Bible n'ime otu afọ Machị 21DEUTERONOMI 3:1-291. Ayi we che iru, rigo n'uzọ Beshan: Og, bú eze Beshan, we puta izute ayi, ya onwe-ya na ndi-ya nile, ibu agha, rue Edrei.2. Jehova we sim, Atula egwu ya: n'ihi na n'aka-gi ka M'nyeworo ya, na ndi-ya nile, na ala-ya; i gēme kwa ya dika i mere Saihon, bú eze ndi-Amorait, onye bi na Heshbon.3. Jehova, bú Chineke-ayi, we nye kwa n'aka-ayi Og, bú eze Beshan, na ndi-ya nile: ayi we tib͕ue ya rue mb͕e ọ nādighi otù onye fọduru arapuru ya.4. Ayi we were obodo-ya nile na mb͕e ahu; ọ dighi obodo ayi nānaraghi n'aka-ha; ọgu obodo atọ, akuku Agob nile, bú ala-eze Og nime Beshan.5. Ndia nile bu obodo eji mb͕idi di elu, na ọnu-uzọ-ama, na nkpọrọ, wusi ike; nāgughi obodo nēnweghi mb͕idi, ha bara uba nke-uku.6. Ayi we wezuga ha ka ebibie ha, dika ayi mere Saihon, bú eze Heshbon, nēwezuga obodo, ndikom ọ bula, ya na ndinyom, na umu-ntakiri, ka ebibie ya.7. Ma anu-ulo nile, na ihe-nkwata nke obodo ahu nile, ayi lutara ha n'agha n'onwe-ayi.8. Na mb͕e ahu ka ayi nara ala ahu n'aka eze abua nke ndi-Amorait ndi bi n'ofè Jọdan, site na ndagwurugwu Anon rue ugwu Heamon:9. (ndi Saidon nākpọ Heamon ahu Sirion, ma ndi-Amorait nākpọ ya Senia;)10. bú obodo nile nke ala ahu di lari, na Gilead nile, na Beshan nile, rue Saleka na Edrei, bú obodo ala-eze Og nime Beshan.11. (N'ihi na nání Og, bú eze Beshan, ka arapuru site na ndi fọduru nke Refaim; le, ihe-ndina-ya bu ihe-ndina ígwè; ihe-ndina ahu, ọ̀ dighi na Raba nke umu Amon? cubit iteghete ka ogologo-ya di, cubit anọ ka obosara-ya di kwa, dika cubit nke nwoke si di.)12. Ala nka ka ayi nweta-kwa-ra mb͕e ahu: site n'Aroea, nke di n'akuku ndagwurugwu Anon, na nkera ugwu Gilead, na obodo nile ya, ka m'nyere ndi Reuben nye kwa ndi Gad:13. nke fọduru nime Gilead, na Beshan nile, bú ala-eze Og, ka m'nyere nkera ebo Manase; akuku Agob nile (Beshan ahu nile ka anākpọ ala Refaim.14. Jaia nwa Manase were akuku Agob nile, rue ókè-ala ndi Geshua na ndi Meakat; ọ we kpọ ha Beshan-havot-jaia, n'aha-ya, rue ta.)15. Ọ bu kwa Makia ka m'nyere Gilead.16. M'we nye ndi Reuben nye kwa ndi Gad site na Gilead we rue ndagwurugwu Anon, bú etiti ndagwurugwu ahu, ka ọ buru ókè-ala; we rue miri-iyi Jabok, bú ókè-ala umu Amon;17. na Araba, na Jọdan, ka ọ buru ókè-ala, site na Kineret we rue oké osimiri Araba, bú Oké Osimiri Nnú, n'okpuru nkpọrube Pisga, n'akuku ọwuwa-anyanwu.18. M'we nye unu iwu na mb͕e ahu, si, Jehova, bú Chineke-unu, enyewo unu ala nka inweta ya: na njikere-agha ka unu gāgabiga n'iru umu-nne-unu, bú umu Israel, unu ndi-dìnkpà nile.19. Ọ bu nání na ndinyom-unu, na umu-ntakiri-unu, na anu-ulo-unu, (amawom na unu nwere ọtutu anu-ulo,) gānọdu n'obodo-unu nke m'nyeworo unu;20. rue mb͕e Jehova gēme ka umu-nne-unu zuru ike, dika O mere unu, ha onwe-ha we nweta kwa ala ahu nke Jehova, bú Chineke-unu, nēnye ha n'ofè Jọdan: unu we laghachi, nwoke ọ bula rue ihe-nnweta-ya, nke m'nyeworo