× Asụsụ Europe Russian Belarusian Asụsụ Ukraine Asụsụ Polish Serbian Bulgaria Asụsụ Slovakian Czech Asụsụ Romania Moldovian Azebaịjan Armenia Onye Georgia Albania Avar Bashkir Tatar Chechen Asụsụ Slovenian Asụsụ Croatian Estonia Asụsụ Latvian Asụsụ Lithuania Asụsụ Hungary Asụsụ Finish Asụsụ Norway Asụsụ Sweden Asụsụ Iceland Grik Masedonia German Bavaria Asụsụ Dutch Asụsụ Danish Welsh Gaelic Asụsụ Aịrish French Basque Catalan .Talian Galacian Romani Bosnian Kabardian North America Bekee South America Asụsụ Spanish Asụsụ Portuguese Guarani Asụsụ Quechuan Aymara Central America Onye Jamaica Asụsụ Nawatụl Kiche Qeqchi Asụsụ Haiti Ebe Ọwụwa Anyanwụ Eshia Chinese nke Ndị Japan Korean Mongolian Uyghur Hmong Tibetian South East Asia Onye Malaysia Burmese Chin Asụsụ Nepali Cebuano Asụsụ Tagle Kambodia Thai Indoneshian Asụsụ Sundan Vietnam Asụsụ Javanese Lao Iban Iu Mien Kachin Lahu Aceh Balinese Bugis Pampanga Sasak Shan Waray South Asia Hindi Dia Awadhi Mizo Kannada Malayalam Marathi Gujarati Asụsụ Tamil Telugu Asụsụ Punjabi Kurukh Asụsụ Assam Maithili Asụsụ Bengali Asụsụ Urdu Sinhala Dogri Haryanvi Meitei Konkani Santalaị Sindhi Koya Thado Sanskrit Devanagari Adilabad Gondi Ahirani Balochi Bundeli Chhattisgarhi Garhwali Kangri Kumaoni Mewari Munda Sadri Seraiki Shekhawati Sylheti Bagri Bhilali Bodo Braj Tulu Etiti Asia Kyrgyz Asụsụ Uzbek Tajik Ndị Turkmen Kazakhstan Karakalpak Etiti ọwụwa anyanwụ Turkish Hibru Arabic Peshia Kurdi Mazanderani Pashto Coptic Africa Afrịka Xhosa Asụsụ Ndebele Akpan Asụsụ Amharik Wolaytta Onye Naijiria Mossi Ika Dinka Kabyle Ewe Asụsụ Swahili Morocco Asụsụ Somali Shona Madagaska Igbo Lingala Baoule Siswati Tsonga Tswana Onye Gambian Ndi Yoruba Kamba Kinyarwanda Hausa Chewa Luo Makua Dyula Fulfulde Kalenjin Kikọyu Kikwango Kirundi Krio Nigerian Pidgin Oromo Tshiluba Tshivenda Twi Umbundu Lugbara Luguru Pular Gussi Maasai Turkana Moba Nuer Shilluk Tamasheq Makonde Bemba Fon Hadiyya Ibibio Kimbundu Kimiiru Lango Liberian Kreyol Lomwe Mende Morisyen Ndau Nyankole Sena Sidamo Soga Songe Sukuma Tarifit Teso Tiv Zande Dagbani Edo Kituba Kọntinent Australia New Zealand Papua New Guinea Asụsụ Ochie Asụsụ Arameik Latin Esperanto 1 1 1 Igbo 1988 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo 2020Bible Nso 2006Igbo 19881 1 1 1 TIMỌTI MATIUMAKLUKJỌNỌLU OZIROM1 KỌRINT2 KỌRINTGALETIAEFESỌSFILIPAIKỌLỌSI1 TESALỌNAIKA2 TESALỌNAIKA1 TIMỌTI2 TIMỌTITAITỌSFAILIMONHIBRUJEMES1 PITA2 PITA1 JỌN2 JỌN3 JỌNJUDNKPUGHE1 1 1 1 1234561 1 1 : 1 12345678910111213141516171819201 1 1 Igbo Bible 1988 1 TIMỌTI 1 Chekwaa ihe edeturu 1Mụ onwe m Pọl, onye Chineke Onye nzọpụta anyị, na Kraịst Jisọs, onye bụ olileanya anyị họpụtara zipụ ịbụ onyeozi Kraịst, na-edegara gị akwụkwọ a.2Timoti ezi nwa m dị ka okwukwe anyị nwere nꞌime Onyenwe anyị si dị. Ka Chineke Nna na Kraịst Onyenwe anyị gosi gị obi ọma ya. Ya meekwara gị ebere, nyekwa gị udo nke obi na nke mmụọ.3Dị ka m rịọrọ gị ka ị nọgide nꞌEfesọs mgbe m hapụrụ gaa Masidonia, nọgidekwa nꞌebe ahụ. Nꞌihi na achọrọ m ka i mee ka ụfọdụ mmadụ nọ nꞌEfesọs kwụsị ozizi ụgha ha.4Mee ka ha kwụsị ịkọ ogologo akụkọ, na inyocha ihe gbasara usoro ọmụmụ dị iche iche nke