× Asụsụ Europe Russian Belarusian Asụsụ Ukraine Asụsụ Polish Serbian Bulgaria Asụsụ Slovakian Czech Asụsụ Romania Moldovian Azebaịjan Armenia Onye Georgia Albania Avar Bashkir Tatar Chechen Asụsụ Slovenian Asụsụ Croatian Estonia Asụsụ Latvian Asụsụ Lithuania Asụsụ Hungary Asụsụ Finish Asụsụ Norway Asụsụ Sweden Asụsụ Iceland Grik Masedonia German Bavaria Asụsụ Dutch Asụsụ Danish Welsh Gaelic Asụsụ Aịrish French Basque Catalan .Talian Galacian Romani Bosnian Kabardian North America Bekee South America Asụsụ Spanish Asụsụ Portuguese Guarani Asụsụ Quechuan Aymara Central America Onye Jamaica Asụsụ Nawatụl Kiche Qeqchi Asụsụ Haiti Ebe Ọwụwa Anyanwụ Eshia Chinese nke Ndị Japan Korean Mongolian Uyghur Hmong Tibetian South East Asia Onye Malaysia Burmese Chin Asụsụ Nepali Cebuano Asụsụ Tagle Kambodia Thai Indoneshian Asụsụ Sundan Vietnam Asụsụ Javanese Lao Iban Iu Mien Kachin Lahu Aceh Balinese Bugis Pampanga Sasak Shan Waray South Asia Hindi Dia Awadhi Mizo Kannada Malayalam Marathi Gujarati Asụsụ Tamil Telugu Asụsụ Punjabi Kurukh Asụsụ Assam Maithili Asụsụ Bengali Asụsụ Urdu Sinhala Dogri Haryanvi Meitei Konkani Santalaị Sindhi Koya Thado Sanskrit Devanagari Adilabad Gondi Ahirani Balochi Bundeli Chhattisgarhi Garhwali Kangri Kumaoni Mewari Munda Sadri Seraiki Shekhawati Sylheti Bagri Bhilali Bodo Braj Tulu Etiti Asia Kyrgyz Asụsụ Uzbek Tajik Ndị Turkmen Kazakhstan Karakalpak Etiti ọwụwa anyanwụ Turkish Hibru Arabic Peshia Kurdi Mazanderani Pashto Coptic Africa Afrịka Xhosa Asụsụ Ndebele Akpan Asụsụ Amharik Wolaytta Onye Naijiria Mossi Ika Dinka Kabyle Ewe Asụsụ Swahili Morocco Asụsụ Somali Shona Madagaska Igbo Lingala Baoule Siswati Tsonga Tswana Onye Gambian Ndi Yoruba Kamba Kinyarwanda Hausa Chewa Luo Makua Dyula Fulfulde Kalenjin Kikọyu Kikwango Kirundi Krio Nigerian Pidgin Oromo Tshiluba Tshivenda Twi Umbundu Lugbara Luguru Pular Gussi Maasai Turkana Moba Nuer Shilluk Tamasheq Makonde Bemba Fon Hadiyya Ibibio Kimbundu Kimiiru Lango Liberian Kreyol Lomwe Mende Morisyen Ndau Nyankole Sena Sidamo Soga Songe Sukuma Tarifit Teso Tiv Zande Dagbani Edo Kituba Kọntinent Australia New Zealand Papua New Guinea Asụsụ Ochie Asụsụ Arameik Latin Esperanto 1 1 1 Igbo 1988 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo 2020Bible Nso 2006Igbo 19881 1 1 KỌLỌSI MATIUMAKLUKJỌNỌLU OZIROM1 KỌRINT2 KỌRINTGALETIAEFESỌSFILIPAIKỌLỌSI1 TESALỌNAIKA2 TESALỌNAIKA1 TIMỌTI2 TIMỌTITAITỌSFAILIMONHIBRUJEMES1 PITA2 PITA1 JỌN2 JỌN3 JỌNJUDNKPUGHE1 1 1 1 12341 1 1 : 1 12345678910111213141516171819202122232425262728291 1 1 Igbo Bible 1988 KỌLỌSI 1 Chekwaa ihe edeturu 1Ọ bụ Pọl, onye e mere onyeozi site nꞌọchịchọ Kraịst Jisọs, na ọchịchọ Chineke, ya na nwanna anyị Timoti,2na-edegara ndị Kraịst nọ na Kọlọsị akwụkwọ a. Ndị ahụ bụ ụmụnna anyị nꞌime Kraịst site nꞌokwukwe ha. Ka Chineke Nna anyị nye unu amara ya na udo ya.3Mgbe ọ bụla anyị na-ekpere unu ekpere, anyị na-ekele Chineke onye bụ Nna Onyenwe anyị Jisọs Kraịst ekele.4Nꞌihi na anyị anụla ihe banyere okwukwe unu nꞌime Kraịst Jisọs, na otu unu si hụ ndị Chineke nꞌanya.5Mgbe eziokwu ahu bụ ozi ọma rutere unu, unu nụrụ banyere olileanya dịrị ndị nabatara ya. Nꞌihi ya okwukwe unu na ịhụnaya unu na-ele anya ya, bụ ihe e chebere nke ọma nꞌihi unu nꞌeluigwe.6Ozi ọma ahụ e kwusaara unu bụkwa otu ozi ọma ahụ a na-agbasa nꞌụwa nile, nke na-eweta mgbanwe na ndụ ndị nụrụ ya, dị ka o si wetara unu mgbanwe mgbe unu nụrụ ya, ghọtakwa ụdị obi ebere Chineke nwere nꞌebe ndị mmehie nọ.7Ọ bụ Epafras onye anyị na ya na-arụkọ ọrụ, onye anyị hụkwara nꞌanya, wetaara unu ozi ọma a. Epafras bụ odibo Kraịst, onye nọ ugbu a na-enyere anyị aka nꞌọnọdụ unu.8Ọ bụ ya gwara anyị ihe banyere ịhụnanya Mmụọ Nsọ nyere unu.9Nꞌihi nke a site nꞌụbọchị anyị nụrụ ihe banyere unu, anyị esepụghị aka ikpere unu ekpere. Anyị na-ekpe ekpere na-arịọ Chineke ka o nyere unu aka ịghọta ihe ọ chọrọ ka unu mee. Anyị na-arịọkwa ya ka o nye unu amamihe nke ga-enyere unu aka ịmata ihe nke mmụọ.10Ka unu si otu a bie ndụ dị ka Onyenwe anyi chọrọ. Ka unu bụrụkwa ndị na-eme ihe ọma mgbe nile, ndị na-eme ihe na-atọ ya ụtọ, na ndị na-eto eto nꞌihe banyere ịma Chineke mgbe nile.11Anyị na-arịọkwa Chineke ka ọ gbaa unu ume, ka o mejụpụta unu nꞌike ya dị ebube ka unu nwee ike ịga nꞌihu nꞌọrụ unu nꞌọnọdụ ọ bụla, bụrụkwa ndị jupụtara nꞌọṅụ nke Onyenwe anyị na-enye,12na ndị na-ekele Nna anyị ekele mgbe nile, nꞌihi na o mere ka anyị bụrụ ndị kwesịrị iketa oke nꞌihe nile ahụ o mere ka ọ bụrụ nke ndị ahụ bi nꞌalaeze nke ìhè.13Nꞌihi na ọ bụ ya sitere nꞌike nke ọchịchịrị, bụ alaeze ekwensu, gbapụta anyị, ma kpọbata anyị nꞌime alaeze Ọkpara ya ọ hụrụ nꞌanya.14Onye e sitere nꞌaka ya mee ka anyị nwere onwe anyị; onye gbaghakwaara anyị mmehie anyị nile.15Kraịst bụ nnọọ oyiyi Chineke onye anyị na-apụghị ịhụ anya. Ọ nọ na-adị ndụ tupuu Chineke ekee ihe ọ bụla e kere eke.16Nꞌezie, ọ bụ site nꞌaka Kraịst ka e ji kee ihe nile dị nꞌụwa na nke dị nꞌeluigwe, ndị anyị pụrụ ịhụ anya na ndị anyị na-apụghị ịhụ anya. Ike nile dị iche iche, ma ike nile nke mmụọ dị iche iche, ya na ndị isi ha nile, na alaeze ha, ma ndị na-achị achị nꞌetiti ha, ma ndị na-atụ ihe ga-eme eme. Kraịst kere ihe nile. O kere ha iji ha ịrụ ọrụ dị ka o si dị ya mma, na