Bible n'ime otu afọ Mee 23JỌN 7:28-5328. Mgbe ahụ Jisọs tiri mkpu sị, “Nꞌezie unu maara m. Unu maara ebe a nọ mụọ m. Ma ọ dị onye zitere m. Onye ahụ zitere m bụ eziokwu. Ma unu amaghị ya.29. Amaara m ya. Ọbụkwa ebe ọ nọ ka m si bịa. Ọ bụ ya zitekwara m.”30. Mgbe ahụ ndị isi Juu ahụ biliri chọọ ijide ya. Ma mmadụ ọ bụla emetụghị ya aka nꞌihi na oge Chineke kara aka erubeghị.31. Ma ọtụtụ mmadụ nọ nꞌebe ahụ kweere na ya. Ihe ha kwuru bụ nke a, “Mgbe Onye nzọpụta ahụ ga-abịa, ọ̀ ga-arụ ọrụ ebube ọzọ karịrị nke nwoke a rụrụ?”32. Mgbe ndị Farisii nụrụ ihe ndị mmadụ na-ekwu, ha na ndị isi nchụaja gbara izu, zite ndị uwe ojii ka ha jide Jisọs.33. Ma Jisọs gwara igwe mmadụ ahụ okwu sị, “Nanị nwa oge nta ka m ga-anọnyere unu. Emesịa aga m alakwuru onye zitere m.34. Unu ga-achọ m ma unu agaghị achọta m. Unu enwekwaghị ike ịbịaru ebe m gaaga.”35. Ndị isi ndị Juu jụrịtara onwe ha ajụjụ sị, “Ebee ka ọ na-akwado ịga? Ọ̀ bụ ijekwuru ndị Juu nọ na mba ọzọ soro ha nọdụ na-ezi ndị mba ọzọ naabụghị ndị Juu ihe?36. Ụdị okwu dị aṅaa bụ nke a, na anyị ga-achọ ya ma anyị agaghị achọta ya? Na anyị apụghị ịbịaru ebe ọ na-aga?”37. Nꞌụbọchị ikpeazụ bụ ụbọchị dị mkpa nꞌoge mmemme ahụ, Jisọs guzoro ọtọ tie mkpu sị, “Ọ bụrụ na akpịrị na-akpọ onye ọ bụla nkụ ya bịakwute m, bịa ṅụrụ mmiri na-enye ndụ.38. Ọ bụrụ na unu ekwere na m, dị ka akwụkwọ nsọ kwuru, Chineke ga-eme ka isi iyi mmiri na-enye ndụ site nꞌime unu naasọpụta.”39. (Jisọs na-ekwu okwu banyere Mmụọ Nsọ nke ndị kweere na ya ga-anata. Nꞌoge ahụ Mmụọ Nsọ abịabeghị nꞌihi na Jisọs alaghachibeghị nꞌebube ya nꞌeluigwe).40. Mgbe ndị mmadụ nụrụ okwu a, ụfọdụ nꞌime ha sịrị, “Nꞌezie, nwoke a bụ onye amụma ahụ.”41. Ụfọdụ sịrị, “Nke a bụ Onye nzọpụta ahụ e kwere na nkwa.” Ma ụfọdụ sịrị, “Onye nzọpụta ahụ e kwere na nkwa ọ̀ ga-esi Galili pụta?42. Akwụkwọ Nsọ gwara anyị na Kraịst ga-esite nꞌagbụrụ Devidi bịa. Akwụkwọ nsọ gwakwara anyị na ọ ga-esi na Betilehem obodo Devidi pụta.”43. Nꞌihi nke a, nkewa dị nꞌetiti igwe mmadụ ndị ahụ.44. Ụfọdụ chọrọ ijide ya. Ma mmadụ ọ bụla emetụghị ya aka.45. Ndị uwe ojii ahụ e zitere ijide ya laghachiri azụ. Ha lọghachiri nꞌebe ndị isi nchụaja na ndị Farisii nọ. Mgbe ndị isi ahụ jụrụ ha ihe mere ha akpụtaghị Jisọs,46. Ha zara sị ha, “Anyị ahụbeghị nwoke kwuru okwu dị ka nwoke a si kwuo okwu taa.”47. Ndị Farisii jụrụ ha sị, “A ghọgbuokwala unu?48. Ò dị onyeisi ndị Juu ma ọ bụ onye Farisii unu hụrụ kweere na nwoke a bụ Onye nzọpụta ahụ?49. Ma igwe mmadụ ndị a amaghị akwụkwọ nsọ. Ha bụ ndị a bụrụ ọnụ.”50. Nikọdimọs, otu nꞌime ndị isi ndị Juu (nwoke ahụ bịakwutere Jisọs nꞌabalị),51. jụrụ ndị ibe ya sị, “Ò ziri ezi nꞌiwu ịma mmadụ ikpe tupuu e kpee ya ikpe?”52. Ha jiri oke olu jụọ Nikọdimọs ajụjụ nꞌiwe sị, “Gị onwe gị i sokwa na ndị si Galili pụta? Lee anya nꞌakwụkwọ nsọ ị ga-achọpụta na onye amụma ọ bụla esitebeghị na Galili pụta!”53. Nzụkọ ahụ gbasara. Onye ọ bụla lara nꞌụlọ ya. Igbo Bible 1988 No Data