× Asụsụ Europe Russian Belarusian Asụsụ Ukraine Asụsụ Polish Serbian Bulgaria Asụsụ Slovakian Czech Asụsụ Romania Moldovian Azebaịjan Armenia Onye Georgia Albania Avar Bashkir Tatar Chechen Asụsụ Slovenian Asụsụ Croatian Estonia Asụsụ Latvian Asụsụ Lithuania Asụsụ Hungary Asụsụ Finish Asụsụ Norway Asụsụ Sweden Asụsụ Iceland Grik Masedonia German Bavaria Asụsụ Dutch Asụsụ Danish Welsh Gaelic Asụsụ Aịrish French Basque Catalan .Talian Galacian Romani Bosnian North America Bekee South America Asụsụ Spanish Asụsụ Portuguese Guarani Asụsụ Quechuan Aymara Central America Onye Jamaica Asụsụ Nawatụl Kiche Qeqchi Asụsụ Haiti Ebe Ọwụwa Anyanwụ Eshia Chinese nke Ndị Japan Korean Mongolian Uyghur Hmong South East Asia Onye Malaysia Burmese Chin Asụsụ Nepali Cebuano Asụsụ Tagle Kambodia Thai Indoneshian Vietnam Asụsụ Javanese Lao Iban Iu Mien Kachin Lahu Aceh Balinese Bugis Pampanga Sasak Shan Waray South Asia Hindi Dia Awadhi Mizo Kannada Malayalam Marathi Gujarati Asụsụ Tamil Telugu Asụsụ Punjabi Kurukh Asụsụ Assam Maithili Asụsụ Bengali Asụsụ Urdu Sinhala Dogri Haryanvi Meitei Konkani Santalaị Sindhi Koya Thado Sanskrit Devanagari Adilabad Gondi Ahirani Balochi Bundeli Chhattisgarhi Garhwali Kangri Kumaoni Mewari Munda Sadri Seraiki Shekhawati Sylheti Etiti Asia Kyrgyz Asụsụ Uzbek Tajik Ndị Turkmen Kazakhstan Karakalpak Etiti ọwụwa anyanwụ Turkish Hibru Arabic Peshia Kurdi Pashto Coptic Africa Afrịka Xhosa Asụsụ Ndebele Akpan Asụsụ Amharik Wolaytta Onye Naijiria Mossi Ika Dinka Kabyle Ewe Asụsụ Swahili Morocco Asụsụ Somali Shona Madagaska Igbo Lingala Baoule Siswati Tsonga Tswana Onye Gambian Ndi Yoruba Kamba Kinyarwanda Hausa Chewa Luo Makua Dyula Fulfulde Kalenjin Kikọyu Kikwango Kirundi Krio Nigerian Pidgin Oromo Tshiluba Tshivenda Twi Umbundu Lugbara Luguru Pular Gussi Maasai Turkana Moba Nuer Shilluk Tamasheq Makonde Bemba Fon Hadiyya Ibibio Kimbundu Kimiiru Lango Liberian Kreyol Lomwe Mende Morisyen Ndau Nyankole Sena Sidamo Soga Songe Sukuma Tarifit Teso Tiv Zande Dagbani Kọntinent Australia New Zealand Papua New Guinea Asụsụ Ochie Asụsụ Arameik Latin Esperanto 1 1 1 1988 Nsọ nʼIgbo 2020Bible Nso 200619881 1 1 JEMES MATIUMAKLUKJỌNỌLU OZIROM1 KỌRINT2 KỌRINTGALETIAEFESỌSFILIPAIKỌLỌSI1 TESALỌNAIKA2 TESALỌNAIKA1 TIMỌTI2 TIMỌTITAITỌSFAILIMONHIBRUJEMES1 