꞌọnwụ Kraịst ka ọ gbaghaara anyị mmehie anyị.8Chineke egosila anyị ịba ụba nke amara ya. Nꞌihi na ọ maara anyị nke ọma. Ọ na-ewerekwa ihe kachasị mma nye ndụ anyị mgbe nile.9Chineke emeela ihe o zubere na ọ ga-eme. O meela ka nzube ya zoro ezo pụta ìhè site nꞌizite Kraịst. Nꞌihi na nke a bụ ihe o zubere site na mgbe ochie.10Nke a bụkwa ihe o zubere: Na mgbe oge ahụ ruru, ọ ga-akpọkọta ụmụ ya nile na ihe nile o kere nꞌeluigwe na nꞌụwa, ka Kraịst bụrụ isi ihe nile.11Nꞌihi na site nꞌihe Kraịst meere anyị, anyị abụrụla ndị ga-eso keta ihe ndị ahụ Chineke kwere nkwa inye Kraịst. Nꞌihi na Chineke họpụtara anyị site nꞌoge gara aga ịbụ nke ya. Ihe ndị a ga-emezukwa dị ka ọchịchọ Chineke siri dị.12Ya mere, ka anyị bụ ndị buru ụzọ tụkwasị Kraịst obi, too ebube Chineke nꞌihi ihe ndị a o meere anyị.13Nꞌihi na otu a ka ọ dịkwa unu onwe unu. Unu kweere nꞌozi ọma ahụ na-eweta nzọpụta mgbe unu nụrụ ya. Mgbe unu kwekwara, Chineke nyere unu Mmụọ Nsọ ya ka o biri nꞌime unu dị ka akara a kakwasịrị unu igosi na unu bụ ndị nke ya.14Mmụọ Nsọ nọkwa ọnọdụ dị ka ihe akaebe igosi na anyị ga-anata ihe nile Chineke kwere nkwa inye ndị ya. Mmụọ Nsọ a bụkwa ihe ga-eme ka anyị nwee obi siri ike na Chineke ga-arụzu ọrụ mgbapụta nke ndị ahụ nile bụ nke ya. Ya mere, ka anyị too ebube Chineke.15Ọ bụ nꞌihi ihe ndị a nile, site na mgbe m nụrụ akụkọ otu okwukwe unu siri sie ike nꞌime Onyenwe anyị Jisọs, nụkwa otu unu siri na-ahụ ndị kwere ekwe nọ ebe nile nꞌanya,16esepụghị m aka ikele Chineke ekele nꞌihi unu. Nꞌihi na mgbe nile ka m na-echeta unu nꞌekpere m nile,17na-arịọ Chineke nke Onyenwe anyị Jisọs Kraịst bụ Nna Onyenwe ebube nile, ka o nye unu mmụọ amamihe ka unu nwee ike ịhụ na ịghọtakwa nke ọma onye ọ bụ.18Ana m arịọkwa Chineke ka o meghee obi unu ka unu hụ ìhè ya, ka unu matakwa ụdị olileanya unu nwere nꞌihi ọkpụkpọ ọ kpọrọ unu. Ana m arịọkwa Chineke ka o nyere unu aka ịmata ụdị ngọzi ndị ahụ dị ebube o kwere nkwa inye ndị ya.19Ana m arịọkwa Chineke ka o mee ka unu ghọta na ike dị ukwuu nke na-arụ ọrụ nꞌime anyị bụkwa otu ike ahụ,20Chineke jiri kpọlite Kraịst site nꞌọnwụ, mee ya ka ọ nọdụ nꞌakụkụ aka nri ya nꞌeluigwe.21Nꞌebe ahụ ka Kraịst na-achị ndị ọchịchị nile nọ nꞌeluigwe, na ndị isi nile, na ndị nwere ike nile, na ndị nwe mmadụ nile. Ọkwa eze ya dị elu karịa ọkwa eze ndị dị ike nile nọ nꞌụwa a, na nꞌụwa ọzọ.22Chineke emeela ka ihe nile dị nꞌokpuru ike Kraịst, meekwa ya ka ọ bụrụ onyeisi ihe nile nke nzukọ ya bụ chọọchị.23Nꞌihi na chọọchị bụ anụ ahụ Kraịst. Ọ bụkwa ihe na-emezu Kraịst onye ya onwe ya bụ mmezu ihe nile nꞌebe nile.Igbo Bible 1988 No Data Igbo Bible 1988 EFESỌS 1 00:00:00 00:00:00 0.5x 2.0x https://beblia.bible:81/BibleAudio/igbo1988/ephesians/001.mp3 6 1