× Asụsụ Europe Russian Belarusian Asụsụ Ukraine Asụsụ Polish Serbian Bulgaria Asụsụ Slovakian Czech Asụsụ Romania Moldovian Azebaịjan Armenia Onye Georgia Albania Avar Bashkir Tatar Chechen Asụsụ Slovenian Asụsụ Croatian Estonia Asụsụ Latvian Asụsụ Lithuania Asụsụ Hungary Asụsụ Finish Asụsụ Norway Asụsụ Sweden Asụsụ Iceland Grik Masedonia German Bavaria Asụsụ Dutch Asụsụ Danish Welsh Gaelic Asụsụ Aịrish French Basque Catalan .Talian Galacian Romani Bosnian North America Bekee South America Asụsụ Spanish Asụsụ Portuguese Guarani Asụsụ Quechuan Aymara Central America Onye Jamaica Asụsụ Nawatụl Kiche Qeqchi Asụsụ Haiti Ebe Ọwụwa Anyanwụ Eshia Chinese nke Ndị Japan Korean Mongolian Uyghur Hmong South East Asia Onye Malaysia Burmese Chin Asụsụ Nepali Cebuano Asụsụ Tagle Kambodia Thai Indoneshian Vietnam Asụsụ Javanese Lao Iban Iu Mien Kachin Lahu Aceh Balinese Bugis Pampanga Sasak Shan Waray South Asia Hindi Dia Awadhi Mizo Kannada Malayalam Marathi Gujarati Asụsụ Tamil Telugu Asụsụ Punjabi Kurukh Asụsụ Assam Maithili Asụsụ Bengali Asụsụ Urdu Sinhala Dogri Haryanvi Meitei Konkani Santalaị Sindhi Koya Thado Sanskrit Devanagari Adilabad Gondi Ahirani Balochi Bundeli Chhattisgarhi Garhwali Kangri Kumaoni Mewari Munda Sadri Seraiki Shekhawati Sylheti Etiti Asia Kyrgyz Asụsụ Uzbek Tajik Ndị Turkmen Kazakhstan Karakalpak Etiti ọwụwa anyanwụ Turkish Hibru Arabic Peshia Kurdi Pashto Coptic Africa Afrịka Xhosa Asụsụ Ndebele Akpan Asụsụ Amharik Wolaytta Onye Naijiria Mossi Ika Dinka Kabyle Ewe Asụsụ Swahili Morocco Asụsụ Somali Shona Madagaska Igbo Lingala Baoule Siswati Tsonga Tswana Onye Gambian Ndi Yoruba Kamba Kinyarwanda Hausa Chewa Luo Makua Dyula Fulfulde Kalenjin Kikọyu Kikwango Kirundi Krio Nigerian Pidgin Oromo Tshiluba Tshivenda Twi Umbundu Lugbara Luguru Pular Gussi Maasai Turkana Moba Nuer Shilluk Tamasheq Makonde Bemba Fon Hadiyya Ibibio Kimbundu Kimiiru Lango Liberian Kreyol Lomwe Mende Morisyen Ndau Nyankole Sena Sidamo Soga Songe Sukuma Tarifit Teso Tiv Zande Kọntinent Australia New Zealand Papua New Guinea Asụsụ Ochie Asụsụ Arameik Latin Esperanto 1 1 1 1988 Nsọ nʼIgbo 2020Bible Nso 200619881 1 1 1 JỌN MATIUMAKLUKJỌNỌLU OZIROM1 KỌRINT2 KỌRINTGALETIAEFESỌSFILIPAIKỌLỌSI1 TESALỌNAIKA2 TESALỌNAIKA1 TIMỌTI2 TIMỌTITAITỌSFAILIMONHIBRUJEMES1 PITA2 PITA1 JỌN2 JỌN3 JỌNJUDNKPUGHE1 1 1 4 123451 1 1 : 19 1234567891011121314151617181920211 1 1 Igbo Bible 1988 1 JỌN 4 Chekwaa ihe edeturu 1Ndị enyi m m hụrụ nꞌanya, unu ekwenyela okwu nile unu nụrụ nꞌihi na mmadụ sị na ọ bụ ozi si nꞌebe Chineke nọ bịa. Kama nwapụtanụ ma ọ bụ okwu Chineke nꞌezie. Nꞌihi na ọtụtụ ndị amụma ụgha na ndị ozizi ụgha ejupụtala ebe nile.2Ụzọ unu ga-esi mata ma okwu unu nụrụ o si nꞌaka Mmụọ Chineke bụ nke a, ọ̀ na-ekwupụta na Jisọs Kraịst Ọkpara Chineke ghọrọ mmadụ jiri anụ ahụ mmadụ bịa nꞌụwa? Ọ bụrụ na okwu ahụ kwagidere na Jisọs bịara nꞌụdị mmadụ nꞌụwa mgbe ahụ okwu ahụ bụ nke si nꞌebe Chineke nọ bịa.3Ma ọ bụrụ na nkwusa ahụ asị na Jisọs esighị otu a bịa, ọ bụghị nke si nꞌebe Chineke nọ pụta. Ọ bụ nkwusa okwu ụgha ahụ, nke si nꞌebe onye iro Kraịst bịa. Unu anụla ihe banyere ọbịbịa ya. Ndị ozi ya jupụtara ụwa taa.4Ma unu bụ ụmụ Chineke, ndị enyi m. Unu emeriela ndị ozizi ụgha ndị a nile. Nꞌihi