× Asụsụ Europe Russian Belarusian Asụsụ Ukraine Asụsụ Polish Serbian Bulgaria Asụsụ Slovakian Czech Asụsụ Romania Moldovian Azebaịjan Armenia Onye Georgia Albania Avar Bashkir Tatar Chechen Asụsụ Slovenian Asụsụ Croatian Estonia Asụsụ Latvian Asụsụ Lithuania Asụsụ Hungary Asụsụ Finish Asụsụ Norway Asụsụ Sweden Asụsụ Iceland Grik Masedonia German Bavaria Asụsụ Dutch Asụsụ Danish Welsh Gaelic Asụsụ Aịrish French Basque Catalan .Talian Galacian Romani Bosnian North America Bekee South America Asụsụ Spanish Asụsụ Portuguese Guarani Asụsụ Quechuan Aymara Central America Onye Jamaica Asụsụ Nawatụl Kiche Qeqchi Asụsụ Haiti Ebe Ọwụwa Anyanwụ Eshia Chinese nke Ndị Japan Korean Mongolian Uyghur Hmong South East Asia Onye Malaysia Burmese Chin Asụsụ Nepali Cebuano Asụsụ Tagle Kambodia Thai Indoneshian Vietnam Asụsụ Javanese Lao Iban Iu Mien Kachin Lahu Aceh Balinese Bugis Pampanga Sasak Shan Waray South Asia Hindi Dia Awadhi Mizo Kannada Malayalam Marathi Gujarati Asụsụ Tamil Telugu Asụsụ Punjabi Kurukh Asụsụ Assam Maithili Asụsụ Bengali Asụsụ Urdu Sinhala Dogri Haryanvi Meitei Konkani Santalaị Sindhi Koya Thado Sanskrit Devanagari Adilabad Gondi Ahirani Balochi Bundeli Chhattisgarhi Garhwali Kangri Kumaoni Mewari Munda Sadri Seraiki Shekhawati Sylheti Etiti Asia Kyrgyz Asụsụ Uzbek Tajik Ndị Turkmen Kazakhstan Karakalpak Etiti ọwụwa anyanwụ Turkish Hibru Arabic Peshia Kurdi Pashto Coptic Africa Afrịka Xhosa Asụsụ Ndebele Akpan Asụsụ Amharik Wolaytta Onye Naijiria Mossi Ika Dinka Kabyle Ewe Asụsụ Swahili Morocco Asụsụ Somali Shona Madagaska Igbo Lingala Baoule Siswati Tsonga Tswana Onye Gambian Ndi Yoruba Kamba Kinyarwanda Hausa Chewa Luo Makua Dyula Fulfulde Kalenjin Kikọyu Kikwango Kirundi Krio Nigerian Pidgin Oromo Tshiluba Tshivenda Twi Umbundu Lugbara Luguru Pular Gussi Maasai Turkana Moba Nuer Shilluk Tamasheq Makonde Bemba Fon Hadiyya Ibibio Kimbundu Kimiiru Lango Liberian Kreyol Lomwe Mende Morisyen Ndau Nyankole Sena Sidamo Soga Songe Sukuma Tarifit Teso Tiv Zande Kọntinent Australia New Zealand Papua New Guinea Asụsụ Ochie Asụsụ Arameik Latin Esperanto 1 1 1 1988 Nsọ nʼIgbo 2020Bible Nso 200619881 1 1 EFESỌS MATIUMAKLUKJỌNỌLU OZIROM1 KỌRINT2 KỌRINTGALETIAEFESỌSFILIPAIKỌLỌSI1 TESALỌNAIKA2 TESALỌNAIKA1 TIMỌTI2 TIMỌTITAITỌSFAILIMONHIBRUJEMES1 PITA2 PITA1 JỌN2 JỌN3 JỌNJUDNKPUGHE1 1 1 4 1234561 1 1 : 15 12345678910111213141516171819202122232425262728293031321 