× Asụsụ Europe Russian Belarusian Asụsụ Ukraine Asụsụ Polish Serbian Bulgaria Asụsụ Slovakian Czech Asụsụ Romania Moldovian Azebaịjan Armenia Onye Georgia Albania Avar Bashkir Tatar Chechen Asụsụ Slovenian Asụsụ Croatian Estonia Asụsụ Latvian Asụsụ Lithuania Asụsụ Hungary Asụsụ Finish Asụsụ Norway Asụsụ Sweden Asụsụ Iceland Grik Masedonia German Bavaria Asụsụ Dutch Asụsụ Danish Welsh Gaelic Asụsụ Aịrish French Basque Catalan .Talian Galacian Romani Bosnian North America Bekee South America Asụsụ Spanish Asụsụ Portuguese Guarani Asụsụ Quechuan Aymara Central America Onye Jamaica Asụsụ Nawatụl Kiche Qeqchi Asụsụ Haiti Ebe Ọwụwa Anyanwụ Eshia Chinese nke Ndị Japan Korean Mongolian Uyghur Hmong South East Asia Onye Malaysia Burmese Chin Asụsụ Nepali Cebuano Asụsụ Tagle Kambodia Thai Indoneshian Vietnam Asụsụ Javanese Lao Iban Iu Mien Kachin Lahu Aceh Balinese Bugis Pampanga Sasak Shan Waray South Asia Hindi Dia Awadhi Mizo Kannada Malayalam Marathi Gujarati Asụsụ Tamil Telugu Asụsụ Punjabi Kurukh Asụsụ Assam Maithili Asụsụ Bengali Asụsụ Urdu Sinhala Dogri Haryanvi Meitei Konkani Santalaị Sindhi Koya Thado Sanskrit Devanagari Adilabad Gondi Ahirani Balochi Bundeli Chhattisgarhi Garhwali Kangri Kumaoni Mewari Munda Sadri Seraiki Shekhawati Sylheti Etiti Asia Kyrgyz Asụsụ Uzbek Tajik Ndị Turkmen Kazakhstan Karakalpak Etiti ọwụwa anyanwụ Turkish Hibru Arabic Peshia Kurdi Pashto Coptic Africa Afrịka Xhosa Asụsụ Ndebele Akpan Asụsụ Amharik Wolaytta Onye Naijiria Mossi Ika Dinka Kabyle Ewe Asụsụ Swahili Morocco Asụsụ Somali Shona Madagaska Igbo Lingala Baoule Siswati Tsonga Tswana Onye Gambian Ndi Yoruba Kamba Kinyarwanda Hausa Chewa Luo Makua Dyula Fulfulde Kalenjin Kikọyu Kikwango Kirundi Krio Nigerian Pidgin Oromo Tshiluba Tshivenda Twi Umbundu Lugbara Luguru Pular Gussi Maasai Turkana Moba Nuer Shilluk Tamasheq Makonde Bemba Fon Hadiyya Ibibio Kimbundu Kimiiru Lango Liberian Kreyol Lomwe Mende Morisyen Ndau Nyankole Sena Sidamo Soga Songe Sukuma Tarifit Teso Tiv Zande Kọntinent Australia New Zealand Papua New Guinea Asụsụ Ochie Asụsụ Arameik Latin Esperanto 1 1 1 1988 Nsọ nʼIgbo 2020Bible Nso 200619881 1 1 KỌLỌSI MATIUMAKLUKJỌNỌLU OZIROM1 KỌRINT2 KỌRINTGALETIAEFESỌSFILIPAIKỌLỌSI1 TESALỌNAIKA2 TESALỌNAIKA1 TIMỌTI2 TIMỌTITAITỌSFAILIMONHIBRUJEMES1 PITA2 PITA1 JỌN2 JỌN3 JỌNJUDNKPUGHE1 1 1 3 12341 1 1 : 23 123456789101112131415161718192021222324251 1 1 Igbo Bible 1988 KỌLỌSI 3 Chekwaa ihe edeturu 1Ebe e mere ka unu bụrụ ndị so Kraịst bilie nꞌọnwụ, tụkwasịnụ obi unu nꞌakụ na ọṅụ dị nꞌeluigwe ebe Kraịst nọ nꞌocheeze ya nꞌakụkụ Chineke.2Ka echiche gbasara eluigwe ju unu obi. Unu atụfukwala oge ichegbu onwe unu banyere ihe dị nꞌụwa.3Nꞌihi na unu anwụọla. E zokwara ndụ unu nꞌime Chineke site na Kraịst.4Mgbe Kraịst, onye ahụ ji ndụ unu nꞌaka ya ga-alọghachi, unu ga-enwukwa dị ka ya, soro ya keta oke nꞌebube ya.5Wezuganụ mmehie na ihe ụwa nile na-arụ arụ nꞌime unu. Meenụ ka ọchịchọ ọjọọ nile dị nꞌime unu bụrụ ihe nwụrụ anwụ. Unu etinyekwala aka nꞌịkwa iko, adịghị ọcha, ọchịchọ ọjọọ, agụụ ime ihe ọjọọ, na anya ukwu (nꞌihi na anya ukwu bụkwa ikpere arụsị).6Iwe ọkụ Chineke ga-adakwasị ndị nile