unu.21. Joshua ka m'nye-kwa-ra iwu na mb͕e ahu, si, Anya-gi abua nāhu ihe nile Jehova, bú Chineke-unu, meworo eze abua ndia: otú a ka Jehova gēme ala-eze nile ebe gi onwe-gi nāgabiga.22. Unu atula egwu ha: n'ihi na Jehova, bú Chineke-unu, Ya onwe-ya bu onye nēburu unu agha.23. M'we riọ Jehova amara na mb͕e ahu, si,24. Onye-nwe-ayi, Jehova, Gi onwe-gi amalitewo ime ka orù-Gi hu idi-uku-Gi, na aka-Gi di ike: n'ihi na òle chi di n'elu-igwe ma-ọbu n'uwa, nke nēme dika omume-Gi nile si di, na dika idi-ike-Gi nile si di?25. Biko, ka m'gabiga, hu ezi ala ahu nke di n'ofè Jọdan, ezi ugwu ahu, na Lebanon.26. Ma Jehova webigara iwe ókè n'arum n'ihi unu, O geghi-kwam nti: Jehova we sim, O zuwo gi; agwa-kwa-lam okwu bayere ihe a ọzọ ma-ọli.27. Rigo n'elu Pisga, welie anya-gi abua le akuku Ọdida-anyanwu, na akuku Ugwu na akuku Ndida, na akuku ọwuwa-anyanwu, were kwa anya-gi abua le: n'ihi na i gaghi-agabiga Jọdan nka.28. Nye kwa Joshua iwu, me kwa ya ka ọ di ike, b͕a kwa ya ume: n'ihi na ya onwe-ya gāgabiga n'iru ndi nka, ya onwe-ya gēme kwa ka ha keta ala ahu nke i nāhu.29. Ayi we nọdu na ndagwurugwu na ncherita-iru Bet-peoa.DEUTERONOMI 4:1-491. Ma ub͕u a, Israel, ge nti ukpuru nile, ge kwa nti ikpé nile, nke mu onwem nēzí unu, ime ha; ka unu we di ndu, we ba, nweta kwa ala ahu nke Jehova, bú Chineke nke nna-unu-hà, nēnye unu.2. Unu atukwasila ihe n'okwu ahu nke mu onwem nēnye unu n'iwu, unu agubì-kwa la ihe nime ya, idebe ihe nile Jehova, bú Chineke-unu, nyere n'iwu, bú nke mu onwem nēnye unu n'iwu.3. Anya-unu nāhu ihe ahu nke Jehova mere n'okwu Beal-peoa: n'ihi na nwoke ọ bula nke jesoro Beal-peoa, Jehova, bú Chineke-gi, ekpochapuwo ya n'etiti gi.4. Ma unu onwe-unu ndi nārapara n'aru Jehova, bú Chineke-unu, unu nādi ndu ta, unu nile.5. Le, ezíwom unu ukpuru di iche iche na ikpé di iche íche, dika Jehova, bú Chinekem, nyerem iwu, ka unu we me otú a n'etiti ala ahu ebe unu onwe-unu nābà inweta ya.6. Debe-kwa-nu ha, me kwa ha; n'ihi na nka bu amam-ihe-unu na nghọta-unu n'anya ndi nile, ndi gānu ukpuru ndia nile, we si, Otú ọ di, ndi mara ihe na ndi nwere nghọta ka mba uku a bu.7. N'ihi na òle mba uku di, nke nwere chi di ya nso dika Jehova, bú Chineke-ayi, si di n'ihe nile ayi kpọkuworo Ya?8. Òle mba uku di kwa, nke nwere ukpuru na ikpé ziri ezi dika iwu a nile, nke Mu onwem nētiye n'iru unu ta?9. Nání lezie onwe-gi anya, debe kwa nkpuru-obi-gi nke-ọma, ka i ghara ichezọ ihe nile nke anya-gi abua huworo, ka ha ghara kwa isi n'obi-gi wezuga onwe-ha ubọchi nile nke ndu-gi; kama gi me ka umu-gi na umu umu-gi mara ha;10. ubọchi nke i guzoro n'iru Jehova, bú Chineke-gi, nime Horeb, mb͕e Jehova sirim, Kpọkọtaram ndim, M'gēme kwa ka ha nu okwum nile, ka ha we muta itu egwum ubọchi nile nke ha onwe-ha nādi ndu n'elu ala, ka ha we zí kwa umu-ha.11. Unu we biaru nso, guzo n'okpuru ugwu ahu; ugwu ahu nēre ọku rue obi elu-igwe, n'ọchichiri, na igwe-oji, na