× Asụsụ Europe Russian Belarusian Asụsụ Ukraine Asụsụ Polish Serbian Bulgaria Asụsụ Slovakian Czech Asụsụ Romania Moldovian Azebaịjan Armenia Onye Georgia Albania Avar Bashkir Tatar Chechen Asụsụ Slovenian Asụsụ Croatian Estonia Asụsụ Latvian Asụsụ Lithuania Asụsụ Hungary Asụsụ Finish Asụsụ Norway Asụsụ Sweden Asụsụ Iceland Grik Masedonia German Bavaria Asụsụ Dutch Asụsụ Danish Welsh Gaelic Asụsụ Aịrish French Basque Catalan .Talian Galacian Romani Bosnian Kabardian North America Bekee South America Asụsụ Spanish Asụsụ Portuguese Guarani Asụsụ Quechuan Aymara Central America Onye Jamaica Asụsụ Nawatụl Kiche Qeqchi Asụsụ Haiti Ebe Ọwụwa Anyanwụ Eshia Chinese nke Ndị Japan Korean Mongolian Uyghur Hmong Tibetian South East Asia Onye Malaysia Burmese Chin Asụsụ Nepali Cebuano Asụsụ Tagle Kambodia Thai Indoneshian Asụsụ Sundan Vietnam Asụsụ Javanese Lao Iban Iu Mien Kachin Lahu Aceh Balinese Bugis Pampanga Sasak Shan Waray Madurese South Asia Hindi Dia Awadhi Mizo Kannada Malayalam Marathi Gujarati Asụsụ Tamil Telugu Asụsụ Punjabi Kurukh Asụsụ Assam Maithili Asụsụ Bengali Asụsụ Urdu Sinhala Dogri Haryanvi Meitei Konkani Santalaị Sindhi Koya Thado Sanskrit Devanagari Adilabad Gondi Ahirani Balochi Bundeli Chhattisgarhi Garhwali Kangri Kumaoni Mewari Munda Sadri Seraiki Shekhawati Sylheti Bagri Bhilali Bodo Braj Tulu Etiti Asia Kyrgyz Asụsụ Uzbek Tajik Ndị Turkmen Kazakhstan Karakalpak Etiti ọwụwa anyanwụ Turkish Hibru Arabic Peshia Kurdi Mazanderani Pashto Coptic Africa Afrịka Xhosa Asụsụ Ndebele Akpan Asụsụ Amharik Wolaytta Onye Naijiria Mossi Ika Dinka Kabyle Ewe Asụsụ Swahili Morocco Asụsụ Somali Shona Madagaska Igbo Lingala Baoule Siswati Tsonga Tswana Onye Gambian Ndi Yoruba Kamba Kinyarwanda Hausa Chewa Luo Makua Dyula Fulfulde Kalenjin Kikọyu Kikwango Kirundi Krio Nigerian Pidgin Oromo Tshiluba Tshivenda Twi Umbundu Lugbara Luguru Pular Gussi Maasai Turkana Moba Nuer Shilluk Tamasheq Makonde Bemba Fon Hadiyya Ibibio Kimbundu Kimiiru Lango Liberian Kreyol Lomwe Mende Morisyen Ndau Nyankole Sena Sidamo Soga Songe Sukuma Tarifit Teso Tiv Zande Dagbani Edo Kituba Kọntinent Australia New Zealand Papua New Guinea Asụsụ Ochie Asụsụ Arameik Latin Esperanto 1 1 1 Igbo 1988 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo 2020Bible Nso 2006Igbo 19881 1 1 FAILIMON MATIUMAKLUKJỌNỌLU OZIROM1 KỌRINT2 KỌRINTGALETIAEFESỌSFILIPAIKỌLỌSI1 TESALỌNAIKA2 TESALỌNAIKA1 TIMỌTI2 TIMỌTITAITỌSFAILIMONHIBRUJEMES1 PITA2 PITA1 JỌN2 JỌN3 JỌNJUDNKPUGHE1 1 1 1 11 1 1 : 1 123456789101112131415161718192021222324251 1 1 FAILIMON 1 Chekwaa ihe edeturu 1Akwụkwọ ozi a si nꞌaka m Pọl, onye e tinyere nꞌụlọ mkpọrọ nꞌihi Kraịst Jisọs na site nꞌaka nwanna anyị Timoti. Anyị na-edetara gị ya ezi enyi anyị na onye anyị na ya na-arụkọ ọrụ, Faịlimọn.2Anyị na-edetakwara ya nzukọ Kraịst dị nꞌụlọ gị, na nwanna anyị nwanyị Afịa, na Akipọs onye anyị na ya so na-alụ agha a.3Ka Chineke Nna anyị na Onyenwe anyị Jisọs Kraịst nye unu amara ya na udo ya.4Nwanna m Faịlimọn, ana