× Asụsụ Europe Russian Belarusian Asụsụ Ukraine Asụsụ Polish Serbian Bulgaria Asụsụ Slovakian Czech Asụsụ Romania Moldovian Azebaịjan Armenia Onye Georgia Albania Avar Bashkir Tatar Chechen Asụsụ Slovenian Asụsụ Croatian Estonia Asụsụ Latvian Asụsụ Lithuania Asụsụ Hungary Asụsụ Finish Asụsụ Norway Asụsụ Sweden Asụsụ Iceland Grik Masedonia German Bavaria Asụsụ Dutch Asụsụ Danish Welsh Gaelic Asụsụ Aịrish French Basque Catalan .Talian Galacian Romani Bosnian North America Bekee South America Asụsụ Spanish Asụsụ Portuguese Guarani Asụsụ Quechuan Aymara Central America Onye Jamaica Asụsụ Nawatụl Kiche Qeqchi Asụsụ Haiti Ebe Ọwụwa Anyanwụ Eshia Chinese nke Ndị Japan Korean Mongolian Uyghur Hmong South East Asia Onye Malaysia Burmese Chin Asụsụ Nepali Cebuano Asụsụ Tagle Kambodia Thai Indoneshian Vietnam Asụsụ Javanese Lao Iban Iu Mien Kachin Lahu Aceh Balinese Bugis Pampanga Sasak Shan Waray South Asia Hindi Dia Awadhi Mizo Kannada Malayalam Marathi Gujarati Asụsụ Tamil Telugu Asụsụ Punjabi Kurukh Asụsụ Assam Maithili Asụsụ Bengali Asụsụ Urdu Sinhala Dogri Haryanvi Meitei Konkani Santalaị Sindhi Koya Thado Sanskrit Devanagari Adilabad Gondi Ahirani Balochi Bundeli Chhattisgarhi Garhwali Kangri Kumaoni Mewari Munda Sadri Seraiki Shekhawati Sylheti Etiti Asia Kyrgyz Asụsụ Uzbek Tajik Ndị Turkmen Kazakhstan Karakalpak Etiti ọwụwa anyanwụ Turkish Hibru Arabic Peshia Kurdi Pashto Coptic Africa Afrịka Xhosa Asụsụ Ndebele Akpan Asụsụ Amharik Wolaytta Onye Naijiria Mossi Ika Dinka Kabyle Ewe Asụsụ Swahili Morocco Asụsụ Somali Shona Madagaska Igbo Lingala Baoule Siswati Tsonga Tswana Onye Gambian Ndi Yoruba Kamba Kinyarwanda Hausa Chewa Luo Makua Dyula Fulfulde Kalenjin Kikọyu Kikwango Kirundi Krio Nigerian Pidgin Oromo Tshiluba Tshivenda Twi Umbundu Lugbara Luguru Pular Gussi Maasai Turkana Moba Nuer Shilluk Tamasheq Makonde Bemba Fon Hadiyya Ibibio Kimbundu Kimiiru Lango Liberian Kreyol Lomwe Mende Morisyen Ndau Nyankole Sena Sidamo Soga Songe Sukuma Tarifit Teso Tiv Zande Kọntinent Australia New Zealand Papua New Guinea Asụsụ Ochie Asụsụ Arameik Latin Esperanto 1 1 1 1988 Nsọ nʼIgbo 2020Bible Nso 200619881 1 1 1 TIMỌTI MATIUMAKLUKJỌNỌLU OZIROM1 KỌRINT2 KỌRINTGALETIAEFESỌSFILIPAIKỌLỌSI1 TESALỌNAIKA2 TESALỌNAIKA1 TIMỌTI2 TIMỌTITAITỌSFAILIMONHIBRUJEMES1 PITA2 PITA1 JỌN2 JỌN3 