× Asụsụ Europe Russian Belarusian Asụsụ Ukraine Asụsụ Polish Serbian Bulgaria Asụsụ Slovakian Czech Asụsụ Romania Moldovian Azebaịjan Armenia Onye Georgia Albania Avar Bashkir Tatar Chechen Asụsụ Slovenian Asụsụ Croatian Estonia Asụsụ Latvian Asụsụ Lithuania Asụsụ Hungary Asụsụ Finish Asụsụ Norway Asụsụ Sweden Asụsụ Iceland Grik Masedonia German Bavaria Asụsụ Dutch Asụsụ Danish Welsh Gaelic Asụsụ Aịrish French Basque Catalan .Talian Galacian Romani Bosnian North America Bekee South America Asụsụ Spanish Asụsụ Portuguese Guarani Asụsụ Quechuan Aymara Central America Onye Jamaica Asụsụ Nawatụl Kiche Qeqchi Asụsụ Haiti Ebe Ọwụwa Anyanwụ Eshia Chinese nke Ndị Japan Korean Mongolian Uyghur Hmong South East Asia Onye Malaysia Burmese Chin Asụsụ Nepali Cebuano Asụsụ Tagle Kambodia Thai Indoneshian Vietnam Asụsụ Javanese Lao Iban Iu Mien Kachin Lahu Aceh Balinese Bugis Pampanga Sasak Shan Waray South Asia Hindi Dia Awadhi Mizo Kannada Malayalam Marathi Gujarati Asụsụ Tamil Telugu Asụsụ Punjabi Kurukh Asụsụ Assam Maithili Asụsụ Bengali Asụsụ Urdu Sinhala Dogri Haryanvi Meitei Konkani Santalaị Sindhi Koya Thado Sanskrit Devanagari Adilabad Gondi Ahirani Balochi Bundeli Chhattisgarhi Garhwali Kangri Kumaoni Mewari Munda Sadri Seraiki Shekhawati Sylheti Etiti Asia Kyrgyz Asụsụ Uzbek Tajik Ndị Turkmen Kazakhstan Karakalpak Etiti ọwụwa anyanwụ Turkish Hibru Arabic Peshia Kurdi Pashto Coptic Africa Afrịka Xhosa Asụsụ Ndebele Akpan Asụsụ Amharik Wolaytta Onye Naijiria Mossi Ika Dinka Kabyle Ewe Asụsụ Swahili Morocco Asụsụ Somali Shona Madagaska Igbo Lingala Baoule Siswati Tsonga Tswana Onye Gambian Ndi Yoruba Kamba Kinyarwanda Hausa Chewa Luo Makua Dyula Fulfulde Kalenjin Kikọyu Kikwango Kirundi Krio Nigerian Pidgin Oromo Tshiluba Tshivenda Twi Umbundu Lugbara Luguru Pular Gussi Maasai Turkana Moba Nuer Shilluk Tamasheq Makonde Bemba Fon Hadiyya Ibibio Kimbundu Kimiiru Lango Liberian Kreyol Lomwe Mende Morisyen Ndau Nyankole Sena Sidamo Soga Songe Sukuma Tarifit Teso Tiv Zande Kọntinent Australia New Zealand Papua New Guinea Asụsụ Ochie Asụsụ Arameik Latin Esperanto 1 1 1 1988 Nsọ nʼIgbo 2020Bible Nso 200619881 1 1 2 PITA MATIUMAKLUKJỌNỌLU OZIROM1 KỌRINT2 KỌRINTGALETIAEFESỌSFILIPAIKỌLỌSI1 TESALỌNAIKA2 TESALỌNAIKA1 TIMỌTI2 TIMỌTITAITỌSFAILIMONHIBRUJEMES1 PITA2 PITA1 JỌN2 JỌN3 JỌNJUDNKPUGHE1 1 1 3 1231 1 1 : 9 1234567891011121314151617181 1 1 Igbo Bible 1988 2 PITA 3 Chekwaa ihe edeturu 1Ndị m hụrụ nꞌanya, nke a bụ akwụkwọ nke abụọ m na-edetara unu.2Nꞌime ha abụọ ihe m mere bụ ichetara unu ihe ndị ahụ nile unu maara, nke bụ ihe nile unu mụtara site nꞌaka ndị amụma dị nsọ, na site nꞌọnụ anyị bụ ndị ozi, ndị wetaara unu okwu Onyenwe anyị na Onye nzọpụta anyị.3Ihe mbụ m chọrọ ichetara unu bụ nke a: matanụ na nꞌoge ikpeazụ ahụ ụfọdụ mmadụ ga-apụta, ndị ga-eme ihe ọjọọ ọ bụla ha nwere ike ichepụta nꞌuche ha. Ha ga-achịkwa eziokwu ahụ unu na-ekwusa ọchị.4Lee ụdị ihe ha ga-agwa unu, “Jisọs ò kwere unu nkwa na ọ ga-alọghachi ọzọ? Olee kwanụ ya? O nweghị nke ọ na-abịa! Leenụ kemgbe nna nna anyị ha biri ndụ nwụọ, ihe