× Asụsụ Europe Russian Belarusian Asụsụ Ukraine Asụsụ Polish Serbian Bulgaria Asụsụ Slovakian Czech Asụsụ Romania Moldovian Azebaịjan Armenia Onye Georgia Albania Avar Bashkir Tatar Chechen Asụsụ Slovenian Asụsụ Croatian Estonia Asụsụ Latvian Asụsụ Lithuania Asụsụ Hungary Asụsụ Finish Asụsụ Norway Asụsụ Sweden Asụsụ Iceland Grik Masedonia German Bavaria Asụsụ Dutch Asụsụ Danish Welsh Gaelic Asụsụ Aịrish French Basque Catalan .Talian Galacian Romani Bosnian North America Bekee South America Asụsụ Spanish Asụsụ Portuguese Guarani Asụsụ Quechuan Aymara Central America Onye Jamaica Asụsụ Nawatụl Kiche Qeqchi Asụsụ Haiti Ebe Ọwụwa Anyanwụ Eshia Chinese nke Ndị Japan Korean Mongolian Uyghur Hmong South East Asia Onye Malaysia Burmese Chin Asụsụ Nepali Cebuano Asụsụ Tagle Kambodia Thai Indoneshian Vietnam Asụsụ Javanese Lao Iban Iu Mien Kachin Lahu Aceh Balinese Bugis Pampanga Sasak Shan Waray South Asia Hindi Dia Awadhi Mizo Kannada Malayalam Marathi Gujarati Asụsụ Tamil Telugu Asụsụ Punjabi Kurukh Asụsụ Assam Maithili Asụsụ Bengali Asụsụ Urdu Sinhala Dogri Haryanvi Meitei Konkani Santalaị Sindhi Koya Thado Sanskrit Devanagari Adilabad Gondi Ahirani Balochi Bundeli Chhattisgarhi Garhwali Kangri Kumaoni Mewari Munda Sadri Seraiki Shekhawati Sylheti Etiti Asia Kyrgyz Asụsụ Uzbek Tajik Ndị Turkmen Kazakhstan Karakalpak Etiti ọwụwa anyanwụ Turkish Hibru Arabic Peshia Kurdi Pashto Coptic Africa Afrịka Xhosa Asụsụ Ndebele Akpan Asụsụ Amharik Wolaytta Onye Naijiria Mossi Ika Dinka Kabyle Ewe Asụsụ Swahili Morocco Asụsụ Somali Shona Madagaska Igbo Lingala Baoule Siswati Tsonga Tswana Onye Gambian Ndi Yoruba Kamba Kinyarwanda Hausa Chewa Luo Makua Dyula Fulfulde Kalenjin Kikọyu Kikwango Kirundi Krio Nigerian Pidgin Oromo Tshiluba Tshivenda Twi Umbundu Lugbara Luguru Pular Gussi Maasai Turkana Moba Nuer Shilluk Tamasheq Makonde Bemba Fon Hadiyya Ibibio Kimbundu Kimiiru Lango Liberian Kreyol Lomwe Mende Morisyen Ndau Nyankole Sena Sidamo Soga Songe Sukuma Tarifit Teso Tiv Zande Kọntinent Australia New Zealand Papua New Guinea Asụsụ Ochie Asụsụ Arameik Latin Esperanto 1 1 1 1988 Nsọ nʼIgbo 2020Bible Nso 200619881 1 1 EFESỌS MATIUMAKLUKJỌNỌLU OZIROM1 KỌRINT2 KỌRINTGALETIAEFESỌSFILIPAIKỌLỌSI1 TESALỌNAIKA2 TESALỌNAIKA1 TIMỌTI2 TIMỌTITAITỌSFAILIMONHIBRUJEMES1 PITA2 PITA1 JỌN2 JỌN3 JỌNJUDNKPUGHE1 1 1 3 1234561 1 1 : 12 12345678910111213141516171819201 1 1 Igbo Bible 1988 EFESỌS 3 Chekwaa ihe edeturu 1Ọ bụ nꞌihi nke a ka mụ onwe m bụ Pọl, onye e tinyere nꞌụlọ mkpọrọ nꞌihi ikwusa ozi ọma Kraịst nye unu bụ ndị mba ọzọ, jiri na-ekpere Chineke ekpere.2Nꞌihi na echere m na unu nụrụ otu Chineke jiri site nꞌamara ya nye m ọrụ ikwusara unu ozi ọma.3Chineke kpughere nzube nzuzo ya nile nye m. Ọ bụkwa nke a ka m