× Asụsụ Europe Russian Belarusian Asụsụ Ukraine Asụsụ Polish Serbian Bulgaria Asụsụ Slovakian Czech Asụsụ Romania Moldovian Azebaịjan Armenia Onye Georgia Albania Avar Bashkir Tatar Chechen Asụsụ Slovenian Asụsụ Croatian Estonia Asụsụ Latvian Asụsụ Lithuania Asụsụ Hungary Asụsụ Finish Asụsụ Norway Asụsụ Sweden Asụsụ Iceland Grik Masedonia German Bavaria Asụsụ Dutch Asụsụ Danish Welsh Gaelic Asụsụ Aịrish French Basque Catalan .Talian Galacian Romani Bosnian Kabardian North America Bekee South America Asụsụ Spanish Asụsụ Portuguese Guarani Asụsụ Quechuan Aymara Central America Onye Jamaica Asụsụ Nawatụl Kiche Qeqchi Asụsụ Haiti Ebe Ọwụwa Anyanwụ Eshia Chinese nke Ndị Japan Korean Mongolian Uyghur Hmong Tibetian South East Asia Onye Malaysia Burmese Chin Asụsụ Nepali Cebuano Asụsụ Tagle Kambodia Thai Indoneshian Asụsụ Sundan Vietnam Asụsụ Javanese Lao Iban Iu Mien Kachin Lahu Aceh Balinese Bugis Pampanga Sasak Shan Waray Madurese South Asia Hindi Dia Awadhi Mizo Kannada Malayalam Marathi Gujarati Asụsụ Tamil Telugu Asụsụ Punjabi Kurukh Asụsụ Assam Maithili Asụsụ Bengali Asụsụ Urdu Sinhala Dogri Haryanvi Meitei Konkani Santalaị Sindhi Koya Thado Sanskrit Devanagari Adilabad Gondi Ahirani Balochi Bundeli Chhattisgarhi Garhwali Kangri Kumaoni Mewari Munda Sadri Seraiki Shekhawati Sylheti Bagri Bhilali Bodo Braj Tulu Etiti Asia Kyrgyz Asụsụ Uzbek Tajik Ndị Turkmen Kazakhstan Karakalpak Etiti ọwụwa anyanwụ Turkish Hibru Arabic Peshia Kurdi Mazanderani Pashto Coptic Africa Afrịka Xhosa Asụsụ Ndebele Akpan Asụsụ Amharik Wolaytta Onye Naijiria Mossi Ika Dinka Kabyle Ewe Asụsụ Swahili Morocco Asụsụ Somali Shona Madagaska Igbo Lingala Baoule Siswati Tsonga Tswana Onye Gambian Ndi Yoruba Kamba Kinyarwanda Hausa Chewa Luo Makua Dyula Fulfulde Kalenjin Kikọyu Kikwango Kirundi Krio Nigerian Pidgin Oromo Tshiluba Tshivenda Twi Umbundu Lugbara Luguru Pular Gussi Maasai Turkana Moba Nuer Shilluk Tamasheq Makonde Bemba Fon Hadiyya Ibibio Kimbundu Kimiiru Lango Liberian Kreyol Lomwe Mende Morisyen Ndau Nyankole Sena Sidamo Soga Songe Sukuma Tarifit Teso Tiv Zande Dagbani Edo Kituba Kọntinent Australia New Zealand Papua New Guinea Asụsụ Ochie Asụsụ Arameik Latin Esperanto 1 1 1 Igbo 1988 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo 2020Bible Nso 2006Igbo 19881 1 1 2 TIMỌTI MATIUMAKLUKJỌNỌLU OZIROM1 KỌRINT2 KỌRINTGALETIAEFESỌSFILIPAIKỌLỌSI1 TESALỌNAIKA2 TESALỌNAIKA1 TIMỌTI2 TIMỌTITAITỌSFAILIMONHIBRUJEMES1 PITA2 PITA1 JỌN2 JỌN3 JỌNJUDNKPUGHE1 1 1 1 12341 1 1 : 1 1234567891011121314151617181 1 1 Igbo Bible 1988 2 TIMỌTI 1 Chekwaa ihe edeturu 1Akwụkwọ ozi a si nꞌaka m Pọl, onyeozi Kraịst Jisọs, onye Chineke zipụrụ ịgwa ndị nile nọ nꞌebe nile, nwoke na nwanyị, ihe banyere ndụ ebighị ebi o kwere ha na nkwa site nꞌokwukwe nꞌime Jisọs Kraịst.2Ọ bụ gị nwoke m hụrụ nꞌanya Timoti, ezi nwa m, ka m na-edere akwụkwọ a. Ka Chineke Nna, na Kraịst Jisọs Onyenwe anyị, wụkwasị gị obi ebere na amara ya na udo ya.3Ana m ekele Chineke