nile dịkwa otu ha dị site na mgbe e kere ụwa. Ọ dịghị ihe mgbanwe ọ bụla dị.”5Ma ndị na-ekwu ụdị okwu a kpachaara anya chefuo na Chineke onye sitere nꞌokwu ọnụ ya kee eluigwe na ụwa, bụkwa onye mere ka e jiri mmiri dị ukwuu laa ụwa mbụ ahụ nꞌiyi nꞌoge gara aga. Ọ bụ otu Chineke ahụ mere ka e sitekwa na mmiri kpụpụta ala akọrọ na ihe nile gbara ya gburugburu.6***7Ọ bụkwa otu okwu ọnụ Chineke ahụ ka e ji nye iwu ka e chebe eluigwe na ụwa tutuu ruo ụbọchị ikpe ahụ, mgbe a ga-eji ọkụ laa ha nꞌiyi nꞌụbọchị ahụ a ga-ekpe ndị nile na-amaghị Chineke ikpe, laakwa ha nꞌiyi.8Ndị m hụrụ nꞌanya, unu echefula otu okwu a, nꞌanya Chineke, ọ dịghị ihe dị iche nꞌetiti otu ụbọchị na puku ụbọchị. Ha bụ otu ihe nꞌanya ya.9Onyenwe anyị anaghị etufu oge imezu nkwa ya, dị ka ndị mmadụ na-ekwu, kama o sitere ogologo ntachi obi na-eche ndị mmehie ka ha chegharịa, nꞌihi na ọ chọghị ka onye ọ bụla laa nꞌiyi, kama ọ chọrọ ka onye ọ bụla si na mmehie ya chegharịa.10Ma ụbọchị ahụ Onyenwe anyị kwadobere ga-abịa mgbe anyị na-eleghị anya ya. Nꞌụbọchị ahụ, eluigwe ga-eji oke ụzụ gafee. Ihe nile dị nꞌeluigwe ga-agba ọkụ, laa nꞌiyi. Ụwa na ihe nile dị nꞌime ya ka ọkụ ga-erepịakwa nꞌotu ntabi anya.11Ebe ọ bụ na ihe nile gbara anyị gburugburu ga-esi otu a laa nꞌiyi, ụdị ndụ dị nsọ dị aṅaa ka anyị kwesịrị ibi? Ụdị ndụ ezi omume dịkwa aṅaa ka anyị kwesịrị ibi12mgbe anyị nọ na-ele anya ọbịbịa nke oke ụbọchị ahụ? Gbalịsiekwanụ ike isite na ndụ unu mee ka ụbọchị ahụ bịa ngwangwa, ụbọchị ahụ Chineke ga-eji ọkụ repịa eluigwe, mee ka ihe nile dị nꞌeluigwe gbazee bụrụ ihe na-agaghị adịkwa.13Ma anyị na-ele anya mmezu nkwa ahụ Chineke kwere, nkwa inye anyị elugwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ ebe ezi omume nanị ga-adị.14Bikonụ ndị m hụrụ nꞌanya, mgbe unu nọ na-eche ọbịbịa nke ụbọchị ahụ jisienụ ike hụ na aka unu dị ọcha, kwerekwanụ ka unu na ndị ọzọ biri nꞌudo, ka a hapụ ịchọta ntụpọ ọ bụla nꞌime unu mgbe unu ga-eguzo nꞌihu Chineke.15Chetakwanụ ihe mere Onyenwe anyị adịghị eme ngwangwa ịlọghachi. Ọ na-enye anyị ohere ime ka ndị ọzọ nata ozi ọma ahụ ga-ewetara ha nzọpụta. Nwanna anyị Pọl ejirila amamihe Chineke nyere ya dee ihe banyere okwu a nꞌọtụtụ akwụkwọ ozi ọ na-ede. E nwere ụfọdụ ihe o kwuru nke siri ike ịghọta. Ma ọ bụ nꞌụdị okwu a ka a na-ahụ ọtụtụ ndị nzuzu, ndị na-akọwa okwu ndị a dị ka ha si chepụta nꞌobi ha. Ha asụgharịala ihe o dere isi, mee ka a ghọta okwu ndị a nꞌụzọ na-abụghị ụzọ Pọl onye dere ha chọrọ ka anyị ghọta ha. Nke a bụkwa ihe ha na-emekwa mpaghara akwụkwọ nsọ ụfọdụ si otu a na-ewetara onwe ha ịla nꞌiyi.16***17Ụmụnna m, ana m adọ unu aka na ntị banyere ihe ndị a, ime ka unu nọọ na nche, ka a ghara isite na njehie ndị ozizi ọjọọ a duhie unu, ime ka unu si nꞌọnọdụ unu dapụ.18Bụrụnụ ndị na-eto eto nꞌime mmụọ unu, bụrụkwanụ ndị na-aga nꞌihu ịmụta ihe banyere Onyenwe anyị na Onye nzọpụta anyị Jisọs Kraịst nke ọma. Ka otuto dịrị ya ugbu a na mgbe nile ebighị ebi. Amin.Igbo Bible 1988 No Data Igbo Bible 1988 2 PITA 3 00:00:00 00:00:00 0.5x 2.0x https://beblia.bible:81/BibleAudio/igbo1988/2peter/003.mp3 3 3