na onye ahụ bi nꞌime unu dị ike karịa onye ahụ nọ nꞌụwa.5Nꞌihi na ndị a nile si nꞌime ụwa pụta. Ya mere, ihe ha na-ekwu okwu ya bụ nanị ihe banyere ụwa. Ụwa na-aṅakwa ha ntị.6Ma anyị bụ ụmụ Chineke, ya mere, ọ bụ nanị ndị maara Chineke ga-ege anyị ntị. Ndị ụwa agaghị ege anyị ntị nꞌihi na ha amaghị Chineke. Nke a bụkwa ụzọ anyị pụrụ isi chọpụta onye si nꞌọnụ ndị nkwusa na-ekwu okwu. Nꞌihi na ọ bụrụ na Chineke esi nꞌọnụ ha kwuo okwu ụwa agaghị anabata ya.7Ndị enyi m, o kwesịrị ka anyị hụrịtaa onwe anyị nꞌanya nꞌihi na ịhụnanya na-esi nꞌebe Chineke nọ abịa. Ndị nile na-ahụ ibe ha nꞌanya na-egosi na ha bụ ụmụ Chineke. Ha na-egosikwa na ha na-amata Chineke nke ọma nke ọma.8Ọ bụrụ na mmadụ adịghị ahụ ibe ya nꞌnya ọ na-ezipụta na ọ maghị onye Chineke bụ, nꞌihi na Chineke bụ ịhụnanya.9Nꞌihi na Chineke gosiri anyị ịdị ukwuu nke ịhụnanya ya site nꞌizite Ọkpara ya ka o wetara anyị ndụ ebighị ebi site nꞌọnwụ ọ nwụrụ.10Site nꞌihe a Chineke meere anyị, anyị na-ahụ ihe a na-akpọ ịhụ mmadụ nꞌanya nꞌezie. Ọ bụghị na anyị buru ụzọ hụ Chineke nꞌanya kama ọ bụ na Chineke nꞌonwe ya hụrụ anyị nꞌanya zite Ọkpara ya ka ọ bụrụ ihe ịjụrụ ya obi nꞌihi mmehie anyị.11Ndị enyi m, ebe ọ bụ na Chineke si otu a hụ anyị nꞌanya, anyị kwesịrị ịhụrịta onwe anyị nꞌanya.12Ọ bụ ezie na o nwebeghị mgbe ọ bụla anyị ji anyạ anyị hụ Chineke anya, ma ọ bụrụ na anyị ahụ ibe anyị nꞌanya, Chineke na-ebi nꞌime anyị. Ịhụnanya ya kwa na-eto eto nꞌime anyị.13O tinyekwala Mmụọ Nsọ ya nꞌime anyị igosi anyị na o bi nꞌime anyị, na anyị bikwa nꞌime ya.14Karịsịa, anyị ejirila anya anyị hụ Ọkpara ahụ Chineke zitere. Ugbu a anyị na-akọrọ ụwa nile na Chineke zitere Ọkpara ya ka ọ bụrụ Onye nzọpụta ụwa.15Chineke bi nꞌime onye ọ bụla kweere, na nꞌime onye bụla meghere ọnụ ya kwupụta na Jisọs bụ Ọkpara Chineke. Onye dị otu a bikwa nꞌime Chineke.16Anyị maara na Chineke hụrụ anyị nꞌanya nꞌihi mmetụta ịhụnanya ya metụtara anyị, na nꞌihi na anyị kweere na ya mgbe ọ gwara anyị na ọ hụrụ anyị nꞌanya. Chineke bụ ịhụnanya. Onye ọ bụla kwa na-ebi ndụ ịhụnanya na-anọgide nꞌime Chineke. Chineke nꞌonwe ya na-ebinyekwara onye dị otu a.17Ọ bụrụ na anyị na-ebi ndụ nꞌime Kraịst, ịhụnanya anyị gaaba ụba tutuu ruo mgbe ọ ghọrọ ihe zuru oke. Mgbe ahụ ihere agaghị eme anyị nꞌụbọchị ikpe ahụ. Kama anyị ga-eji ntụkwasị obi na ọṅu guzoro nꞌihi Chineke nꞌụbọchị ahụ, nꞌihi na ọ hụrụ anyị nꞌanya dị ka anyị onwe anyị si hụ ya nꞌanya.18Anyị adịghị atụ onye hụrụ anyị nꞌanya ụjọ. Ezi ịhụnanya o nwere nꞌebe anyị nọ na-ewezụga ụjọ ọ bụla anyị nwere banyere ihe ọ ga-eme anyị. Ọ bụrụ na anyị na-atụ ya ụjọ, o gosiri na anyị enweghị afọ ojuju na ọ hụrụ anyị nꞌanya nꞌezie.19Ma ihe pụtara ìhè bụ na anyị hụrụ Chineke nꞌanya nꞌihi na o buru ụzọ gosi anyị na ọ hụrụ anyị nꞌanya.20Ọ bụrụ na onye ọ bụla asị, “Ahụrụ Chineke nꞌanya,” ma nọgide na-akpọ nwanna ya asị, onye ahụ bụ nnọọ onye ụgha. Nꞌihi na ọ bụrụ na ọ hụghị nwanna ya nꞌanya, bụ onye ọ na-ahụ anya kwa ụbọchị, ọ̀ ga-esi aṅaa hụ Chineke nꞌanya bụ onye ọ na-ahụbeghị anya?21Chineke nꞌọnwe ya kwuru sị, “Onye na-ahụ Chineke nꞌanya kwesịkwara ịhụ nwanna ya nꞌanya.”Igbo Bible 1988 No Data Igbo Bible 1988 1 JỌN 4 00:00:00 00:00:00 0.5x 2.0x https://beblia.bible:81/BibleAudio/igbo1988/1john/004.mp3 5 4