Bible n'ime otu afọ Septemba 92 KỌRINT 1:1-231. Akwụkwọ ozi a sitere nꞌaka m Pọl onye Chineke họpụtara ịbụ onyeozi Jisọs Kraịst na site nꞌaka nwanna anyị bụ Timoti. Ọ bụ unu ndị chọọchị Chineke dị na Kọrint ka anyị na-edere akwụkwọ a, na ụmụ Chineke nile nọ na Griis.2. Ka amara na udo na-esite nꞌebe Chineke Nna anyị, na nꞌebe Onyenwe anyị Jisọs Kraịst nọ, dịrị unu.3. Ka anyị nye Chineke Nna nke Onyenwe anyị Jisọs Kraịst ekele nꞌihi na ọ bụ Nna nke obi ebere, bụrụkwa Chineke onye inyeaka anyị na-esite nꞌaka ya abịa.4. Ọ na-enyere anyị aka nꞌime nsogbu anyị nile, ka anyị site nꞌụzọ dị otu a nwee ike inyere ndị ọzọ nọ na nsogbu dị iche iche aka. Inyere ha aka dị ka anyị onwe anyị si nata inyeaka site nꞌaka Chineke.5. Nꞌihi na dị ka anyị si eketa oke nꞌime ọtụtụ ahụhụ nke Kraịst, otu a ka Chineke si na-akasị anyị obi nꞌime Kraịst.6. Ma ọ bụrụ na anyị na-ahụ ahụhụ, ọ bụ nꞌihi na anyị chọrọ ka a kasie unu obi, na ka a zọpụta unu. Ọ bụrụkwa na a na-akasị anyị obi, e sikwa ụzọ dị otu a enyere unu aka, nꞌihi na a na-enye unu ike na ume iji ntachi obi die ụdị ahụhụ nke anyị onwe anyị na-edikwa.7. Anyị nwere olileanya na ọ bụrụ na unu enwee nsogbu dị ka anyị nwere, Chineke ga-akasị unu obi, ma nyekwara unu aka dị ka o si nyere anyị aka nꞌime nsogbu anyị.8. Anyị chọrọ ka unu mara ụmụnna m, ihe banyere nsogbu e sogburu anyị nꞌEsia. Nꞌezie, nsogbu ahụ karịrị anyị ike, mee ka anyị hapụ inwekwa olileanya na anyị ga-emesị dịrị ndụ.9. Ee, ọ dị nnọọ nꞌoge ahụ, dị ka a ga-asị na a mara anyị ikpe ọnwụ. Ma anyị maara na o si otu a mee ka anyị nwee ike ịmụta na o kwesịghị ka anyị tụkwasị obi nꞌike nke aka anyị, kama ka anyị nwee olileanya nꞌime Chineke, onye pụrụ ime ka ndị nwụrụ anwụ si nꞌọnwụ bilie.10. Ọ bụ Chineke bụ onye dọpụtara anyị site nꞌime oke ọnwụ dị otu a. Ọ bụ Chineke ga-adọpụtakwa anyị nꞌoge dị nꞌihu. Anyị nwekwara ntụkwasị obi na ọ ga-aga nꞌihu na-adọpụtakwa anyị.11. Ma unu onwe unu nwere ike inyere anyị aka site nꞌikpere anyị ekpere. Nꞌihi na ọ bụrụ na ọtụtụ mmadụ anọgide na-ekpere anyị ekpere, ọtụtụ mmadụ ga-ekelekwa Chineke ekele nꞌihi ngọzi ọ na-agọzi anyị na nꞌihi nchebe ọ na-echebe ndụ anyị.12. Nꞌihi na otu ihe anyị ji na-anya isi, nke akọnuche anyị na-agwakwa anyị na ọ bụ eziokwu, bụ na mmeso anyị na-emeso ndị ọzọ, karịsịa mmeso anyị na-emeso unu, bụ mmeso nke obi ịdị ọcha na ikwu eziokwu site na ndabere anyị nꞌime Onyenwe anyị. Anyị emeghị nke a site nꞌamamihe ụwa a, kama site nꞌamara Chineke.13. Anyị na-edere unu nanị ihe anyị maara na unu nwere ike ịgụ ma ghọtakwa. Mgbe anyị na-edere unu akwụkwọ anyị, ọ dịghị ihe zoro ezo ọzọ anyị dere, bụ nke anyị na-achọghị ka unu ghọta.14. Ọ bụ ezie na unu amaghị anyị nke ọma ugbu a, ma enwere m olileanya na ụbọchị ahụ Onyenwe anyị Jisọs ga-abịa ọzọ, anyị ga-abụ ihe unu ga-eji nyaa isi, dị ka unu onwe unu ga-esi bụrụkwa ihe anyị ga-eji nyaa isi.15. Ọ bụ nꞌihi ntụkwasị obi m nwere na unu ga-aghọta, ka m ji zubekwa na mbụ ịbịakwute unu.16. Ebu m ya nꞌobi na m ga-akwụsị hụ unu mgbe m na-agafe ịga Masidonia. Ebukwa m ya nꞌobi na mgbe m si Masidonia na-alaghachi na m ga-akwụsịkwa ileta unu, ka m si otu a bụrụ ngọzi nye unu ugboro abụọ, ka unu nweekwa ike inyere anyị aka mgbe anyị bidoro ịlaghachi Judia.17. Ùnu chere na mgbe m zubere ime nke a, na ihe m zubere ime edoghị m anya? Ka ùnu chere na mgbe m zubere nke a, na m zubere ime ya dị ka onye ụwa, nke na-asị, ee, mgbe ihe o bu nꞌobi bụ é,è?18. Mbaa! Dị ka Chineke si bụrụ onye kwesịrị ntụkwasị obi, abụghị m onye na-ekwu otu ihe mee ihe ọzọ. Nꞌihi na ee m bụ ee! Ọ dịghị m, bụkwa ọ dịghị.19. Nꞌihi na Jisọs Kraịst Ọkpara Chineke, onye e sitere nꞌọnụ Sailas na Timoti na mụ onwe m bụ Pọl kwusaa abụghị onye na-asị ee, mgbe ihe o bu nꞌobi bụ ọ dịghị, kama Kraịst bụ onye na-eme ihe o kwuru.20. Nꞌihi na nkwa nile Chineke kwere mezuru nꞌime Jisọs Kraịst. Ọ bụ nꞌihi nke a ka anyị ji na-enye Chineke otuto a site nꞌaha Jisọs Kraịst.21. Ọ bụ Chineke nꞌonwe ya mere ka anyị na unu guzosie ike nꞌime Kraịst. O meela ka anyị bụrụ ndị e doro iche nye ya.22. Chineke akakwasịla anyị akara ya igosi na anyị bụ ndị nke ya. O nyekwala anyị Mmụọ Nsọ ya nꞌime obi anyị dị ka ihe akaebe na anyị ga-anata ihe nile o zubere inye anyị.23. Chineke bụ onye akaebe m, nꞌihi na ọ maara obi m, ọ maara na ekpebiri m ịhapụ ịbịa Kọrint nꞌihi na achọghị m ime ka obi jọọ unu njọ site na mba nke m bu nꞌobi ịbara unu. Igbo Bible 1988 No Data