JỌNJUDNKPUGHE1 1 1 5 1234561 1 1 : 8 123456789101112131415161718192021222324251 1 1 Igbo Bible 1988 1 TIMỌTI 5 Chekwaa ihe edeturu 1Abarala okenye mba, kama jiri arịrịọ na nsọpụrụ gwa ya okwu dị ka ọ bụ nna gị. Na-agwa ụmụ okorọbịa okwu dị ka ị ga-esi gwa ụmụnne gị ị hụrụ nꞌanya okwu.2Na-emeso ndị bụ agadi nwanyị omume dị ka ndị nne, ma na-emesokwa ụmụ agbọghọ omume dị ka ị ga-esi mesoo ụmụnne gị nwanyị omume. Na-echekwa uche dị ọcha banyere ha.3O kwesịrị ka chọọchị na-enyere ụmụ nwanyị di ha nwụrụ aka, ma ọ bụrụ na ha enweghị onye ọ bụla gaelekọta ha anya.4Kama ọ bụrụ na nwanyị ọ bụla di ya nwụrụ nwere ụmụ, ma ọ bụ ụmụ ụmụ, ndị a bụ ndị kwesịrị ibu mkpa ha. Nꞌihi na anyị kwesịrị isite nꞌụlọ anyị gosi obi ọma anyị inyere ndị mụrụ anyị aka. Nꞌihi na omume dị otu a na-atọ Chineke ụtọ.5Nwanyị di ya nwụrụ, nke nọ nanị ya nꞌụwa, na-enweghị onye inyeaka, nwere olileanya na Chineke ga-enyere ya aka. Ọ na-anọgidekwa nꞌekpere ehihie na abalị na-arịọ enyemaka Chineke.6Ma nwanyị di ya nwụrụ nke weere onwe ya nyefee nꞌaka ịgbaso ihe na-eme ya obi ụtọ bụ rịị onye nwụrụ anwụ, ọ bụ ezie na ọ ka dị ndụ.7Ihe ndị a bụ ihe i kwesịrị inye ndị chọọchị gị dị ka iwu, ka ụmụ Chineke mụta, ma na-emekwa ihe dị mma.8Ọ bụrụ na onye ọ bụla ajụ inyere ikwu na ibe ya ka, nke ka nke, onye ọ bụla jụrụ inyere ndị ezinụlọ nke aka ya aka, ekwesịghị ịkpọ onwe ya onye nke Kraịst. Nꞌihi na onye dị otu a dị njọ karịa onye na-ekpere arụsị.9Ma nwanyị ọ bụla dị ya nwụrụ nke chọrọ ịbụ otu onye nꞌime ndị na-eje ozi na chọọchị, aghaghị ịbụ onye gbara iri afọ isii. Ọ ga-abụkwa onye lụrụ nanị otu di na ndụ ya nile.10Ọ ga-abụ onye mmadụ nile na-agbara ezi ama, nꞌihi ezi ọrụ ọ rụrụ. Ọ ga-abụ onye zụlitere ụmụ ya nꞌụzọ ziri ezi, onye na-elezi ndị ọbịa anya, onye na-enyere ndị ọrịa na ndị merụrụ ahụ aka, na onye jikeere mgbe nile ime ihe ọma.11Ma o kwesịghị ka a kpọbata ụmụ agbọghọ di ha nwụrụ nꞌòtù ụmụ nwanyị na-eje ozi na chọọchị. Nꞌihi na nwa oge nta gafee ha nwere ike lụọ di ọzọ, chefuo nkwa ha kwere na ha gaanọgidesi ike rụọra Kraịst ọrụ.12Ụdị omume a pụrụ iwetara ha ikpe ọmụma, nꞌihi na ha emezughị nkwa ha kwere na mbụ.13Ewezugakwarị na ha nwere ike lụọ di ọzọ, ụmụ agbọghọ dị otu a bụ ndị umengwụ, ndị na-atụfu oge ha na-akpa asịrị site nꞌotu ụlọ ruo nꞌụlọ ọzọ, na-etinye onwe ha nꞌokwu na-agbasaghị ha, na nꞌọrụ na-abụghị