× Asụsụ Europe Russian Belarusian Asụsụ Ukraine Asụsụ Polish Serbian Bulgaria Asụsụ Slovakian Czech Asụsụ Romania Moldovian Azebaịjan Armenia Onye Georgia Albania Avar Bashkir Tatar Chechen Asụsụ Slovenian Asụsụ Croatian Estonia Asụsụ Latvian Asụsụ Lithuania Asụsụ Hungary Asụsụ Finish Asụsụ Norway Asụsụ Sweden Asụsụ Iceland Grik Masedonia German Bavaria Asụsụ Dutch Asụsụ Danish Welsh Gaelic Asụsụ Aịrish French Basque Catalan .Talian Galacian Romani Bosnian North America Bekee South America Asụsụ Spanish Asụsụ Portuguese Guarani Asụsụ Quechuan Aymara Central America Onye Jamaica Asụsụ Nawatụl Kiche Qeqchi Asụsụ Haiti Ebe Ọwụwa Anyanwụ Eshia Chinese nke Ndị Japan Korean Mongolian Uyghur Hmong South East Asia Onye Malaysia Burmese Chin Asụsụ Nepali Cebuano Asụsụ Tagle Kambodia Thai Indoneshian Vietnam Asụsụ Javanese Lao Iban Iu Mien Kachin Lahu Aceh Balinese Bugis Pampanga Sasak Shan Waray South Asia Hindi Dia Awadhi Mizo Kannada Malayalam Marathi Gujarati Asụsụ Tamil Telugu Asụsụ Punjabi Kurukh Asụsụ Assam Maithili Asụsụ Bengali Asụsụ Urdu Sinhala Dogri Haryanvi Meitei Konkani Santalaị Sindhi Koya Thado Sanskrit Devanagari Adilabad Gondi Ahirani Balochi Bundeli Chhattisgarhi Garhwali Kangri Kumaoni Mewari Munda Sadri Seraiki Shekhawati Sylheti Etiti Asia Kyrgyz Asụsụ Uzbek Tajik Ndị Turkmen Kazakhstan Karakalpak Etiti ọwụwa anyanwụ Turkish Hibru Arabic Peshia Kurdi Pashto Coptic Africa Afrịka Xhosa Asụsụ Ndebele Akpan Asụsụ Amharik Wolaytta Onye Naijiria Mossi Ika Dinka Kabyle Ewe Asụsụ Swahili Morocco Asụsụ Somali Shona Madagaska Igbo Lingala Baoule Siswati Tsonga Tswana Onye Gambian Ndi Yoruba Kamba Kinyarwanda Hausa Chewa Luo Makua Dyula Fulfulde Kalenjin Kikọyu Kikwango Kirundi Krio Nigerian Pidgin Oromo Tshiluba Tshivenda Twi Umbundu Lugbara Luguru Pular Gussi Maasai Turkana Moba Nuer Shilluk Tamasheq Makonde Bemba Fon Hadiyya Ibibio Kimbundu Kimiiru Lango Liberian Kreyol Lomwe Mende Morisyen Ndau Nyankole Sena Sidamo Soga Songe Sukuma Tarifit Teso Tiv Zande Kọntinent Australia New Zealand Papua New Guinea Asụsụ Ochie Asụsụ Arameik Latin Esperanto 1 1 1 1988 Nsọ nʼIgbo 2020Bible Nso 200619881 1 1 EFESỌS MATIUMAKLUKJỌNỌLU OZIROM1 KỌRINT2 KỌRINTGALETIAEFESỌSFILIPAIKỌLỌSI1 TESALỌNAIKA2 TESALỌNAIKA1 TIMỌTI2 TIMỌTITAITỌSFAILIMONHIBRUJEMES1 PITA2 PITA1 JỌN2 JỌN3 JỌNJUDNKPUGHE1 1 1 5 1234561 1 1 : 23 1234567891011121314151617181920212223242526272829303132331 1 1 Igbo Bible 1988 EFESỌS 5 Chekwaa ihe edeturu 1Ebe unu bụ ụmụ Chineke, gbalịanụ ka unu dịrị ka ya, dị ka ụmụ si agbalị ịdị ka nna ha.2Ka ịhụnanya bụrụ ihe pụtara ìhè na ndụ unu, ụdị ịhụnanya nke Kraịst hụrụ anyị mgbe o nyere Chineke ndụ ya nꞌihi anyị, dị ka onyinye na aja iwepụ mmehie anyị, Aja a tọrọ Chineke ụtọ, nꞌihi na o nwere isisi ụtọ nꞌihu Chineke.3Ka ahapụ ịkọta akụkọ mmehie ịkwa iko, ma ọ bụ nke adịghị ọcha, ma ọ bụ nke inwe anya ukwu nꞌebe ihe ndị ọzọ nꞌetiti unu nwere dị. Ka ntị ọ bụla hapụ ịnụ ya, nꞌihi na omume ọjọọ dị otu a ekwesịghị ụmụ Chineke.4Ọ dịkwaghị mma ka unu na-ekwu okwu rụrụ arụ ma ọ bụ okwu nzuzu. Kama werenụ oge unu gwarịtaa onwe unu ihe banyere ịdị mma Chineke. Werekwanụ oge unu kelee Chineke ekele.5Matanụ nke ọma na onye na-akwa iko, ma ọ bụ mmadụ na-adịghị ọcha, ma ọ bụ onye anya ukwu, nꞌihi