1 1 Igbo Bible 1988 EFESỌS 4 Chekwaa ihe edeturu 1Ya mere, mụ onwe m bụ Pọl onye nọ nꞌụlọ mkpọrọ nꞌihi na m na-ejere Onyenwe anyị ozi, na-arịọ unu ka unu bie ndụ kwesịrị ọkpụkpọ Chineke kpọrọ unu ịnata ngọzi ndị a nile dị ebube.2Bụrụnụ ndị dị umeala nꞌobi, ndị dị nwayọọ na ndị na-enwe ntachi obi oge nile. Sitekwanụ nꞌịhụnanya na-anabatakwa ibe unu ọ bụladị mgbe ha mejọrọ unu.3Nọọnụ nꞌudo nꞌetiti onwe unu gbalịakwanụ ime ka ịdị nꞌotu unu dịgide nꞌime Mmụọ Nsọ.4Ọ bụ nanị otu anụ ahụ Kraịst dị, otu Mmụọ Nsọ dịkwa. Anyị nwekwara nanị otu olileanya nke Chineke debere nꞌihu anyị.5Ọ bụ nanị otu Onyenwe anyị dị, otu okwukwe na otu baptizim.6Ọ bụkwa nanị otu Chineke dị onye bụ Nna ihe nile na onye na-achị ihe nile, na onye na-arụ ọrụ ya nꞌime ihe nile, na-ebikwa nꞌime ihe nile.7Ma Chineke enyela anyị nile nꞌotu nꞌotu onyinye dị iche iche site nꞌụlọ akụ onyinye Kraịst.8Nꞌihi na dị ka akwụkwọ nsọ kwuru, “Mgbe ọ rigoro gaa nꞌelu, o duuru igwe ndị a dọtara nꞌagha, nyekwa ụmụ mmadụ onyinye.”9Lee na akwụkwọ nsọ kwuru na ọ rigoro nꞌeluigwe! Nke a na-egosi na o buru ụzọ site nꞌeluigwe rịdata jeruo na nsọtụ ala.10Onye ahụ si nꞌelu rịdata bụkwa otu onye ahụ rigoro nꞌelu, ka ọ bụrụ onye na-achị ihe nile nꞌebe nile.11Ọ bụkwa ya nyere ndị mmadụ onyinye. Ụfọdụ ka o nyere onyinye ịbụ ndị ozi, ndị ọzọ onyinye ịbụ ndị amụma, ndị ọzọ onyinye ikwusa ozi ọma, ndị ọzọ onyinye ịbụ ndị ụkọchukwu, ndị ọzọ onyinye ịbụ ndị ozizi.12Gịnị mere o jiri nye ha onyinye ndị a? O nyere onyinye ndị a ime ka ụmụ Chineke bụrụ ndị zuru oke ịrụrụ Chineke ọrụ iwuli nzukọ ya bụ ahụ Kraịst elu. Ka onye ọ bụla nꞌime ụmụ Chineke bụrụ ndị dị ike na ndị tozuru oke nꞌihe ọmụma,13tutuu anyị nile ekwekọtaa nꞌotu ihe ahụ banyere nzọpụta anyị, tutuu anyị enwee ọmụma ihe juru eju banyere Ọkpara Chineke. Na tutuu anyị abụrụ ndị tozuru oke nꞌime Onyenwe anyị, mgbe e mere ka ọdịdị Kraịst jupụta nꞌime anyị.14Mgbe ahụ anyị agaghị adịkwa ka ụmụntakịrị ndị na-agbanwe obi ha mgbe nile banyere ihe ha kweere nꞌime ya, mgbe ha nụrụ ihe ọzọ dị iche ma ọ bụ mgbe onye ọzọ jiri aghụghọ kwuo okwu ụgha nke ga-adị ka eziokwu.15Kama ka anyị gbasoo eziokwu site na mmụọ ịhụnanya, ka anyị gwarịtaa ibe anyị eziokwu mesokwaa ha mmeso eziokwu, gbalịsiekwa ike ịghọ Kraịst onye bụ onyeisi nzukọ ya bụ chọọchị.16Nꞌihi na ọ bụ site na ya ka e mere ka anụ ahụ nile jikọtaa bụrụ otu. Akụkụ nile