1. Ihe anyị na-ekwu bụ nke a, anyị nwere onyeisi nchụaja dị otu a. Ọ na-anọdụkwa nꞌebe nsọpụrụ dị elu nꞌakụkụ aka nri Chineke onye dị ukwuu, nꞌeluigwe.
2. Jisọs na-arụkwa ọrụ ya dị ka onyeisi nchụaja nꞌebe kachasị nsọ nke eluigwe. Ọ bụkwaghị nꞌụlọ nsọ nke mmadụ jiri aka wuo, kama nꞌụlọ nsọ ahụ Chineke nꞌonwe ya wuru.
3. Onyeisi nchụaja ọ bụla a họpụtara na-achụ aja na-enyekwa onyinye. Nꞌihi nke a Kraịst kwesịkwara ịchụ aja.
4. A sịkwarị na Kraịst nọ nꞌụwa, a garaghị anabata ya dị ka onye nchụaja nꞌihi na e nwere ndị nchụaja na-achụ aja dị ka usoro ọchụchụ aja ndị Juu si dị.
5. Ma ọrụ nile ndị nchụaja na-arụ bụ nanị onyinyo banyere ihe nke dị nꞌeluigwe. Ọ bụkwa nꞌihi nke a ka Chineke jiri gosi Mosisi mgbe ọ na-akwado iwuru ya ebe a ga-anọ fee ya ofufe nꞌọzara, otu ọ ga-esi wuo ụlọ ahụ. Chineke gwara ya okwu sị, “Lezie anya hụ na i mere ihe nile nꞌusoro dị ka m si gosi gị nꞌelu ugwu.”
6. Ma ọrụ nchụaja nke Chineke nyere Jisọs karịrị nke ndị nchụaja ndị Juu mma. Otu a kwa, ọgbụgba ndụ Kraịst mere ka ọ dịrị nꞌetiti Chineke na mmadụ dabeere na nkwa dị mma karịa nkwa ọgbụgba ndụ ochie ahụ.
7. O nweghị oge Chineke nwapụtara na ọgbụgba ndụ ochie ahụ zuru oke. A sịkwarị na ọgbụgba ndụ ochie ahụ juru afọ, Chineke agaraghị ekwe nkwa iwere ọgbụgba ndụ ọhụrụ dochie nke ochie ahụ.
8. Ma Chineke nꞌonwe ya sitere nꞌọnụ Jeremaya onye amụma kwuo okwu banyere ezughị oke nke ọgbụgba ndụ ochie ahụ sị “Lezienụ anya! Oge ga-adị mgbe m ga-eme ka ọgbụgba ndụ ọhụrụ guzosie ike nꞌetiti mụ onwe m na ụlọ Izirel na ndị Juda nile.
9. Ọgbụgba ndụ ọhụrụ a agaghị adị dị ka nke mụ na nna nna unu ochie ha gbara nꞌime ọzara. Nꞌoge ahụ, eji m aka m dupụta ha site nꞌala Ijipti, ma ha edebeghị ọgbụgba ndụ ahụ. Nꞌihi nke a mụ onwe m hapụrụ ha.
10. Ma otu a ka ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ ga-esi dịrị nꞌetiti mụ onwe m na ụmụ Izirel. Aga m etinye iwu m nile nꞌime mmụọ ha ka ha nwee ike ịmata ihe m chọrọ ka ha mee. Aga m edekwa iwu m nile nꞌime obi ha ka ha hapụ ichefu iwu m nile. Aga m akpọbata ha dị ka ụmụ nke m. Mụ onwe m ga-abụ Chineke ha.
11. Ọ dịkwaghị onye ọ bụla nꞌetiti ha ga-ezi ibe ya ma ọ bụ zisaa ozi ọma nye nwanne ya, ma ọ bụ gwa onye agbata obi ya okwu sị, ‘O kwesịrị ka ị mata Chineke!’ Nꞌihi na onye ọ bụla nꞌime ha, onye ukwu na onye nta, ga-amata m, sọpụrụ m site nꞌobi ha nile.
12. Mgbe ahụ, aga m enwe obi ebere banyere amaghị ihe ha. Aga m agbaghara ha mmehie ha nile. Agaghị m echetakwa mmehie ha nile ọzọ.”
13. Okwu a Chineke kwuru banyere ọgbụgba ndụ ọhụrụ a na-egosi na ọgbụgba ndụ ochie agabigala. Ọ dị ka akwa ochie dọkara adọka, nke e tufuru ruo mgbe ebighị ebi.