Bible n'ime otu afọ Julaị 13ỌLU OZI 17:16-3416. Pọl nọdụrụ nꞌAtens chere Timoti na Sailas. Nꞌoge a o wutere ya nke ukwuu nꞌihi arụsị nile ọ hụrụ, nke jupụtara nꞌobodo ahụ.17. Nꞌihi ya, ọ banyere nꞌụlọ nzukọ ndị Juu soro ha kwuritaa okwu. Ụfọdụ ndị nọ nꞌime nzukọ a bụ ndị mba ọzọ na-atụ egwu Chineke. Ụbọchị nile Pọl na-ekwusara ndị nile na-abịakwute ya nꞌọgbọ ọha, ozi ọma.18. O sokwaara ndị ọkachamara obodo ahụ, ndị a na-akpọ ndị Epikuri na ndị Stoik kwurita okwu. Kama ha enweghị afọ ojuju mgbe Pọl gwara ha ihe banyere Jisọs na mbilite nꞌọnwụ ya. Mgbe ha nụrụ ya ụfọdụ sịrị, “Nwoke a na-arọ nrọ.” Ndị ọzọ sịkwa, “Ọ na-ewebata ozizi ọhụrụ dị iche.”19. Ndị ọkachamara ahụ kpọbatara ya nꞌebe ha zukọrọ, ebe a na-akpọ Ugwu Mas, sị ya, “Bịa kọwaara anyị ozizi ọhụrụ gị.20. Ihe nile ị na-ekwu na-akọ anyị ọkọ na ntị. Ha na-agbagwoju anyị anya. Anyị chọrọ ịnụ ha nke ọma.”21. Ihe e jiri mara ndị Atens bụ na ha na-achọ nanị ikwu okwu banyere ihe ọhụrụ. Nke a agwụchaala ọrụ ha, ịnụ ihe banyere ihe ọhụrụ na ikwu maka ya. Nke a bụkwa ọrụ ndị ọbia bi nꞌobodo ahụ.22. Nꞌihi nke a Pọl guzoro nꞌelu ugwu ahụ gwa ha okwu sị, “Unu ndị nile bi nꞌAtens. Amatara m na ọ na-anụ unu ọkụ nꞌobi ịsọpụrụ mmụọ nke unu na-efe ofufe.23. Nꞌihi na mgbe m na-ejegharị nꞌobodo unu, ahụrụ m ụlọ chi dị iche iche. Otu nꞌime ha ka e dekwasịrị ihe dị otu a nꞌelu ya, ‘E wuru ụlọ a nye chi ahụ a na-amaghị.’ Nke a pụtara na unu na-efe chi ahụ unu na-amaghị ofufe. Ma ugbu a, achọrọ m ka m kọwaara unu ihe banyere ya.24. “Chineke bụ onye kere ụwa na ihe nile dị nꞌime ya. Ebe ọ bụ onye nwe eluigwe na ụwa, ọ dịghị ebikwa nꞌụlọ e jiri aka wuo.25. Otu aka ahụ, mmadụ ọ bụla apụghị isite nꞌike aka ya jeere ya ozi nꞌụzọ kwesịrị. Nꞌihi na ọ dịghị ihe na-akpa Chineke mkpa. Ya onwe ya na-enye ndụ na ume na ihe nile. Ọ na-egbokwa mkpa nile.26. Ọ bụ ya kere mmadụ nile site nꞌotu nwoke. O mere ka mba dị iche iche dị nꞌelu ụwa. Ọ bụkwa nanị ya na-ekpebi ihe banyere mbilite na ọdịda nke mba nile. Ọ matakwara ihe banyere oge nile a kara aka na njedebe ihe nile e kere eke.27. “Ma nzube ya banyere ihe nile bụ ka onye ọ bụla chọsie ihu ya ike. Eleghị anya mmadụ nwere ike lezie ụzọ ya anya, si otu a chọta Chineke. Ọ nọkwaghị mmadụ ọ bụla nꞌebe dị anya.28. Nꞌihi na nꞌime ya ka anyị na-adị ndụ, anyị na-ejegharịkwa nꞌime ya. Dị ka otu onye nꞌetiti unu na-ekwu sị, ‘Anyị onwe anyị bụkwa ụmụ Chineke.’29. Ọ bụrụ na nke a bụ eziokwu, anyị ekwesịghị iche na Chineke dị ka ihe mmadụ jiri aka ya kpụọ. A pụkwaghị iwere ọlaọcha na ọlaedo ma ọ bụ nkume kpụọ Chineke!30. Ma Chineke lefuru enweghị ngbọta mmadụ anya banyere ihe ndị a nile nꞌoge gara aga. Ma ugbu a, ọ chọrọ ka onye ọ bụla site nꞌikpere arụsị wezuga onwe ya. Ọ chọkwara ka mmadụ nile fee ya ofufe.31. Nꞌihi na o debela otu ụbọchị mgbe ọ ga-ekpe ụwa nile ikpe nꞌụzọ ezi omume. Nke a bụ site nꞌaka Onye ahụ ọ họpụtara. O mekwara ka okwu a guzosie ike, mgbe o mere ka Onye ahụ si nꞌọnwụ bilie.”32. Mgbe ha nụrụ ozizi Pọl banyere mbilite nꞌọnwụ nke ndị nwụrụ anwụ, ha chịrị ya ọchị. Ma ụfọdụ nꞌime ha sịrị, “Nꞌoge ọzọ anyị ga-achọ ịnụ okwu ndị a.”33. Mmadụ ole na ole sooro Pọl. Ha kweere nꞌOnyenwe anyị. Otu onye nꞌime ha bụ Dionisiọs. Ọ bụ otu nꞌime ndị isi obodo ahụ. Onye ọzọ bụ nwanyị a na-akpọ Damariọs na ndị ọzọ kwa. Igbo Bible 1988 No Data