isite na ha wetara onwe ya otuto.17Kraịst nọ anọ tupuu e kee ihe nile, ọ bụkwa ike aka ya ka o ji ejikọta ihe nile, mee ka ha dịrị ebe ha dị.18Ọ bụ ya bụ isi nke anụ ahụ ahụ bụ chọọchị, nzukọ Kraịst ahụ o bidoro. O sitere nꞌọnwụ bilie bụrụ onyeisi mbụ nꞌetiti ndị nile ga-esi nꞌọnwụ bilie. Nke a mere ka ọ bụrụ onyeisi mbụ nꞌime ihe nile.19Nꞌihi na ọ bụ mkpebi Chineke nꞌonwe ya, na ọdịdị ya bụ Chineke ga-apụta ìhè nꞌime Ọkpara ya.20Ọ bụ site nꞌihe Ọkpara ya mere ka Chineke ji kpebie ka ụwa nile bịaghachikwute ya. Nꞌihi na site nꞌọnwụ nke Kraịst nwụrụ nꞌelu obe, na ọbara ọ wụsịrị, e meela ka udo dịrị nꞌetiti Chineke na mmadụ nile. Ihe nile dị nꞌụwa na nꞌeluigwe nwekwara ike ịbịakwute Chineke ugbu a.21Nke a metụtakwara unu, ọ bụ ezie na unu bụ ndị na-anọghị Chineke nso na mbụ. Mgbe ahụ unu bụ ndị iro ya, ndị mmehie ha na echiche ọjọọ ha, na omume ọjọọ ha, mere ka Chineke dị anya nꞌebe unu nọ. Ma ugbu a, ọ kpọbatala unu dị ka ndị enyi ya.22Chineke mere nke a site nꞌọnwụ nke Ọkpara ya nwụrụ nꞌelu obe, nke mere ka unu bụrụ ndị enyi ya, ndị a kpọbatara nꞌihu ya, ndị guzokwa nꞌihu ya dị ka ndị dị nsọ na ndị dị ọcha, ndị na-enweghị ntụpọ ọ bụla.23Ihe ọzọ Chineke chọrọ nꞌaka unu bụ ka unu nọgide bụrụ ndị guzosiri ike nꞌihe unu kwenyere, na ndị guzosiri ike nꞌime Onyenwe anyị, ndị ozi ọma ahụ doro anya nke ọma. Ozi ọma ahụ nke kwuru na Jisọs nwụrụ nꞌihi unu. Hụnụ na unu esiteghị nꞌozi ọma a wezuga onwe unu, ma ọ bụ kwụsị ịtụkwasị ya obi ịzọpụta unu. Nke a bụ ozi ọma ahụ e wetaaara unu nke a na-ezisakwa nꞌụwa nile. Mụ onwe m bụ Pọl, jikwa ọṅụ na-agwa ya ndị ọzọ.24Nꞌezie, ana m aṅụrị ọṅụ nꞌihi na m na-ata ahụhụ ndị a, ana m emejupụta ihe fọdụrụ nꞌahụhụ ahụ Kraịst tara nꞌihi anụ ahụ ya bụ chọọchị.25Chineke emeela ka m bụrụ odibo chọọchị ya. O nyere m ọrụ a m na-arụ nꞌihi ọdịmma unu.26Nzube dị omimi ahụ o zonarịrị mmadụ nile nꞌoge gara aga, nke o mekwara ka ọ pụta ìhè nye ndị ya hụrụ ya nꞌanya nꞌoge a.27Ọ bụkwa ọchịchọ Chineke ime ka ndị mba ọzọ mata ịba ụba na ịdị ebube nke nzube ya dị omimi. Ihe omimi ahụ bụkwa nke a, na obibi nke Kraịst bi nꞌime unu, bụ nanị olileanya unu nwere iketa oke nꞌebube Chineke.28Ọ bụ ya mere ebe ọ bụla anyị gara, anyị na-ekwusa ihe banyere Kraịst, na-ezikwa ihe nile anyị maara banyere ya. Nꞌihi na anyị chọrọ ịkpọbata onye ọ bụla nꞌihu Chineke dị ka ndị zuru oke, nꞌihi ihe Kraịst meere ha nꞌotu nꞌotu.29Nke a bụ ọrụ m na-arụ. Ana m arụkwa ya nꞌihi ike dị ukwuu nke na-arụkwa ọrụ nꞌime m.Igbo Bible 1988 No Data Igbo Bible 1988 KỌLỌSI 1 00:00:00 00:00:00 0.5x 2.0x https://beblia.bible:81/BibleAudio/igbo1988/colossians/001.mp3 4 1