× Asụsụ Europe Russian Belarusian Asụsụ Ukraine Asụsụ Polish Serbian Bulgaria Asụsụ Slovakian Czech Asụsụ Romania Moldovian Azebaịjan Armenia Onye Georgia Albania Avar Bashkir Tatar Chechen Asụsụ Slovenian Asụsụ Croatian Estonia Asụsụ Latvian Asụsụ Lithuania Asụsụ Hungary Asụsụ Finish Asụsụ Norway Asụsụ Sweden Asụsụ Iceland Grik Masedonia German Bavaria Asụsụ Dutch Asụsụ Danish Welsh Gaelic Asụsụ Aịrish French Basque Catalan .Talian Galacian Romani Bosnian North America Bekee South America Asụsụ Spanish Asụsụ Portuguese Guarani Asụsụ Quechuan Aymara Central America Onye Jamaica Asụsụ Nawatụl Kiche Qeqchi Asụsụ Haiti Ebe Ọwụwa Anyanwụ Eshia Chinese nke Ndị Japan Korean Mongolian Uyghur Hmong South East Asia Onye Malaysia Burmese Chin Asụsụ Nepali Cebuano Asụsụ Tagle Kambodia Thai Indoneshian Vietnam Asụsụ Javanese Lao Iban Iu Mien Kachin Lahu Aceh Balinese Bugis Pampanga Sasak Shan Waray South Asia Hindi Dia Awadhi Mizo Kannada Malayalam Marathi Gujarati Asụsụ Tamil Telugu Asụsụ Punjabi Kurukh Asụsụ Assam Maithili Asụsụ Bengali Asụsụ Urdu Sinhala Dogri Haryanvi Meitei Konkani Santalaị Sindhi Koya Thado Sanskrit Devanagari Adilabad Gondi Ahirani Balochi Bundeli Chhattisgarhi Garhwali Kangri Kumaoni Mewari Munda Sadri Seraiki Shekhawati Sylheti Etiti Asia Kyrgyz Asụsụ Uzbek Tajik Ndị Turkmen Kazakhstan Karakalpak Etiti ọwụwa anyanwụ Turkish Hibru Arabic Peshia Kurdi Pashto Coptic Africa Afrịka Xhosa Asụsụ Ndebele Akpan Asụsụ Amharik Wolaytta Onye Naijiria Mossi Ika Dinka Kabyle Ewe Asụsụ Swahili Morocco Asụsụ Somali Shona Madagaska Igbo Lingala Baoule Siswati Tsonga Tswana Onye Gambian Ndi Yoruba Kamba Kinyarwanda Hausa Chewa Luo Makua Dyula Fulfulde Kalenjin Kikọyu Kikwango Kirundi Krio Nigerian Pidgin Oromo Tshiluba Tshivenda Twi Umbundu Lugbara Luguru Pular Gussi Maasai Turkana Moba Nuer Shilluk Tamasheq Makonde Bemba Fon Hadiyya Ibibio Kimbundu Kimiiru Lango Liberian Kreyol Lomwe Mende Morisyen Ndau Nyankole Sena Sidamo Soga Songe Sukuma Tarifit Teso Tiv Zande Kọntinent Australia New Zealand Papua New Guinea Asụsụ Ochie Asụsụ Arameik Latin Esperanto 1 1 1 1988 Nsọ nʼIgbo 2020Bible Nso 200619881 1 1 1 PITA MATIUMAKLUKJỌNỌLU OZIROM1 KỌRINT2 KỌRINTGALETIAEFESỌSFILIPAIKỌLỌSI1 TESALỌNAIKA2 TESALỌNAIKA1 TIMỌTI2 TIMỌTITAITỌSFAILIMONHIBRUJEMES1 PITA2 PITA1 JỌN2 JỌN3 JỌNJUDNKPUGHE1 1 1 3 123451 1 1 : 9 123456789101112131415161718192021221 1 1 Igbo Bible 1988 1 PITA 3 Chekwaa ihe edeturu 1Unu ndị inyom nwere di na-eruberenụ di unu isi nꞌihi na ọ bụ site na mmeso unu na-emeso ha ka ndị na-ekweghị nꞌokwu Chineke nwere ike ikwere.2Ndụ ọma unu na-ebi pụrụ ime ka ha chegharịa karịa okwu ọnụ ọ bụla unu ga-agwa ha.3Unu abụla ndị na-achọ ịkwa mma nke anụ ahụ nanị, ndị na-atụfu oge ijikwa ma ọ bụ iyi iyeri ma ọ bụ ihe ntị dị iche iche ma ọ bụkwanụ ndị na-achọ ka ha yie uwe ọhụrụ ma ọ bụ maa akwa ọhụrụ pụtara mgbe ọ bụla.4Kama meenụ ka mma unu bụrụ mma si nꞌime ime unu pụta, mma ahụ na-adịghị eme agadi, mma nke mmụọ ịdị nwayọọ, ma mmụọ ịdị nsọ, mma dị oke ọnụ ahịa nꞌihu Chineke.5Nke a bụ ụdị ịma mma a hụrụ na ndụ ndị inyom ihe ha dị Chineke mma na mgbe ochie. Ndị inyom tụkwasịrị Chineke obi, na ndị echiche ha na nzube di ha dakọtara.6Nke a bụ ihe Sera nꞌonwe ya mere. O doro onwe ya nꞌokpuru di ya bụ Eberaham, sọpụrụ ya dị ka nna nwe ụlọ. Ugbu a ọ bụrụ na unu emee otu a, unu na-agbaso nzọ ụkwụ Sera dị ka ụmụ na-eme ezi ihe. Mgbe ahụ ịtụ egwu agaghị adịrị unu na unu ga-emejọ di unu.7Unu bụ di na-alụ nwụnye lezienụ nwụnye unu anya nke ọma. Cheenụ echiche banyere ihe na-akpa ha mkpa nꞌihi adịghị ike ha. Nye ha ugwu ruuru ha nꞌihi na ọ bụ unu na nwụnye unu ga-abụ otu ịnata ndụ ahụ Chineke ga-enye. Ọ bụrụ na unu emesoghị ha mmeso dị ka o si kwesị Chineke agaghị aza ekpere unu.8Ihe ọzọ m chọrọ ịgwa unu bụ nke a, nweenụ otu obi, ka ihe na-ewute ibe unu na-ewute unu. Bụrụnụ ndị nwere obi ọma na obi dị umeala.9Unu ejila ihe ọjọọ akwụghachi ihe ọjọọ e mere unu, ma ọ bụ gwa mmadụ okwu ọjọọ mgbe ha gwara unu okwu ọjọọ. Kama kpeenụ ekpere ka Chineke gọzie ha, nꞌihi na anyị kwesịrị ịbụ ndị na-emere ndị ọzọ ebere. Chineke ga-agọzikwa unu nꞌihi ya.10Nꞌihi na akwụkwọ nsọ kwuru sị, “Onye ọ bụla chọrọ ibi ndụ dị ụtọ, nke chọrọ ịhụ ụbọchị ọma ahụ anya, ya kwụsị ikwu okwu ọjọọ na okwu ụgha.11Ya sitekwa nꞌajọ omume ya tụgharịa bido ime ezi ihe. Ya gbalịakwa ibi ndụ udo, ma na-agbasokwa ndụ udo.12Nꞌihi na Chineke si nꞌelu na-ele ndị ezi omume anya mgbe nile, ọ na-egekwa ntị nꞌekpere ha, ma ọ na-ele ndị ajọ omume anya ọjọọ.”13O nweghị onye ga-emerụ unu ahụ nꞌihi na unu na-eme ezi ihe.14Ma a sịkwarị na ha ataa unu ahụhụ nꞌihi na unu mere ihe dị mma, ngọzi dịrị unu. Unu atụla ha egwu, ka obi gharakwa ịlọ unu mmiri.15Na-enyenụ Chineke nsọpụrụ nꞌime obi unu. Nọọkwanụ na njikere mgbe nile iguzo kọwaara onye ọ bụla jụrụ unu ajụjụ banyere olileanya ahụ unu nwere nꞌime unu. Ma werenụ obi dị umeala na nsọpụrụ na-eme ya.16Meenụ obi unu ka ọ dị ọcha, ka ndị na-akọ unu ọnụ na ndị na-ekwulu unu bụrụ ndị ihere ga-eme mgbe ha hụrụ na ihe ha na-ebo unu ebubo banyere ya bụ ihe ọma.17Nꞌihi na ọ ka mma ịta ahụụ nꞌihi ọrụ ọma ma ọ bụrụ uche Chineke, karịa ịta ahụụ nꞌihi ọrụ ọjọọ.18Nꞌihi na Kraịst nꞌonwe ya hụrụ ahụhụ nwụọ nꞌihi unu. Ọ nwụrụ ọnwụ nanị otu ugboro nꞌihi anyị nile bụ ndị mmehie. Ezi mmadụ na-emeghị ihe ọjọọ ọ bụla nwụrụ nꞌihi ndị ajọ omume, nꞌihi ime ka anyị bịa nꞌihu Chineke. Ọ bụ ezie na e gburu ya nꞌanụ ahụ ma e mere ka ọ dịrị ndụ nꞌime mmụọ ya.19Ọ bụkwa nꞌime mmụọ ya ka ọ gara kwusaa ozi ọma nye mmụọ ndị ahụ a kpọchiri nꞌụlọ mkpọrọ.20Nke a bụ mmụọ ndị ahụ jụrụ ime ihe Chineke chọrọ mgbe ahụ o ji ntachi obi chere ha nꞌoge ahụ Noa nọ na-ewu ụgbọ mmiri ya. Ọ bụ nanị mmadụ asatọ nꞌime ndị bi nꞌoge ahụ ka a zọpụtara site na mmiri ahụ riri ndị bi nꞌụwa.21Nke a bụ ihe ịma atụ na-ezi anyị ihe baptizim pụtara. Mgbe e mere anyị baptizim, anyị na-egosi na a zọpụtala anyị site nꞌọnwụ na mbibi nꞌihi mbilite nꞌọnwụ Kraịst. O gosighị na e meela ka anụ ahụ anyị dịrị ọcha nꞌihi baptizim e mere anyị, kama ọ na-egosi na anyị, ndị e mere baptizim na-alọghachikwute Chineke na-arịọ ya ka ọ sachaa mmehie dị nꞌobi anyị.22Ugbu a Kraịst nọ nꞌeluigwe. Ọ nọkwa nꞌakụkụ aka nrị Chineke. Ọ bụ ya na-achị ndị mmụọ ozi nile, ndị ọchịchị nile, na ike nile nke eluigwe.Igbo Bible 1988 No Data Igbo Bible 1988 1 PITA 3 00:00:00 00:00:00 0.5x 2.0x https://beblia.bible:81/BibleAudio/igbo1988/1peter/003.mp3 5 3