Bible n'ime otu afọ Jenụwarị 20MATIU 13:31-5831. Jisọs tukwara ilu ọzọ sị ha, “Alaeze eluigwe dị ka mkpụrụ mọsụtadị nke onye ọrụ ubi kụrụ nꞌubi ya. Ọ bụ ezie ha ọ bụ mkpụrụ dịkarịsịrị nta karịa mkpụrụ ubi nile, ọ dị nta dị ka mkpụrụ aṅara32. ma mgbe mkpụrụ a toro, ọ na-adị ukwuu karịa ihe nile a kụrụ nꞌubi. Ọ na-aghọ osisi buru ibu, nke ụmụ nnụnụ na-arụ akwụ ha nꞌalaka ya.”33. Ọzọ kwa, Jisọs ji alaeze eluigwe tụnyere ihe na-eko achịcha nke nwanyị na-ewere gwakọtaa nꞌụtụ ọka e ji eme beredi, tutuu ruo mgbe ihe iko achịcha ahụ mere ka ụtụ ọka ahụ koo.34. Oge nile ka Jisọs na-eji ilu na-agwa ndị mmadụ ndị a okwu. O nweghị oge ọ bụla ọ gwara ha okwu hapụ iji ilu.35. O mere nke a ka okwu ndị amụma kwuru mezuo, nꞌihi na ha buru amụma sị, “Aga m eji ilu kwuo okwu mgbe m na-agwa ha okwu. Aga m agwakwa ha ihe mmadụ ọ bụla na-amaghị site nꞌoge e kere ụwa.”36. Emesịa, Jisọs hapụrụ igwe mmadụ ahụ nꞌezi baa nꞌụlọ. Ndị na-eso ụzọ ya bịakwutere ya sị ya, “Kọwaara anyị ihe ilu ahụ ị tụrụ pụtara, ilu banyere ahịhịa puru nꞌubi a kụrụ ọka.”37. Jisọs zara ha sị, “Ọ dị mma. Lee ihe nkọwa ya bụ: nwoke ahụ kụrụ mkpụrụ ahụ bụ mụ onwe m.38. Ubi ahụ a ghanyere mkpụrụ ndị ahụ bụ ụwa. Mkpụrụ nke a kụrụ nꞌubi ahụ nọchiri anya ụmụ nke alaeze ahụ. Ahịhịa ahụ puru nꞌubi ahụ nọchikwara anya ụmụ ekwensu.39. Onye iro ahụ gara kụọ mkpụrụ puru ahịhịa bụ ekwensu. Owuwe ihe ubi nọchiri anya ọgwụgwụ oge. Ndị owuwe ihe ubi bụkwa ndị mmụọ ozi.40. “Dị ka e siri fopụtasịa ahịhịa ahụ kpọọ ha ọkụ, otu a ka ọ ga-adị mgbe ụwa ga-agwụ.41. Aga m ezipụ ndị mmụọ ozi m ka ha gaa chịkọtaa ndị nile na-eme ka ndị mmadụ mee mmehie, na ndị nile na-arụ ọrụ ọjọọ.42. Ha ga-atụba ndị a nꞌime ọkụ, ebe ha ga-anọ na-akwa akwa, na-atakwa ikikere eze.43. Ma ndị nile bụ ụmụ Chineke ga-enwụ dị ka anyanwụ nꞌime alaeze Nna ha. Ndị nwere ntị ịnụ ihe ha nụrụ.44. “Ala eze eluigwe dị ka akụ e zoro nꞌotu ibiribe ala, nke otu nwoke chọpụtara. Nwoke a jiri ọṅụ ree ihe nile o nwere, ma gaa zụọ ibiribe ala ahụ.45. “Ọzọ, alaeze eluigwe yiri nkume dị oke ọnụ ahịa nke onye na-azụ ahịa chọtara.46. Mgbe ọ hụrụ nkume a, o rere ihe nile o nwere, were ego ya gaa zụrụ nkume a dị oke ọnụ ahịa.47. “Ọzọ kwa, alaeze eluigwe dị ka ụgbụ e ji egbu azụ, nke onye ọkụ azụ wụnyere nꞌime mmiri, jiri ya jide azụ dị iche iche, ndị a na-eri eri na ndị a na-adịghị eri eri.48. Mgbe ụgbụ a juru, onye ọkụ azụ ahụ na-adọpụta ya, nọdụ ala họpụtasịa ndị a na-eri eri ma na-etufụ ndị a na-adịghị eri eri.49. Otu a ka ọ ga-adị mgbe ụwa ga-agwụ. Ndị mmụọ ozi ga-abịa kewapụ ndị ọjọọ site nꞌetiti ụmụ Chineke.50. A ga-atụba ndị ọjọọ nꞌime ọkụ. Nꞌebe ahụ ka ha ga-anọ na-akwa akwa na-atakwa ikikere eze.51. Unu ghọtara ihe ndị a m na-ekwu?” Ha azara sị ya, “Ee, anyị ghọtara.”52. Jisọs sịrị ha, “Ya mere, onye ozizi iwu Mosisi ọ bụla soro bụrụ onye na-eso ụzọ nke alaeze eluigwe, ga-adị ka onyenwe ụlọ nke na-esite nꞌọba ya na-ewepụta ihe ọhụrụ na ihe ochie.”53. Mgbe Jisọs kwusịrị okwu ndị a, ọ laghachiri nꞌobodo Nazaret, gaa izi ndị mmadụ ihe nꞌime ụlọ ekpere. Amamihe ya na ọrụ ebube ọ rụrụ juru onye ọ bụla anya. Ha jụrịtara onwe ha ajụjụ na-asị, “Ebee ka o si nweta amamihe a? Ebee ka o si nweta ike ịrụ ọrụ ebube ndị a nile?54. ***55. “Nwoke a ọ̀ bụghị nwa Josef, onye ọkwa nka? Ọ̀ bụghị Meri bụ nne ya? Jemes, na Josef, na Saịmọn, na Judas, ha abụghị ụmụnne ya?56. Ọ̀ bụ na anyị amakwaghị ụmụnne ya ndị nwanyị, ndị anyị na ha bi nꞌebe a? Ebee ka o si nweta oke amamihe dị otu a?”57. Iwe were ha nꞌebe ọ nọ. Ma Jisọs gwara ha okwu sị ha, “A na-asọpụrụ onye amụma nꞌebe nile, ma a dịghị asọpụrụ ya nꞌala a mụrụ ya, na nꞌetiti ndị ikwu ya.”58. Ya mere, ọ rụghị ọtụtụ ọrụ ebube nꞌebe ahụ, nꞌihi na ha enweghị okwukwe nꞌime ya. Igbo Bible 1988 No Data