× Asụsụ Europe Russian Belarusian Asụsụ Ukraine Asụsụ Polish Serbian Bulgaria Asụsụ Slovakian Czech Asụsụ Romania Moldovian Azebaịjan Armenia Onye Georgia Albania Avar Bashkir Tatar Chechen Asụsụ Slovenian Asụsụ Croatian Estonia Asụsụ Latvian Asụsụ Lithuania Asụsụ Hungary Asụsụ Finish Asụsụ Norway Asụsụ Sweden Asụsụ Iceland Grik Masedonia German Bavaria Asụsụ Dutch Asụsụ Danish Welsh Gaelic Asụsụ Aịrish French Basque Catalan .Talian Galacian Romani Bosnian North America Bekee South America Asụsụ Spanish Asụsụ Portuguese Guarani Asụsụ Quechuan Aymara Central America Onye Jamaica Asụsụ Nawatụl Kiche Qeqchi Asụsụ Haiti Ebe Ọwụwa Anyanwụ Eshia Chinese nke Ndị Japan Korean Mongolian Uyghur Hmong South East Asia Onye Malaysia Burmese Chin Asụsụ Nepali Cebuano Asụsụ Tagle Kambodia Thai Indoneshian Vietnam Asụsụ Javanese Lao Iban Iu Mien Kachin Lahu Aceh Balinese Bugis Pampanga Sasak Shan Waray South Asia Hindi Dia Awadhi Mizo Kannada Malayalam Marathi Gujarati Asụsụ Tamil Telugu Asụsụ Punjabi Kurukh Asụsụ Assam Maithili Asụsụ Bengali Asụsụ Urdu Sinhala Dogri Haryanvi Meitei Konkani Santalaị Sindhi Koya Thado Sanskrit Devanagari Adilabad Gondi Ahirani Balochi Bundeli Chhattisgarhi Garhwali Kangri Kumaoni Mewari Munda Sadri Seraiki Shekhawati Sylheti Etiti Asia Kyrgyz Asụsụ Uzbek Tajik Ndị Turkmen Kazakhstan Karakalpak Etiti ọwụwa anyanwụ Turkish Hibru Arabic Peshia Kurdi Pashto Coptic Africa Afrịka Xhosa Asụsụ Ndebele Akpan Asụsụ Amharik Wolaytta Onye Naijiria Mossi Ika Dinka Kabyle Ewe Asụsụ Swahili Morocco Asụsụ Somali Shona Madagaska Igbo Lingala Baoule Siswati Tsonga Tswana Onye Gambian Ndi Yoruba Kamba Kinyarwanda Hausa Chewa Luo Makua Dyula Fulfulde Kalenjin Kikọyu Kikwango Kirundi Krio Nigerian Pidgin Oromo Tshiluba Tshivenda Twi Umbundu Lugbara Luguru Pular Gussi Maasai Turkana Moba Nuer Shilluk Tamasheq Makonde Bemba Fon Hadiyya Ibibio Kimbundu Kimiiru Lango Liberian Kreyol Lomwe Mende Morisyen Ndau Nyankole Sena Sidamo Soga Songe Sukuma Tarifit Teso Tiv Zande Kọntinent Australia New Zealand Papua New Guinea Asụsụ Ochie Asụsụ Arameik Latin Esperanto 1 1 1 1988 Nsọ nʼIgbo 2020Bible Nso 200619881 1 1 FILIPAI MATIUMAKLUKJỌNỌLU OZIROM1 KỌRINT2 KỌRINTGALETIAEFESỌSFILIPAIKỌLỌSI1 TESALỌNAIKA2 TESALỌNAIKA1 TIMỌTI2 TIMỌTITAITỌSFAILIMONHIBRUJEMES1 PITA2 PITA1 JỌN2 JỌN3 JỌNJUDNKPUGHE1 1 1 1 12341 1 1 : 6 1234567891011121314151617181920212223242526272829301 1 1 Igbo Bible 1988 FILIPAI 1 Chekwaa ihe edeturu 1Akwụkwọ ozi a si nꞌaka Pọl na Timoti, ndị bụ ohu Jisọs Kraịst na-abịara ndị ụkọchukwu, ndị okenye na ndị isi nile nọ nꞌụlọ nzukọ Kraịst dị nꞌobodo