m ekele Chineke ekele mgbe ọ bụ m na-echeta gị nꞌekpere nile m na-ekpe.5Nꞌihi na oge nile ka m na-anụ ihe banyere otu i si hụ ụmụ Chineke nile nꞌanya, na ụdị okwukwe i nwere nꞌebe Onyenwe anyị Jisọs nọ.6Ekpere m na-ekpe nꞌihi gị bụ ka Chineke mee ka ndị ahụ nile naesite na ndụ gị na nꞌọnụ gị na-anụ ozi ọma ahụ bụrụ ndị ga-ekpebi iso Kraịst nꞌihi ihe ọma ha na-ahụ nꞌime gị nke na-esi nꞌebe Kraịst nọ abịa.7Ịhụnanya gị na-enye mụ onwe ọṅụ nke nkasịobi, ezi nwanna m Faịlimọn, nꞌihi na e sitela nꞌobi ọma gị zụọ ọtụtụ ụmụ Chineke.8Ugbu a, ọ dị ihe m chọrọ ka i meere m. Enwere m ike ịsị na ihe a bụ ihe ị na-aghaghị ime site nꞌaha Kraịst nꞌihi na ọ bụ ihe dị mma ime eme. Ma nꞌihi ịhụnanya m nwere nꞌebe ị nọ, achọghị ịkwagide gị ka i mee ya.9Kama ọ kaara m mma ịrịọ gị ya dị ka arịrịọ. Ee, ọ bụ mụ Pọl, agadi nwoke ahụ nọ nꞌụlọ mkpọrọ nꞌihi Jisọs Kraịst na-arịọ gị arịrịọ a.10Biko, arịrịọ m na-arịọ gị bụ nꞌisi Onisimọs, onye e mere ka ọ bụrụ nwa m nꞌime Kraịst, onye m ritere nꞌuru nye Kraịst oge a m nọ nꞌụlọ mkpọrọ.11Na mbụ, o nweghị uru ọ bụla Onisimọs baara gị, ma ugbu a, ọ bụ onye ga-abara gị uru na onye gaabakwara m uru.12Ana m eme ka ọ laghachikwute gị. Ma mgbe ọ na-alọghachikwute gị achọrọ m ka ị mata na mkpụrụ obi m so ya na-alọta.13Ọ gụsịrị m agụụ ike ime ka mụ na ya nọdụ nꞌebe a, ka ọ na-enyere m ụdị aka ị gaara enyere m nꞌime ụlọ mkpọrọ a m nọ nꞌihi ozi ọma.14Ma otu ọ dị, ekpebiri m na ebe ọ bụ na ị maghị ihe ọ bụla banyere ya agaghị m ejide ya. Achọghị m ka i nyere m aka nꞌihi na a kwagidere gị, kama ọ dị mma ka o si gị nꞌobi pụta.15Ma eleghị anya Onisimọs si nꞌụlọ gị gbapụ maka ịnọ nwa oge nta, ma ugbu a ọ na-alọghachi ka gị na ya nọọ ruo ebighị ebi.16Ugbu a, ọ naghị alọghachi nanị dị ka ohu, kama ọ na-alọghachi dị ka onye karịrị ohu. Nꞌihi na ugbu a Onisimọs bụ nwanna anyị nꞌime Kraịst. Nꞌezie, Faịlimọn, Onisimọs dị m nꞌobi nke ukwuu.17Nꞌihi nke a, ọ bụrụ nꞌezie na ị gụrụ m dị ka enyi gị, nabata Onisimọs dị ka ị ga-esi nabata m.18Biko, ọ bụrụ na o mejọrọ gị nꞌụzọ ọ bụla, ọ bụrụkwa na ọ dị ihe ọ bụla o zuru, gụọ ya dị ka ụgwọ m ji gị.19Aga m akwụghachi gị ya! Ka m jiri aka m dee ya nꞌebe a: mụ onwe m bụ Pọl ga-akwụghachi gị. Ọ bakwaghị uru ichetara gị ụgwọ i ji m. Nꞌihi na ụgwọ i ji m bụ mkpụrụ obi gị nꞌonwe ya.20Biko nwanna m, nꞌaha Onyenwe anyị, ana m arịọ gị ka i meere m nke a, ka obi m nwee izuike. Meere m ya dị ka nwanna m nꞌime Kraịst.21Obi siri m ike na ị ga-emere m ihe m rịọrọ gị nꞌime akwụkwọ a, ọ bụladị mee karịa dị ka m rịọrọ.22Were okwukwe kwadooro m ebe m ga-anọ nꞌihi na enwere m olileanya na Chineke ga-aza ekpere unu ime ka m si nꞌebe a pụta bịakwute unu.23Epafras, onye mụ na ya nọ nꞌụlọ mkpọrọ nꞌihi Kraịst Jisọs na-ekele unu.24Mak, na Aristakus, na Dimas, na Luuku, ndị mụ na ha na-arụkọ ọrụ na-ekelekwa unu.25Ka amara Onyenwe anyị Jisọs Kraịst dịnyere mmụọ unu.Igbo Bible 1988 No Data Igbo Bible 1988 FAILIMON 1 00:00:00 00:00:00 0.5x 2.0x https://beblia.bible:81/BibleAudio/igbo1988/philemon/001.mp3 1 1