na-adịghị agwụ agwụ. Nꞌihi na ihe ndị a na-eweta ajụjụ na ịrụ ụka na-abaghị uru, kama inyere ndị mmadụ aka ịnabata ụzọ ahụ Chineke kwadoro site nꞌokwukwe.5Ihe m chọrọ ịhụ bụ ka ụmụ Chineke nile jupụta nꞌịhụnanya nke na-esite nꞌobi dị ọcha. Achọkwara m ịhụ na ha nwere akọnuche zuru oke, na okwukwe siri ike, nke aghụghọ na-adịghị.6Nꞌihi na ndị ozizi ụgha ahụ esitela nꞌokwukwe anyị wezụga onwe ha. Ha nọ ugbu a na-atụfu oge ịjụ ajụjụ na ikwu okwu nzuzu.7Ha chọrọ ịbụ ndị a maara aha ha dị ka ndị ozizi iwu Mosisi, ma ha amaghị ihe iwu ahụ naegosi anyị.8Ma anyị maara na iwu Chineke dị mma, ma ọ bụrụ na onye ọ bụla ewere ya mee ihe Chineke chọrọ ka e jiri ya mee.9Ma emeghị iwu ahụ nꞌihi anyị ndị a zọpụtara. Kama e mere ya nꞌihi ndị ahụ na-emebi iwu, ndị na-akpọ Chineke asị, ndị ahụ naenupụ isi nꞌobi ha megide Chineke, ndị mmehie, na ndị obi ha na-adịghị ọcha, ndị ahụ na-egbu nne na nna ha, na ndị na-egbu mmadụ ibe ha.10Ee, Chineke nyere iwu a ime ka ndị naakwa iko pụta ìhè dị ka ndị mmehie. Ha na ndị na-eche uche na-adịghị ọcha, na ndị ikom na-emerụ onwe ha nꞌebe ndị ikom ibe ha nọ, ndị na-eme ihe ọjọọ dị iche iche megide ezi ozizi na-eweta ndụ.11Nꞌezie, ndị nile naemegide ozi ọma ebube Chineke ahụ e nyere m nꞌaka idebe.12Ana m ekele Kraịst Jisọs Onyenwe anyị ekele, onye na-enye m ike ikwusa ozi ọma. Ana m ekelekwa ya ekele nꞌihi na ọ gụrụ m dị ka onye e kwesịrị ịtụkwasị obi mgbe ọ họpụtara m ijere ya ozi.13Ọ bụ ezie na nꞌoge gara aga ekwuru m okwu ọjọọ megide Kraịst, meekwa ndị na-eso ụzọ ya ihe ihere. Ma Chineke meere m ebere nꞌihi na amataghị m ihe m na-eme mgbe m na-eme ihe ndị a. Nꞌihi na amaghị Kraịst nꞌoge ahụ.14Ma lee ka obi ọma Onyenwe anyị si dị ukwuu, nꞌihi na o gosiri m ụzọ m ga-esi tụkwasị ya obi, na otu ịhụnanya Kraịst ga-esi jupụta m obi.15Okwu a bụ okwu e kwesịrị ịtụkwasị obi. Ọ na-agụkwa m ka onye ọ bụla mata ya nke ọma, ma kwerekwa ya, na Kraịst Jisọs bịara nꞌụwa ịzọpụta ndị mmehie, nke mụ onwe m bụ onyeisi ha.16Ma Chineke meere m ebere ime ka Kraịst Jisọs were m gosi ndị ọzọ otu o si bụrụ onye ogologo ntachi obi nꞌebe ndị ajọ omume nọ, ka m bụrụ ihe àma nye ndị ọzọ na ha onwe ha nwekwara ike inweta ndụ ebighị ebi.17Ka otuto na nsọpụrụ dịrị Chineke ruo mgbe nile ebighị ebi. Onye bụ eze nꞌọgbọ nile, onye a na-apụghị ịhụ anya. Chineke na-adịghị anwụ anwụ, Onye nanị ya bụ Chineke. Ka otuto na nsọpụrụ dịrị ya ruo mgbe nile ebighị ebi. Amin.18Ugbu a, Timoti nwa m, iwu a ka m na-enye gị nꞌaka idebe. Lụsie ọgụ okwu Onyenwe anyị ike, dị ka Onyenwe nꞌonwe ya si nye anyị iwu ka anyị, lụọ ya site nꞌọnụ ndị amụma ya.19Jidesie okwukwe i nwere nꞌime Kraịst ike. Meekwa ka akọnuche gị dị ọcha mgbe nile. Nꞌihi na ụfọdụ mmadụ eleziela anya jụ ime ezi ihe akọnuche ha gwara ha. Ma ha emeela ihe ahụ ha maara na ọ jọrọ njọ. Ugbu a ọ bụghị ihe iju anya na ha esitela nꞌokwukwe anyị dapụ.20Haimeniọs na Alegzanda bụ ndị ikom abụọ mere ụdị ihe a. Ewerela m ha nyefee ekwensu nꞌaka, ka ọ taa ha ahụhụ tutuu ruo mgbe ha mụtara na ha ekwesịghị ikwu okwu ọjọọ megide Chineke.Igbo Bible 1988 No Data Igbo Bible 1988 1 TIMỌTI 1 00:00:00 00:00:00 0.5x 2.0x https://beblia.bible:81/BibleAudio/igbo1988/1timothy/001.mp3 6 1