× Asụsụ Europe Russian Belarusian Asụsụ Ukraine Asụsụ Polish Serbian Bulgaria Asụsụ Slovakian Czech Asụsụ Romania Moldovian Azebaịjan Armenia Onye Georgia Albania Avar Bashkir Tatar Chechen Asụsụ Slovenian Asụsụ Croatian Estonia Asụsụ Latvian Asụsụ Lithuania Asụsụ Hungary Asụsụ Finish Asụsụ Norway Asụsụ Sweden Asụsụ Iceland Grik Masedonia German Bavaria Asụsụ Dutch Asụsụ Danish Welsh Gaelic Asụsụ Aịrish French Basque Catalan .Talian Galacian Romani Bosnian North America Bekee South America Asụsụ Spanish Asụsụ Portuguese Guarani Asụsụ Quechuan Aymara Central America Onye Jamaica Asụsụ Nawatụl Kiche Qeqchi Asụsụ Haiti Ebe Ọwụwa Anyanwụ Eshia Chinese nke Ndị Japan Korean Mongolian Uyghur Hmong South East Asia Onye Malaysia Burmese Chin Asụsụ Nepali Cebuano Asụsụ Tagle Kambodia Thai Indoneshian Vietnam Asụsụ Javanese Lao Iban Iu Mien Kachin Lahu Aceh Balinese Bugis Pampanga Sasak Shan Waray South Asia Hindi Dia Awadhi Mizo Kannada Malayalam Marathi Gujarati Asụsụ Tamil Telugu Asụsụ Punjabi Kurukh Asụsụ Assam Maithili Asụsụ Bengali Asụsụ Urdu Sinhala Dogri Haryanvi Meitei Konkani Santalaị Sindhi Koya Thado Sanskrit Devanagari Adilabad Gondi Ahirani Balochi Bundeli Chhattisgarhi Garhwali Kangri Kumaoni Mewari Munda Sadri Seraiki Shekhawati Sylheti Etiti Asia Kyrgyz Asụsụ Uzbek Tajik Ndị Turkmen Kazakhstan Karakalpak Etiti ọwụwa anyanwụ Turkish Hibru Arabic Peshia Kurdi Pashto Coptic Africa Afrịka Xhosa Asụsụ Ndebele Akpan Asụsụ Amharik Wolaytta Onye Naijiria Mossi Ika Dinka Kabyle Ewe Asụsụ Swahili Morocco Asụsụ Somali Shona Madagaska Igbo Lingala Baoule Siswati Tsonga Tswana Onye Gambian Ndi Yoruba Kamba Kinyarwanda Hausa Chewa Luo Makua Dyula Fulfulde Kalenjin Kikọyu Kikwango Kirundi Krio Nigerian Pidgin Oromo Tshiluba Tshivenda Twi Umbundu Lugbara Luguru Pular Gussi Maasai Turkana Moba Nuer Shilluk Tamasheq Makonde Bemba Fon Hadiyya Ibibio Kimbundu Kimiiru Lango Liberian Kreyol Lomwe Mende Morisyen Ndau Nyankole Sena Sidamo Soga Songe Sukuma Tarifit Teso Tiv Zande Kọntinent Australia New Zealand Papua New Guinea Asụsụ Ochie Asụsụ Arameik Latin Esperanto 1 1 1 1988 Nsọ nʼIgbo 2020Bible Nso 200619881 1 1 FILIPAI MATIUMAKLUKJỌNỌLU OZIROM1 KỌRINT2 KỌRINTGALETIAEFESỌSFILIPAIKỌLỌSI1 TESALỌNAIKA2 TESALỌNAIKA1 TIMỌTI2 TIMỌTITAITỌSFAILIMONHIBRUJEMES1 PITA2 PITA1 JỌN2 JỌN3 JỌNJUDNKPUGHE1 1 1 4 12341 1 1 : 6 12345678910111213141516171819202122231 1 1 Igbo Bible 1988 FILIPAI 4 Chekwaa ihe edeturu 1Ya mere, ụmụnna m, ndị m hụrụ nꞌanya, na ndị ihe ha na-agụsị m agụụ ike, unu ndị na-enye m ọṅụ, na ndị bụ ụgwọ ọrụ m nꞌihi ọrụ m na-arụ, bikonụ, guzosienụ ike nꞌime Onyenwe anyị.2Arịrịọ m na-arịọ Yodia na Sintiki bụ, ha biko, ha kwụsị ise okwu.3Ana m arịọkwa gị, ezi onye mụ na ya na-arụkọ ọrụ, sị gị biko, nyere ụmụ nwanyị a aka idozi okwu ha, nꞌihi na ha abụọ bụ ndị so m rụọ ọrụ ikwusa ozi ọma nye ndị ọzọ. Ha sokwa Klement rụọkwa ọrụ, sorokwa ndị ọzọ mụ na ha rụkọrọ ọrụ rụọ ọrụ, bụ ndị