Bible n'ime otu afọ June 21ỌLU OZI 5:1-211. Ma ọ dị otu nwoke a na-akpọ Ananayas. Ya na nwụnye ya Safaịra gbara izu ree ala ha nwere.2. Ma ha ewetaghị ego nile ha retara. Ananayas zoro ụfọdụ nꞌime ego ahụ. Safaịra nwụnye ya matakwara. O kwenyere ka di ya zoo ego ahụ. Ma ego ha kwekọtara iwepụta ka Ananayas wetara nye ndị ozi.3. Ma Pita maara ihe Ananayas mere. Ọ sịrị ya, “Gịnị mere i ji kwenye ka ekwensu na-achị nꞌobi gị ime ka ị ghọgbuo Mmụọ Nsọ? Gịnị mere ekwensu ji mee ka i kwere izo ụfọdụ nꞌime ego i retara?4. Mgbe a na-erebeghị ala ahụ, ala ahụ ọ̀ bụ nke onye? Ọ bụghị nke gị? Mgbe i rere ya ego i retara ọ̀ bụkwaghị nke gị, iji mee ihe ị chọrọ? Gịnị mere i ji mee ihe dị otu a? Ọ bụghị mmadụ ka ị ghọgburu, ọ bụ Chineke ka ị ghọrọ aghụghọ.”5. Mgbe Ananayas nụrụ okwu ndị a, ọ dara nꞌala nwụọ. Ndị nile nụrụ ihe mere tụrụ egwu.6. Ụmụ okorọbịa ndị nọ nꞌebe ahụ batara jiri akwa kee Ananayas bupụ ya, gaa lie ya.7. Mgbe awa atọ gasịrị, Safaịra nwụnye Ananayas batara. Ọ matabeghị ihe ọ bụla banyere ihe mere di ya.8. Mgbe ahụ Pita jụrụ ya sị, “Gwa m, ego ole ka unu rere ala ahụ?” Safaịra gwara na ọ bụ ihe ahụ di ya gwara ya.9. Pita sịrị ya, “Gịnị mere gị na di gị ji gbakọọ izu ịkpasu Mmụọ Nsọ iwe? Gee ntị! Nzọ ụkwụ ị na-anụ bụ nzọ ụkwụ ụmụ okorọbịa liri di gị. Ha ga-ebupụkwa gị!”10. Nꞌotu oge ahụ Safaịra dara nꞌihu Pita nwụọ. Ụmụ okorọbịa ahụ liri di ya batakwara buru ya pụọ gaa lie ya nꞌakụkụ ebe ha liri di ya.11. Oke egwu tụrụ nzukọ Kraịst nile. Oke egwu tụkwara ndị nile nụrụ akụkọ ndị a.12. Ndị ozi ahụ rụkwara ọrụ ebube na ọrụ ịtụnanya dị ukwuu nꞌetiti ndị mmadụ. Ndị kwere ekwe nile jiri otu obi zukọọ na mpaghara ụlọ nsọ ukwu Chineke a na-akpọ Mgbe ụlọ Solomọn.13. Ndị ọzọ tụrụ egwu ịdịnyere ha. Ma ọtụtụ mmadụ kwuru okwu dị mma banyere ha.14. Ọtụtụ ndị ọzọ, bụ ndị kwere nꞌOnyenwe anyị dịnyeere ha, nwoke na nwanyị.15. Nꞌihi ọrụ ebube ndị ozi rụrụ, ọtụtụ bupụtara ndị enyi ha na ndị ikwu ha nꞌụzọ, bụ ndị ahụ na-esighị ike. Ha nyibere ha nꞌụte ma ọ bụ nꞌihe ndina ọzọ. Nzube ha bụ na ọ bụrụ na Pita agafee ha, onyinyo ya ga-eme ka ahụ dị ha mma.16. Igwe mmadụ zukọrọ site nꞌobodo dị Jerusalem gburugburu. Ha butekwara ndị na-arịa ọrịa, na ndị mmụọ ọjọọ na-enye nsogbu. Ndị ozi mekwara ka ahụ dị ha mma.17. Ihe ndị a nile mere ka onyeisi nchụaja na ndị enyi ya, na ndị Sadusii megharịa ahụ. Ha jupụtara nꞌiwe na ekworo.18. Ha jidere ndị ozi a tinye ha nꞌụlọ mkpọrọ.19. Ma nꞌabalị ahụ, Onyenwe anyị zitere mmụọ ozi ya. Mmụọ ozi ahụ meghere ụzọ ụlọ mkpọrọ ahụ, dupụta ndị ozi ahụ, gwa ha okwu sị,20. “Gaanụ, guzonụ nꞌụlọ nsọ ụkwụ Chineke gwa ndi mmadụ ihe banyere ndụ ọhụrụ a!”21. Ndị ozi ahụ pụrụ dị ka mmụọ ozi gwara ha. Nꞌisi ụtụtụ ha banyere nꞌụlọ nso ukwu Chineke bido izi ihe. Mgbe e mesịrị, onyeisi nchụaja na ndị enyi ya, batara nꞌụlọ nzukọ ha. Onyeisi nchụaja kpọrọ nzukọ ndị na-achị achị. Ndị bịara nzukọ a bụ ndị okenye ndị Juu, ndị na-anọchite anya ụmụ Izirel nile. Mgbe ha zukọrọ, onyeisi nchụaja ziri ndị uwe ojii ka ha gaa kpụta ndị ozi site nꞌụlọ mkpọrọ. Igbo Bible 1988 No Data