Filipai. Anyị na-edekwa ya nye ndị nile kwere nꞌOnyenwe anyị Jisọs Kraịst.2Ka Chineke gọzie unu nile. Ọ bụkwa ekpere m ka Chineke nna anyị, onye bi nꞌeluigwe, na Onyenwe anyị Jisọs Kraịst gọzie unu nile. Ka o nyekwa unu udo zuru oke nꞌime obi unu.3Ana m ekele Chineke m ekele nke ukwuu, mgbe ọ bụla m chetara unu.4Nꞌime arịrịọ nile m na-arịọ ya nꞌekpere m nꞌihi unu, obi m na-ejupụta nꞌọṅụ.5Nꞌihi inyeaka nile unu na-enye, ime ka izisa ozi ọma Onyenwe anyị na-aga nꞌihu ọ bụladị ruo ugbu a.6Ya mere, amaara m nꞌezie na Chineke ahụ wuliri mmụọ unu ime ka unu malite ọrụ ọma dị otu a, ga-aga nꞌihu inyere unu aka ito eto nꞌime amara ya, tutuu ruo mgbe ọ ga-arụzu ọrụ a ọ malitere ịrụ nꞌime unu, ruo ụbọchị ahụ Onyenwe anyị Jisọs Kraịst ga-alọghachi dị ka o kwere na nkwa.7Ọ bụ ihe ziri ezi nꞌebe m nọ iche ụdị echiche dị otu a banyere unu nile nꞌihi na unu dị m nꞌobi. Mụ na unu esorola keta oke na ngọzi ahụ Chineke na-enye ọ bụladị mgbe m nọ nꞌụlọ mkpọrọ, na mgbe m si nꞌụlọ mkpọrọ pụta na-arụ ọrụ igbasa ozi ọma.8Chineke pụrụ ịgbara m ezi ama, otu m si hụ unu nꞌanya, na otu ihe gbasara unu si na-emetụ mmụọ m, site nꞌụdị obi ebere Jisọs dị nꞌime m.9Ọ bụkwa nꞌihi nke a ka m ji na-ekpesi ekpere ike, ka ịhụnanya unu na-ahụrịta onwe unu na-aba ụba. Ka unu nwee ike ito eto, ruo nꞌinwe mmazu na nghọta nke eziokwu ahụ.10Ka unu si otu a bụrụ ndị na-enwe nghọta banyere ihe dị iche nꞌetiti ihe ọma na ihe ọjọọ. Ka unu bụrụkwa ndị dị ọcha nꞌobi unu, ndị onye ọ bụla na-agaghị enwe ihe ọjọọ ha ga-ekwu megide unu, tutuu ruo ụbọchị ahụ Kraịst ga-alọghachi.11Bụrụkwanụ ndị na-eme ihe dị mma mgbe nile, ụdị ihe ọma ahụ ga-egosi na unu bụ ụmụ Chineke, nꞌihi na nke a bụ ihe ga-ewetara Chineke otuto.12Ugbu a, nke a bụ ihe m chọrọ ime ka unu ghọta, na nsogbu nile dakwasịrị m emeela ka ọrụ ikwusa ozi ọma Kraịst na-aga nꞌihu.13Nꞌihi na ọ pụtala ìhè nye ndị nche ụlọ mkpọrọ na onye ọ bụla ọzọ nọ nꞌebe a, na ọ bụ nanị nꞌihi na m bụ onye na-eso Kraịst ka e ji tụọ m kpọrọ.14Site na mkpọrọ a a tụrụ m, e meela ka ọtụtụ ụmụnna anyị bụrụ ndị siri ike, ịmalite inwe nkwuwa okwu, izisa ozi ọma Onyenwe anyị Jisọs Kraịst.15Ọ bụ eziokwu na ụfọdụ nꞌime ha ji ekworo na anya ụfụ na-ezisa ozi ọma a. Ma ụfọdụ kwa na-ezisa ya site nꞌọchịchọ obi nke ziri ezi.16Ndị ji obi dị ọcha na-ezisa ozi ọma ahụ na-eme ya nꞌihi na ha hụrụ m nꞌanya, ebe ọ bụ na ha maara na ọ bụ Onyenwe anyị mere ka m nọọ nꞌụlọ mkpọrọ nꞌihi ịkwali ọrụ izisa ozi ọma. Ndị ọzọ na-ezisa ozi ọma ahụ ime ka obi jọọ m njọ. Echiche ha bụ na ịga nꞌihu nke ozi ọma ha na-ekwusa ga-eme ka obi jọọ m njọ nꞌụlọ mkpọrọ karịa.17***18Otu ọ dị, ihe ọ bụla ha bu