ọ bụla na-arụ ọrụ ya nke ọma, na-esite nꞌụzọ ahụ enyere akụkụ ndị ọzọ aka, ime ka ha too, na iwuli ha elu site nꞌịhụnanya.17Ya mere, dị ka ndị e jikọtara ha na Onyenwe anyị nꞌotu, ana m agwa unu, na-arịọkwa unu, ka unu hapụ ibi ndụ dị ka ndị na-amaghị Chineke, ndị echiche ha na-abaghị uru.18Ndị obi ha jupụtara nꞌọchịchịrị. Ndị dị otu a enweghị òke na ndụ ahụ Chineke na-enye, nꞌihi na ha mechiri obi ha nꞌebe Chineke nọ. Ha adịghị aghọtakwa ụzọ ya.19Ihere adịghị eme ha; ihe ọ bụla adịkwaghị emetụ ha nꞌobi. Ha enyefeela onwe ha ime ihe rụrụ arụ nile na-ajụghị ajụjụ banyere ihe ọjọọ ha na-eme.20Ma nke a abụghị ụdị ndụ Kraịst ziri unu ibi21ma ọ bụrụ na unu anụla ihe banyere ya, ọ bụrụkwa na unu amụtala ihe site nꞌaka ya banyere ezi ndụ ahụ dị nꞌime Kraịst.22Ya mere, tufuonụ ọdịdị ochie ahụ dị nꞌime unu, ọdịdị ochie ahụ na-eme ka unu mee ihe ọjọọ dị iche iche nꞌoge gara aga. Ee, ọdịdị ochie ahụ rere ure, nke jupụtara nꞌagụụ ime ihe ọjọọ nile.23Ugbu a, e nwoghaala ndụ unu site nꞌinye unu ndụ ọhụrụ.24Dịkwanụ ka ndị dị ọhụrụ na ndị dị iche, ndị dị nsọ na ndị dị mma. Yikwasịnụ onwe unu ọdịdị ọhụrụ ahụ Chineke mere ka ọ dịrị ka ya nꞌịdị nsọ na nꞌịrụ ọrụ ezi omume.25Kwụsịnụ ịgha ụgha nye ibe unu. Kwuonụ eziokwu nye ibe unu, nꞌihi na unu nile bụ ndị e jikọtara nꞌotu nꞌanụ ahụ.26Ọ bụrụ na iwe ewee gị, emehiela site nꞌibu iro nꞌobi gị. Ewela iwe site nꞌụtụtụ ruo nꞌanyasị.27Enyela ekwensu ohere. Nꞌihi na mgbe iwe na-ewe gị, ị pụrụ inye ekwensu ohere ime gị ka i mehie.28Ka onye na-ezu ohi kwụsị izu ohi. Kama ya jiri aka ya abụọ rụpụta ego, ka o nwee ike inyere ndị ọzọ nọ na mkpa aka.29Ka okwu rere ure ọ bụla hapụ isite nꞌọnụ unu pụta. Kama kwuonụ okwu ga-abara ndị ọzọ uru na nke ga-enyere ha aka. Ụdị okwu pụrụ iwuli ndị ọzọ elu na iwetara ha ngọzi.30Unu emela ka obi jọọ Mmụọ Nsọ bi nꞌime unu njọ. Nꞌihi na Mmụọ Nsọ bụ akara Chineke kwakwasịrị unu igosi na unu bụ nke ya. Ọ nọ dị ka ihe akaebe nke na-egosi na otu ụbọchị na-abịa mgbe Chineke ga-eme ka unu nwere onwe unu.31Wepụnụ obi ilu, na obi ọjọọ na iwe nꞌetiti unu. Wepụkwanụ ise okwu na ịkọ ọnụ nꞌetiti unu.32Nꞌọnọdụ ihe ndị a nile, nweenụ obi ọma nꞌebe ibe unu nọ. Gbagharanụ ibe unu dị ka Chineke sitere nꞌamara ya gbaghara unu nꞌihi na unu bụ nke Kraịst.Igbo Bible 1988 No Data Igbo Bible 1988 EFESỌS 4 00:00:00 00:00:00 0.5x 2.0x https://beblia.bible:81/BibleAudio/igbo1988/ephesians/004.mp3 6 4