ahụ e dere aha ha nꞌakwụkwọ nke ndụ ahụ.4Na-aṅụrịnụ ọṅụ mgbe nile nꞌime Onyenwe anyị. Ka m kwuokwa ya ọzọ, ṅụrịanụ ọṅụ!5Meenụ ka mmadụ nile jiri anya ha hụ na unu bụ ndị obi ọma nꞌihe nile unu na-eme. Chetanụ na ọbịbịa Onyenwe anyị dị nso.6Unu echegbula onwe unu banyere ihe ọ bụla. Kama nꞌihe nile, sitenụ nꞌekpere na arịrịọ, ya na ekele, chee ihe nile na-akpa unu nꞌihu Chineke.7Udo Chineke, nke dị ukwuu karịa ihe ọ bụla mmadụ nwere ike ịghọta ga-eche echiche uche unu na obi unu nche nꞌime Kraịst Jisọs.8Ugbu a ụmụnna m, tupu m mechie, achọrọ m ịgwa unu otu ihe a, na-echenụ echiche mgbe nile banyere ihe bụ eziokwu, na ihe dị mma, na ihe ziri ezi. Na-echekwanụ echiche banyere ihe dị ọcha, ihe ọ bụla mabigara mma oke, ihe ọ bụla dị mma na ndụ onye ọ bụla nke e kwesịrị ịṅomi, na nke e kwesịrị inwe otuto nꞌihi ya.9Na-emenụ ihe ọ bụla unu si nꞌaka m mụta, ma ọ bụ ihe unu hụrụ m ka m na-eme. Chineke onye na-enye udo ga-anọnyekwara unu.10Obi dị m nnọọ ụtọ nꞌihi inyeaka unu nyeere m ọzọ. Ana m etokwa Onyenwe anyị nꞌihi ya. Amaara m na ọ dị unu nꞌobi kemgbe izitere m ihe unu nwere ike, ma unu enwebeghị ohere ime ya.11Ọ bụghị na m nọ nꞌọnọdụ oke mkpa na ụkọ. Nꞌihi na amụtala m otu m ga-esi jiri ọṅụ nọọ nꞌọnọdụ ọ bụla, ma m nwere ihe ma m enweghị ihe.12Amụtala m otu m ga-esi nọọ mgbe ihe siri ike na mgbe ihe bara ụba. Amụtakwala m otu m ga-esi nwee afọ ojuju nꞌọnọdụ ọ bụla, ma ọ bụ mgbe m na-anọ agụụ, ma ọ bụ mgbe m rijuru afọ ma ọ bụ mgbe m nwere ihe dị ukwuu ma ọ bụ nꞌoge ụkọ.13Nꞌihi na apụrụ m ime ihe nile site nꞌinyeaka Kraịst onye na-enye m ike.14Ma unu mere nnọọ nke ọma inyere m aka nꞌọnọdụ nsogbu nke m nọ nꞌime ya ugbu a.15Dị ka unu maara, na mmalite, site na mgbe m kwusaara unu ozi ọma tutuu ruo mgbe m si nꞌetiti unu pụọ, gaa Masidonia, ọ bụ nanị unu ndị Filipai, bụ ndị na-enyere m aka site nꞌinye m onyinye. O nwebeghị chọọchị ọzọ mere ihe dị otu a.16Ọ bụladị mgbe m nọ na Tesalonaika, unu ziteere m onyinye ihe karịrị otu ugbo, inyere m aka na mkpa m.17Ọ bụ ezie na obi na-atọ m ụtọ nꞌihi onyinye unu na-enye m, ma ihe na-enyekarị m ọṅụ nꞌobi m, bụ ncheta m na-echeta ụgwọ ọrụ zuru ezu, unu ga-anata nꞌihi obi ọma unu.18Ugbu a enweela m ihe nile na-akpa m mkpa, nꞌezie enweela m karịa ihe na-akpa m. Onyinye unu nyere m, nke Epafroditọs wetarạ, egboola mkpa m nile. Onyinye ndị a dị ka aja na-esi isi ụtọ a chụụrụ Chineke, nke ọ na-anabatakwa nke ọma.19Ọ bụ Chineke m ga-egboro unu mkpa unu nile, site nꞌụlọ akụ ebube ya nke eluigwe, nꞌihi ihe Kraịst Jisọs meere anyị.20Ugbu a ka otuto dịrị Chineke Nna anyị ruo mgbe ebighị ebi. Amin.21Keleere m ụmụnna nꞌime Kraịst nile nọ nꞌebe ahụ. Ụmụnna ndị mụ na ha nọ na-ekelekwa unu.22Ndị Kraịst nile nọ nꞌebe a na-ekele unu, karịsịa ndị nọ nꞌụlọ Siza.23Ka amara Onyenwe anyị Jisọs Kraịst dịnyere mmụọ unu.Igbo Bible 1988 No Data Igbo Bible 1988 FILIPAI 4 00:00:00 00:00:00 0.5x 2.0x https://beblia.bible:81/BibleAudio/igbo1988/philippians/004.mp3 4 4