Bible n'ime otu afọ Julaị 15ỌLU OZI 19:1-201. Mgbe Apọlọs nọgidere na Kọrint, Pọl gakwara nꞌihu nꞌije ya. Ọ bịaruru Tọki. Nꞌebe ahụ ọ hụrụ ọtụtụ ndị na-eso ụzọ Onyenwe anyị.2. Ọ jụrụ ndị a ajụjụ sị ha, “Unu natakwara Mmụọ Nsọ mgbe unu kweere?” Ha zara sị ya, “Ọ dịghị! Anyị aghọtaghị ihe ị na-ekwu. Gịnị bụ Mmụọ Nsọ?”3. Pọl jụrụ ha ajụjụ ọzọ sị, “Gịnị ka unu kwenyere nꞌime ya mgbe e mere unu baptizim?” Ha zara sị ya, “Anyị kweere nꞌihe nile Jọn omee baptizim ziri.”4. Mgbe ahụ Pọl kọwaara ha na baptizim Jọn bụ ihe gosiri na ndị e mere ya chọrọ inwe mkpebi ichegharị site na mmehie ha bịakwute Chineke. O gosikwara na ndị e mere baptizim ahụ, jikeere ịga nꞌihu ikwere na Jisọs Onye ahụ Jọn kwuru na ọ ga-abịa.5. Mgbe ha ghọtara ihe ndị a, e mere ha baptizim nꞌaha Onyenwe anyị Jisọs.6. Mgbe Pọl bikwasịrị ha aka ya abụọ nꞌisi, ha natara Mmụọ Nsọ. Ha kwukwara okwu nꞌasụsụ dị iche iche, buokwa amụma.7. Ndị mere ihe ndị a ruru mmadụ iri na abụọ.8. Emesịa, Pọl jekwuuru ndị Juu nꞌụlọ nzukọ ha, na-agwa ha okwu, ma gbalịakwa ime ka ha nabata ihe ọ na-ezi ha banyere alaeze Chineke. O mere nke a ọnwa atọ.9. Ma ụfọdụ ekwereghị okwu ya, kama ha kwuru okwu megide Jisọs. Nꞌihi nke a Pọl hapụrụ ha. Ọ gwakwaghị ha okwu Chineke ọzọ. O kewapụrụ ụmụ Chineke ka ha nwee nzukọ dị iche nꞌebe ọzọ. O bidoro nzukọ ọzọ nꞌụlọ nzukọ otu nwoke a na-akpọ Tiranọs, nke dị nꞌime obodo ahụ. Ọ na-ekwusakwa okwu Chineke nꞌebe ahụ ụbọchị nile.10. Ihe ndị a gakwara nꞌihu afọ abụọ. Ndị nile bi na Tọki, nke dị nꞌEsia, nụkwara ozi ọma Onyenwe anyị Jisọs. Ọtụtụ nꞌime ha bụ ndị Juu ma ndị ọzọ bụ ndị Griik.11. Onyenwe anyị tụkwasịrị Pọl ike, ime ihe ịrịba ama dị iche iche.12. Ihe ịrịba ama o mere dị ukwuu. Nke ka nke, a na-ewere ụfọdụ nꞌime akịsị ma ọ bụ ịchafo ọ na-eji ehicha ihu na-atụkwasị nꞌahụ ndị ọrịa, ka ahụ dịkwa ha ike. E sitekwara na ya chụpụ mmụọ ọjọọ.13. Ụfọdụ ndị Juu dịkwa ndị na-ejegharị nꞌobodo dị iche iche na-achụpụ mmụọ ọjọọ nꞌime mmadụ. Ha chọkwara ime nke a nꞌaha Jisọs. Ihe ha na-agwa mmụọ ọjọọ bụ nke a, “E ji m aha Jisọs onye Pọl na-ekwusa nye gị iwu ka i site nꞌime ya pụta.”14. Ndị na-eme ihe dị otu a bụ ụmụ asaa Skiva onye nchụaja ndị Juu.15. Mgbe ha mere ihe dị otu a nꞌebe otu nwoke mmụọ ọjọọ bi nꞌime ya, mmụọ ọjọọ ahụ sịrị ha, “Amaara m Onye Jisọs bụ. Amakwaara m Pọl, ma onye ka unu bụ?”16. Nwoke ahụ mmụọ ọjọọ na-achị jidere mmadụ abụọ nꞌime ha tie ha ihe nke ukwuu, mee ka ha gbaa ọsọ. Ha gbaara ọtọ gbapụ nꞌụlọ ahụ. Ha merụkwara ahụ nke ukwuu nꞌakụkụ ahụ ha nile.17. Akụkọ banyere ihe ndị a jezuru obodo Efesọs nile. Mgbe ahụ ndị Juu na ndị Griik ụfọdụ nụkwara ihe ndị a. Oke egwu jidere ndị obodo ahụ. Nꞌihi nke a, e mekwara ka aha Onyenwe anyị Jisọs daa ụda nꞌebe nile.18. Ọtụtụ ndị chegharịrị bịara na-ekwupụta omume ọjọọ ha nile, nꞌihu mmadụ nile.19. Ọtụtụ ndị na-agwọ ọgwụ mgbaasị, bupụtara akwụkwọ nile ha ji na-eme mgbaasị, kpọọ ha ọkụ nꞌihu mmadụ nile. A kpọkwara ọgwụ nile ọkụ. Akwụkwọ nile a kpọrọ ọkụ nꞌụbọchị ahụ ga-erukwa akwụkwọ a ga-eji puku naịra anọ zụta.20. Ihe nile ndị a gosiri otu okwu Chineke si gbasaa, ma guzosiekwa ike. Igbo Bible 1988 No Data