nke ha kwesịrị ịrụ.14Nꞌihi nke a echere m na ọ bụ ihe kwesịrị ekwesi ka ụmụ agbọghọ ndị a di ha nwụrụ lụrụ di ọzọ, mụọkwa ụmụ, ma na-elekọtazikwa ezinụlọ ha anya nke ọma. Ọ bụrụ na ha mee nke a, ọ dịghị onye ọ bụla ga-ekwu okwu ọjọọ megide ha.15Nꞌihi na ekwensu eduhiela ụfọdụ mee ka ha mehie, ma site na chọọchị gbapụ.16Ka m chetara gị ya ọzọ ndị ikwu na ibe nwanyị di ya nwụrụ kwesịrị igboro ya mkpa dịrị ya. O kwesịghị ka ha hapụrụ ya chọọchị. Nꞌihi na ọ bụ ọrụ chọọchị inyere ụmụ nwanyị di ha nwụrụ aka, ndị na-enweghị onye inyeaka nꞌebe ọ bụla.17O kwesịrị ka akwụọ ndị ụkọchukwu na-arụzi ọrụ ha ụgwọ dị mma, nke kwesịrị ọrụ ha na-arụ. O kwesịkwara ka a na-enye ha nsọpụrụ ruru ha, karịsịa, ndị ahụ na-arụsị ọrụ ike ikwusa na izi okwu Chineke.18Nꞌihi na akwụkwọ nsọ kwuru sị, “Ejila ihe kechie ehi ọnụ mgbe ọ na-azọcha ọka, kama hapụ ya ka ọ na-eri nri mgbe ọ na-arụ ọrụ!” Akwụkwọ nsọ kwukwara nꞌebe ọzọ sị, “Onye na-arụ ọrụ kwesịrị ịnata ụgwọ ọrụ ya”.19Egela ntị nꞌebubo ọjọọ ọ bụla a naebo onye okenye karịakwa ma ọ bụ na ndị akaebe abụọ ma ọ bụ atọ gbara ama megide ya.20Ọ bụrụ na ọ mehiere nꞌezie, kpọpụta ya baara ya mba nꞌihu mmadụ nile na chọọchị, ka onye ọzọ gharakwa iso omume ya.21Ana m enye gị iwu a nꞌihu Chineke na nꞌihu Onyenwe anyị Jisọs Kraịst na nꞌihu ndị mmụọ ozi dị nsọ ka i nye okenye ọ bụla mehiere ntaramahụhụ kwesịrị mmehie ya, ma okenye ahụ ọ bụ enyị gị ma ọ bụghị, elekwala onye ọ bụla anya nꞌihu.22Ebikwasịkwala onye ọ bụla aka nꞌisi ọsịịsọ ime ya okenye ma ọ bụ onye na-eje ozi. Nꞌihi na ị pụrụ ilefu mmehie ya anya. Nke a pụkwara ime ka ọ dị ka ị naakwagide mmehie ha. Hụ na gị onwe gị wezugara onwe gị nꞌebe mmehie nile dị.23Aṅụkwala nanị mmiri. Kama o kwesịrị ka ị na-aṅụtụ mmanya ntakịrị ntakịrị nꞌihi ọrịa afọ nke ị na-arịa mgbe nile.24Cheta na ụfọdụ mmadụ, ọ bụladị ụfọdụ ndị ụkọchukwu, na-ebi ndụ mmehie nke onye ọ bụla maara ihe banyere ya. Nꞌụdị mmehie dị otu a, i nwere ike ikwu okwu banyere ya. Ma e nwere mmehie ndị ọzọ nke anya naadịghị ahụ. Ha ga-apụta ìhè nꞌụbọchị ikpe.25Otu a kwa, ndị mmadụ maara ụfọdụ ihe ọma nke ndị ụkọchukwu na-eme, ma o nwere ụfọdụ ihe ọma ha na-eme nke na-agaghị apụta ìhè tutuu ruo oge ikpeazụ.Igbo Bible 1988 No Data Igbo Bible 1988 1 TIMỌTI 5 00:00:00 00:00:00 0.5x 2.0x https://beblia.bible:81/BibleAudio/igbo1988/1timothy/005.mp3 6 5