oké ọchichiri.12. Jehova we si n'etiti ọku ahu gwa unu okwu: ọ bu olu okwu ka unu onwe-unu nānu, ma ọdighi onye unu nāhu anya; nání olu.13. Ọ we gosi unu ọb͕ub͕a-ndu-Ya, nke Ọ nyere unu iwu ime, bú okwu iri ahu; Ọ we de ha n'elu mbadamba nkume abua.14. Ọ bu kwa mu ka Jehova nyere iwu na mb͕e ahu izí unu ukpuru di iche iche na ikpé di iche iche, ka unu we me ha n'ala ahu ebe unu nāgabiga inweta ya.15. Lezi-kwa-nu nkpuru-obi-unu anya nke-uku; n'ihi na unu ahughi udi ọ bula n'ubọchi Jehova si n'etiti ọku ahu gwa unu okwu na Horeb:16. ka unu we ghara ibibi onwe-unu, we mere onwe-unu arusi apiri api, bú udi nke oyiyi-ihe, ihe-atù nke oké ma-ọbu nwunye,17. ihe-atù nke anumanu ọ bula nke di n'uwa, ihe-atù nke nnunu ọ bula nke nwere nkù nke nēfe n'elu-igwe,18. ihe-atù nke ihe ọ bula nke nākpu akpu n'ala, ihe-atù nke azù ọ bula nke di na miri n'okpuru uwa:19. ka i we ghara kwa iweli anya-gi abua le elu-igwe, hu anyanwu na ọnwa na kpakpando, bú usu nile nke ihe elu-igwe, ewe duhie gi, i we kpọ isi ala nye ha, fè ha, bú ihe nke Jehova, bú Chineke-gi, kesaworo ndi nile n'okpuru elu-igwe nile.20. Ma Jehova ewerewo unu, me ka unu si n'oké ọku ígwè ahu, bú Ijipt, puta, iburu Ya ndi nketa, otú ọ di ta.21. Jehova wesa-kwa-ram iwe n'ihi okwu-unu, we ṅua iyi na m'gaghi-agabiga Jọdan, na m'gaghi-abà kwa n'ezi ala ahu, nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi ka ọ buru ihe-nketa:22. ma mu onwem gaje inwu n'ala nka, adighm-agabiga Jọdan: ma unu onwe-unu nāgabiga, unu gēnweta kwa ezi ala ahu.23. Lezienu onwe-unu anya, ka unu ghara ichezọ ọb͕ub͕a-ndu nke Jehova, bú Chineke-unu, nke unu na Ya b͕ara, unu we mere onwe-unu arusi apiri api, bú udi ihe ọ bula nke Jehova, bú Chineke-gi, nyere gi iwu bayere ya, si, Emela.24. N'ihi na Jehova, bú Chineke-gi, ọku nēripia eripia ka ọ bu, Chineke ekworo.25. Mb͕e i gāmu umu, na umu umu, unu we nọ di anya n'ala ahu, duhie onwe-unu, me arusi apiri api, bú udi ihe ọ bula, i we me ihe ọjọ n'anya Jehova, bú Chineke-gi, ikpasu Ya iwe:26. emewom ka elu-igwe na uwa b͕agide unu àmà ta, na unu gālapusi n'iyì ngwa ngwa n'ala ahu nke unu nāgabiga Jọdan ibà n'ebe ahu inweta ya; unu agaghi-eme ka ubọchi-unu di anya n'elu ya, kama agēkpochapu unu ekpochapu.27. Jehova gēme kwa ka unu b͕asa n'etiti ndi nile, unu gāfọdu kwa ndikom ole-na-ole n'etiti mba nile ọzọ, ebe Jehova gēduga unu.28. Unu gēfè kwa chi n'ebe ahu, ndi bu ọlu aka madu, bú osisi na nkume, nke nādighi-ahu uzọ, ha adighi-anu kwa ihe, ha adighi-eri ihe, ha adighi-anu kwa ísì.29. Ma asi na i si n'ebe ahu chọ Jehova, bú Chineke-gi, i gāchọta kwa Ya, mb͕e i were obi-gi nile na nkpuru-obi-gi nile jua ase Ya.30. Mb͕e nkpab͕u diri gi, mb͕e ihe nile ndia abiakwasiwo-kwa-ra gi, na mb͕e ikpe-azu nke ubọchi ndia i gālaghachikuru kwa Jehova, bú Chineke-gi, ge kwa olu-Ya nti:31. n'ihi na Jehova, bú Chineke-gi, bu Chineke nwere obi-ebere; Ọ gaghi-ara gi aka, Ọ gaghi-ebibi kwa gi, Ọ gaghi-echezọ kwa ọb͕ub͕a-ndu nke nna-gi-hà, nke Ọ ṅuru ha iyi bayere ya.32. N'ihi na biko, jua ajuju bayere ubọchi nile gara aga, nke buru gi uzọ, site n'ubọchi mb͕e Chineke kere madu n'elu uwa, site kwa n'otù nsọtu elu-igwe we rue nsọtu elu-igwe ọzọ, ma ihe dika ihe uku a adiwo, ma-ọbu na anuwo ihe di ka ya.33. Ọ̀di ndi ọ bula nuru olu Chineke ka o nēsi n'etiti ọku kwue okwu, dika gi onwe-gi nuworo, we di ndu?34. Ma-ọbu Chineke, Ọ̀ nwawo ibà nime otù mba isi n'etiti ya were n'Onwe-ya mba ọzọ, n'ọnwunwa di iche iche, na n'ihe-iriba-ama di iche iche, na n'ihe-ebube di iche iche, na n'agha, na n'aka di ike, na n'ogwe-aka esetiri eseti, na n'oké egwu di iche iche, dika ihe nile si di nke Jehova, bú Chineke-unu, mere unu n'Ijipt n'anya-unu?35. Emewo ka gi onwe-gi hu ya, ka i we mara na Jehova, Ya onwe-ya bu Chineke; ọ dighi onye ọzọ ma-ọbughi Ya;36. N'elu-igwe ka O si me ka i nu olu-Ya, ka O we dọ gi aka na nti: n'elu uwa ka O me-kwa-ra gi ka i hu ọku uku Ya; i we nu okwu-Ya nile site n'etiti ọku ahu.37. Ma n'ihi na Ọ huru nna-gi-hà n'anya, O we rọputa nkpuru-ha nọchiri ha, O we were ike uku Ya me ka i si n'Ijipt puta n'iru Ya;38. ka O we napu mba uku di kwa ike kari gi ala-ha n'iru gi, ime ka i ba, ka O we nye gi ala-ha ibu ihe-nketa, otú ọ di ta.39. I mawo kwa ta, cheta-kwa-ra obi-gi, na Jehova, Ya onwe-ya bu Chineke n'elu-igwe di n'elu na n'elu uwa di n'okpuru: ọ dighi onye ọzọ.40. I gēdebe kwa ukpuru-Ya nile, na ihe nile O nyere n'iwu, nke Mu onwem nēnye gi n'iwu ta, ka o we diri gi nma, di-kwa-ra umu-gi gānọchi gi, ka i we me kwa ka ubọchi-gi di anya n'elu ala ahu, nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi, ubọchi nile.41. Mb͕e ahu Moses kpaputara obodo atọ n'ofè Jọdan n'uzọ ọwuwa-anyanwu;42. ka ob͕u-madu we b͕alaga n'ebe ahu, bú onye nēb͕u ab͕ata-obi-ya nāmaghi ama, ma ya onwe-ya akpọghi ya asì na mb͕e gara aga; ka ọ we b͕alaga n'otù nime obodo ahu, we di ndu:43. bú Biza nime ọzara, n'ala ahu di lari, ka ọ diri ndi Reuben; na Remot nime Gilead, ka ọ diri ndi Gad; na Golan nime Beshan, ka ọ diri ndi Manase.44. Nka bu kwa iwu ahu nke Moses doro n'iru umu Israel:45. ndia bu ihe-àmà, na ukpuru, na ikpé, nke Moses gwara umu Israel, mb͕e ha si n'Ijipt puta;46. n'ofè Jọdan, na ndagwurugwu ahu na ncherita-iru Bet-peoa, n'ala Saihon, bú eze ndi-Amorait, onye bi na Heshbon, onye Moses na umu Israel tib͕uru, mb͕e ha si n'Ijipt puta:47. ha we nweta ala-ya, na ala Og, bú eze Beshan, bú eze abua ndi-Amorait, ndi di n'ofè Jọdan n'uzọ ọwuwa-anyanwu;48. site n'Aroea, nke di n'usọ ndagwurugwu Anon, we rue ugwu Saion (nke ahu bu Heamon),49. na Araba nile n'ofè Jọdan n'uzọ ọwuwa-anyanwu, we rue oké osimiri nke Araba, n'okpuru nkpọrube Pisga.ABÙ ỌMA 36:7-127. Le ka ebere-Gi si di oké ọnu-ahia, Chineke! Umu madu nāb͕abá kwa n'okpuru ǹdò nkù-Gi abua.8. Afọ nējubiga ha ókè site n'abuba nke ulo-Gi; Ọ bu kwa miri-iyi nke