gwara unu ihe banyere ya nꞌokwu dị nta nꞌakwụkwọ ozi ahụ m detaara unu.4Ọ bụrụkwa na unu agụọ akwụkwọ ahụ m deere unu, unu ga-aghọta ụdị nghọta m nwere banyere ihe omimi nke Kraịst.5Nꞌoge gara aga o nweghị onye ọ bụla a gwara banyere ihe omimi a. Ma ugbu a Chineke ekpugheela ya nye ndị ozi ya dị nsọ na ndị amụma ya site nꞌike nke Mmụọ Nsọ.6Nke a bụkwa ihe omimi ahụ, na unu bụ ndị mba ọzọ ga-esoro ndị Juu keta ngọzi Chineke site nꞌịnụ na ịnabata ozi ọma ya. Na unu na ndị Juu ga-abụ otu anụ ahụ soro keta nkwa Chineke kwere nꞌime Kraịst.7Abụrụla m onye nkwusa ozi ọma a, nꞌihi na Chineke nyere m ọrụ a dị ka onyinye site nꞌịrụ ọrụ nke ike ya.8Ee, Chineke nyere m ọrụ a, mụ bụ onye dịkarịsịrị nta nꞌetiti ụmụ Chineke nile. Ma Chineke họpụtara m ịgwa ndị mba ọzọ ozi ọma banyere agwụghị agwụ nke akụ ebube ahụ pụrụ ịbụ nke ha site nꞌime Kraịst.9Chineke zikwara m ịkọwara mmadụ nile na Chineke bụkwa onye nzọpụta nke ndị mba ọzọ. Nꞌihi na nke a bụ ihe onye kere ihe nile zubere na nzuzo ime site na mbụ.10Gịnị mere Chineke jiri zube ime ihe ndị a? Ọ bụ nꞌihi na ọ chọrọ ka ndị mmụọ ozi nọ nꞌeluigwe mata ịba ụba nke amamihe ya nꞌụzọ dị iche iche dị ka o si na-arụpụta nzube ya nꞌime nzukọ Kraịst bụ chọọchị.11Na dị ka Chineke siri zubekwarị ime ya site na Jisọs Kraịst Onyenwe anyị.12Ya mere, mgbe anyị bịakwutere Kraịst tukwasị obi anyị nꞌime ya, anyị nwere ike ịbịa nꞌihu Chineke na-atụghị egwu nꞌihi na anyị maara na ọ ga-anabata anyị.13Ya mere, unu adala mba nꞌihi ahụhụ nke m na-ahụ ugbu a. Ha bụ nꞌihi ọdịmma unu.14Mgbe m nọdụrụ chee ihe banyere amamihe Chineke na ịdị ukwuu nke nzube ya, ana m ada nꞌala gbuo ikpere nꞌihu Nna Onyenwe anyị Jisọs Kraịst,15Onye ezinụlọ nile dị nꞌụwa a na nke dị nꞌeluigwe na-esite nꞌaka ya enwe aha.16Ana m arịọkwa Chineke ka o site nꞌịba ụba nke ebube ya nye unu ike na-esite na Mmụọ Nsọ ya bịa, ka unu bụrụ ndị dị ike nꞌime mmụọ unu.17Ana m arịọkwa ka Kraịst mee ka obi unu bụrụ ebe obibi ya site nꞌokwukwe unu nꞌime ya. Ana m arịọkwa ka Chineke mee ka unu bụrụ ndị gbara mgbọrọgwụ nꞌime ịhụnanya Chineke.18Ana m arịọkwa, ka unu na ndị Kraịst nile nwee ike ịghọta enweghị atụ nke ịba ụba na ịdị ukwu nke ịhụnanya Kraịst nꞌebe anyị nọ.19Ka unu mata, mazuokwa ụdị ịhụnanya Kraịst nwere nꞌebe anyị nọ. Ka unu bụrụkwa ndị e mere ka ha jupụta nꞌọdịdị Chineke nꞌonwe ya.20Ugbu a, ka otuto dịrị Chineke onye nwere ike imere anyị karịa ka anyị pụrụ ịrịọ ya, ma ọ bụ karịa ka anyị pụrụ ichepụta nꞌuche anyị, site nꞌike ya na-arụ ọrụ nꞌime anyị. Ka otuto dịrị ya nꞌime nzukọ ya bụ chọọchị na nꞌime Kraịst mgbe nile, na site mgbe ebighị ebi ruo ebighị ebi! Amin.Igbo Bible 1988 No Data Igbo Bible 1988 EFESỌS 3 00:00:00 00:00:00 0.5x 2.0x https://beblia.bible:81/BibleAudio/igbo1988/ephesians/003.mp3 6 3