na-eme ihe dị otu a.7Ihe ndị a bụ ihe unu onwe unu na-eme nꞌoge gara aga mgbe unu na ndị ụwa bụ otu.8Ma ugbu a bụ oge iwezụga ihe ndị a na ndụ unu: iwe, na ọnụma, na obi ọjọọ, na nkwulu nile, ya na okwu ihere nile na-esi unu nꞌọnụ na-apụta.9Unu agwala ibe unu okwu ụgha, nꞌihi na unu eyipụla mmadụ ochie ahụ na-eme ụdị omume a.10Ugbu a unu eyikwasịla ndụ ọhụrụ ahụ, nke bụ mmadụ ọhụrụ ahụ Chineke onye kere ya na-eme ka ọ na-adị ọhụrụ mgbe nile, na nke na-agbalị ịdị ka Kraịst.11Nkewa ọ bụla adịghị nꞌime ndụ a. Ọ dịghị mkpa ebe onye ọ bụla si pụta, ma ọ bụ onye Juu ma ọ bụ onye mba ọzọ, ma ọ bụ onye e biri ugwu, ma ọ bụ onye a na-ebighị ugwu. Ọ dịkwaghị mkpa ma ọ bụ onye na-asụ asụsụ ọzọ, ma ọ bụ onye ime ọhịa, ma ọ bụ ohu, ma ọ bụkwanụ onye nwe onwe ya. Ihe dị mkpa bụ ma Kraịst o bikwa nꞌime onye ahụ, nꞌihi na Kraịst dịrị mmadụ nile.12Ebe Chineke họpụtara unu mee unu ndị nke ya site nꞌinye unu ndụ ọhụrụ a, ebe ọ bụkwa nꞌihi na ọ hụrụ unu nꞌanya ka o ji họpụta unu, bụrụnụ ndị nwere obi ebere, ndị obi ọma, ndị dị nwayọọ, na ndị na-enwe ogologo ntachi obi.13Jirinụ obi dị umeala na-anagide mmejọ ibe unu mejọrọ unu, ma gbagharakwa ha. Chetanụ na Chineke nꞌonwe ya gbaghaara unu, ya mere gbaghakwaranụ ibe unu.14Nke kachasị nke, kwerenụ ka ịhụnanya na-achị achị na ndụ unu, nꞌihi na ọ bụ nke a ga-ejikọta unu nile nꞌotu.15Ka udo ahụ Chineke na-enye bụrụ ihe ga-adị nꞌobi unu, ma pụtakwa ìhè na ndụ unu. Nꞌihi na ebe unu bụ akụkụ nke otu anụ ahụ ahụ, Chineke kpọrọ unu ka unu nọdụ nꞌudo. Mgbe nile kwa nọọnụ na-ekele Chineke ekele.16Kwerenụ ka okwu Kraịst nwee ọnọdụ nꞌime unu, ime unu ndị bara ụba nꞌamamihe. Zikwanụ ndị ọzọ okwu amamihe a. Na-abụnụ abụ ọma na abụ na-ebuli mmụọ elu. Na-abụkunụ Onyenwe anyị abụ ndị a site nꞌobi jupụtara nꞌekele.17Ka ihe nile unu na-eme, ya na okwu unu na-ekwu, bụrụ nke e mere na nke e kwuru site nꞌaha Onyenwe anyị Jisọs. Jirikwanụ obi ekele bata nꞌihu Chineke bụ Nna anyị site nꞌaha Kraịst.18Unu bụ ụmụ nwanyị nwere dị, doonụ onwe unu nꞌokpuru di unu nꞌihi na nke a bụ ihe unu kwesịrị ime dị ka ndị Kraịst.19Ma unu ndị bụ di, unu enwela obi ilu nꞌebe nwụnye unu nọ, kama na-ahụnụ ha nꞌanya.20Unu bụ ụmụntakịrị, na-emenụ ihe na-atọ Chineke ụtọ site nꞌirubere nne na nna unu isi. Nke a bụ ihe unu kwesịrị ime dị ka ndị Kraịst.21Unu bụ nne na nna, unu emela ihe ga-ebutere ụmụ unu iwe, ka ha ghara inwe obi ụfụ nꞌebe unu nọ.22Ndị bụ ohu, na-asọpụrụnụ nna unu ukwu nꞌihe nile. Na-emenụ ihe ha gwara unu mee, ọ bụghị nanị mgbe ha nọ na-ele unu anya, kama werenụ obi unu nile jeere ha ozi, nꞌihi na unu bụ ndị kwesịrị ime ihe ga-atọ Onyenwe anyị ụtọ.23Ihe ọ bụla unu na-eme, werenụ obi unu nile mee ya. Ka ọ dị ka ọ bụ Chineke ka unu na-arụrụ ya, ọ bụghị dị ka unu na-arụrụ ya mmadụ.24Chetanụ nke ọma na unu nwere ụgwọ ọrụ nke Chineke kwadobere inye unu, ndị ya. Nꞌihi na ọ bụ Kraịst ka unu na-ejere ozi.25Onye ọ bụla na-eme ihe ọjọọ ga-anata ụgwọ ọrụ nꞌihi ihe ọjọọ nile o mere. Nꞌihi na Chineke anaghị ele mmadụ anya nꞌihu mgbe ọ na-ekpe ikpe ya.Igbo Bible 1988 No Data Igbo Bible 1988 KỌLỌSI 3 00:00:00 00:00:00 0.5x 2.0x https://beblia.bible:81/BibleAudio/igbo1988/colossians/003.mp3 4 3