ihe-utọ-Gi nile ka I nēme ka ha ǹua.9. N'ihi na n'ebe I nọ ka isi-iyi ndu di: N'ìhè-Gi ka ayi nāhu ìhè.10. Me ka ebere-Gi digidere ndi mara Gi; Me kwa ka ezi omume-Gi digidere ndi ziri ezi n'obi.11. Ekwela ka ukwu npako biakwasim, Ekwe-kwa-la ka aka nke ndi nēmebi iwu me ka m'wagharia.12. N'ebe ahu ka ndi nālu ajọ ihe daworo: Enudawo ha, ha apughi kwa ibili ọzọ.ILU 12:7-77. Asi na ekpùe ndi nēmebi iwu iru, ha anọghi kwa: Ma ulo ndi ezi omume gēguzo.LUK 1:1-201. Ebe ọtutu madu tinyere aka-ha ide akwukwọ banyere ihe ahu nke emezuworo n'etiti ayi,2. ha dere ihe ndi mbu ji anya ha hu ihe ndia burukwa ndi na-ekwuputa ozioma, gwara ayi,3. ọ di-kwa-ram nma, ebe m'soro ihe nile nke-ọma site na mbu, ka m'dere gi ka o si me, Teọfilọs di oké ebube;4. ka i we mata na ihe nile ejiworo okwu ọnu zí gi bu ihe kwesiri itukwasi obi.5. N'ubọchi Herod, eze Judia, otù onye-nchu-àjà di, aha-ya bu Zakaraias, nke si n'òtù obodo Abaija puta: o nwe-kwa-ra nwunye nke si n'etiti umu-nwanyi Eron puta; aha nwayi ahu bu Elizabet.6. Ha abua bu ndi ezi omume n'iru Chineke, nāga n'ihe nile Onye-nwe-ayi nyere n'iwu na n'ihe nile Ọ guru n'ihe ziri ezi nādighi ita uta.7. Ha ejighi kwa nwa, n'ihi na Elizabet bu nwanyi-àgà, ha abua aghọwo kwa agadi.8. Ma o rue, mb͕e ọ nālu ọlu nchu-àjà n'iru Chineke dika ha si-eme kwa ubochi,9. dika omume ọlu nchu-àjà nādi, ọlu ibà n'ulo nsọ nke Onye-nwe-ayi na isure ihe-nsure-ọku nēsì isì utọ ruru ya site n'ife nzà.10. Ọra ndi-Ju nile nēkpe kwa ekpere n'èzí n'oge hour isure ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ.11. Ewe me ka ọ hu mọ-ozi Onye-nwe-ayi ka o guzoro n'aka-nri ebe-ichu-àjà ebe a na-eme ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ.12. Mb͕e Zakaraias huru ya obi we lọ ya miri, ọ tu-kwa-ra egwu.13. Ma mọ-ozi ahu siri ya, Atula egwu, Zakaraias: n'ihi na a nuwo aririọ-gi, nwunye-gi Elizabet gāmu-kwa-ra gi nwa-nwoke, i gākpọ kwa aha-ya Jọn.14. I gēnwe kwa ọṅù na obi-utọ; ọtutu madu gāṅuri kwa ọṅu n'ọmumu-ya.15. N'ihi na ọ gābu onye uku n'anya Onye-nwe-ayi, ọ gaghi-aṅu kwa manya-vine na ihe-ọṅuṅu nābà n'anya ma-ọli; agēme kwa ka o juputa na Mọ Nsọ, ọbuná site n'afọ nne-ya.16. Ọtutu madu nime umu Israel ka ọ gēme kwa ka ha chigharikwute Onye-nwe-ayi Chineke-ha.17. Ya onwe-ya gāga kwa n'iru Ya nime mọ na ike Elaija, ime ka obi ndi bu nna chigharikute umu-ha, ime kwa ka ndi nānughi ihe chigharia iga n'uche ndi ezi omume; idozi nye Onye-nwe-ya otù ndi nke akwadebeworo Ya.18. Zakaraias we si mọ-ozi ahu, Òle ihe m'gēji mara nka? n'ihi na mu onwem bu agadi, nwunyem aghọwo kwa agadi.19. Mọ-ozi ahu we za, si ya, Mu onwem bu Gebriel, onye nēguzo n'iru Chineke; ezite-kwa-ram igwa gi okwu, na izì gi ozi ọma ndia.20. Le kwa, i gēkpuchi ọnu, i gaghi-apu kwa ikwu okwu, rue ubọchi ahu mb͕e ihe ndia gēme, n'ihi na i kweghi okwum ndia, nke gēmezu n'oge-ha. Igbo Bible 2006 Igbo Bible © Bible Society of Nigeria © 1906, 2006