ekele nꞌihi gị Timoti. Ana m ekpere gị ekpere kwa ụbọchị. Ọtụtụ mgbe kwa, ma ọ bụ nꞌime abalị, ka m na-ebili na-arịọ Chineke arịrịọ ka ọ gọzie gị. Chineke, onye bụ Chineke nke nna nna m ha, na Chineke nke m kwa. Ọ bụkwa nanị otu ihe ka m na-ezube nꞌime ndụ a, ọ bụ ime ihe ga-atọ ya ụtọ.4Ọ na-agụsi m agụụ ike ịhụ gị anya ọzọ. Ịhụ gị ga-abụkwa ihe oke ọṅụ nye m, nꞌihi na echetara m anya mmiri gị mgbe anyị gbasara nꞌoge ikpeazụ anyị zukọrọ.5Amatara m ụdị ntụkwasị obi i nwere nꞌime Onyenwe anyị, ụdị ntụkwasị obi ahụ buru ụzọ dịrị nꞌime nne gị Yunaịsi, na nꞌime nne nne gị Lọịsi. Enwekwara m olileanya na ị na-atụkwasịkwa Onyenwe anyị obi ugbu a karia.6Nꞌihi nke a, achọrọ m ichetara gị ka i mee ka ike nkwuwa okwu ahụ i nwere na-enwụ dị ka ọkụ. Ike ahụ Chineke nyere gị mgbe m bikwasịrị gị aka m abụọ nꞌisi, gọziekwa gị.7Nꞌihi na Chineke enyeghị anyị mmụọ ịtụ ụjọ, kama o nyere anyị Mmụọ na-emejupụta anyị nꞌike, na ịhụnanya, na uche zuru oke.8Ọ bụrụ na ị na-akwali ike nke ime mmụọ ahụ i nwere, ụjọ agaghị atụ gị ịgwa ndị ọzọ okwu banyere Onyenwe anyị, ma ọ bụ ime ka ha mata na m bụ enyi gị. Ọ bụ ezie na m nọ nꞌụlọ mkpọrọ nꞌihi aha Kraịst. Ị ga-ejikerekwa isoro m hụọ ahụhụ nꞌihi Kraịst, nꞌihi na ọ ga-agba gị ume nꞌime ahụhụ.9Ọ bụ Chineke zọpụtara anyị, kpọbata anyị nꞌọrụ ya dị nsọ. Ọ bụghị nꞌihi na anyị kwesịrị ka a kpọọ anyị, kama ọ bụ rịị nzube ya ịkpọ anyị tupuu a tọọ ntọ ala ụwa a, nꞌihi na ọ chọrọ isite nꞌihe ọ ga-emere anyị gosi anyị ịhụnanya ya na obi ọma ya, na amara ya site na Jisọs Kraịst.10Ugbu a o meela ka ihe nile o zubere ime nꞌobi ya pụta ìhè site nꞌọbịbịa nke Onyenwe anyị Jisọs Kraịst, onye lara ike nke ọnwụ nꞌiyi zi anyị ụzọ anyị gaesi nwee ndụ ebighị ebi site nꞌịtụkwasị ya obi.11Chineke ahọpụtala m ka m bụrụ onye na-ekwusa ozi ọma a, na onyeozi, na onye nkuzi.12Ọ bụkwa nꞌihi nke a ka m ji naahụ ahụhụ ndị a nꞌime ụlọ mkpọrọ nꞌebe a, ma nꞌeziokwu, ihere adịghị eme m, nꞌihi na amaara m onye m naatụkwasị obi, amakwaara m nke ọma, na o nwere ike ichebe ihe nile m nyere ya nꞌaka idebe tutuu ruo ụbọchị ahụ ọ ga-alọghachi.13Jidesie eziokwu ahụ aka ike, ụdị eziokwu ahụ nke mụ onwe m ziri gị, eziokwu ahụ nke gbasara okwukwe ahụ, na ịhụnanya ahụ dị nꞌime Kraịst Jisọs.14Chezie onyinye ọma ahụ Chineke sitere nꞌaka Mmụọ Nsọ nke bi nꞌime gị nye gị idebe.15Dị ka ị maara, ndị Kraịst nile si nꞌEsia bịa nꞌebe a agbaketala m azụ. Ọ bụladị Faigelọs na Hamoganis ahapụla m laa.16Ka Onyenwe anyị gọzie ezinụlọ Onisiferọs. Nꞌihi na ọ bịara leta m, gbaa m ume ọtụtụ mgbe. Ọbịbịa ya kpọtere mmụọ m. Ihere emekwaghị ya ịbịakwute m nꞌụlọ mkpọrọ.17Nꞌezie, mgbe ọ bịaruru Rom, ọ chọgharịrị m nꞌebe nile, ma nꞌikpeazụ, ọ chọtara m.18Ekpere m bụ ka Onyenwe anyị nye ya ezi ngọzi pụrụ iche nꞌụbọchị ahụ Kraịst ga-alọghachi. Ị makwaara nke ọma karịa ka m nwere ike ịgwa gị, otu o si nyere m aka nꞌEfesọs.Igbo Bible 1988 No Data Igbo Bible 1988 2 TIMỌTI 1 00:00:00 00:00:00 0.5x 2.0x https://beblia.bible:81/BibleAudio/igbo1988/2timothy/001.mp3 4 1