× Asụsụ Europe Russian Belarusian Asụsụ Ukraine Asụsụ Polish Serbian Bulgaria Asụsụ Slovakian Czech Asụsụ Romania Moldovian Azebaịjan Armenia Onye Georgia Albania Avar Bashkir Tatar Chechen Asụsụ Slovenian Asụsụ Croatian Estonia Asụsụ Latvian Asụsụ Lithuania Asụsụ Hungary Asụsụ Finish Asụsụ Norway Asụsụ Sweden Asụsụ Iceland Grik Masedonia German Bavaria Asụsụ Dutch Asụsụ Danish Welsh Gaelic Asụsụ Aịrish French Basque Catalan .Talian Galacian Romani Bosnian North America Bekee South America Asụsụ Spanish Asụsụ Portuguese Guarani Asụsụ Quechuan Aymara Central America Onye Jamaica Asụsụ Nawatụl Kiche Qeqchi Asụsụ Haiti Ebe Ọwụwa Anyanwụ Eshia Chinese nke Ndị Japan Korean Mongolian Uyghur Hmong South East Asia Onye Malaysia Burmese Chin Asụsụ Nepali Cebuano Asụsụ Tagle Kambodia Thai Indoneshian Vietnam Asụsụ Javanese Lao Iban Iu Mien Kachin Lahu Aceh Balinese Bugis Pampanga Sasak Shan Waray South Asia Hindi Dia Awadhi Mizo Kannada Malayalam Marathi Gujarati Asụsụ Tamil Telugu Asụsụ Punjabi Kurukh Asụsụ Assam Maithili Asụsụ Bengali Asụsụ Urdu Sinhala Dogri Haryanvi Meitei Konkani Santalaị Sindhi Koya Thado Sanskrit Devanagari Adilabad Gondi Ahirani Balochi Bundeli Chhattisgarhi Garhwali Kangri Kumaoni Mewari Munda Sadri Seraiki Shekhawati Sylheti Etiti Asia Kyrgyz Asụsụ Uzbek Tajik Ndị Turkmen Kazakhstan Karakalpak Etiti ọwụwa anyanwụ Turkish Hibru Arabic Peshia Kurdi Pashto Coptic Africa Afrịka Xhosa Asụsụ Ndebele Akpan Asụsụ Amharik Wolaytta Onye Naijiria Mossi Ika Dinka Kabyle Ewe Asụsụ Swahili Morocco Asụsụ Somali Shona Madagaska Igbo Lingala Baoule Siswati Tsonga Tswana Onye Gambian Ndi Yoruba Kamba Kinyarwanda Hausa Chewa Luo Makua Dyula Fulfulde Kalenjin Kikọyu Kikwango Kirundi Krio Nigerian Pidgin Oromo Tshiluba Tshivenda Twi Umbundu Lugbara Luguru Pular Gussi Maasai Turkana Moba Nuer Shilluk Tamasheq Makonde Bemba Fon Hadiyya Ibibio Kimbundu Kimiiru Lango Liberian Kreyol Lomwe Mende Morisyen Ndau Nyankole Sena Sidamo Soga Songe Sukuma Tarifit Teso Tiv Zande Kọntinent Australia New Zealand Papua New Guinea Asụsụ Ochie Asụsụ Arameik Latin Esperanto 1 1 1 1988 Nsọ nʼIgbo 2020Bible Nso 200619881 1 1 EFESỌS MATIUMAKLUKJỌNỌLU OZIROM1 KỌRINT2 KỌRINTGALETIAEFESỌSFILIPAIKỌLỌSI1 TESALỌNAIKA2 TESALỌNAIKA1 TIMỌTI2 TIMỌTITAITỌSFAILIMONHIBRUJEMES1 PITA2 PITA1 JỌN2 JỌN3 JỌNJUDNKPUGHE1 1 1 2 1234561 1 1 : 4 123456789101112131415161718192021221 1 1 Igbo Bible 1988 EFESỌS 2 Chekwaa ihe edeturu 1Na mgbe ochie, unu bụ ndị nwụrụ anwụ nꞌime mmụọ unu nꞌihi na ndụ unu jupụtara na mmehie na nnupụ isi. Ma Chineke emeela ka mmụọ unu dịkwa ndụ ọzọ.2Nꞌihi na unu bụ ndị biri na mmehie na mgbe ochie, na-agbaso ụzọ ọjọọ nile nke ụwa. Unu na-erubekwara ekwensu isi, onye na-achị mmụọ ọjọọ nile bi nꞌikuku, onye ya onwe ya bụ onye anya na-adịghị ahụ. Ọ bụkwa ekwensu na-achị ndị nile na-adịghị erubere Chineke isi.3Ọ bụkwa nꞌetiti ndị dị otu a ka anyị jegharịrị nꞌoge gara aga, na-agbaso ọchịchọ nile nke anụ ahụ ma na-emekwa ihe ọ bụla ahụ anyị na obi anyị chọrọ. Nꞌihi na site nꞌọdịdị