na anya ukwu dị ka ikpere arụsị, enweghị ike ịbata nꞌalaeze Kraịst na Chineke.6Unu ekwela ka onye ọ bụla jiri okwu nzuzu duhie unu. Ana m ekwu ihe banyere ndị ahụ na-asị na mmehie ndị a abụghị ihe ọjọọ, nꞌihi na iwe Chineke na-adakwasị ndị na-eme ha.7Ka unu na ndị na-ekwu ụdị okwu a hapụ inwe mmekọrịta ọ bụla.8Nke a bụ ihe unu na-eme nꞌoge gara aga, ma kemgbe unu jiri bụrụ ụmụ Chineke unu nọ nꞌime ìhè. Ya mere, bienụ ndụ dị ka ndị nọ nꞌìhè.9Nꞌihi na ebe ọ bụla ìhè dị, ebe ahụ ka ịma mma nile na ezi omume nile na eziokwu nile dị.10Gbalịanụ mgbe nile ịchọpụta na ịmụta ihe na-atọ Chineke ụtọ.11Unu etinyela aka nꞌọrụ ọchịchịrị ọ bụla, kama meenụ ka ọrụ ọjọọ ndị a pụta ìhè ka ndị mmadụ mata otu ha siri dị njọ.12Ọ bụ ihe ihere ikwu okwu banyere ihe ndị na-amaghị Chineke na-eme na nzuzo.13Ma mgbe unu mere ka ọrụ ọjọọ ha pụta ìhè, ìhè ga-achakwasị mmehie ha, gosikwa ihe ọ bụ.14Nꞌihi na ìhè na-eme ka a hụzie ihe ọ bụla anya nke ọma. Ọ bụ nꞌihi nke a ka akwụkwọ nsọ jiri kwuo sị, “Bilie gị onye na-arahụ ụra. Site nꞌọnwụ bilie! Kraịst ga-emekwa ka ìhè ya mụkwasị gị.”15Ya mere, kpachapụnụ anya otu unu si ebi ndụ unu. Unu ebila ndụ dị ka ndị nzuzu, kama bienụ ndụ dị ka ndị maara ihe.16Jirinụ oge nile unu nwere rụọ ọrụ ọma, nꞌihi na ụbọchị ndị a dị njọ.17Unu emela dị ka ndị na-enweghị uche, kama gbalịanụ ịchọpụta ihe Chineke chọrọ ka unu mee, meekwa ya.18Unu aṅụbigala mmanya oke nke ga-emerụ unu. Kama jupụtanụ na Mmụọ Nsọ.19Gosinụ ọṅụ unu site nꞌisoro ndị enyi unu ịbụ abụ ọma, na abụ nile dị iche iche e ji eto Onyenwe anyị. Bụọnụ abụ mgbe nile na-eto Onyenwe anyị nꞌobi unu.20Na-enyenụ Chineke Nna ekele ụbọchị nile nꞌihi ihe nile nꞌaha Onyenwe anyị Jisọs Kraịst.21Sọpụrụnụ Chineke site nꞌido onwe unu nꞌokpuru ibe unu.22Unu bụ ndị nwanyị a na-alụ alụ, doonụ onwe unu nꞌokpuru di unu dị ka unu si doo onwe unu nꞌokpuru Onyenwe anyị.23Nꞌihi na nwoke bụ isi nwụnye ya, dị ka Kraịst siri bụrụ isi nzukọ ya bụ chọọchị, na onye nzọpụta nke nzukọ ahụ bụ anụ ahụ ya.24Ya mere, dị ka nzukọ Kraịst si edo onwe ya nꞌokpuru Kraịst, otu a ka ụmụ nwanyị nwere di kwesịrị ido onwe ha nꞌokpuru di ha.25Unu bụ ndị nwoke na-alụ nwụnye, hụnụ nwụnye unu nꞌanya dị ka Kraịst siri hụ nzukọ ya bụ chọọchị nꞌanya nwụọ nꞌihi ya.26Jisọs Kraịst sitere nꞌọnwụ ya mee ka nzukọ ya dịrị nsọ, site na nsacha nke baptizim na nke okwu Chineke.27Ka nzukọ ahụ bụrụ nzukọ jupụtara nꞌebube, na ịma mma, na ịdị ọcha na-enweghị ntụpọ ọ na-enweghibụla.28Otu a ka ndị nwoke kwesịrị isi hụ nwụnye ha nꞌanya dị ka ha bụ anụ ahụ ha. Nꞌihi na onye ọ bụla hụrụ nwụnye ya nꞌanya na-ahụ anụ ahụ ya nꞌanya.29Mmadụ ọ bụla adịghị nke kpọrọ anụ ahụ ya asị. Kama ọ na-azụ ya na-edozikwa ya. Nke a bụkwa ihe Kraịst meere anụ ahụ ya bụ chọọchị.30Nꞌihi na anyị nile bụ akụkụ anụ ahụ ya.31Dị ka akwụkwọ nsọ kwuru, “Nꞌihi nke a ka nwoke ga-eji hapụ ụlọ nne na nna ya ka e jikọtaa ya na nwụnye ya. Ha abụọ ga-abụkwa otu.”32Amaara m na okwu a siri ike ịghọta, ma ọ bụ ihe e ji ama atụ banyere njikọta e jikọtara Kraịst na nzukọ ya.33Ya mere, ọ dị mkpa na nwoke ga-ahụ nwụnye ya nꞌanya dị ka onwe ya. Nwanyị ọ bụla kwesịkwara ịsọpụrụ di ya.Igbo Bible 1988 No Data Igbo Bible 1988 EFESỌS 5 00:00:00 00:00:00 0.5x 2.0x https://beblia.bible:81/BibleAudio/igbo1988/ephesians/005.mp3 6 5