nꞌuche mgbe ha na-ekwusa ozi ọma adịghị ewute m. Ihe dị mkpa bụ na ozi ọma Kraịst ka a na-ekwusa. Ọ bụkwa nke a na-enye m ọṅụ mgbe nile.19Nꞌihi nke a, amaara m na site nꞌekpere unu, ya na ịgba ume nke Mmụọ Nsọ, ihe ndị a nile dakwasịrị m ga-emesị ghọọrọ m ihe ọma.20Nꞌihi na olileanya m na ntụkwasị obi m bụ na Chineke agaghị ekwe ka m mee ihe ọ bụla ga-eme ka ihere mee m nꞌụzọ ọ bụla. Enwekwara m olileanya na m ga-aga nꞌihu nọdụ na njikere ikwupụta okwu na-atụghị egwu nꞌihi Kraịst, ọ bụladị ugbu a m nọ nꞌahụhụ ndị a. Aga m ekwupụta okwu ahụ dị ka m si ekwu ya nꞌoge gara aga. Aga m agakwa nꞌihu ịhụ na ndụ m bụ ihe ga-ewetara Kraịst otuto nꞌọnọdụ ọ bụla, ma ọ bụ na ndụ ma ọ bụ nꞌọnwụ.21Nꞌihi na nꞌebe m nọ, ịdị ndụ bụ ịnọ nꞌime Kraịst, ịnwụ ọnwụ bụkwa uru nye m.22Ma ọ bụrụ na ịdị ndụ ga-enye m ohere iritere Kraịst ọtụtụ ndị mmadụ nꞌuru, amakwaghị m nke ka mma, ma ọ bụ ịdị ndụ ma ọ bụ ịnwụ anwụ.23Nꞌihi na mgbe ụfọdụ ụzọ ihe abụọ na-agụsi m ike. Ọ na-agụ m ịdị ndụ na-aga nꞌihu, ma mgbe ụfọdụ ọ na-agụ m ikewapụ onwe m site nꞌanụ ahụ nke a, ka m lakwuru Kraịst, ebe mụ na ya ga-anọ mgbe nile. Ọ bụkwa ịlakwuru Kraịst kachasị ihe nile ọ bụla mma.24Ma ọ pụtara ìhè na ọ dị mkpa nye unu ma ọ bụrụ na m adịrị ndụ gaa nꞌihu.25Nꞌezie, amaara m na m nwere ọrụ nke m ga-arụ nꞌụwa. Nꞌihi ya amaara m na m ga-anọgide ịdị ndụ. Ka mụ na unu jikọtaakwa aka rụọ ọrụ Onyenwe anyị, nke ga-enyere unu aka ito eto nꞌokwukwe, na inwe ọṅụ nꞌime Kraịst.26Mgbe m si nꞌebe a pụta, bịa ileta unu, nnọkọ nke mụ na unu ga-anọkọ ga-ewetara unu ọṅụ nke ga-akwali unu inye Kraịst Jisọs otuto nꞌihi nchebe o chebere m.27Ma nꞌọnọdụ ọ bụla m nọ, na-ebinụ ndụ ga-egosi na unu bụ ndị Kraịst nꞌezie. Ka ọ bụrụ na a sị na m mesịrị nwee ike ịbịa ịnọnyere unu, ma ọ bụ, a sị na m enweghị ike ịbịa ịnọnyere unu, akụkọ m ga na-anụ banyere unu ga-abụ nke ga-akọ otu unu si jiri otu obi guzosie ike, jikọtaa onwe unu nꞌotu, ikwusa ozi ọma Kraịst,28na-atụghị ụjọ ihe ndị iro unu ga-eme. Iguzosi ike unu ga-agbara ha ezi ama banyere ịla nꞌiyi nke ga-abịakwasị ha. Ma nꞌebe unu nọ, ọ ga-abụrụ unu ihe ngosi si nꞌebe Chineke nọ bịa, igosi na ọ nọnyeere unu, na o nyela unu ndụ ebighị ebi.29Nꞌihi na ohere ahụ e nyere unu abụghị ohere ikwere nanị nꞌOnyenwe anyị Jisọs Kraịst, kama ọ bụ ohere ịhụkwa ahụhụ nꞌihi aha ya.30Ọ bụ anyị nile na-ebukọ agha a nꞌotu. Mụ onwe m ahụọla ahụhụ nꞌihi Kraịst nꞌoge gara aga. Ma ruo ugbu a, unu na-ahụkwa na m nọkwa nꞌime ahụhụ dị ukwuu, dị ka unu maara.Igbo Bible 1988 No Data Igbo Bible 1988 FILIPAI 1 00:00:00 00:00:00 0.5x 2.0x https://beblia.bible:81/BibleAudio/igbo1988/philippians/001.mp3 4 1