anyị, anyị na ndị ọzọ nọ nꞌọmuma ikpe Chineke.4Ma ebere Chineke bara ụba nke ukwuu! Ịhụnanya ya nꞌebe anyị nọ dịkwa ukwuu!5Nꞌihi na mgbe mmụọ anyị nwụrụ anwụ nꞌime mmehie, Chineke nyekwara anyị ndụ ọzọ mgbe o mere ka Kraịst site nꞌọnwụ dịrị ndụ. Nꞌihi na ọ bụ site nꞌamara Chineke ka e jiri zọpụta anyị.6Dị ka o siri kpọlite Kraịst site nꞌọnwụ, otu a ka Chineke siri kpọlitekwa anyị site na ndụ ochie anyị, mee ka anyị soro Kraịst nọkọọ nꞌeluigwe.7Chineke mere nke a igosi ịdị ukwuu nke amara ya nꞌọgbọ nile, na igosi obi ọma ya nꞌebe anyị nọ nꞌime Kraịst.8Nꞌihi na ọ bụ site nꞌamara Chineke ka e ji zọpụta unu site nꞌokwukwe unu nwere nꞌime ya. Nke a esiteghị nꞌihe aka unu rụpụtara. Ọ bụ onyinye Chineke!9Ọ dịghị ihe ọ bụla unu pụrụ isite nꞌihi ya nyaa isi, ebe ọ bụ na nzọpụta a esiteghị nꞌihe unu jiri aka unu rụpụta.10Ọ bụ Chineke mere anyị ihe anyị bụ! O kere anyị ọhụrụ nꞌime Kraịst Jisọs ka anyị nwee ike ịrụ ọrụ ọma. Nꞌihi na ọ bụ otu a ka o siri kwadoo na anyị kwesịrị ibi ndụ ụbọchị nile.11Ya mere, chetanụ na unu bụ ndị mba ọzọ site nꞌọmụmụ nke a mụrụ unu. Chetakwanụ na ndị Juu ndị kpọrọ onwe ha ndị e biri ugwu, na-akpọkwa unu ndị a na-ebighị ugwu, nꞌihi ihe ndị a e mere ha nꞌanụ ahụ. Chetakwanụ ihe unu bụ nꞌoge gara aga.12Nꞌoge ahụ, ọ dịghị ihe jikọtara unu na Kraịst. Unu bụ ọbịa nꞌebe ụmụ Izirel ndị Chineke họpụtara nọ. Unu enweghị òke nꞌime ọgbụgba ndụ na nkwa nile Chineke nyere ụmụ Izirel. Unu biri nꞌụwa na-enweghị olileanya, na-enwekwaghị Chineke.13Ma ugbu a, site na njikọta e jikọtara unu na Kraịst, unu ndị nọ nꞌebe dị anya, ka e mere ka unu bịaruo Chineke nso site nꞌọbara Kraịst nke a wụsịrị.14Nꞌihi na Kraịst wetaara anyị udo. O mere ka ndị Juu na ndị mba ọzọ buru otu. Ọ kwaturu mgbidi kewera ha na mgbe ochie.15Ọ kagburu iwu ndị Juu ka o nwee ike mee ndị Juu na ndị mba ọzọ otu agbụrụ ndị e jikọtara ọnụ nꞌime ahụ ya. Site nꞌụzọ dị otu a, o mere ka udo dịrị.16Site nꞌọnwụ ya nꞌelu obe, o mere ka ekworo dị nꞌetiti ndị Juu na ndị mba ọzọ gwụsịa. Sitekwa nꞌọnwụ ya nꞌobe, o mekwara ha abụọ ka ha bụrụ otu. O sitekwara nꞌụzọ dị otu a mee ka ha bịaghachikwute Chineke.17Ya mere, Kraịst bịara kwusaa ozi ọma nye mmadụ nile. O kwusara ozi ọma nye ndị Juu nọ nso, na unu ndị mba ọzọ nọ nꞌebe dị anya.18Nꞌihi na ọ bụ site na Kraịst ka anyị nile, ndị Juu na ndị mba ọzọ, nwere ike ịbịa nꞌihu Chineke site nꞌotu Mmụọ ahụ.19Matakwanụ ugbu a na unu abụkwaghị ndị mba ọzọ na ndị ọbịa. Unu esorola ụmụ Chineke nile bụrụ diala nꞌezinụlọ Chineke.20Unu bụkwa ndị a na-ewusi ike nꞌokwukwe site na ntọ ala nke ndị ozi Kraịst na ndị amụma ya tọrọ. Kraịst bụkwa nkume dị mkpa na ntọ ala ahụ.21Kraịst bụkwa onye na-ejikọta ụlọ obibi ahụ nile nke ọma. Ọ bụkwa ya na-eme ka o too bụrụ ụlọ dị nsọ, nke e doro iche nye Chineke.22Ọ bụkwa nꞌime Kraịst ka a na-ewusi unu ike dị ka e si ewusi ndị ọzọ ike, ka unu nile bụrụ ebe obibi nke Chineke site na Mmụọ Nsọ.Igbo Bible 1988 No Data Igbo Bible 1988 EFESỌS 2 00:00:00 00:00:00 0.5x 2.0x https://beblia.bible:81/BibleAudio/igbo1988/ephesians/002.mp3 6 2