PITA2 PITA1 JỌN2 JỌN3 JỌNJUDNKPUGHE1 1 1 1 123451 1 1 : 1 1234567891011121314151617181920212223242526271 1 1 Igbo Bible 1988 JEMES 1 Chekwaa ihe edeturu 1Akwụkwọ ozi a sitere nꞌaka m Jemes, onye bụ onyeozi Chineke na Onyenwe anyị Jisọs Kraịst kwa. Ọ bụ unu ndị Juu kweere na Kraịst ka m na-edere ya. Unu ndị e sitere na mkpagbu a na-akpagbu unu mee ka unu gbasasịa biri nꞌebe dị iche iche nꞌụwa. Ndeewonụ!2Ụmụnna m, ka obi unu jupụta nꞌọṅụ mgbe ọ bụla ọnwụnwa dị iche iche gbara unu gburugburu.3Nꞌihi na mgbe a na-anwa okwukwe unu ọnwụnwa, ntachi obi unu na-enwe ohere ito eto.4Ya mere, agbalịla ịgbara nsogbu ọsọ, ma ọ bụ ịchọ ụzọ dị mfe ị ga-esi wepụ onwe gị na nsogbu ahụ. Kama nye ntachi obi gị ohere ka o too. Nꞌihi na mgbe o toro tozuo oke, ị ga-abụkwa onye pụrụ iguzo chịm, onye zuru ezu nꞌime onwe ya, nke ihe ọ bụla naagaghị akọ.5Ọ bụrụ na ọ dị onye na-enweghị ụdị amamihe ahụ dị mkpa nꞌoge ọnwụnwa, ya rịọ Chineke ka o nye ya. Nꞌihi na Chineke na-enye onye ọ bụla rịọrọ ya amamihe nꞌefu. Ọ dịghị atakwa onye ọ bụla ụta.6Ma mgbe ọ rịọrọ arịrịọ ahụ, ya site na mmụọ nke na-enweghị obi abụọ, mmụọ nke nwere ntụkwasị obi na Chineke ga-eme ihe ọ rịọrọ ya ka o mee. Nꞌihi na onye sitere nꞌobi abụọ rịọ Chineke ihe ọ bụla dị ka mpempe akwụkwọ nke ikuku naebugharị.7Onye dị otu ahụ ekwesịghị ile anya na ọ ga-esite nꞌaka Chineke nata ihe ọ bụla.8Nꞌihi na onye ahụ dịkwa ka nwoke na-enwe obi abụọ mgbe nile, nke na-adịghị enwe mkpebi nꞌime onwe ya banyere ihe ọ bụla ọ chọrọ ime.9Ka nwanna nꞌime Kraịst, nke bụ ogbenye nꞌihe nke ụwa a, ṅụrịa ọṅụ, nꞌihi na ọ bụ ọgaranya nꞌihu Onyenwe anyị.10Ka onye bụ ọgaranya nꞌakụ na ụba nke ụwa ṅụrịakwa ọṅụ nꞌihi na e meela ka ọ mata, na akụ na ụba ya abaghị uru nꞌihu Onyenwe anyị. E meela ka ọ ghọtakwa na ya onwe ya ga-anwụkwa, dị ka okoko osisi si ada nꞌala kpọnwụọ.11Nꞌihi na mgbe ọ bụla anwụ waliri chasie ike, wepụta okpomọkụ, ọ na-eme ka ahihia kpọnwụọ, ka okoko osisi daa nꞌala, ka mma ya gwụsịakwa.12Ọṅụ dịrị nwoke ahụ nke naanọgide na-adịghị ada mba nꞌoge ọnwụnwa. Nꞌihi na mgbe oge ọnwụnwa ahụ gasịrị, ọ ga-anata ụgwọ ọrụ, nke bụ okpueze ndụ, nke Chineke kwere nkwa inye ndị nile hụrụ ya nꞌanya.13Ka onye ọ bụla hapụ ịsị mgbe a na-anwa ya, “Ọ bụ Chineke wetaara m ọnwụnwa a.” Nke a abụghị eziokwu. Nꞌihi na ọ dịghị mgbe a pụrụ ịnwa Chineke ka o mee ihe ọjọọ. Ọ dịkwaghị anwa mmadụ ọ bụla ka o mee ihe ọjọọ.14Kama ọnwụnwa na-abịara mmadụ site nꞌọchịchọ nke obi ya. Ọ bụkwa ọchịchọ ọjọọ nke mmadụ na-arafu ya, dọkpụfuo ya.15Ọ bụ ọchịchọ ọjọọ a, mgbe ha bara ụba nꞌime obi, na-eduba mmadụ na mmehie. Mgbe anyị mehiekwara, ọ bụ mmehie na-eduba nꞌọnwụ.16Ya mere, ka onye ọ bụla hapụ iduhie unu ụmụnna m.17Onyinye ọ bụla dị mma, na nke zuru oke na-esite nꞌeluigwe abịa. Ọ na-esite nꞌebe Chineke dị ukwuu nke eluigwe, onye kere ihe nile na-abịa. Chineke enweghị oge ọ na-agbanwe, nꞌihi na ọ dịghị ka onyinyo mmadụ nke na-agbanwe agbanwe.18Ọ bụ nanị Chineke kpebiri ime ka anyị dịrị ndụ site nꞌokwu ya bụ eziokwu. O mekwara nke a nꞌihi na ọ chọrọ ka anyị bụrụ ụmụ mbụ ọ mụrụ nꞌezinụlọ ọhụrụ ahụ o mere ka ọ dịrị.19Chetanụ nke a ụmụnna m. Ka onye ọ bụla nwee ntị na-anụ ihe ọsịịsọ, na ire dị arọ ikwu okwu. Ka onye ọ bụla bụrụ onye iwe na-adịghị ewe ọsịịsọ.20Nꞌihi na iwe mmadụ abụghị ụzọ ziri ezi anyị pụrụ isi rụpụta ihe Chineke gụrụ dị ka ezi ihe.21Ya mere, wezuganụ ụzọ rụrụ arụ nile na ihe ọ bụla dị njọ nke fọdụrụ nꞌime ndụ unu. Nꞌọnọdụ ya nabataranụ onwe unu okwu ndụ ahụ nke a kụrụ nꞌobi unu, nke nwere ike ịzọpụta unu.22Unu abụla ndị na-eji ntị ha na-anụ okwu ndụ ahụ nanị, site nꞌụzọ dị otu a na-aghọgbu onwe unu. Kama bụrụnụ ndị na-eme ihe okwu ahụ kwuru.23Nꞌihi na onye ọ bụla na-ege ntị nꞌokwu ọ bụla ma hapụ iji ihe ọ nụrụ mee ihe, dị ka nwoke na-ele ihu ya nꞌenyo.24O lesịa onwe ya pụọ, ọ naechefukwa ihe ihu ya yiri ma nwa oge nta gasịa.25Ma nwoke ahụ nọgidesịrị ike na-ele anya nꞌime iwu ahụ zuru oke, nke na-eme ka mmadụ nwere onwe ya ee, nwoke ahụ na-aga nꞌihu ile na ime ihe iwu ahụ kwuru, hapụkwa ichefu ya, ka Chineke ga-agọzi mgbe ọ na-aga nꞌihu na-eme ihe ahụ.26Ọ bụrụ na mmadụ ọ bụla echee na ya bụ onye na-ekpere Chineke ma hapụ ijide ire ya aka ma ọ bụ ịkwa ire ya nga, onye dị otu a na-arafu onwe ya, okpukpe Chineke ya bụkwa ihe na-abaghị uru.27Ezi okpukpe Chineke, nke Chineke na-anabata dị ka okpukpe dị ọcha, na nke na-enweghị ọrụ, bụ ka anyị lekọtaa ndị na-enweghị nne na nna nꞌime nsogbu ha. Ka anyị debe onwe anyị iche hapụ ịmerụ onwe anyị nꞌụwa.Igbo Bible 1988 No Data Igbo Bible 1988 JEMES 1 00:00:00 00:00:00 0.5x 2.0x https://beblia.bible:81/BibleAudio/igbo1988/james/001.mp3 5 1